Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Olee otú Chineke si lee ndị Izrel na-agụ kpakpando anya?
Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara na ịgụ kpakpando pụtara “ịmụ otú mbara ala dị iche iche, anyanwụ, ọnwa, na kpakpando si agagharị, na-eburu n’obi na ngagharị ha na-emetụta ndụ ndị mmadụ.” Ka ụwa na-agba anyanwụ gburugburu kwa afọ, ọ na-adị onye nọ n’ụwa ka ìgwè kpakpando dị iche iche hà na-agagharị agagharị. Kemgbe oge ochie, ndị mmadụ na-ahụ mgbanwe ndị ahụ ma na-ekwu na o nwere ezigbo ihe ha pụtara.
Ọ ga-abụ ndị Babịlọn oge ochie, ndị na-efe ìgwè kpakpando, malitere ịgụ kpakpando. Ndị Izrel malitekwara ife kpakpando mgbe ha kwusịrị ife Chineke ezi ofufe. Ka ọ na-erula n’oge Eze Josaya nke Juda, ịgụ kpakpando eruola ebe niile n’ala ahụ. Echiche Chineke n’okwu a doro anya. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Iwu Mozis kwuru na a ga-egbu onye ọ bụla kpọọrọ kpakpando isiala.—Diuterọnọmi 17:2-5.
Otu ihe Eze Josaya mere iji mezighachi ofufe ndị Juu bụ inye iwu ka a kwụsị isurere “anyanwụ na ọnwa na ìgwè kpakpando nke zodịak na ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, ihe nsure ọkụ.” Baịbụl kwuru na ihe mere eze ahụ ji mee ya bụ na ọ chọrọ ‘iso Jehova na idebe ihe o nyere n’iwu.’ (2 Ndị Eze 23:3-5) Ndị chọrọ ife Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu” taa kwesịkwara ime ihe ahụ o mere.—Jọn 4:24.
Olee ndị bụ́ “Ụmụ Zus” a kpọrọ aha n’Ọrụ 28:11?
Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ọrụ Ndịozi kwuru na mgbe Pọl onyeozi na-aga Rom, ọ banyere ụgbọ mmiri si Mọlta na-aga Putiolaị, bụ́ nke nwere ihe a tụrụ atụ bụ́ “Ụmụ Zus.” (Ọrụ 28:11) N’oge ochie, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na ndị njem na-ahụkarị ụdị ihe ahụ n’ụgbọ.
N’akụkọ ifo ndị Gris na ndị Rom, e kwuru na Zus (bụ́ chi a na-akpọkwa Jupita) na Leda mụrụ ụmụ ejima ndị nwoke, bụ́ Castor na Pollux. N’ime ọrụ niile e weere ya na “Ụmụ Zus” a na-arụ, a sịrị na ha bụkwa aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri nakwa na ha na-achịkwa ifufe na ebili mmiri. N’ihi ya, a malitere ife ha ofufe dị ka chi na-echebe ndị na-akwọ ụgbọ mmiri. Ọ bụrụ na oké ifufe efewe n’osimiri, ndị ụgbọ mmiri na-achụrụ ha àjà ma rịọ ha ka ha napụta ha. Ọtụtụ ndị kweere na chi ụmụ ejima ahụ na-eji ọkụ St. Elmo, bụ́ ire ọkụ na-apụta mgbe ụfọdụ n’ákwà ụgbọ mmiri mgbe oké ifufe na-efe, egosi ike ha.
Ọtụtụ ndị Gris na ndị Rom fere Castor na Pollux ofufe, otu ihe e dere n’oge ochie kwukwara na e fere chi ndị ahụ n’ógbè Saịrini, nke dị n’Ebe Ugwu Africa. Ụgbọ ahụ e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi si n’ebe dị nso na Saịrini, bụ́ Alegzandria, Ijipt.
[Foto dị na peeji nke 9]
Ogidi nkume ndị Babịlọn nke na-egosi Eze Nazimaruttash na ìgwè kpakpando
[Foto dị na peeji nke 9]
Ego kịrịkịrị Dinarịọs e sere “Ụmụ Zus,” nke dịrị n’agbata afọ 114 na 113 tupu oge anyị
[Ebe E Sigasị Nweta Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ogidi nkume: Réunion des Musées Nationaux/Art Resource, NY; ego kịrịkịrị: A natara Classical Numismatic Group, Inc./cngcoins.com ikike