Olee Otú Eluigwe Dị?
Olee Otú Eluigwe Dị?
ỤFỌDỤ ndị na-eche na ọ gaghị ekwe omume ịmata ihe banyere eluigwe n’ihi na ọ dịtụbeghị onye si n’eluigwe gbadata ịkọrọ anyị banyere ya. Ikekwe, ha echefuola na Jizọs kwuru, sị: “Esi m n’eluigwe bịa.” (Jọn 6:38) Ọ gwakwara ụfọdụ ndị ndú okpukpe, sị: “Unu si n’ebe dị n’ala; esi m n’ebe dị n’elu.” (Jọn 8:23) Olee ihe Jizọs kwuru banyere eluigwe?
Jizọs kwughachiri na eluigwe bụ ebe Jehova bi. Ọ kpọrọ Chineke “Nna m nke bi n’eluigwe.” (Matiu 12:50) Ma, ọ bughị naanị otu ebe ka Jizọs kpọrọ “eluigwe.” Dị ka ihe atụ, ọ kpọrọ mbara ikuku “eluigwe” mgbe o kwuru, sị: “Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya.” (Matiu 6:26) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova bi n’ebe dị elu karịa mbara ikuku. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dị Onye bi n’ebe dị elu karịa ụwa nke dị gburugburu.”—Aịzaya 40:22.
‘Nna anyị nke bi n’eluigwe’ ò bi n’ebe kpakpando dị? N’Akwụkwọ Nsọ, a kpọkwara ihe ndị e kere eke dị n’elu “eluigwe.” Dị ka ihe atụ, otu ọbụ abụ dere, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ihe mkpịsị aka gị rụrụ, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ, nke mere i ji na-echeta ya?”—Abụ Ọma 8:3, 4.
Ee e, Jehova Chineke agaghị ebi n’ime eluigwe na ụwa nkịtị o kere eke otú ahụ ọkwa nkà na-agaghị ebi n’ime kọbọd ọ rụrụ. N’ihi ya, mgbe Eze Sọlọmọn raara ụlọ nsọ Jeruselem nye Jehova, o kwuru, sị: “Chineke ọ̀ ga-ebi n’elu ala n’ezie? Lee! Eluigwe, ee, eluigwe nke eluigwe apụghị ịba gị, ma ya fọdụzie ụlọ a m wuru!” (1 Ndị Eze 8:27) Ọ bụrụ na Jehova ebighị n’eluigwe nkịtị, olee eluigwe nke o bi na ya?
Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ ejirila nnukwu onyokomita dị iche iche mụọ banyere eluigwe nkịtị, ụfọdụ agaakwala na mbara igwe, ihe Baịbụl kwuru ka bụ eziokwu: “Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Jizọs kọwara ihe mere o ji dị otú ahụ mgbe o kwuru, sị: “Chineke bụ Mmụọ.”—Jọn 4:24.
Mmụọ bụ ihe dị ndụ nke karịrị mmadụ. Mmụọ enweghị ihe ndị e nwere ike ịhụ anya ma bitụ aka, dị ka anụ ahụ́ na ọbara. N’ihi ya, mgbe Jizọs kwuru na ya nọbu n’akụkụ Nna ya “n’eluigwe,” ihe ọ na-ekwu bụ na ya dị n’ụdị dị ebube karịa nke ihe ọ bụla a na-ahụ anya. (Jọn 17:5; Ndị Filipaị 3:20, 21) Ọ bụ ebe a ndị bụ́ mmụọ bi, bụ́ ebe Jizọs na Nna ya bi tupu Jizọs abịa n’ụwa, ka Baịbụl kpọrọ “eluigwe.” Olee otú ọ dị? Olee ihe na-eme n’ebe ahụ?
Ebe E Ji Obi Ụtọ Eje Ozi
Baịbụl kọwara eluigwe dị ka ebe a na-arụ ọtụtụ ọrụ. O kwuru banyere ọtụtụ narị nde ndị mmụọ kwesịrị ntụkwasị obi bi na ya. (Daniel 7:9, 10) Onye nke ọ bụla n’ime mmụọ ndị a dị iche n’ibe ya. Olee otú anyị si mara? N’ihe niile e kere eke a na-ahụ anya, ọ dịghị ihe abụọ ya na ibe ya bụ nnọọ otu, n’ihi ya, anyị ji n’aka na a ga-enwekwa nnọọ ụdị ndị dị iche iche n’eluigwe. Ndị mmụọ a niile nọ n’eluigwe na-arụkọ nnọọ ọrụ n’ịdị n’otu, n’adịghị ka ndị bi n’ụwa taa, bụ́ ndị ọ na-esiri ike ịrụkọta ọrụ.
Lee otú Baịbụl si kọwaa ọrụ ndị a na-arụ n’eluigwe. “Gọzienụ Jehova, unu ndị mmụọ ozi ya, ndị dị ike nke ukwuu, ndị na-eme ihe o kwuru, site n’irube isi n’iwu ya. Gọzienụ Jehova, unu ụsụụ ndị agha ya niile, unu ndị ozi ya, ndị na-eme uche ya.” (Abụ Ọma 103:20, 21) Ya mere, a na-arụ ọtụtụ ọrụ n’eluigwe. Anyị ji n’aka na ọrụ a bụ ọrụ obi ụtọ.
Ọ dịla ezigbo anya ndị mmụọ ozi ji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi, ọbụna tupu e kee ụwa. Akwụkwọ Nsọ kwuru na mgbe Jehova tọrọ ntọala ụwa, ụmụ Chineke “tikọrọ mkpu ọṅụ” ma ‘malite iti mkpu otuto.’ (Job 38:4, 7) Otu n’ime ụmụ eluigwe nke Chineke nwedịrị ohere ọma nke iso Chineke rụọ ọrụ n’ike ihe ndị ọzọ niile. (Ndị Kọlọsi 1:15-17) Ihe ndị a Baịbụl kwuru banyere ọrụ obi ụtọ ndị a na-arụ n’eluigwe nwere ike ime ka ị jụwa ajụjụ ụfọdụ banyere eluigwe na ụmụ mmadụ.
Chineke Ò Bu n’Obi Ka Ndị Mmadụ Gaa Eluigwe?
Ebe ọ bụ na ndị bụ́ mmụọ nọ na-ejere Chineke ozi n’eluigwe tupu a tọọ ntọala ụwa, o doro anya na e keghị nwoke na nwaanyị mbụ iji nweta ndị ga-ebi n’eluigwe. Kama nke ahụ, Chineke gwara nwoke na nwaanyị mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa.” (Jenesis 1:28; Ọrụ 17:26) Adam bụ mmadụ mbụ n’ụwa, nke nwere ike ịmata Chineke na ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ gaje ịbụ nna nke agbụrụ ụmụ mmadụ ga-ebi n’ụwa. “Eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.”—Abụ Ọma 115:16.
Mmadụ isi zuru okè agaghị achọ ịnwụ; e keghị ụmụ mmadụ ịnwụ anwụ. Chineke gwara Adam na ọ ga-anwụ naanị ma o nupụ isi. A sị na Adam rubeere Chineke isi, ọ gaghị anwụ anwụ.—Jenesis 2:17; Ndị Rom 5:12.
N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na Chineke ekwughị ihe ọ bụla banyere Adam ịga eluigwe. N’ihi ya, ụwa abụghị ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ka e nwee ike ịchọpụta ma hà ga-ebili n’eluigwe. E kere mmadụ ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, a ka ga-emezukwa ihe a Chineke zubere. Baịbụl kwere nkwa na “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) O doro anya na Chineke ebughị n’obi ka ụmụ mmadụ gaa eluigwe mgbe ọ na-eke ha. Oleezi ihe mere Jizọs ji kwe ndịozi ya nkwa na ha ga-ebi n’eluigwe? Jizọs ọ̀ na-ekwu na ndị ọma niile ga-aga eluigwe?