Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị n’Ezie?
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị n’Ezie?
Ọ̀ NA-ADỊ gị ka a hụrụ gị n’anya? Ka ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ọ dịghị onye na-eche banyere gị? N’ụwa a ọ na-adị ndị mmadụ ngwa ngwa, ha ana-achọkwa ọdịmma onwe ha, o yiri ka ò nwere ike ịdịrị gị mfe ikwere na o nweghị uru ị bara nakwa na o nweghị onye na-ahụ gị. Ihe Baịbụl kwuru banyere oge anyị a bụ eziokwu, ọtụtụ ndị taa na-achọ ọdịmma onwe ha nke na ndị mmadụ na-eleghara ibe ha anya n’ebe niile.—2 Timoti 3:1, 2.
N’agbanyeghị afọ ndụ anyị, omenala, asụsụ na agbụrụ anyị, ọ dị anyị niile mkpa ka a hụ anyị n’anya nakwa ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya. Akụkọ ụfọdụ gosiri na o nwere ihe e kenyere anyị n’ahụ́ nke isi ihe ọ na-arụ bụ ime ka anyị mata mgbe e gosiri anyị ịhụnanya na ọmịiko. Jehova Chineke, bụ́ onye kere anyị, ghọtara karịa onye ọ bụla ọzọ otú ọ dịruru anyị mkpa ka ndị ọzọ hụ anyị n’anya ma nwee mmasị n’ebe anyị nọ. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na o mesie gị obi ike na ị dị oké ọnụ ahịa n’anya ya? N’ezie, ọ ga-abụ ùgwù kachanụ e nwere ike ịkwanyere gị. Ànyị nwere nnọọ ike ijide n’aka na Jehova nwere mmasị n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ? Ọ̀ na-eche banyere anyị n’otu n’otu? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe na-eme ka o nwee mmasị n’ebe mmadụ nọ?
Jehova Na-eche Banyere Anyị
Ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, mgbe otu ọbụ abụ nke na-atụ egwu Chineke hụrụ otú eluigwe nke jupụtara na kpakpando n’abalị si maa mma, ọ tụrụ ya n’anya. O doro ya anya na Onye kere kpakpando a na-apụghị ịgụta ọnụ dị ebube karịa onye ọ bụla ọzọ. Mgbe ọbụ abụ ahụ tụgharịrị uche n’otú Jehova si dị ukwuu na otú ụmụ mmadụ si dị ala, ọ tụrụ ya n’anya na Jehova ji ịhụnanya na-eche banyere anyị. O kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ihe mkpịsị aka gị rụrụ, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ, nke mere i ji na-echeta ya?” (Abụ Ọma 8:3, 4) Ọ ga-adị mfe ikwubi na Onye Kasị Elu nọ n’ebe dị nnọọ anya ma ọ bụ na o ji nnọọ ọrụ n’aka ịhụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ma, ọbụ abụ ahụ maara na Chineke ji anyị kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ndụ anyị dị mkpụmkpụ, anyị adịkwa nnọọ ala ma e jiri anyị tụnyere Ya.
Abụ Ọma 147:11) Ihe ọbụ abụ abụọ ahụ na-ekwu na-emetụ n’obi. Ọ bụghị naanị na Jehova maara ụmụ mmadụ, kama, ‘ihe ha na-atọ ya ụtọ,’ ọ ‘na-elekọtakwa ha’ n’agbanyeghị otú o si dị elu.
Ọbụ abụ ọzọ kwuru ihe a na-emesi obi ike: “Ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ ndị na-atụ egwu ya, ee, ndị na-echere obiọma ya.” (Amụma Baịbụl nke kọrọ ihe ndị ga-eme n’oge anyị a mere ka nke a dokwuo anya. Jehova si n’ọnụ Hagaị onye amụma gosi na a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa niile. Olee ihe ndị ọ ga-arụpụta? Lekwa otu n’ime ha: “Ihe a na-achọsi ike nke mba niile ga-abata; m ga-emekwa ka ụlọ a jupụta n’ebube.”—Hagaị 2:7.
Olee ihe bụ́ “ihe [ndị a] a na-achọsi ike” e si ná mba niile na-achịkọta? O doro anya na ha abụghị akụnụba. (Hagaị 2:8) Ihe na-eme ka obi Jehova ṅụrịa abụghị ọlaọcha na ọlaedo. Ihe na-atọ ya ụtọ bụ ụmụ mmadụ ndị na-efe ya ofufe n’ihi na ha hụrụ ya n’anya n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (Ilu 27:11) Ha bụ “ihe a na-achọsi ike” nke na-enye ya otuto, ofufe ha ji obi ha dum na-efe ya na ozi ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya na-atọkwa ya ụtọ. Ì so na ha?
O nwere ike isiri mmadụ ike ikweta na Onye Ukwu kere eluigwe na ala nwere mmasị n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ. Ma, eziokwu a kwesịrị ime ka anyị zaa òkù o ji ịhụnanya na-akpọ anyị ka anyị bịaruo ya nso.—Aịzaya 55:6; Jems 4:8.
“Ị Bụ Onye A Hụrụ n’Anya nke Ukwuu”
Mgbe Daniel onye amụma merela agadi, otu ihe dị ịtụnanya mere ná ndụ ya n’otu mgbede. Ka Daniel nọ na-ekpe ekpere, otu nnukwu ọbịa bịaara ya na mberede. Aha ya bụ Gebriel. Daniel ahụla ya mbụ ma mata na ọ bụ mmụọ ozi Jehova. Gebriel kọwara ihe kpatara ọbịbịa mberede ya, sị: “Daniel, ugbu a abịawo m ime ka i nwee ike ịghọta na ịmata ihe karị . . . n’ihi na ị bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.”—Daniel 9:21-23.
N’oge ọzọ, otu n’ime ndị mmụọ ozi Jehova gwara Daniel, sị: “Daniel, nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.” Iji gbaa Daniel ume, mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Atụla egwu, nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu. Udo dịrị gị.” (Daniel 10:11, 19) Ya mere, a gwara Daniel ugboro atọ na ọ bụ nwoke “a hụrụ n’anya nke ukwuu.” Okwu ahụ nwekwara ike ịpụta “onye e ji kpọrọ ihe nke ukwuu” ma ọ bụdị “onye a kacha hụ n’anya.”
N’ezie, Daniel aghọtala na Chineke ya nọ ya nso, o dokwara anya na ọ ghọtara na Jehova nabatara ozi o ji obi ya niile na-ejere ya. Ma, ọ ga-abụrịrị na ozi ndị ahụ Chineke si n’ọnụ ndị mmụọ ozi ya zie Daniel, nke bụ́ na Ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu, mesiri nnọọ Daniel obi ike. O jughị anyị anya na Daniel 10:19.
Daniel kwuziri, sị: “I mewo ka m dị ike.”—E dere akụkọ ahụ na-enye obi ụtọ, bụ́ nke kwuru banyere ịhụnanya Jehova nwere n’ebe onye amụma ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ, n’Okwu Chineke maka abamuru anyị. (Ndị Rom 15:4) Ịtụgharị uche n’ihe nlereanya Daniel na-eme ka anyị ghọta ihe na-eme ka Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya hụ mmadụ n’anya nke ukwuu.
Na-amụchi Okwu Chineke Anya
Daniel na-amụsi Akwụkwọ Nsọ ike. Otú anyị si mara nke a bụ na ya onwe ya dere, sị: “Mụ onwe m . . . ghọtara site n’akwụkwọ dị iche iche afọ ole Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu.” (Daniel 9:2) O nwere ike ịbụ na akwụkwọ ndị Mozis, Devid, Sọlọmọn, Aịzaya, Jeremaya, Ezikiel, na ndị amụma ndị ọzọ si n’ike mmụọ nsọ dee so n’akwụkwọ ndị o nwere mgbe ahụ. Anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ ka ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta gbara Daniel gburugburu, hụkwa ka o ji obi ya niile na-agụ akwụkwọ ndị ahụ ma jiri amụma ndị metụtara mweghachi ezi ofufe na Jeruselem na-atụnyere ibe ha. Ka ọ nọ naanị ya, ikekwe n’ọnụ ụlọ dị n’elu ụlọ ya, o doro anya na ọ tụgharịrị nnọọ uche n’ihe ebe ndị ahụ ọ gụrụ pụtara. Ihe ọ mụrụ iji ghọta ihe ndị amụma kwuru mere ka okwukwe ya sie ike ma mee ka ọ bịaruo Jehova nso.
Ịmụ Okwu Chineke kpụziri àgwà Daniel ma metụta ihe niile ọ na-eme ná ndụ. O doro anya na ihe ndị a kụziiri ya site n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ bụ nwata mere ka o kpebisie ike mgbe ọ na-eto eto irube isi n’Iwu ndị Chineke nyere banyere ihe oriri, bụ́ ndị na-eduzi ndị Chineke n’oge ahụ. (Daniel 1:8) Mgbe e mechara, o ziri ndị eze Babịlọn ozi Chineke n’atụghị egwu. (Ilu 29:25; Daniel 4:19-25; 5:22-28) E ji ịdị uchu, ịkwụwa aka ọtọ, na ikwesị ntụkwasị obi mara ya. (Daniel 6:4) Nke ka nke bụ na Daniel tụkwasịrị nnọọ Jehova obi kama imebi iwu Chineke iji chebe ndụ ya. (Ilu 3:5, 6; Daniel 6:23) Ka a sịkwa ihe mere o ji bụrụ onye Chineke “hụrụ n’anya nke ukwuu”!
E nwere ike ikwu na ịmụ Baịbụl dịịrị anyị mfe n’oge a karịa otú ọ dịịrị Daniel. Akwụkwọ ndị dị mfe ọgụgụ anọchiela anya nnukwu akwụkwọ mpịakọta. Anyị nwere Baịbụl zuru ezu ugbu a, nke gụnyere ihe e dere banyere otú amụma ndị Daniel buru si mezuo. Anyị nwekwara ọtụtụ ihe ndị na-enye aka n’ịmụ Baịbụl na ime nchọnchọ. * Ị̀ na-eji ihe ndị a amụ ihe? Ị̀ na-ewepụta oge mgbe niile iji gụọ Baịbụl ma tụgharịa uche? Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abara gị uru otú ahụ ọ baara Daniel. Ị ga-enwe ike inwe okwukwe siri ike, gị na Jehova adịkwuokwa ná mma. Okwu Chineke ga na-eduzi gị ná ndụ, mee ka obi sie gị ike na Chineke hụrụ gị n’anya ma na-elekọta gị.
Nọgidesie Ike n’Ekpere
Daniel ejighị ekpere egwuri egwu. Ọ rịọrọ Chineke arịrịọ ndị kwesịrị ekwesị. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, a gwara ya na a ga-egbu ya ma ọ bụrụ na ọ kọlighị nrọ Eze Nebukadneza nke Babịlọn rọrọ. N’egbughị oge, Daniel rịọrọ Jehova ka ọ kwado ya ma chebe ya. (Daniel 2:17, 18) Ọtụtụ afọ ka nke ahụ gasịrị, ebe onye amụma a kwesịrị ntụkwasị obi ji obi umeala ghọta na ya bụ mmadụ na-ezughị okè, o kwupụtara mmehie ya na mmehie nke ndị ya ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara ha. (Daniel 9:3-6, 20) Mgbe Daniel na-aghọtaghị ihe ndị e ji ike mmụọ nsọ gosi ya, ọ rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka. N’otu oge, mmụọ ozi nke mechara leta Daniel iji mee ka o nwekwuo nghọta gwara ya, sị: “A nụrụ ihe i kwuru.”—Daniel 10:12.
Ma, naanị ihe Daniel ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mere abụghị ịrịọ Chineke arịrịọ. Daniel 6:10 kwuru, sị: “Ọ [na-ekpe] ekpere ma too Chineke ya ugboro atọ n’ụbọchị, dị ka ọ na-eme mgbe niile tupu oge ahụ.” Daniel hụrụ ọtụtụ ihe ndị mere ọ ga-eji kelee Jehova ma too ya. O mekwara otú ahụ mgbe niile. N’ezie, ekpere bụ otu n’ime ihe ndị kacha mkpa ọ na-eme n’ofufe ya, nke na o kweghị ịkwụsị ya mgbe a gwara ya na a ga-egbu ya ma ọ́ kwụsịghị ya. O doro anya na ikwesị ntụkwasị obi ya mere ka ọ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova.
Ekpere bụ ezigbo ihe ùgwù! Anọla otu ụbọchị n’agwaghị Nna gị nke eluigwe okwu. Cheta ikele ya na ito ya maka ihe ọma niile ọ na-eme. Gwa ya ihe niile na-echegbu gị. Chee echiche otú o sirila meere gị ihe ndị ị rịọrọ ya, keleekwa ya maka ha. Agbala ekpere gị ọsọ. Mgbe anyị na-agwa Jehova obi anyị niile otú ahụ n’ekpere, anyị na-ahụ na ọ hụrụ anyị onwe anyị n’anya. Nke ahụ kwesịrị nnọọ ime ka anyị ‘nọgidesie ike n’ekpere’!—Ndị Rom 12:12.
Na-eto Aha Jehova
O nweghị mmadụ abụọ ga-anọgide na-abụ ezigbo enyi ma ọ bụrụ na otu n’ime ha na-achọ naanị ọdịmma onwe ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ná mmekọrịta anyị na Jehova. Daniel maara nke a. Chetụgodị echiche otú ito aha Jehova dịruru ya ná mkpa.
Mgbe Chineke zara ekpere ya site n’ikpughere ya nrọ Nebukadneza na nkọwa ya, Daniel kwuru, sị: “Ka aha Chineke bụrụ ihe a gọziri agọzi site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, maka amamihe na ịdị ike ya, n’ihi na ọ bụ ya nwe ha.” Ka e mechara, mgbe Daniel na-agwa Nebukadneza nrọ ya na nkọwa ya, o nyere Jehova otuto ugboro ugboro, mee ka o doo anya na ọ bụ naanị Ya bụ “Onye na-ekpughe ihe nzuzo.” N’otu aka ahụ, mgbe Daniel na-arịọ Chineke ka ọ gbaghara ha ma napụta ha, o kpere ekpere, sị: “Chineke m, . . . a kpọkwasịrị obodo gị na ndị gị aha gị.”—Daniel 2:20, 28; 9:19.
Anyị nwere ọtụtụ ụzọ anyị ga-esi ṅomie Daniel na nke a. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị nwere ike ịgwa Chineke na ọ na-agụ anyị agụụ ‘ka e doo aha ya nsọ.’ (Matiu 6:9, 10) Anyị ekwesịtụghị ikwe ka àgwà anyị wetara aha nsọ Jehova nkọcha. Kama nke ahụ, ka anyị na-eto Jehova mgbe niile site n’ịgwa ndị ọzọ ihe ndị anyị mụtara banyere ozi ọma nke Alaeze ya.
N’ezie, ndị mmadụ anachaghị ahụ ibe ha n’anya ma ọ bụ echebara ibe ha echiche n’ụwa anyị a. Ma, ịmara na Jehova na-echebara ndị na-efe ya ofufe echiche n’otu n’otu nwere nnọọ ike ịkasi anyị obi. Dị ka otu ọbụ abụ kwuru: “Ihe ndị Jehova na-atọ ya ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta achọ ndị dị umeala n’obi mma.”—Abụ Ọma 149:4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 Ndịàmà Jehova na-emepụta ọtụtụ ihe ndị na-enye aka n’ime nchọnchọ na n’ịmụ ihe, bụ́ ndị nwere ike ime ka ịgụ Baịbụl na ịmụ ya na-abakwuru gị uru. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ihe ndị dị otú ahụ na-enye aka n’ịmụ Baịbụl, kpọtụrụ Onyeàmà Jehova ọ bụla.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]
Chineke gosiri na ọ hụrụ Daniel n’anya site n’izite mmụọ ozi Gebriel ka ọ gaa gbaa ya ume
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]
Ịdị uchu n’ọmụmụ ihe na n’ekpere mere ka àgwà Daniel ka mma, meekwa ka Chineke hụ ya n’anya