Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ileta Ebe Obibi Akwụkwọ Pụrụ Iche

Ileta Ebe Obibi Akwụkwọ Pụrụ Iche

Ileta Ebe Obibi Akwụkwọ Pụrụ Iche

Ọ GA-ABỤ na nke a abụghị nke mbụ ị na-ahụ magazin a ị na-agụ. Ikekwe, Ndịàmà Jehova abịatụla n’ụlọ gị nye gị Ụlọ Nche na Teta! iji nyere gị aka ịghọtakwu Baịbụl. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị hụtụla Ndịàmà n’okporo ámá ma ọ bụ n’ahịa ka ha na-enye ndị mmadụ magazin ndị ahụ e ji amụ Baịbụl. N’eziokwu, a na-ebipụta magazin a ihe karịrị iri nde atọ na nde ise kwa ọnwa, ọ bụkwa magazin okpukpe a kacha ebipụta n’ụwa niile.

Ma, ì chetụla echiche banyere ebe a na-ebi akwụkwọ ndị a na otú e si ebi ha? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba anya naanị n’otu n’ime ọtụtụ ebe Ndịàmà Jehova na-ebi akwụkwọ n’ụwa, ya bụ, na nke e nwere na Wallkill, New York, U.S.A. Ọ gaghị adịrị ọtụtụ n’ime ndị na-agụ akwụkwọ anyị mfe ịbịa leta ebe a Ndịàmà Jehova na-ebi akwụkwọ na United States, n’ihi ya, foto ndị dị ebe a na ihe ndị e kwuru banyere ha ga-eme ka ị matakwuo otú e si ebi akwụkwọ n’ebe a.

Tupu e bie akwụkwọ, a na-ebu ụzọ ede ihe a ga-ebi. Ngalaba Ide Ihe dị na Brooklyn, New York, na-eji kọmputa ezigara Ngalaba Na-ahazị Otú Akwụkwọ Ga-adị Ma E Bie Ya ihe ndị ha dere. Ha na-ahazi ihe ndị ahụ e dere ede ma tinye ha na plate ndị e ji ebi akwụkwọ. Kwa ọnwa, a na-ebubata ihe dị ka otu puku ùkwù akwụkwọ na narị anọ n’ebe obibi akwụkwọ dị na Wallkill, bụ́ ebe a na-eji ihe dị ka iri tọn akwụkwọ asatọ ruo otu narị tọn ebi akwụkwọ kwa ụbọchị. A na-etinye ùkwù akwụkwọ ndị ahụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-akarị otu puku na narị kilogram atọ n’ịdị arọ, ná nnukwu ígwè ise na-ebi akwụkwọ e tinyere plate ndị ahụ n’ime ha. Ígwè ndị ahụ na-ebi ihe n’akwụkwọ ahụ, pịa ha ma kebisie ha peeji iri atọ na abụọ peeji iri atọ na abụọ. Magazin a ị na-agụ bụ otu nkebi. Oleekwanụ maka nnukwu akwụkwọ? N’ebe a na-ekwe akwụkwọ, a na-ekwekọta nkebi akwụkwọ dị iche iche ịghọ otu akwụkwọ. Otu n’ime ahịrị abụọ ebe a na-ekwe akwụkwọ nwere ike ikwe iri puku akwụkwọ ise mkpo ha siri ike ma ọ bụ iri puku akwụkwọ asaa na puku ise ndị mkpo ha na-esighị ike n’otu ụbọchị. Ahịrị nke ọzọ nwere ike ikwe ihe dị ka otu narị puku akwụkwọ mkpo ha na-esighị ike kwa ụbọchị.

N’afọ 2008, e biri akwụkwọ karịrị nde iri abụọ na asatọ n’ebe obibi akwụkwọ a, nde abụọ na narị puku isii n’ime ha bụ Baịbụl. N’afọ ahụkwa, e biri magazin karịrị narị nde abụọ na iri nde anọ. E nwere akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’ihe dị ka narị asụsụ atọ na iri asatọ n’ebe a. Olee ihe a na-eme ma e bichaa akwụkwọ ndị ahụ?

Puku ọgbakọ iri na abụọ na narị asaa na iri ise na anọ nke Ndịàmà Jehova dị na United States na otu puku ọgbakọ na narị atọ na iri isii na itoolu ndị dị na Caribbean na Hawaii na-ezite ọda akwụkwọ ha n’ebe obibi akwụkwọ a. Ngalaba Na-ezipụ Akwụkwọ na-ekechi akwụkwọ ndị ahụ ma zigara ha ọgbakọ ndị tụrụ ọda ha. Kwa afọ, a na-ebugara ọgbakọ ndị dị na United States akwụkwọ ruru nde kilogram iri na anọ n’ịdị arọ.

Ihe kacha mkpa n’ebe obibi akwụkwọ a bụ ụmụ mmadụ, ọ bụghị ígwè ọrụ. Ihe karịrị narị mmadụ atọ na-arụ ọrụ ná ngalaba ndị dị n’ebe obibi akwụkwọ ahụ, bụ́ Ngalaba Na-ahazị Otú Akwụkwọ Ga-adị Ma E Bie Ya, Ngalaba Na-ahazi Mgbe A Ga-arụ nke A Ga-arụ, Ngalaba Na-ebi Akwụkwọ, Ngalaba Na-ekwe Akwụkwọ, na Ngalaba Na-ezipụ Akwụkwọ. Ndị ọrụ ahụ, bụ́ ndị nọ n’agbata afọ iri na itoolu na iri itoolu na abụọ, anaghị eri ụgwọ ọnwa.

Ha nwere ezigbo mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, bụ́ ndị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi nara akwụkwọ ndị a, ụkpụrụ Baịbụl ndị dị na ha akụziere ha ihe, gbaa ha ume, ma duzie ha. Anyị nwere olileanya na i so ná ndị ahụ na-agụ akwụkwọ anyị, nweekwa olileanya na akwụkwọ ndị a na-ebipụta n’ebe a ga-enyere gị aka ịna-amụ banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, bụ́ nke ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

[Foto dị na peeji nke 17]