Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“N’oge Herọd Bụ́ Eze”

“N’oge Herọd Bụ́ Eze”

“N’oge Herọd Bụ́ Eze”

MGBE Herọd Onye Ukwu, bụ́ eze Judia, chọrọ igbu nwa ọhụrụ bụ́ Jizọs, o zigara ndị mmadụ ka ha gaa gbuo ụmụaka nwoke niile nọ na Betlehem. E dere ọtụtụ ihe mere “n’oge Herọd bụ́ eze” n’akụkọ ihe mere eme, bụ́ ihe ndị na-eme ka anyị ghọtakwuo ihe ndị mere n’oge ndụ Jizọs na ozi ya.—Matiu 2:1-16.

Olee ihe mere Herọd ji chọọ igbu Jizọs? Oleekwa ihe mere na mgbe a mụrụ Jizọs, ndị Juu nwere eze, ma mgbe Jizọs nwụrụ, ha enwee gọvanọ onye Rom, bụ́ Pọntiọs Paịlet? Iji ghọta nke ọma ọrụ Herọd rụrụ na ihe mere akụkọ ya ji dị ndị na-agụ Baịbụl mkpa, ọ dị mkpa ka anyị tụlee ihe ndị mere iri afọ ole na ole tupu a mụọ Jizọs.

Ịzọ Ọchịchị na Judia

Ndị eze chịrị Judia n’ọkara mbụ nke narị afọ nke abụọ T.O.A. (Tupu Oge Anyị) bụ ndị si n’ezinụlọ Seleucus nke Siria bụ́ otu n’ime ọchịchị anọ malitere ịchị mgbe alaeze ukwu Alexander Onye Ukwu dasịrị. Ma, n’ihe dị ka afọ 168 T.O.A., mgbe onye eze si n’ezinụlọ Seleucus nwara iji ofufe Zus dochie anya ofufe Jehova n’ụlọ nsọ ndị Juu dị na Jeruselem, ndị ezinụlọ Maccabee du ndị Juu lụso ha ọgụ. Ndị Maccabee, ma ọ bụ ndị Hasmon, chịrị Judia malite n’afọ 142 ruo afọ 63 T.O.A.

N’afọ 66 T.O.A., ụmụ eze abụọ bụ́ ndị Hasmon, Hyrcanus nke Abụọ na nwanne ya nwoke bụ́ Aristobulus, busoro ibe ha agha ebe ha na-azọ onye ga-anọchi nna ha. Nke ahụ kpatara agha obodo, ha abụọ achọọkwa enyemaka Pompey, bụ́ ọchịagha ndị Rom nọ na Siria n’oge ahụ. Obi tọrọ Pompey ụtọ iji ohere ahụ bata n’okwu ahụ.

N’ezie, ndị Rom nọ na-eweghara ọchịchị nke obodo dị iche iche dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ka ọ na-erukwala n’oge a, ha na-achị ihe ka ọtụtụ n’obodo ndị dị n’Eshia Maịnọ. Ma, ọtụtụ ndị ọchịchị aka na-esighị ike chịrị Siria emeela ka ọgba aghara  dịrị n’ebe ahụ, na-achọ imebi udo ndị Rom chọrọ ka e nwee n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. N’ihi ya, Pompey bịara iweghara Siria.

Ihe ọ chọrọ ime iji kwụsị esemokwu ahụ dị n’etiti ụmụ Hasmon bụ ịkwado Hyrcanus. N’ihi ya, n’afọ 63 T.O.A., ndị Rom wakporo Jeruselem iji mee onye ahụ ha họọrọ eze. Ma, Hyrcanus agajeghị ịbụ onye ọchịchị kwụụrụ onwe ya. Ndị Rom abatala abata, ha adịghịkwa njikere ịpụ. Hyrcanus ghọrọ onye ọchịchị nọ n’okpuru ndị Rom, nke dabeere n’obiọma na nkwado ndị Rom iji nọgide n’ọchịchị. O nwere ike ime mkpebi ọ chọrọ ma a bịa n’ihe ndị na-eme n’ime obodo, ma a bịa ná mmekọrịta mba na mba, ọ ghaghị ime ihe ndị Rom chọrọ.

Otú Herọd Si Ghọọ Eze

Hyrcanus bụ onye ọchịchị aka na-esighị ike. Ma, Antipater, onye Idumia, bụ́kwa nna Herọd Onye Ukwu, kwadoro ya. Antipater bụ onye na-ekwu ihe a na-eme n’ọchịchị ahụ. O gbochiri òtù ndị Juu na-agba ọchịchị ahụ ụkwụ iweghara ọchịchị, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ bụ ya na-ekwuzi ihe na-eme na Judia. O nyeere Julius Siza aka ịlụso ndị iro ya nọ n’Ijipt ọgụ, ndị Rom kwụkwara Antipater ụgwọ ya site n’ime ya onye ọchịchị ndị Rom, bụ́ onye nọ nnọọ n’okpuru ha. Antipater mekwaranụ ụmụ ya abụọ, bụ́ Phasael na Herọd, gọvanọ Jeruselem na Galili.

Antipater kụziiri ụmụ ya na ọ dịghị ihe ha ga-eme ga-aga nke ọma ma ha ebughị ụzọ jụta ndị Rom. Herọd chetara nnọọ ihe ahụ a kụziiri ya nke ọma. N’oge dum ọ nọ n’ọchịchị, ọ gbara mbọ imeta ma ndị Rom tinyere ya n’ọchịchị ma ndị Juu ọ na-achị mma. Nkà ndị o nwere dị ka onye na-ahazi ihe nke ọma na ọchịagha nyeere ya aka. Mgbe e mere Herọd gọvanọ mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise, o mere nnọọ ihe ozugbo iji kpochapụ òtù ndị ohi e nwere n’ebe ahụ ọ na-achị, bụ́ nke mere ka ma ndị Juu ma ndị Rom hụ ya n’anya.

Mgbe ndị ha na Antipater na-azọ ọchịchị ji nsí gbuo ya n’afọ 43 T.O.A., Herọd ghọrọ onye kasị ike na Judia. N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ndị iro. Ndị oké ozu nọ na Jeruselem weere ya ka onye weghaara ọchịchị na-erughịrị ya ma gbalịa ime ka ndị Rom wepụ ya. Nke ahụ kụrụ afọ n’ala. Ndị Rom echefughị ihe Antipater meere ha, obi sikwara ha ike na nwa ya ga-eme nke ọma.

Otú E Si Mee Ya Eze Judia

Ihe Pompey mere iri afọ abụọ tupu mgbe ahụ maka esemokwu ụmụ Hasmon banyere onye ga-anọchi nna ha kpasuru ọtụtụ ndị iwe. Òtù ndị Juu na-ekwenyeghịrị ya nwara ugboro ugboro iweghara ọchịchị ahụ ma o nweghị isi, n’afọ 40 T.O.A. kwa, site n’enyemaka nke ndị iro Rom, bụ́ ndị Patia, ha nwetara ihe ha na-achọ. N’oge e nwere ọgba aghara n’ihi agha obodo a na-alụ na Rom, ha ji ohere ahụ wakpoo Siria, wepụ Hyrcanus ma jiri onye iro ndị Rom si n’ezinụlọ Hasmon dochie ya.

Herọd gbagara Rom, bụ́ ebe a nabatara ya nke ọma. Ndị Rom chọrọ ka a chụpụ ndị Patia na Judia nakwa ka ógbè ahụ dịrịghachi n’okpuru ha site n’itinye onye ọchịchị ha chọrọ n’ebe ahụ. Ha chọrọ onye ha ga-atụkwasịli obi ha na ya ga-arụkọ ọrụ, ha lekwara Herọd anya ka ụdị onye ahụ. N’ihi ya, Ndị Ome Iwu Rom mere Herọd eze Judia. Herọd duuru ìgwè Ndị Ome Iwu Rom gaa n’ụlọ nsọ Jupita, bụ́ ebe ọ nọ chụọrọ arụsị dị iche iche àjà, iji gosi na ya dị njikere ime ihe ọ bụla dị mkpa iji nọgide n’ọchịchị.

Site n’enyemaka nke ìgwè ndị agha Rom, Herọd meriri ndị iro ya na Judia ma ghọọ eze. Ihe o mere ndị ahụ megidere ya abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. O gbuchapụrụ ụmụ Hasmon na ndị oké ozu ndị Juu kwadoro ha, gbuokwa onye ọ bụla na-achọghị ka enyi ndị Rom chịa ya.

Herọd Mere Ka Ọchịchị Ya Sikwuo Ike

N’afọ 31 T.O.A. mgbe Octavius ghọrọ onye ọchịchị a na-apụghị ịgbagha agbagha nke ndị Rom site n’imeri Mark Antony n’Actium, Herọd ghọtara na a ga-enyowe enyi ya na Mark Antony bụ kemgbe enyowe. N’ihi ya, Herọd mere ihe ngwa ngwa iji gosi Octavius na ya nọ n’akụkụ ya. Onye ọchịchị ọhụrụ Rom ahụ meghachikwaranụ Herọd eze Judia ma gbasakwuo ebe ọ na-achị.

N’afọ ndị sochirinụ, Herọd mere ka ọchịchị ya sikwuo ike, meekwa ka ógbè ahụ bakwuo ọgaranya, gbanwee Jeruselem ka ọ ghọọ ebe a na-akụzi omenala ndị Gris. Ọ rụrụ ọtụtụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ—rụọ obí eze, wuo obodo Sesaria nke nwere ọdụ ụgbọ mmiri, wuokwa ọtụtụ ụlọ ndị mara mma n’ụlọ nsọ Jeruselem. N’oge ahụ niile, ndị na-agwa ya ihe ọ na-eme na ndị na-enye ya ike bụ ndị Rom.

Judia niile nọ n’okpuru Herọd; ọ bụkwa ya bụ o kwuchaa o bie. Herọd tinyekwara aka n’ọrụ nnukwu onye nchụàjà, na-etinye onye ọ bụla ọ chọrọ n’ọkwá ahụ.

Ekworo nke Kpatara Igbu Ọchụ

Ezinụlọ Herọd nọ n’ọgba aghara. Ọtụtụ n’ime ndị nwunye ya iri chọrọ ka otu n’ime ụmụ ha nwoke nọchie nna ya. Nkata a na-akpa n’obí Herọd kpaliri ya inyowe ndị ezinụlọ ya enyowe na imeso ha omume obi ọjọọ. N’ihi ekworo, o nyere iwu ka e gbuo nwunye ya ọ kacha hụ n’anya, bụ́ Mariamne, mechaakwa nye iwu ka a nyagbuo ụmụ nwoke abụọ nwunye ya ahụ mụụrụ ya n’ihi na a sịrị na ha na-akpa nkata ịkwatu ya n’ọchịchị. N’ihi ya, ihe Matiu kọrọ banyere ọtụtụ ụmụaka e gburu na Betlehem kwekọrọ n’iwe ọkụ e ji mara Herọd na mkpebi o mere igbu onye ọ bụla nwere ike ịnọchiri ya ụzọ.

Ụfọdụ kwuru na ebe ọ bụ na Herọd maara na ndị mmadụ kpọrọ ya asị, o kpebisiri ike ịhụ na mba ahụ niile ruru uju kama ịṅụrị ọṅụ mgbe ọ nwụrụ. Na nkata ọ kpara iji mezuo ebumnobi ya ahụ, o jichiri ụmụ amaala ọnụ na-eru n’okwu na Judia ma nye iwu ka e gbuo ha niile ozugbo a mara ọkwa ọnwụ nke ya. E mechaghị mee ihe ahụ o kwuru.

Ihe E Ji Mara Herọd Onye Ukwu

Mgbe Herọd nwụrụ, ndị Rom nyere iwu ka Akeleyọs nọchie nna ya dị ka onye na-achị Judia, ụmụ Herọd ndị nwoke abụọ ọzọ ghọkwara ndị ọchịchị kwụụrụ onwe ha—Antipas chịrị Galili na Peria, Filip achịakwa Ituria na Trakọnaịtis. Ọchịchị Akeleyọs adịghị ma ndị ọ na-achị ma ndị nyere ya ọchịchị mma. Mgbe ọ chịchara ọchịchị afọ iri n’arụpụtaghị ihe ọ bụla, ndị Rom wepụrụ ya ma mee onye nke ha gọvanọ, bụ́ onye Pọntiọs Paịlet nọchiri. Ka ọ dịgodị, Antipas—bụ́ onye Luk na-akpọ naanị Herọd—na Filip na-achị ógbè nke ha dị ka ndị gọvanọ. Nke a bụ otú ihe si kwụrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe Jizọs malitere ozi ya.—Luk 3:1.

Herọd Onye Ukwu bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma nke a na-akọ na ogbu mmadụ obi fere azụ, ikekwe nke kacha njọ o mere bụ́ mgbalị ahụ o mere igbu nwa ọhụrụ bụ́ Jizọs. Inyocha ọrụ Herọd rụrụ ga-abara ndị na-agụ Baịbụl uru, ya bụ, ọ na-enye aka ịghọtakwu ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere n’oge ahụ, na-akọwa otú ndị Rom si malite ịchị ndị Juu, ma na-eme ka anyị ghọta otú ihe si kwụrụ mgbe a mụrụ Jizọs na mgbe o jere ozi ya n’ụwa.

[Map dị na peeji nke 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Palestaịn na ógbè ndị gbara ya gburugburu n’oge Herọd

SIRIA

ITURIA

GALILI

TRAKỌNAỊTIS

Oké Osimiri Galili

Osimiri Jọdan

Sesaria

SAMERIA

PERIA

Jeruselem

Betlehem

JUDIA

Oké Osimiri Nnu

IDUMIA

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Herọd bụ naanị otu onye n’ime ọtụtụ ndị chịrị Judia n’ime narị afọ abụọ tupu Jizọs amalite ozi ya