“Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ụlọ”
Otú Ndụ Dị n’Oge Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ
“Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ụlọ”
“Ma ka ha nọ na-aga, ọ banyere n’otu obodo nta. N’ebe a, otu nwaanyị aha ya bụ Mata nabatara ya n’ụlọ ya dị ka ọbịa. Nwaanyị a nwekwara nwanne nwaanyị a na-akpọ Meri, bụ́ onye nọdụrụ ala n’akụkụ ụkwụ Onyenwe anyị ma na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. Ma ọtụtụ ihe Mata nọ na-eme dọpụrụ uche ya. Ya mere, ọ bịaruru nso wee sị: ‘Onyenwe anyị, ọ́ bụghịrị gị ihe ọ bụla na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Ya mere, gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.’ Onyenwe anyị zara ya, sị: ‘Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe. Ma, ihe dị mkpa bụ ihe ole na ole ma ọ bụ naanị otu ihe. Ma Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.’”—LUK 10:38-42.
MATA bụ nnọọ nwaanyị na-arụsi ọrụ ike. O doro anya na ndị mmadụ na-akwanyere ya nnọọ ùgwù. N’omenala ndị Juu nke narị afọ mbụ, ihe e ji amata ezigbo nwaanyị bụ ịrụsi ọrụ ike n’ụlọ na ịdị uchu ya n’ijere ndị ezinụlọ ya ozi.
A gbakwara ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ ume ịbụ “ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ.” (Taịtọs 2:5) Ma ha nwekwara ọrụ ọzọ pụrụ iche e nyere ha, nke bụ́ ịkụziri ndị ọzọ ihe Ndị Kraịst kweere. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 2:18) Olee ụfọdụ n’ime “ọtụtụ ihe” nwaanyị onye Juu nke narị afọ mbụ na-aghaghị ime? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs kwuru banyere Meri?
‘Ọtụtụ Ihe Ọ Na-eme’ Nwaanyị Juu a lụ alụ na-amalite ọrụ ụbọchị ya n’isi ụtụtụ, ikekwe tupu anwụ awaa. (Ilu 31:15) Mgbe o sichaara ezinụlọ ya nri mkpụrụ akụ́kụ́ a gwọrọ agwọ, bụ́ nke na-anaghị ewecha oge, o nwere ike ịkpọga ụmụ ya nwoke n’ụlọ akwụkwọ dị n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ụmụ ya nwaanyị ga-anọnyere ya n’ụlọ ka o nwee ike ịkụziri ha nkà ndị ga-eme ka ha ghọọ ezi ndị nwunye.
Nwaanyị ahụ na ụmụ ya nwaanyị ga-amalitekọ ọrụ ụbọchị ha site n’ịrụ ọrụ ndị bụ́ isi dị n’ụlọ—ịgbanye mmanụ na mpanaka (1), ịza ụlọ (2), na ịpịpụta mmiri ara ewu (3). Ha mechaa nke ahụ, ha emee achịcha a ga-ata n’ụbọchị ahụ. Ụmụ agbọghọ ahụ ga-ebu ụzọ yọchaa ọka iji wepụsịa ihe ndị na-adịghị mma na ya (4), ma jirizie okwute gweritụ ya (5). Nne ha ga-eburu ntụ ọka ahụ, tinye ya mmiri na ihe iko achịcha. Ọ ga-agwakọta ntụ ọka ahụ ma (6) hapụ ya ka o koo ka ọ na-arụ ọrụ ndị ọzọ dịịrị ya n’ụlọ. Ka ọ dịgodị, ụmụ ya ndị nwaanyị nwere ike ịnọ na-akwagharị mmiri ara ewu ahụ a ka pịpụtara apịpụta ka ọ ghọọ chiiz (7).
Mgbe nwaanyị ahụ na ụmụ ya nwaanyị mechara nke ahụ n’ụtụtụ ahụ, ọ na-akpọ ha aga ahịa. Ka ọ na-azụ ihe ndị dị ezinụlọ ya mkpa n’ụbọchị ahụ, ọ na-anụ ísì dị iche iche, na-anụ ubé na-agba agba ná ntị nke ụmụ anụmanụ, nakwa ụzụ ndị na-ekwe ọnụ ahịa na ndị ha na-ekwe ọnụ na-eme (8). Akwụkwọ nri a kpatara ọhụrụ na azụ̀ a mịrị amị nwere ike iso n’ihe ha ga-eri n’ụbọchị ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ Onye Kraịst, o nwekwara ike iji ohere ahụ gwa ndị ọzọ ọ hụrụ n’ahịa banyere ihe ndị o kweere.—Ọrụ 17:17.
Nwaanyị maara ọrụ ya ga-eji ohere ahụ ya na ụmụ ya ji aga ahịa ma na-alọta nyere ha aka ịmụta ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ na iji ha kpọrọ ihe. (Diuterọnọmi 6:6, 7) O nwekwara ike ịgwa ụmụ ya ihe ndị ga-enyere ha aka ịzụta ihe ọnụ ala.—Ilu 31:14, 18.
Ọrụ ọzọ ụmụ nwaanyị na-arụ kwa ụbọchị bụ ịga kute mmiri n’olulu mmiri (9). Ha na-agbata mmiri ha ga-eji gbajuo ite mmiri ha n’ụlọ, ikekwe ha na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ bịakwara ịgbara mmiri ga na-ekwurịta okwu. Mgbe nwaanyị ahụ na ụmụ ya nwaanyị lọtara, ha na-amalite ime achịcha. Ha ga-ebu ụzọ kpụọ ntụ ọka a gwọrọ agwọ ka ọ dị mbadamba mbadamba, tinyezie ha n’ekwú dị ọkụ (10), bụ́ nke na-adịkarị n’èzí. Ka ha na-anụ ísì ọma achịcha ahụ ma na-eche ka o ghee, ha ga na-akparịta ụka.
Mgbe ihe ndị a gachara, ha ga-agazi n’iyi dị ha nso ịga saa ákwà (11). Ụmụ nwaanyị ahụ na-ebu ụzọ kpachara anya jiri ncha saa ákwà, bụ́ ncha e ji ntụ ahịhịa ụfọdụ eme.
Mgbe ha ṅachasịrị ákwà ndị ahụ ma hịpụsịa ha mmiri, ha na-agbasa ha n’obere osisi na okwute ndị dị nso n’ebe ahụ ka ha kọọ.Mgbe nwaanyị ahụ na ụmụ ya nwaanyị bulatachara ákwà ahụ ha sụrụ, ha nwere ike ịrịgo n’elu ụlọ ha dị larịị iji nọrọ ebe ahụ dụzie (12) ákwà ọ bụla dọkara adọka tupu ha ekonye ha n’ebe nkonye ákwà. E mechaa, e nwere ike ịkụziri ụmụ agbọghọ ahụ otú e si akpa ákwà (13). N’oge na-adịghị anya, ụmụ nwaanyị ahụ na-amalite isi nri abalị (14). E ji ile ọbịa mara ndị Juu, n’ihi ya, ezinụlọ ahụ ga-adị njikere iso ndị ọbịa ha rie obere ihe oriri ha, dị ka akwụkwọ nri, chiiz, azụ̀ a mịrị n’ọkụ, na mmiri oyi.
N’abalị, ka ụmụaka na-achọ ịlaba, e nwere ike ite onye merụrụ ahụ́ n’ikpere mmanụ ga-eme ka ọnyá ya laa. Nne na nna nweziri ike iji ìhè mpanaka na-achọ ịnyụ anyụ kọọrọ ụmụ ha otu akụkọ si n’Akwụkwọ Nsọ, ha na ụmụ ha ekpeekwa ekpere tupu ha alaba. Ka ebe niile dara jụụ n’ụlọ ahụ na-abụghị ụlọ ndị oké ozu, di ga-enwe ihe mere ọ ga-eji gwa nwunye ya okwu ndị ahụ a ma ama, bụ́: “Ezigbo nwunye, ònye pụrụ ịchọta ya? Ọnụ ahịa ya dị nnọọ ukwuu karịa nke nkume kọral.”—Ilu 31:10.
Ịhọrọ “Òkè Dị Mma” O doro anya na ụmụ nwaanyị narị afọ mbụ bụ́ ndị maara ọrụ ha nwere ‘ọtụtụ ihe ha na-eme’ n’ụbọchị iji ghara ịnọ nkịtị. (Luk 10:40) N’otu aka ahụ, ụmụ nwaanyị taa, karịsịa ndị nne, na-eji ọrụ n’aka. Ihe ọgbara ọhụrụ ndị e mepụtarala emeela ka ọrụ ụfọdụ ha na-arụ n’ụlọ dịkwuo mfe. Ma, n’ihi ọnọdụ, ọtụtụ ndị nne na-elekọta ezinụlọ ha ma na-arụ ọrụ ego.
N’agbanyeghị ihe isi ike ọtụtụ ụmụ nwaanyị Ndị Kraịst na-enwe taa, ha na-eso ihe nlereanya Meri, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a. Ha na-eji nnọọ ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. (Matiu 5:3) Ha na-elekọta ezinụlọ ha nke ọma, dị ka Akwụkwọ Nsọ gbara ha ume ime. (Ilu 31:11-31) Ma ha na-esokwa ụkpụrụ ahụ Jizọs gwara Mata. Ebe ọ bụ na Mata bụ nwaanyị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, o doro anya na ọ nabatara nnọọ ndụmọdụ ahụ Jizọs ji obiọma nye ya. Ụmụ nwaanyị Ndị Kraịst anaghị ekwe ka ọrụ ụlọ gbochie ha ịmụ banyere Chineke (15) ma ọ bụ ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị ha kweere. (Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:24, 25) Ha na-esi otú ahụ ahọrọ “òkè dị mma.” (Luk 10:42) N’ihi ya, Chineke, Kraịst, na ndị ezinụlọ ha ji ha nnọọ kpọrọ ihe.—Ilu 18:22.