Hà Achọtala Ụgbọ Noa?
Hà Achọtala Ụgbọ Noa?
OYIRI ka ndị mmadụ hà na-akọkarị ọtụtụ akụkọ gbasara otú e si na-achọ ụgbọ Noa. A ma ihe mere ha ji na-achọ ịhụ ya. O doro anya na ọ bụrụ na a chọta nnukwu ụgbọ ahụ chebere Noa na ezinụlọ ya n’oge Iju Mmiri ahụ e nwere n’afọ 2370 ruo afọ 2369 Tupu Oge Anyị, ọ ga-abụ ihe pụrụ iche ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọtatụrụla. Ma, ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ agbalịala ịchọ ụgbọ Noa ahụ, ha ka na-achọ ya. N’agbanyeghị akụkọ niile e tinyere nnu na ose a kọrọla banyere ụgbọ ahụ, olee ihe a maara n’ezie banyere ya?
Baịbụl kwuru na ụgbọ Noa “kwụsịrị n’ugwu Ararat.” (Jenesis 8:4) N’ógbè Ararat, e nwere otu ugwu a ma ama a na-akpọ Ugwu Ararat ugbu a, n’ebe ọwụwa anyanwụ mba Turkey. Ọ dị nso n’ókè mba Armenia na Iran.
Ọtụtụ njem ndị mmadụ merela ịga chọọ ụgbọ Noa n’ebe ahụ emeela ka a kọọ akụkọ na-atọ ụtọ ndị a na-ejighị n’aka. Foto mara mma ndị a nọ n’elu see, ibe osisi ndị e tere korota a hụrụla na akụkọ ndị a na-akọ banyere ndị sị na ha ji anya ha hụ ụgbọ ahụ, emeela ka ndị mmadụ chọọ ịhụ ezigbo ihe akaebe. Ma, ha achọtabeghị ya. Ebe a na-ekwukarị na ọ bụ ebe ụgbọ ahụ kwụsịrị n’Ugwu Ararat dị ihe dị ka kilomita ise ma e si n’ala ala ugwu ahụ gbagowe ya. Ihe ọzọkwa bụ na okwu ndị ọchịchị nọ n’obodo ahụ na-ese na-emekarị ka a ghara ikwe ka ndị si esi bịa gaa chọọ ihe n’ugwu ahụ.
N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị ọ na-agụ agụụ ịhụ ụgbọ ahụ ka chọrọ ka ndị mmadụ gaa chọkwuo ya. Ha kweere na akụkụ ụfọdụ nke ụgbọ ahụ ka dị n’Ugwu Ararat ahụ snoo na-ekpuchi ọtụtụ ọnwa n’afọ. Ha sịrị na ọ bụ naanị n’afọ ndị a ga-enwe oké okpomọkụ ka a ga-enwe ike ịchọta ụgbọ ahụ.
Ọtụtụ akụkọ a kọrọla banyere ụgbọ ahụ emeela ka ndị mmadụ na-atụsikwu anya ya ike. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ Oge Anyị, bụ́ Josephus, kwuru na ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ bu ya ụzọ sịrị na a ka na-ahụ ụgbọ ahụ anya n’elu Ugwu Ararat n’oge ha. Ha kwudịrị na ndị mmadụ na-aga elere ụgbọ ahụ ma na-ewere ibe osisi ndị e tere korota e ji rụọ ya iji na-echeta ya. Otu n’ime ndị Josephus kwuru ihe ha kwuru bụ onye edemede Babịlọn nke aha ya bụ Berossus, onye dịrị ndụ na narị afọ nke atọ Tupu Oge Anyị.
Na narị afọ gara aga, nwoke Armenia aha ya bụ́ George Hagopian kọrọ otu n’ime akụkọ ndị ka kpalie mmasị ndị mmadụ. O kwuru na mgbe ya ka bụ nwata ná mbido afọ ndị 1900, otu onye ikwu ya kpọọrọ ya gaa ebe ụgbọ ahụ dị, ya abanye n’ime ya. Hagopian nwụrụ n’afọ 1972, ma ihe ahụ o kwuru ka na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ, na-atụkwa ha n’anya.
Ọ̀ Bụ Ezigbo Ihe Mere A Ga-eji Nwee Okwukwe?
È nwere ihe e ji n’aka mere anyị ga-eji kwere na ndị na-eme nchọpụta ahụla ụgbọ ahụ ma ọ bụ tụwa anya na ha ga-emecha hụ ya? Ikekwe e nwere. Ma, o yidịrị ka a ka nwee ihe ga-eme ka e nwewe obi abụọ na a ga-achọta ya. Otu n’ime ha bụ na Baịbụl ekwughị kpọmkwem ebe ụgbọ ahụ kwusịrị mgbe mmiri Iju Mmiri ahụ talatara. Naanị ihe o kwuru bụ na ọ kwụsịrị “n’ugwu Ararat.”
* Chetakwa na Noa na ezinụlọ ya biri n’ụgbọ ahụ rụọ ọnwa ole na ole mgbe ụgbọ ahụ kwụsịchara. (Jenesis 8:4, 5) O yighịkwa ka ọ̀ bụ n’ugwu dị oké elu ka Noa na ụmụ anụmanụ ndị ahụ si gbadata mgbe ha si n’ụgbọ ahụ pụta, dị ka à ga-asị na ha bụ aka ochie n’ịrị ugwu. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ raghị ha ahụ́ isi n’ebe ụgbọ ahụ kwụsịrị gbadata otú ndị na-eme nchọpụta taa chere. Ma, ihe a kọrọ na Jenesis 8:4, 5 gosiri na ebe ụgbọ ahụ kwụsịrị dịtụ elu. N’agbanyeghị ebe ọ kwụsịrị n’ógbè Ararat, ọ̀ bụ na ò rekasịbeghị kemgbe ọtụtụ narị afọ ma ọ bụkwanụ ndị mmadụ atụtụrụchaa osisi e ji rụọ ya?
Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị na-eme nchọpụta na ndị na-akọ nkọ chere na ọ bụ n’ugwu kacha elu n’ógbè ahụ ka ụgbọ ahụ kwụsịrị. Ma, Akwụkwọ Nsọ ekwughị na Chineke mere ka ụgbọ ahụ kwụsị n’elu elu Ugwu Ararat, bụ́ ebe na-ajụ oké oyi n’oge a, nke dị ihe dị ka kilomita ise n’ịdị elu.E nwekwara ihe a na-enyo enyo n’ihe ndị na-akọ akụkọ na-ekwu mgbe ụfọdụ banyere uru ọchịchọ a na-achọ ụgbọ ahụ ga-abara ndị okpukpe. Otu nwoke haziri otu njem a chọrọ ime ịga chọọ ụgbọ ahụ kwuru na ịchọta ụgbọ ahụ “ga-eme ka okwukwe ọtụtụ nde mmadụ sie ike . . . meekwa ka ọtụtụ ndị nwee okwukwe.” N’otu nnọkọ ndị nta akụkọ nwere n’afọ 2004, o kwuru na ịchọta ụgbọ ahụ ga-abụ “ihe kacha mkpa metụrụlanụ kemgbe a kpọlitechara Kraịst n’ọnwụ.” E mechara kagbuo njem ahụ ọ haziri.
Ịchọta ụgbọ Noa ahụ ọ̀ ga-eme n’ezie ka okwukwe ndị mmadụ sie ike, meekwa ka ndị ọzọ nwee okwukwe? Baịbụl gosiri na ọ bụghị ihe a na-ahụ anya na ihe a na-ebitụ aka ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo okwukwe. (2 Ndị Kọrịnt 5:7) Ụfọdụ ndị na-arụ nnọọ Baịbụl ụka nke na ha na-ekwu na naanị ihe ga-eme ka ha nwee okwukwe n’akụkọ ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl bụ ma hà ji anya ha hụ ihe na-egosi na o mere eme. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị ihe akaebe ga-eme ka ụdị ndị ahụ nwee okwukwe. Jizọs kwuru na e nwere ụfọdụ ndị na-agaghị ekweta na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu, a sịgodị na ha ahụ ebe a kpọlitere mmadụ n’ọnwụ!—Luk 16:31.
Ma, ezigbo okwukwe abụghị mmadụ ịnụ na ọ dị iri, ya achịrị wụnye n’akpa; a na-enwe ezigbo ihe akaebe. (Ndị Hibru 11:1) È nwere ezigbo ihe akaebe ga-eme ka ndị nwere ezi uche taa kweta na akụkọ Iju Mmiri ahụ a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu? Ee, e nwere. Jizọs Kraịst kwuru hoo haa, sị: “Noa banyere n’ụgbọ, iju mmiri ahụ wee bịa.” (Luk 17:26, 27) O nweghị ihe akaebe karịrị nke a. Maka gịnị?
Jizọs nọ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. (Jọn 8:58) Ọ hụrụ mgbe a na-arụ ụgbọ ahụ; ọ hụrụ mgbe Iju Mmiri ahụ bịara. Ugbu a, olee ihe akaebe i chere ka mma ikweta? Ọ̀ bụ akaebe nke Onye gosiri na a pụrụ ịtụkwasị ya nnọọ obi, gosikwa na ya bụ Ọkpara Chineke? Ka ọ̀ bụ inwe olileanya a na-ejighị n’aka na ndị na-eme nchọpụta ga-ahụ iberibe osisi ochie n’elu ugwu snoo kpuchiri? Ọ bụrụ na anyị esi otú a lee ya anya, anyị ga-ahụ nnọọ na e nwere ọtụtụ ihe akaebe na-egosi na Noa rụrụ ụgbọ n’oge ochie.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Ugwu a na-akpọ Ugwu Ararat taa bụ ugwu na-agbọpụta ọkụ nke na-agbọpụtabeghị ọkụ kemgbe 1840. Ọ dị puku mita ise na otu narị na iri mita isii na ise, snoo na-ekpuchikwa ya n’oge niile n’afọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]
È nwere ezigbo ihe akaebe na-egosi na akụkọ Iju Mmiri ahụ a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
Jizọs Kraịst kwuru hoo haa, sị: “Noa banyere n’ụgbọ, iju mmiri ahụ wee bịa”