Ana M Ekele Chineke n’Agbanyeghị Ọdachi Ndị Dakwasịrị M—Otú Baịbụl Si Nyere M Aka Idi Ha
Ana M Ekele Chineke n’Agbanyeghị Ọdachi Ndị Dakwasịrị M—Otú Baịbụl Si Nyere M Aka Idi Ha
Dị ka Enrique Caravaca Acosta si kọọ
Ihe m na-aga ịkọ mere n’April 15, 1971. M na-aga ileta ndị ezinụlọ m n’ugbo ezinụlọ anyị bụ́ ebe ha bi. Ebe ọ bụ na ọ dịla anya m hapụrụ ụlọ, m nọ na-atụsi anya ike ịhụ mmadụ niile. M nọ na-eche ma ha niile hà ga-anọ n’ụlọ na onye mbụ m ga-ahụ. Mgbe m rutere, ụjọ bara m ahụ́ ịhụ ozu mmadụ anọ n’ụlọ anyị, ma ozu mama m!
AKPATA oyi zuru m ahụ́. Ọ̀ bụ gịnị mere? Gịnị ka m ga-eme? O nweghị onye nọ nso, ike ụwa gwụrụ m, amaghịkwanụ m ihe m ga-eme eme. Ka m burugodị ụzọ kọtụrụ gị banyere onwe m tupu mụ akọọ ihe mezirinụ. Ọ ga-eme ka ị ghọta nnọọ otú obi dị m banyere ihe a merenụ na ọdachi ndị ọzọ dakwasịrị m ná ndụ.
Anyị Chọtara Eziokwu
A mụrụ m na Quirimán, bụ́ obodo dị nso na Nicoya, Costa Rica. Na 1953, mgbe m dị afọ iri atọ na asaa, mụ na ndị mụrụ m bi n’ugbo ezinụlọ anyị. Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Katọlik n’oge anyị na-etolite, ozizi ụfọdụ ndị Katọlik na-ezi adịghị anyị mma, anyị nwekwara ọtụtụ ajụjụ a na-azaghị anyị.
Otu ụtụtụ, otu nwoke a na-akpọ Anatolio Alfaro bịara n’ụlọ anyị gbaa anyị ume ka anyị mụwa Baịbụl. Ọ gụụrụ anyị ọtụtụ ebe ma kụziere anyị ọtụtụ ihe na Baịbụl. Mụ na papa m na mama m na otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke na nwanne m nwaanyị na enyi ya nwaanyị anyị na ya bi nọdụrụ ala gee ya ntị. Anyị ji ụbọchị ahụ dum kwurịta okwu, kwuruo ya n’ime abalị. Anyị nwere ọtụtụ ajụjụ ịjụ.
Anatolio nọbọrọ chi, anyị na ya anọọkwa n’echi ya. Ihe anyị nụrụ mere anyị obi ụtọ, obi tọgbukwara anyị atọgbu na ọ bụ Baịbụl ka o ji zaa anyị ajụjụ ndị anyị jụrụ. Ụka ahụ anyị na ya kparịtara ruru anyị nnọọ n’ahụ́. Anyị chere echiche banyere ihe anyị mụtara, anyị matakwara na anyị achọtala eziokwu. Anatolio hapụụrụ anyị ụfọdụ magazin na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ná mgbede, ezinụlọ anyị na-agụ ha ma na-amụkọ ha ọnụ. Nke a adịtụghị mfe, ebe ọ bụ na anyị enweghị ọkụ eletrik. Tupu anyị anọrọ ọdụ mụwa ihe, onye ọ bụla n’ime anyị na-ewere nnukwu akpa e ji awụnye poteto kpuchie ụkwụ ya ka anwụnta ghara ịta ya.
Mgbe ọnwa isii gafere, mmadụ ise n’ezinụlọ anyị mere baptizim, ma mụnwa ma papa m na mama m. Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi malite ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-akụziri ndị ọzọ ihe
anyị mụtara. Anyị na-eji ụkwụ aga otu obodo a na-akpọ Carrillo, mgbe ụfọdụkwa anyị ejiri ịnyịnya, iji soro ìgwè Ndịàmà Jehova e nwere n’ebe ahụ mụọ ihe. Njem ahụ na-ewe anyị awa abụọ ma anyị jiri ụkwụ. Anatolio nọgidere na-abịa n’ụlọ anyị ịkụziri anyị Baịbụl. A maliteziri inwe ọmụmụ ihe n’ụlọ anyị, mmadụ asatọ na-abịakwa ya. E mechara mee ha niile baptizim. N’oge na-adịghị anya, mmadụ asatọ ahụ ghọrọ obere ọgbakọ nke ihe dị ka mmadụ iri abụọ nọ na ya.Ịrụ Ọrụ Chineke Oge Niile
Ka oge na-aga, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Costa Rica kpọkuru ndị nwere ike ịmalite ọrụ ikwusa ozi ọma oge niile ka ha malite ya. Na 1957, m zara òkù ahụ wee malite ikwusa ozi ọma oge niile. Ọrụ ahụ tọgburu m atọgbu. Ọtụtụ mgbe, naanị m na-aga ije ọtụtụ awa, na-agakwuru ndị bi n’ime ime obodo. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị anabata m. Ọ dịkarịa ala, m ga-echeta ugboro atọ ndị ikom bú mma yiri m egwu, nye m iwu ka m gwa ha onye m bụ na ihe m bịara.
Tupu afọ 1960, ihe ka ọtụtụ n’okporo ụzọ ndị e nwere ná mba anyị bụ naanị ụzọ ụkwụ ndị gafere n’ala ịkpa, ọ na-esikwara anyị ike iru na nke ndị mmadụ. Anyị na-eji ịnyịnya iji nwee ike iru ebe ụfọdụ. Anyị na-erufe mmiri dị iche iche, na-ehikwa n’èzí mgbe ụfọdụ. Anwụnta ndị juru ebe niile na-emesikwa anyị ike. Anyị na-akpachapụkwa anya maka agwọ na agụ iyi. N’agbanyeghị nke a, ọ tọrọ m ezigbo ụtọ inyere ndị mmadụ aka ịmata banyere Jehova Chineke. Mgbe ọ bụla m lọtara n’ụlọ, obi na-atọ m ụtọ na m kụziiri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl. Ka m na-ekwusa ozi ọma, na-amụkwa Baịbụl kwa ụbọchị, m na-ahụkwu Jehova Chineke n’anya, mụ na ya ana-adịkwu ná mma.
Ka oge na-aga, e nyetụkwuru m ọrụ. M rụrụ ọrụ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ihe karịrị afọ iri, na-eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị iche iche ma na-agba ha ume. N’ebe ụfọdụ, m na-eleta otu ọgbakọ otu izu. Ọ bụ eziokwu na ọrịa mere ka m kwụsị ọrụ a, m nọgidere na-ejere Chineke ozi, na-ekwusa ozi ọma oge niile.
Ọdachi Abịa
Ma, n’oge m nọ na Nicoya n’afọ 1971, m lara ụlọ ịga leta ezinụlọ m. Mgbe m banyere n’ime ụlọ anyị, m hụrụ mama m dị afọ iri asatọ ka ọ tọgbọ n’ala. A gbara ya égbè, maakwa ya mmà. Ọ ka na-eku ume mgbe m hulatara ka m jide ya. N’oge na-adịghị anya, ọ nwụrụ ka m ji ya. M legharịrị anya hụ ka nwaanyị na-esiri ezinụlọ anyị nri, bụ́ onye dị ime ọnwa asatọ, tọgbọ n’ala n’ebe a na-esi nri. Ọ nwụọkwala. Ahụkwara m ozu otu onye nọ n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ na veranda, ozu nwa nwoke nke nwaanyị ahụ na-esiri ezinụlọ anyị nri tọgbọkwa n’ebe a na-asa ahụ́! A makasịrị ha niile mmà ahụ́, gbaakwa ha égbè. Ònye kpara ụdị arụ a, gịnịkwa bụ iwe ya?
Mgbe m pụrụ n’èzí, m hụrụ papa m.
A gbara ya égbè n’isi, ma ọ ka dị ndụ! M ji ọsọ gaa n’ụlọ nwanne m nwoke, bụ́ ebe na-ewe ihe dị ka minit iri na ise iru, ma, m nọ n’ebe ahụ nụ na e nwekwara nwaanyị ọzọ e gburu, gbuokwa nwa ya. Akpata oyi zuru m ahụ́ ịnụ na ọ bụ nwa nwanne m nwaanyị dị afọ iri na asaa isi na-adịghị mma, bụ́ onye na-abụghị Onyeàmà Jehova, gburu mmadụ niile ahụ! Ọ gbaala ọsọ. A malitere ịchọ ya otú a na-achọtụbeghị mmadụ na Costa Rica.Akụkọ a zuru ebe niile ná mba anyị. Mgbe ndị uwe ojii chọchara ogbu mmadụ a abalị asaa, ha hụrụ ya ebe o ji nnukwu mma na obere égbè mmadụ resịrị ya n’agbanyeghị na onye ahụ maara na isi adịghị ya mma. A gbagburu nwa nwanne m nwaanyị ahụ mgbe a na-achọ ijide ya.
N’oge ahụ a na-achọ nwa nwanne m nwaanyị, ọtụtụ ndị nyere m ndụmọdụ ka m ghara ịnọ nso n’ụlọ maka a dịghị ama ama ya alọta bịa merụọ m ahụ́. M tinyere nke a n’ekpere n’ihi na m chere na ekwesịghị m ịhapụ ndị ezinụlọ m fọrọ ndụ na ndị nọ n’ọgbakọ anyị n’oge a. N’ihi ya, apụghị m.
Otu Ọdachi Gachaa Ọzọ Esochie Ya
Ọ dị mwute na ọ bụ naanị otu afọ ka papa m dịrị ndụ. N’afọ sochiri ya, e gburu nwanne m nwaanyị, bụ́ ohu Jehova Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, n’ihe ọzọ na-agbasaghị ihe ahụ merenụ. O wutekwara ndị ikwu m niile nke ukwuu na onye ọzọ n’ezinụlọ anyị nwụrụ. Obi ọjọọ na mwute anyị na ndị enyi anyị nwere abụghị ihe e ji ọnụ akọ. N’oge nsogbu ahụ, m dabeere kpamkpam na Jehova ma nọgide na-arịọ ya ka o nye m ike.
Na 1985, m gara ọzụzụ ụbọchị atọ e nyere ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst n’isi obodo anyị, bụ́ San José. Mgbe ọzụzụ ahụ gwụrụ, mmekọrịta mụ na Jehova sikwuru ike. N’isi ụtụtụ Monday ya, m gawara ka m banye bọs ga-ebula m. Ka m na-aga n’ebe a na-abanye bọs, ndị ohi jidere m, tọchie m aka n’akpịrị ma zuo m ohi. Ihe niile a mere ngwa ngwa nke na enweghị m ike ịhụ ihu ha. Nke a emeela ka m ghakwara inwe ike ikele ekele otú ndị Costa Rica si ekele ekele. N’ebe a, n’obodo Guanacaste, ndị ikom na-eti mkpu mgbe ha na-ekele ibe ha ma ha hụ ma ọ bụ mgbe ha chọrọ ime ka a mara na ha nọ ya. M na-etibu mkpu nke ọma, ma kemgbe ahụ ha tọchara m aka n’akpịrị, enwekwaghị m ike iti mkpu.
Na 1979, m lụrụ Celia, bụ́ Onyeàmà ibe m si n’ọgbakọ dị nso na nke m. Celia hụrụ Baịbụl n’anya. Anyị na-agụ Baịbụl ma na-amụkọ ya ọnụ kwa ụbọchị. Ma, ọ dị mwute na ọrịa kansa gburu ya na July 2001. Mgbe ụfọdụ, owu na-ama m, ma olileanya mbilite n’ọnwụ na-agba m ume.—Jọn 5:28, 29.
Enwere M Ọṅụ n’Agbanyeghị Ọnwụnwa
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ọdachi adakwasịla m ná ndụ karịa otú ọ dakwasịrịla ọtụtụ ndị, m weere ha dị ka ohere m nwere igosi na m nwere okwukwe na Jehova ma na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. (Jems 1:13) Iji nyere onwe m aka ịnọgide na-ele ihe ndị merela m ná ndụ anya otú kwesịrịnụ, m na-echetara onwe m mgbe niile na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị” anyị niile. (Ekliziastis 9:11) M na-echetakwa na oge a bụ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ,” n’ihi na ndị mmadụ na-eme ihe ike, ha adịghịkwa ejide onwe ha. (2 Timoti 3:1-5) M na-echetakwa ihe nlereanya Job. N’agbanyeghị ahụhụ niile Job tara, ma ndị ezinụlọ ya nwụrụnụ, ma ọrịa ọ rịara, ma ihe onwunwe ya furunụ, o kwuru hoo haa, sị: “Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.” Jehova kwụghachikwara nnọọ Job ụgwọ maka iguzosi ike n’ezi ihe. (Job 1:13-22; 42:12-15) Ihe niile a Baịbụl kwuru na-enyere m aka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị ọtụtụ ọnwụnwa ndị bịaara m.
Jehova na-enyere m aka mgbe niile ịnọgide na-ebute ya ụzọ ná ndụ m. Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na-akasi m obi nke ukwuu, o nyewokwa m ike idi ọdachi ndị ahụ. Ikpeku Jehova ekpere emeela ka m nwee “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Nke a na-eme ka obi ruo m ala. Ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na itinye ọnụ mgbe a na-amụ ihe emeekwala ka okwukwe m sie ike.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Ọ bụ eziokwu na mụ emeela agadi, m na-ekele Jehova na m ka nwere ume iso Ndị Kraịst ibe m na-arụkọ ọrụ, na-akụzikwara ndị ọzọ Baịbụl ma na-eje ozi ọma. Isi otú a na-ejere ndị ọzọ ozi na-eme ka m nwee ike idi ọdachi ndị ahụ n’adaghị mbà. Eji m obi m dum na-ekele Jehova nke ukwuu n’agbanyeghị ọtụtụ ọdachi dakwasịrị m ná ndụ m. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 26 Afọ abụọ Enrique Caravaca Acosta zipụchara akụkọ ndụ ya a, ọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri itoolu.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 20]
Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na-akasi m obi nke ukwuu, o nyewokwa m ike idi ọdachi ndị ahụ
[Foto dị na peeji nke 19]
Mgbe m malitere ikwu okwu Baịbụl
[Foto dị na peeji nke 20]
Mgbe m na-ekwusa ozi ọma n’oge m bụ okorobịa