Ì Kwesịrị Idebe Ụbọchị Izu Ike Kwa Izu?
Ì Kwesịrị Idebe Ụbọchị Izu Ike Kwa Izu?
NA Disemba 1988, obere ìgwè ndị chọọchị Metọdist nọchiri ebe niile e si abanye Suva, bụ́ isi obodo Fiji. Ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka, bụ́ ndị yicha uwe chọọchị ha, kwụchiri ụzọ ebe iri asaa. Ha kwụsịrị ụgbọ njem niile, tinyere ụgbọelu ndị na-agba naanị n’obodo ahụ na ndị na-aga mba ndị ọzọ. Gịnị mere ha ji mee ihe ahụ? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ime ka mba ahụ maliteghachi idebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu.
N’Izrel, ụlọ elu ọhụrụ ọ bụla a rụrụ malite n’afọ 2001 ga-enwerịrị ma ọ dịkarịa ala otu ígwè mbugo ga na-akwụsị n’onwe ya n’okpukpu nke ọ bụla. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka ndị Juu na-anụrụ okpukpe ha ọkụ n’obi, bụ́ ndị na-edebe Ụbọchị Izu Ike malite ná mgbede Fraịdee ruo mgbede Satọdee, ghara ịpị aka n’ígwè mbugo ahụ, n’ihi na ha weere ya na ọ bụ ọrụ.
Na Tonga, bụ́ alaeze dị n’Ebe Ndịda Pasifik, ịrụ ọrụ ọ bụla na Sọnde megidere iwu. A naghị ekwe ka ụgbọelu ọ bụla daa, a naghịkwa ekwe ka ụgbọ mmiri kwụsị. Nkwekọrịta ọ bụla a bịanyere aka na ya n’ụbọchị ahụ anaghị adị irè. Iwu mba Tonga kwuru na onye ọ bụla ‘ga-edebe ụbọchị Sọnde nsọ’ n’agbanyeghị okpukpe onye ahụ na-ekpe. N’ihi gịnị? Ọ bụ iji hụ na onye ọ bụla ná mba ahụ debere Ụbọchị Izu Ike.
Ihe ndị ahụ e kwuru n’elu na-egosi na ọtụtụ ndị chere na
Chineke chọrọ ka ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu. N’ezie, ụfọdụ na-ekwu na idebe Ụbọchị Izu Ike bụ ihe kacha mkpa, kwere na ọ ga-emetụta nzọpụta ebighị ebi anyị. Ndị ọzọ na-eche na iwu kacha mkpa Chineke nyere bụ ka anyị na-edebe Ụbọchị Izu Ike. Olee ihe bụ́ Ụbọchị Izu Ike? Baịbụl ọ̀ gbakwara Ndị Kraịst ume ka ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu?Gịnị Bụ Ụbọchị Izu Ike?
Okwu Hibru a sụgharịrị “Ụbọchị Izu Ike” pụtara “zuo ike, kwụsị, hapụ.” Ọ bụ ezie na Jenesis kwuru na n’ụbọchị nke asaa Jehova Chineke zuru ike n’ọrụ ike ihe ya, ma, ọ bụ n’oge Mozis ka e nyere ndị Chineke iwu iji otu ụbọchị zuo ike, ma ọ bụ idebe Ụbọchị Izu Ike. (Jenesis 2:2) Mgbe ndị Izrel hapụsịrị Ijipt n’afọ 1513 Tupu Oge Anyị, Jehova nyere ha mana n’ụzọ ọrụ ebube n’ala ịkpa. Mgbe a na-agwa ha otú ha ga-esi na-atụtụ mana a, a gwara ha, sị: “Ụbọchị isii ka unu ga-ekporo ya, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike. Ọ dịghị nke ga-adị.” (Ọpụpụ 16:26) A gwara anyị na ‘ụmụ Izrel debere ụbọchị izu ike n’ụbọchị nke asaa,’ malite mgbe anyanwụ dara ná mgbede Fraịdee ruo mgbe anyanwụ dara ná mgbede Satọdee.—Ọpụpụ 16:30.
Obere oge e nyechara ntụziaka ahụ, Jehova nyere iwu banyere idebe Ụbọchị Izu Ike, tinye ya n’Iwu Iri ahụ o nyere Mozis. (Ọpụpụ 19:1) Iwu nke anọ n’iwu ahụ kwuru, sị: “Cheta ụbọchị izu ike ka i doo ya nsọ, ị ga-eji ụbọchị isii jee ozi ma rụọ ọrụ gị niile. Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nye Jehova bụ́ Chineke gị.” (Ọpụpụ 20:8-10) Idebe Ụbọchị Izu Ike si otú ahụ ghọọ iwu ji ndị Izrel.—Diuterọnọmi 5:12.
Jizọs Ò Debere Ụbọchị Izu Ike Kwa Izu?
Ee, Jizọs debere Ụbọchị Izu Ike. A gwara anyị banyere Jizọs, sị: “Mgbe oge ahụ dum zuru, Chineke zipụrụ Ọkpara ya, bụ́ onye nwaanyị mụrụ, bụrụkwa onye nọ n’okpuru iwu.” (Ndị Galeshia 4:4) A mụrụ Jizọs dị ka onye Izrel, n’ihi ya, ọ nọ n’okpuru Iwu ahụ, bụ́ nke gụnyere iwu Ụbọchị Izu Ike. Ọ bụ mgbe Jizọs nwụchara ka e wepụrụ ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Ịmara mgbe ihe ndị a mere na-enyere anyị aka ịghọta otú Chineke si ele okwu a anya.—Lee chaatị dị na peeji nke 15.
Matiu 5:17) Ma, olee ihe okwu bụ́ “imezu” pụtara? Iji maa atụ: Onye ọrụ ngo na-emezu nkwekọrịta ya na onye ọ na-arụrụ ụlọ mere, ọ bụghị site n’ịdọka akwụkwọ nkwekọrịta ahụ, kama ọ bụ site n’ịrụcha ụlọ ahụ. Ma, ozugbo ọ rụchara ọrụ ahụ otú onye nwe ya chọrọ, e mezuola nkwekọrịta ahụ, iwu ejikwaghị ya ime ihe dị n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ. N’otu aka ahụ, Jizọs ebibighị Iwu ahụ; kama nke ahụ, o mezuru ya site n’idebezu ya. Ozugbo e mezuru “nkwekọrịta” Iwu ahụ, iwu ejighịzi ndị Chineke idebe ya.
N’eziokwu, Jizọs kwuru, sị: “Unu echela na m bịara ibibi Iwu ahụ ma ọ bụ ihe ndị amụma kụziri. M bịara, ọ bụghị ibibi ya, kama imezu ya.” (À Chọrọ Ya n’Aka Ndị Kraịst?
Ebe ọ bụ na Kraịst mezuru Iwu ahụ, iwu ò ji Ndị Kraịst idebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu? Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ zaa ya, sị: “Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bụla kpee unu ikpe n’iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma ọ bụ n’ihe banyere ememme ma ọ bụ banyere ememme ọnwa ọhụrụ ma ọ bụ banyere ụbọchị izu ike; n’ihi na ihe ndị ahụ bụ onyinyo nke ihe gaje ịbịa, ma ihe bụ́ ezie dịịrị Kraịst.”—Ndị Kọlọsi 2:16, 17.
Okwu ndị ahụ si n’ike mmụọ nsọ na-egosi na Chineke agbanweela ihe ọ chọrọ n’aka ndị ohu ya. Olee ihe mere o ji gbanwee ya? Ọ bụ n’ihi na Ndị Kraịst nọ n’okpuru iwu ọhụrụ, bụ́ “iwu nke Kraịst.” (Ndị Galeshia 6:2) Ọgbụgba ndụ Iwu mbụ ahụ e si n’aka Mozis nye ndị Izrel kwụsịrị ịdị irè mgbe ọnwụ Jizọs mezuru ya. (Ndị Rom 10:4; Ndị Efesọs 2:15) Iwu idebe Ụbọchị Izu Ike ò so kwụsị? Ee. Mgbe Pọl kwusịrị na “a tọpụwo anyị n’Iwu ahụ,” ọ gara n’ihu ikwu banyere otu n’ime Iwu Iri ahụ. (Ndị Rom 7:6, 7) N’ihi ya, Iwu Iri ahụ—gụnyere iwu Ụbọchị Izu Ike—so n’Iwu ahụ nke kwụsịrị ịdị irè. Ya mere, iwu ejighịzi ndị na-efe Chineke idebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu.
E nwere ike isi otú a mee ihe atụ nke
mgbanwe a gbanwere ofufe ndị Izrel ma jiri nke Ndị Kraịst dochie ya: Otu mba nwere ike ịgbanwe iwu ya. Ozugbo iwu ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè, iwu ejighịzi ndị obodo ahụ irube isi na nke ochie. Ọ bụ ezie na iwu ụfọdụ dị n’iwu ọhụrụ ahụ nwere ike ịdị n’iwu ochie ahụ, iwu ndị ọzọ nwere ike ịdị iche. N’ihi ya, ọ ga-adị mkpa ka mmadụ mụọ iwu ọhụrụ ahụ nke ọma iji mata iwu ndị o kwesịrị irubere isi. Ọzọkwa, ezi nwa amaala ga-achọ ịma mgbe iwu ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè.N’otu aka ahụ, Jehova Chineke nyere mba Izrel ihe karịrị narị iwu isii, bụ́ ndị gụnyere iri ndị ahụ bụ́ isi. Iwu ndị ahụ gụnyere ndị nke na-ekwu maka akparamàgwà, ịchụ àjà, ihe ndị metụtara ahụ́ ike, na iwu idebe Ụbọchị Izu Ike. Ma, Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ga-abụ “mba” ọhụrụ. (Matiu 21:43) Malite n’afọ 33 Oge Anyị gawa, mba a nwere “iwu” ọhụrụ ndị hiwere isi n’iwu abụọ dị mkpa—ịhụ Chineke na onye agbata obi mmadụ n’anya. (Matiu 22:36-40) Ọ bụ ezie na ‘n’iwu nke Kraịst,’ e nwere ntụziaka ndị yiri ndị dị n’iwu ahụ e nyere Izrel, o kwesịghị iju anyị anya na iwu ụfọdụ dị nnọọ iche n’iwu ndị e nyere Izrel nakwa na ụfọdụ n’ime iwu ndị e nyere Izrel adịghịzi mkpa. Iwu idebe Ụbọchị Izu Ike so ná ndị ahụ na-adịghịzi mkpa.
Chineke Ọ̀ Gbanweela Ụkpụrụ Ya?
Mgbanwe a e mere site n’Iwu Mozis gaa n’Iwu nke Kraịst ọ̀ pụtara na Chineke agbanweela ụkpụrụ ya? Ee e. Otú ahụ nne ma ọ bụ nna ga-esi agbanwe ihe n’iwu o nyere ụmụ ya, dabere n’afọ ole ha dị na ọnọdụ ha, otú ahụ ka Jehova si gbanwee ihe n’iwu ọ chọrọ ka ndị ya na-edebe. Pọl onyeozi si otú a kọwaa ya: “Tupu okwukwe ahụ abịarute, anyị bụ ndị a na-eche nche n’okpuru iwu, bụrụ ndị a kpọchibidokọrọ ọnụ, na-ele anya n’okwukwe ahụ nke a kara aka na a gaje ikpughe. N’ihi ya, Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst, ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe. Ma ebe ọ bụ na okwukwe ahụ abịala, anyị anọkwaghị n’okpuru onye nduzi.”—Ndị Galeshia 3:23-25.
Olee otú ihe ahụ Pọl kwuru si metụta Ụbọchị Izu Ike? Tụlee ihe atụ a: Mgbe nwa akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ, e nwere ike ịchọ ka ọ na-amụ otu ihe ọmụmụ, dị ka ịkwa nkà, otu ụbọchị n’izu. Ma, mgbe ọ malitere ịrụ ọrụ ego, e nwere ike ịchọ ka ọ na-eji nkà ndị ọ mụtara n’ihe ọmụmụ ahụ na-arụ ọrụ kwa ụbọchị n’izu, kama ịbụ naanị n’otu ụbọchị ahụ. N’otu aka ahụ, mgbe ndị Izrel nọ n’okpuru Iwu ahụ, a chọrọ ka ha wepụta otu ụbọchị kwa izu iji na-ezuru ike ma na-efe ofufe. Ma a chọrọ ka Ndị Kraịst na-efe Chineke, ọ bụghị naanị otu ụbọchị n’izu, kama ụbọchị niile.
Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ dị njọ mmadụ iwepụta otu ụbọchị kwa izu iji zuo ike na iji fee ofufe? Ee e. Okwu Chineke hapụrụ onye nke ọ bụla ikpebiri onwe ya ụdị ihe ahụ, wee kwuo, sị: “E nwekwara ụfọdụ ndị Kraịst ndị na-eche na ọ dị otu ụbọchị dị nsọ karịa ụbọchị ndị ọzọ, ma ndị ọzọ na-eche na ụbọchị niile bụ nke Chineke. N’ụdị okwu dị otu a, ọ dị mma ka onye ọ bụla kpebiere onwe ya.” (Ndị Rom 14:5, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ bụ ezie na ụfọdụ nwere ike ịhọrọ ile otu ụbọchị anya ka ụbọchị dị nsọ karịa ụbọchị ndị ọzọ, Baịbụl gosiri nnọọ na Chineke anaghị atụ anya ka Ndị Kraịst na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
“Ụbọchị isii ka unu ga-ekporo ya, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike. Ọ dịghị nke ga-adị.”—ỌPỤPỤ 16:26
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
“Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst, ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe. Ma ebe ọ bụ na okwukwe ahụ abịala, anyị anọkwaghị n’okpuru onye nduzi.”—NDỊ GALESHIA 3:24, 25
[Igbe/Foto dị na peeji nke 13]
Akara Ụwa Ji Agụ Oge na Ụbọchị Izu Ike
Akara ụwa ji agụ oge na-eme ka ihe siere ndị chere na ha aghaghị idebe Ụbọchị Izu Ike n’otu ụbọchị n’ebe niile kwa izu ike. Akara ahụ bụ akara ihe atụ si n’ebe ugwu ụwa gafere akụkụ ka ukwuu nke Oké Osimiri Pasifik gawa n’ebe ndịda. Ya bụrụ na mba ndị dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke akara ahụ nọ n’ụbọchị Sọnde, mba ndị nke nọ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ ya na-anọ na Satọdee.
Dị ka ihe atụ, mgbe mba Fiji na Tonga nọ na Sọnde, ndị nọ ná mba Samoa na Niyuwe na-anọ na Satọdee. N’ihi ya, ya bụrụ na mmadụ edebe Ụbọchị Izu Ike na Satọdee na Fiji, ndị okpukpe ya nọ na Samoa, nke dị naanị otu puku kilomita na otu narị na iri anọ na ise site n’ebe ahụ, ga na-arụ ọrụ n’ihi na ọ bụụrụ ha ụbọchị Fraịdee.
Ndị ụka Sevụnt Dee Adventist nọ na Tonga na-edebe Ụbọchị Izu Ike nke ha na Sọnde, na-eche na ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ha na ndị òtù ha nọ na Samoa, bụ́ nke dị ihe karịtụrụ narị kilomita asatọ na iri ise site n’ebe ahụ, na-edebe ya otu mgbe. Ma, n’otu mgbe ahụ, ndị Sevụnt Dee Adventist nọ na Fiji nke na-erughị narị kilomita asatọ anaghị ezu ike n’ihi na ọ bụ ụbọchị Sọnde n’ebe ahụ, ha na-edebekwa Ụbọchị Izu Ike na Satọdee!
[Ihe Osise]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
\
\
\
\ SAMOA
\
— ― ― ― ― ― ― ―
FIJI \
Sọnde \ Satọdee
\
\
TONGA \
\
\
\
[Chaatị dị na peeji nke 15]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Icheta Banyere Ụbọchị Izu Ike:
Ọ bụ ezie na amaokwu Baịbụl nwere ike ikwu na e kwesịrị idebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu, ọ dị mkpa ka anyị mata mgbe e kwuru okwu ahụ.
4026 T.O.A. TUPU OGE MOZIS
E KERE ADAM E nyeghị iwu idebe Ụbọchị Izu Ike tupu
oge Mozis na ndị Izrel.—Diuterọnọmi 5:
1-3, 12-14.
1513 T.O.A. IWU CHINEKE NYERE IZREL
E NYERE IZREL IWU E nyeghị mba ndị ọzọ iwu idebe Ụbọchị
Izu Ike. (Abụ Ọma 147:19, 20) E nyere ya
dị ka “ihe ịrịba ama” n’etiti Jehova na
ụmụ Izrel.—Ọpụpụ 31:16, 17.
Ụbọchị Izu Ike a na-edebe kwa izu bụ
naanị otu n’ime ụbọchị izu ike ndị
e nyere ụmụ Izrel iwu ka ha
na-edebe.—Levitikọs 16:29-31; 23:4-8;
25:4, 11; Ọnụ Ọgụgụ 28:26.
33 O.A. IWU NKE KRAỊST
IWU E NYERE ỤMỤ IZREL Mgbe ndịozi na ndị okenye na-ekpebi
KWỤSỊRỊ ỊDỊ IRÈ ihe Chineke chọrọ Ndị Kraịst n’aka,
n’afọ 49 O.A. (Oge Anyị) na Jeruselem,
ha ekwughị ihe ọ bụla banyere idebe
Ụbọchị Izu Ike kwa izu.—Ọrụ 15:28, 29.
Pọl onyeozi nọ na-echegbu onwe ya
banyere Ndị Kraịst lekwasịrị anya
n’idebe ụbọchị ndị pụrụ iche.—Ndị
Galeshia 4:9-11.
2010 O.A.
[Foto dị na peeji nke 11]
Akwụkwọ akụkọ dị iche iche kwuru banyere ebe ndị ìgwè dị iche iche nke ndị Metọdist nọchiri ụzọ, na-ekwu na ha chọrọ ka mba Fiji maliteghachi idebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike a natara Fiji Times