Ọ̀ Bụ Emeghị Ihe n’Eziokwu n’Ezie?
Ọ̀ Bụ Emeghị Ihe n’Eziokwu n’Ezie?
“Gbanwetụ ihe n’ihe i dere banyere ihe ọghọm i nwere, okwu agwụ.”
“Ọ bụghị iwu na ị ga-agwa ndị na-ana ụtụ isi ihe niile ị na-enweta.”
“Ihe ka mkpa bụ ka a ghara ijide gị.”
“Olee ihe mere ị ga-eji kwụọ ụgwọ ebe ị ga-enwetali ya n’efu?”
I NWERE ike ịnụ ihe yiri ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị gwa mmadụ ka ọ tụọrọ gị aro n’okwu ego. O yiri ka ụfọdụ ndị hà maara nnọọ “azịza” ihe niile. Ajụjụ bụ, Ime ihe ndị ahụ ha ga-asị gị mee ọ̀ bụ ime ihe n’eziokwu?
Emeghị ihe n’eziokwu juru ebe niile taa nke na ndị mmadụ na-elekarị ịgha ụgha, ịghọ aghụghọ, na izu ohi anya dị ka ihe ndị mmadụ nwere ike ime iji zere ntaramahụhụ, iji kpata ego, ma ọ bụ iji nwee ọganihu. Ndị a ma ama n’obodo anaghị emekarị ihe n’eziokwu. N’otu mba dị na Yurop, ọ fọrọ obere ka ọnụ ọgụgụ ndị gwuru wayo na ndị rikpọrọ ego ọha na eze n’agbata afọ 2005 na afọ 2006 jiri okpukpu abụọ karịa otú ọ dị tupu afọ ndị ahụ. Ọtụtụ obere nrụrụ aka, ndị ụfọdụ ndị na-akpọ “obere njọ,” esoghị na ha. Ikekwe, o juchaghị ndị mmadụ anya na a kọsara akụkọ ọjọọ banyere ndị ọnụ na-eru n’okwu n’azụmahịa na n’ọchịchị ná mba ahụ n’ihi na ha ji asambodo adịgboroja nweta ọkwá ha.
Ma, n’agbanyeghị na emeghị ihe n’eziokwu juru ebe niile n’ụwa, ọtụtụ ndị chọrọ ime ihe ziri ezi. Ikekwe, ị bụ otu n’ime ha. O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ime ihe ziri ezi n’anya Chineke n’ihi na ị hụrụ ya n’anya. (1 Jọn 5:3) I nwere ike inwe ụdị echiche Pọl onyeozi nwere, bụ́ onye dere, sị: “Anyị kwenyesịrị ike na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Ndị Hibru 13:18) N’ihi ya, biko, ka anyị tụlee ọnọdụ ụfọdụ nwere ike ime ka o siere onye chọrọ ime ihe “n’eziokwu n’ihe niile” ike ime otú ahụ. Anyị ga-atụlekwa ụkpụrụ Baịbụl ndị nwere ike inyere gị aka n’ụdị ọnọdụ ndị ahụ.
Ònye Kwesịrị Ịkwụ Ụgwọ Maka Ihe Ọghọm?
Otu ụbọchị mgbe otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lisa * na-akwọ ụgbọala, anya hiere ya, ya agaa kụọ ụgbọala ọzọ. O nweghị onye merụrụ ahụ́, ma, ụgbọala abụọ ahụ mebiri. Ná mba ya, ụmụ okoro na agbọghọ na-akwọ ụgbọala na-akwụ ndị ịnshọransị nnukwu ego, ego ha na-akwụ na-agbagokwukwa mgbe ọ bụla ha nwere ihe ọghọm. Ebe ọ bụ na deede Lisa aha ya bụ Gregọ so ya n’ụgbọala ahụ, otu enyi Lisa tụụrụ ha aro ka ha dee na ọ bụ Gregọ kwọ ụgbọala ahụ. Ha mee otú ahụ, Lisa agaghị akwụzi ndị ịnshọransị ego bukwuru ibu. Aro ahụ yiri ihe magburu onwe ya. Olee ihe o kwesịrị ime?
Ndị ịnshọransị na-esi n’ego ndị ahịa ha
na-akwụ ha akwụ ụgwọ ihe ndị e mebiri ma na-anakwu ha ego ma ọ bụrụ na o zughị. N’ihi ya, ọ bụrụ na Lisa emee ihe ahụ enyi ya tụụrụ ya n’arọ, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-amanye ndị ahịa ndị ọzọ ịkwụ ụgwọ ahụ ọ na-akwụghị. Ọ bụghị naanị na ihe ọ ga-ede abụghị eziokwu, kamakwa ọ ga-ezu ndị ọzọ ohi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na mmadụ aghaa ụgha iji bulie ego ndị ịnshọransị ga-akwụ ya maka ihe ọghọm.Ahụhụ iwu obodo na-ata ndị dara iwu nwere nnọọ ike ime ka ndị mmadụ zere ụdị emeghị ihe n’eziokwu ahụ. Ma, ihe ka mkpa mere e kwesịrị iji zere emeghị ihe n’eziokwu dị n’Okwu Chineke. Otu n’ime Iwu Iri ahụ kwuru, sị, “Ezula ohi.” (Ọpụpụ 20:15) Pọl onyeozi nyeghachiri Ndị Kraịst iwu ahụ, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi.” (Ndị Efesọs 4:28) Ọ bụrụ na i rubere Okwu Chineke isi n’ihe ndị metụtara okwu ịnshọransị, ị ga-ezere ime ihe Chineke na-achọghị. Ị ga-egosikwa na ị hụrụ iwu Chineke na ndị agbata obi gị n’anya, na-akwanyekwara ha ùgwù.—Abụ Ọma 119:97.
“Kwụọnụ Siza Ihe Siza”
Pita bụ ọchụnta ego. Onye na-apịaziri ya ego tụụrụ ya aro ka o tinye akwụkwọ ka e sepụrụ ya ego n’ụtụ isi ya maka “ịzụ” ígwè kọmputa dara oké ọnụ. Ụlọ ọrụ ndị dị ka nke Pita na-azụkarị ụdị ngwá ọrụ ahụ. Ọ bụ ezie na Pita azụghị ụdị ngwá ọrụ ahụ, o yighị ka gọọmenti ọ̀ ga-achọpụta. Ego ahụ a ga-esepụrụ Pita ga-eme ka ụtụ isi ọ ga-akwụ belata nnọọ. Olee ihe o kwesịrị ime? Olee ihe nwere ike inyere ya aka ikpebi ihe ọ ga-eme?
Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nke oge ya, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị . . . Na-enyenụ mmadụ niile ihe Ndị Rom 13:1, 7) Ndị chọrọ ka Chineke gọzie ha na-atụ ụtụ isi niile ndị ọchịchị chọrọ ha n’aka. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na iwu obodo kwuru ka e sepụrụ ụfọdụ ndị ma ọ bụ ụlọ ọrụ ụfọdụ ego n’ụtụ isi, ọ dịghị ihe dị njọ na ya ma onye ruru eru inweta ụdị ego ahụ tinye akwụkwọ ka e sepụrụ ya ya.
ruuru ha, onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi; onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ ahịa, tụọrọnụ ya ụtụ ahịa.” (Ka anyị tụlee ọnọdụ ọzọ metụtara ịtụ ụtụ isi. E were Devid n’ọrụ n’otu ụlọ ọrụ dị n’obodo ya dị ka ọkwa nkà. Ma, ndị enyi ya na ndị agbata obi ya na-agwa ya ka ọ rụọrọ ha oche na ihe ndị ọzọ a na-edowe n’ụlọ, ọ na-arụkwa ha mgbe a gbasara ọrụ. Ego ha na-akwụ ya karịrị ụgwọ ọnwa ya, ma ha achọghị ka o dee ihe ndị ọ rụụrụ ha n’akwụkwọ. N’ihi ya, o nweghị onye na-edekọ ihe ọ na-arụrụ ha, o nweghịkwa onye na-atụ ụtụ isi maka ha. Ọtụtụ ndị chere na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na nke a, ebe ọ bụ na ọ na-abara mmadụ niile uru. Ebe ọ bụ na Devid chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, olee otú o kwesịrị isi lee ọrụ a na-edeghị n’akwụkwọ anya?
Ọ bụ ezie na e nwere ike a gaghị ejide onye si otú ahụ arụ ọrụ, ọ naghị atụrụ gọọmenti ụtụ isi ha kwesịrị inweta. Jizọs nyere iwu, sị: “Ya mere, kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” (Matiu 22:17-21) Jizọs kwuru ihe a iji gbazie echiche ndị na-ege ya ntị banyere ịtụ ụtụ isi. Ndị ọchịchị, bụ́ ndị Jizọs kpọrọ Siza, weere ịtụrụ ha ụtụ isi dị ka ihe ruuru ha. N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ Kraịst na-ele ịtụ ụtụ isi niile anya dị ka ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ ha n’aka.
Ịghọ Aghụghọ n’Ule
Nwa akwụkwọ aha ya bụ Mata, nke nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, na-akwadebe ile ule ikpeazụ ya. Ebe ọ bụ na ihe ga-eme ka o nweta ezigbo ọrụ bụ ime nke ọma n’ule ahụ, o wepụtara ọtụtụ awa gụọ akwụkwọ. Ụfọdụ ụmụ klas ya kwadebekwara—ma, ọ bụ n’ụzọ dị iche. Ha ga-eji ígwè ozi peja, ígwè mgbakọ na mwepụ, na ekwe ntị ghọọ aghụghọ n’ule ahụ iji mee nke ọma. Mata ò kwesịrị ime ihe “onye ọ bụla” na-eme iji hụ na o mere nke ọma n’ule ahụ?
Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-aghọ aghụghọ n’ule, ọtụtụ ndị chere na o nweghị ihe dị njọ na ya. Ha na-eche, sị: “Ihe ka mkpa bụ ka a ghara ijide gị.” Ma, echiche ahụ ezighị ezi n’anya ezi Ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na onye nkụzi nwere ike ọ gaghị ahụ ndị ghọrọ aghụghọ, o nwere onye na-ahụ ha. Jehova Chineke maara ihe anyị na-eme, ọ ga-ekpekwa anyị ikpe maka ihe ndị anyị mere. Pọl dere, sị: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya, ma ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Ịmara na Chineke na-ele anyị anya n’ihi mmasị o nwere ka anyị mee ihe ziri ezi na-eme nnọọ ka anyị kwụwa aka ọtọ n’ule, ọ́ bụghị ya?
Gịnị Ka Ị Ga-eme?
Lisa, Gregọ, Pita, Devid, na Mata hụrụ na ọnọdụ ahụ bịaara ha abụghị ihe e kwesịrị iji gwurie egwu. Ha kpebiri ime ihe n’eziokwu, sikwa otú ahụ nọgide na-enwe akọ na uche dị
ọcha ma kwụsie ike n’ihe ziri ezi. Olee ihe ị ga-eme ma ụdị ọnọdụ ahụ bịara gị?O nwere ike o nweghị ihe ndị enyi gị, ụmụ klas gị, na ndị agbata obi gị ji ịgha ụgha, ịghọ aghụghọ, ma ọ bụ izu ohi kpọrọ. N’eziokwu, ha nwere ike iji ịkwa emo nwaa ịmanye gị ime ihe ndị ha na-eme. Olee ihe nwere ike inyere gị aka ime mkpebi ziri ezi n’agbanyeghị mmanye a na-amanye gị ịghara ime ihe n’eziokwu?
Cheta na ime ihe kwekọrọ n’uche Chineke na-eme ka anyị nwee akọ na uche dị ọcha, meekwa ka ihe anyị dị Chineke mma, ya agọziekwa anyị. Eze Devid dere, sị: “Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị? Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị? Ọ bụ onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ, onye na-eme ezi omume, onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya. . . . A gaghị eme ka onye na-eme ihe ndị a maa jijiji ma ọlị.” (Abụ Ọma 15:1-5) Anyị inwe akọ na uche dị ọcha na anyị na Chineke nke eluigwe ịdị ná mma karịrị nnọọ ihe onwunwe ọ bụla anyị nwere ike ịghọta n’aghụghọ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
“Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi.”
Ịkwanyere iwu Chineke ùgwù na ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya na-akpali anyị ime ihe n’eziokwu n’ihe ndị metụtara ịnshọransị
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
“Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha, onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi.”
Iji nweta ngọzi Chineke, anyị na-atụ ụtụ isi niile iwu chọrọ anyị n’aka
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]
‘Ihe niile ghere oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.’
Ọ bụ ezie na ndị nkụzi nwere ike ha agaghị ejide anyị mgbe anyị na-aghọ aghụghọ n’ule, anyị kwesịrị ime ihe n’eziokwu n’anya Chineke
[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]
Ohi “A Na-anaghị Ahụ Anya”
Ka e were ya na enyi gị zụrụ otu ihe omume kọmputa pụtara ọhụrụ, gị achọọkwa inweta ya. Ya agwa gị na ọ ga-eme ka ị ghara imefu nnukwu ego site n’imepụtaghachiri gị ihe omume ahụ. Nke ahụ ọ̀ bụ emeghị ihe n’eziokwu?
Mgbe ndị nwere kọmputa zụrụ ihe omume kọmputa, ha na-ekwere ịgbaso nkwekọrịta e depụtara n’ihe omume ahụ. Nkwekọrịta ahụ nwere ike ikwu na onye zụrụ ihe omume ahụ nwere ike itinye ya ma jiri ya na-arụ ọrụ naanị n’otu kọmputa. Ya bụrụ otú ahụ, imepụtaghachiri onye ọzọ ihe omume kọmputa ahụ ka o tinye na nke ya ga-abụ imebi nkwekọrịta gị na ndị mepụtara ya, o megidekwara iwu. (Ndị Rom 13:4) Imepụtaghachi ya bụkwa izu ohi, n’ihi na ọ na-eme ka onye mepụtara ihe omume ahụ ghara inweta ego o kwesịrị inweta.—Ndị Efesọs 4:28.
Ụfọdụ nwere ike ikwu, sị, ‘O nweghị onye ga-amata.’ Ya bụrụgodị otú ahụ, anyị kwesịrị icheta ihe a Jizọs kwuru: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ọ na-amasị anyị niile ka a kwụọ anyị ụgwọ ihe anyị rụrụ, anyị na-achọkwa ka ndị ọzọ na-akwanyere ihe onwunwe anyị ùgwù. N’ihi ya, anyị kwesịrị imere ndị ọzọ otu ihe ahụ. Anyị na-ezere ohi “a na-anaghị ahụ anya,” dị ka iwere ihe mmadụ ji ọgụgụ isi ya mepụta * bụ́ nke na-abụghị nke anyị.—Ọpụpụ 22:7-9.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 40 Ihe mmadụ ji ọgụgụ isi ya mepụta nwere ike ịgụnye ihe ndị a na-enyeghị ndị ọzọ ikike imepụtaghachi dị ka egwú, akwụkwọ, ma ọ bụ ihe omume kọmputa, ma è biri ya ebi n’akwụkwọ ma ọ bụ tinye ya na siidi. Akara e ji amata ngwá ahịa, ikike ire ma ọ bụ imepụta ngwá ahịa ọhụrụ, otú e si arụpụta ngwá ọrụ, na ikike mgbasa ozi sokwa na ha.