Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Chineke Na-eme?

Olee Ihe Chineke Na-eme?

Olee Ihe Chineke Na-eme?

“Jehova, gịnị mere i ji guzoro n’ebe dị anya? Gịnị mere i ji zoo onwe gị n’oge m nọ n’ahụhụ?” *ABỤ ỌMA 10:1.

INYOBATỤ anya n’isiokwu ndị gbara n’akwụkwọ akụkọ ga-eme ka mmadụ kweta na anyị bi ‘n’oge ahụhụ.’ Mgbe ọdachi dakwasịkwara anyị—mgbe ndị na-eme mpụ wakporo anyị, mgbe anyị nwere ihe mberede, ma ọ bụ mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ—anyị nwere nnọọ ike ịjụ, sị, Chineke ọ̀ na-ahụ ihe na-emenụ? Ọ̀ na-eche banyere anyị? È nwedịrị Chineke?

Ma, ò nweela mgbe i chere echiche na o nwere ike ịbụ echezighị echiche echezi mere anyị ji atụ anya ka Chineke meere anyị ihe ụfọdụ? Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na nwata nọ na-ewe iwe na nna ya gara ọrụ. Ọ na-agụ nwata ahụ agụụ ka nna ya lọta ka ọ hụ ya anya. Ya adị nwata ahụ ka nna ya ọ̀ gbahapụla ya. N’ụbọchị ahụ dum, ajụjụ ọ kpụ n’ọnụ bụ, “Olee ebe papa m nọ?”

Ọ gaghị esiri anyị ike ịhụ na echiche nwata ahụ ezighị ezi. A sị ka e kwuwe, mgbe ahụ ọ nọ na-ajụ ebe nna ya nọ, nna ya nọ na-arụ ọrụ iji kpata ihe ezinụlọ ha dum ga-eri. Ò nwekwara ike ịbụ na anyị anaghị echezi echiche echezi mgbe anyị na-eti mkpu, sị, “Olee ebe Chineke nọ”?

Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịdị ụfọdụ ndị ka ya bụrụ na Chineke bụ onye na-ata ndị ajọ omume ahụhụ ozugbo. Ndị ọzọ na-ele Chineke anya ka Fada Krismas nke ọrụ ya bụ inye ndị mmadụ onyinye, inye ha ọrụ, di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụdị inye ha tiketi ha ga-eji rie lọtrị.

Ndị nwere echiche abụọ ahụ na-eche na ọ bụrụ na Chineke ataghị ndị mere ihe ọjọọ ahụhụ ozugbo ma ọ bụ meere anyị ihe anyị rịọrọ ya, ọ ga-abụrịrị na ahụhụ anyị na-ata anaghị emetụ ya n’obi nakwa na ọ maghị mkpa anyị. Ma, nke ahụ abụtụghị eziokwu! Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova Chineke na-arụ ọrụ ugbu a inye ụmụ mmadụ niile ihe na-akpa ha, ma, ọ bụghị n’ụzọ ọtụtụ ndị na-arịọ ya ka o si mee ya.

Oleezi ihe Chineke na-eme? Iji zaa ajụjụ ahụ, ọ ga-adị mkpa ka anyị tụlee ihe mere obere oge e kesịrị mmadụ bụ́ mgbe e mebiri mmekọrịta ụmụ mmadụ na Chineke—ma e mebighị ya otú a na-agaghị emezili ya.

Ihe Mmehie Mebiri

Ka e were ya na otu ụlọ dakpọrọ kemgbe ọtụtụ afọ. Uko ya adabala n’ime, ibo ụzọ ya adakapụsịa, e bibisiekwa ahụ́ ya. Ọ dị mgbe ụlọ a dị mma—ma ọ dịkwaghị otú ahụ. N’ihi ọtụtụ ihe mebirila na ya, ịrụzi ya agaghị abụ obere ọrụ; a gaghị arụzicha ya otu ụbọchị.

Ugbu a, ka anyị tụlee ihe ndị mebiri ná ndụ ụmụ mmadụ ihe dị ka puku afọ isii gara aga, bụ́ mgbe mmụọ a na-anaghị ahụ anya, bụ́ Setan, mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi. Tupu mgbe ahụ, ahụ́ zuru nnọọ di na nwunye mbụ ahụ okè, ha enweekwa olileanya na ha na ụmụ ndị ha ga-amụ n’ọdịnihu ga-adị ndụ ebighị ebi. (Jenesis 1:28) Ma, mgbe Adam na Iv mehiere, e nwere ike ikwu na ha mebiiri ụmụ ha, bụ́ ndị ha ka ga-amụ amụ, ihe.

Ihe nnupụisi ahụ mebiri abụghị obere ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.” (Ndị Rom 5:12) Ọ bụghị naanị ọnwụ ka mmehie kpataara anyị, o mebikwara mmekọrịta anyị na Onye Okike anyị ma kpaa ahụ́ anyị na uche anyị aka ọjọọ. N’ihi ya, ọnọdụ anyị yiri nke ụlọ ahụ dakpọrọ adakpọ. Onye ezi omume bụ́ Job kwuru nnọọ otú ọnọdụ anyị dị mgbe o kwuru na ndụ mmadụ “na-adị mkpụmkpụ, jupụtakwa ná nsogbu.”—Job 14:1.

Ma, Chineke ọ̀ gbahapụrụ ụmụ mmadụ mgbe ahụ Adam na Iv mehiechara? Mbanụ! N’ezie, malite mgbe ahụ ruo ugbu a, Nna anyị nke eluigwe nọ na-arụ ọrụ maka ụmụ mmadụ niile. Iji ghọtakwuo nnọọ ihe ọ na-emere anyị, ka anyị tụlee ihe atọ ọ ga-adị mkpa ka e mee iji rụzie ụlọ na otú nke ọ bụla n’ime ha si metụta ihe Chineke merela iji weghachi ụmụ mmadụ n’ọnọdụ ha nọbu.

1 Mgbe onye ụlọ ya mebiri emebi leruchara ya anya, ọ ga-ekpebirịrị ma ọ̀ ga-arụzi ya ka ọ̀ ga-akụtu ya.

Ozugbo Adam na Iv nupụsịrị isi n’Iden, Jehova Chineke kwupụtara nzube ya nke bụ́ iweghachi ụmụ mmadụ n’ọnọdụ ha nọbu. Ọ gwara mmụọ ahụ a na-anaghị ahụ anya nke kpatara nnupụisi ahụ, sị: “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15.

Ihe ahụ Jehova kwuru pụtara na ọ na-ekwe nkwa ibibi onye kpatara nnupụisi ahụ n’Iden. (Ndị Rom 16:20; Mkpughe 12:9) Ọzọkwa, Jehova buru amụma na a ga-enwe “mkpụrụ” nke ga-agbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie. * (1 Jọn 3:8) Nkwa ndị ahụ mere ka otu eziokwu dị mkpa pụta ìhè: Chineke ga-edozi ihe ndị o kere eke, ọ bụghị ibibi ha. Ma, ọ ga-ewe oge iweghachi ụmụ mmadụ n’ọnọdụ ha nọbu.

2 Onye na-ese ụkpụrụ ụlọ na-esepụta ihe niile a ga-arụ n’ụlọ ahụ.

Jehova Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ndị e dere ede ma gwa ha otú ha ga-esi wuo ụlọ nsọ ha ga na-anọ na ya efe ya ofufe. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe ndị ahụ bụ onyinyo nke ihe gaje ịbịa.” (Ndị Kọlọsi 2:17) Dị ka ụkpụrụ ụlọ, ha nọchiri anya ihe ka ukwuu.

Dị ka ihe atụ, ụmụ Izrel chụrụ ụmụ anụmanụ n’àjà ka e nwee ike ịgbaghara ha mmehie ha. (Levitikọs 17:11) Àjà ahụ ha na-achụ nọchiri anya àjà ka ukwuu a ga-achụ ọtụtụ narị afọ n’ọdịnihu—àjà ga-agbapụta nnọọ ụmụ mmadụ. * Akụkụ dị iche iche nke ụlọikwuu na ụlọ nsọ ụmụ Izrel fere ofufe na ha nọchiri nnọọ anya ihe ndị Mesaya ahụ ga-abịa n’ọdịnihu ga-eme, malite n’ọnwụ ọ ga-anwụ iji chụọ àjà ruo ná nlaghachi ọ ga-alaghachi n’eluigwe.—Lee chaatị dị na peeji nke 7.

3 A na-ahọrọ onye na-ewu ụlọ nke ga-eso ihe niile dị n’ụkpụrụ ahụ iji rụzie ụlọ ahụ.

Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa nke ga-eso ihe niile dị n’ụkpụrụ nke àjà ụmụ Izrel chụrụ ma nye ndụ ya iji gbapụta ụmụ mmadụ. N’ezie, Jọn Onye Na-eme Baptizim kpọrọ Jizọs “Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Jizọs ji obi ya niile nara ọrụ ahụ. O kwuru, sị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.”—Jọn 6:38.

Uche Chineke maka Jizọs abụghị naanị ka Jizọs ‘nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,’ uche ya bụkwa ka ya na ndị na-eso ụzọ ya gbaa ndụ maka Alaeze. (Matiu 20:28; Luk 22:29, 30) Ọ bụ Alaeze ahụ ka Chineke ga-eji mezuo nzube ya maka ụmụ mmadụ. A kpọrọ ozi banyere Alaeze Chineke “ozi ọma” n’ihi na ọ na-akọwa na Chineke ehiwela otu ọchịchị n’eluigwe nke ga-achị ụwa!—Matiu 24:14; Daniel 2:44. *

Ọrụ Mweghachi ahụ Ka Na-aga n’Ihu

Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. . . . Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Matiu 28:19, 20.

N’ihi ya, ọrụ iweghachi ụmụ mmadụ n’ọnọdụ ha nọbu agaghị akwụsị n’ọnwụ Jizọs. Ọ ga-aga n’ihu ruo ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a’—mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchịwa ụwa anyị a. Oge ahụ eruola. Otú anyị si mara nke a bụ na ihe ịrịba àmà Jizọs buru n’amụma banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a” emezuwela. *Matiu 24:3-14; Luk 21:7-11; 2 Timoti 3:1-5.

Taa, na narị ala abụọ na iri atọ na isii, Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu Jizọs nyere ka e kwusaa ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’ezie, nzube e ji bipụta magazin a ị na-agụ bụ inyere gị aka ịmụtakwu banyere Alaeze ahụ na ihe ndị ọ ga-eme. Na peeji nke 2 nke Ụlọ Nche ọ bụla, ị ga-ahụ okwu a: “Magazin a . . . na-akasi ndị mmadụ obi site n’izi ha ozi ọma bụ́ na Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe, ga-eme ka ajọ omume niile kwụsị n’oge na-adịghị anya, meekwa ka ụwa ghọọ paradaịs. Ọ na-agba ndị mmadụ ume ka ha nwee okwukwe n’ebe Jizọs Kraịst nọ, bụ́ Eze nke na-achị Alaeze Chineke ugbu a, onye nwụrụ ka anyị wee nweta ndụ ebighị ebi.”

N’ezie, ị ka nwere ike ịnụ banyere arụ ndị na-eyi ọha egwu na-akpa ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha, ma ọ bụkwanụ ọdachi adakwasị gị. Ma, ịmụ Baịbụl ga-eme ka obi sie gị ike na Chineke ahapụbeghị ụmụ mmadụ. N’ezie, “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27) Nkwa ahụ o kwere iweghachi ihe nne na nna anyị mbụ tụfuru ga-emezukwa.Aịzaya 55:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Baịbụl gosiri na aha Chineke bụ Jehova.

^ par. 16 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara Jenesis 3:15 n’ụzọ zuru ezu, gụọ isi 9 nke akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 19 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi 5 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 22 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke, gụọ isi 8 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

^ par. 25 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ya, gụọ isi 9 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

[Chaatị/Foto dị na peeji nke 7]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

“Ihe atụ nke ihe bụ́ ezie”—Ihe Ụlọikwuu ahụ Nọchiri Anya Ya

EBE ỊCHỤÀJÀ

Njikere Chineke dị ịnara àjà Jizọs.—NDỊ HIBRU 13:10-12.

NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ

Jizọs.—NDỊ HIBRU 9:11.

1 N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà na-achụ àjà maka mmehie nke ụmụ Izrel.—LEVITIKỌS 16:15, 29-31.

1 Na Naịsan 14, 33 O.A., Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka mmehie anyị.—NDỊ HIBRU 10:5-10; 1 JỌN 2:1, 2.

EBE NSỌ

Ọnọdụ Jizọs dị ka onye e ji mụọ nsọ mụọ.—MATIU 3:16, 17; NDỊ ROM 8:14-17; NDỊ HIBRU 5:4-6.

ÁKWÀ MGBOCHI

Anụ ahụ́ Jizọs, bụ́ ihe mgbochi nke kewara ndụ elu ala ya na nke eluigwe ya.—1 NDỊ KỌRỊNT 15:44, 50; NDỊ HIBRU 6:19, 20; 10:19, 20.

2 Nnukwu onye nchụàjà ahụ na-agafe n’akụkụ nke ọzọ nke ákwà mgbochi ahụ kewara Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ.

2 Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ ‘gafere n’akụkụ nke ọzọ nke ákwà mgbochi ahụ’ site n’ịrịgo n’eluigwe ‘iji pụta n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.’—NDỊ HIBRU 9:24-28.

EBE KASỊ NSỌ

Eluigwe.—NDỊ HIBRU 9:24.

3 Ozugbo nnukwu onye nchụàjà ahụ banyere n’Ebe Kasị Nsọ, ọ na-efesatụ ọbara nke àjà ahụ n’ihu igbe ọgbụgba ndụ.—LEVITIKỌS 16:12-14.

3 Jizọs kpuchiri nnọọ mmehie anyị site n’iche uru ọbara ọ wụfuru n’ihu Chineke.—NDỊ HIBRU 9:12, 24; 1 PITA 3:21, 22.