Kelee Onye Na-enye Mmiri Ozuzo
Kelee Onye Na-enye Mmiri Ozuzo
OLEE otú ụwa gaara adị anyị ma a sị na mmiri anaghị ezo? O doro anya na ọ bụrụ na mmiri ezofee ókè, o nwere ike ime ka idei mmiri mebisịa ihe. O nwekwara ike mmiri ozuzo anaghị adị ndị bi n’ebe oyi na-atụkarị ma ọ bụ ebe mmiri na-ezokarị mma mgbe niile. (Ezra 10:9) Oleekwanụ maka ọtụtụ nde mmadụ ndị anwụ na-akpa aka ọjọọ? Ọ bụrụ na mmiri emechaa zoo, obi na-atọgbu ha atọgbu!
Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ala ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl, dị ka ndị dị n’ime ime Eshia Maịnọ, bụ́ ebe Pọl onyeozi gara zie ozi ọma. Mgbe Pọl nọ n’ebe ahụ, ọ gwara ndị Likeonia nke oge ochie, sị: “[Chineke ahapụghị] onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.” (Ọrụ 14:17) Ị̀ hụrụ na Pọl bu ụzọ kwuo maka mmiri ozuzo? Nke a bụ n’ihi na ọ bụrụ na mmiri ezoghị, o nweghị ihe ọkụkụ ga-epu, a gaghịkwa enwe “oge mkpụrụ ji amị.”
Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe banyere mmiri ozuzo. Okwu Hibru na Grik a sụgharịrị mmiri ozuzo pụtara ihe karịrị otu narị ugboro na Baịbụl. Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere onyinye a magburu onwe ya, bụ́ mmiri ozuzo? Ị̀ ga-achọkwa ka ihe Baịbụl kwuru, bụ́ nke ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara na ọ bụ eziokwu, mee ka okwukwe gị sikwuo ike?
Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Mmiri Ozuzo
Jizọs Kraịst mere ka anyị mara ihe dị mkpa ga-adịrịrị tupu mmiri a na-ezo. Jizọs kwuru, sị: “Nna unu . . . na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Ị̀ chọpụtara na Jizọs bu ụzọ kwuo maka anyanwụ tupu ya ekwuo maka mmiri ozuzo? Nke ahụ kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ bụghị naanị na anyanwụ na-enyere ihe ọkụkụ aka ito eto, kamakwa ọ na-eme ka mmiri ozuzo na-alaghachi ebe o si bịa. N’afọ ọ bụla, anwụ na-amịrị mmiri dị ukwuu dị n’oké osimiri laghachi n’ígwé. Ebe ọ bụ Jehova Chineke kere anyanwụ, anyị kwutere ya ma anyị sị na ọ bụ ya na-amịkọrọ mmiri mee ka ọ ghọọ mmiri ozuzo.
Baịbụl kwuru otú mmiri ozuzo si alaghachi ebe o si bịa, sị: “Chineke . . . na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala; mmiri ahụ na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ ya. Mmiri ewee si n’ígwé ojii na-atapụta, na-atasa ụmụ mmadụ n’ụba.” (Job 36:26-28) Kemgbe ọtụtụ puku afọ e dere ihe a ndị sayensị chọpụtarala na ọ bụ eziokwu, ndị mmadụ agbalịala nke ukwuu ka ha ghọta otú mmiri ozuzo si alaghachi n’ebe o si bịa. Akwụkwọ ọgụgụ e bipụtara n’afọ 2003, bụ́ Water Science and Engineering, kwuru, sị: “Ka ọ dị ugbu a, a matachabeghị otú ntapụ mmiri si aghọ ntapụ mmiri n’ígwé ojii.”
Ihe ndị sayensị maara bụ na ọ bụ ụmụ irighiri mmiri mmadụ na-enweghị ike iji anya nkịtị hụ na-akpụkọta ghọọ ntapụ mmiri n’ígwé ojii. Nke ọ bụla n’ime ụmụ irighiri mmiri ndị ahụ na-amụba ruo ihe dị ka otu nde okpukpu ụzọ wee ghọọ otu ntapụ mmiri. Otú nke a si eme dị mgbagwoju anya, ọ na-ewekwa ọtụtụ awa. Otu akwụkwọ sayensị bụ́ Hydrology in Practice kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ihe e kwurula banyere otú ụmụ irighiri mmiri dị n’ígwé ojii si aghọ ntapụ mmiri. Ndị na-eme nnyocha ka na-agbasikwa mbọ ike iji chọpụta kpọmkwem otú ụmụ irighiri mmiri si aghọ ntapụ mmiri.”
Job 38:28, 36, 37) Kemgbe ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise a jụchara ajụjụ ndị ahụ tara akpụ, ndị sayensị ka na-agba mbọ iji mara ma ha ga-azata ha.
Onye kere ihe ndị na-eme ka mmiri zoo jụrụ ohu ya bụ́ Job ajụjụ karịrị ya, sị: “Mmiri ozuzo ò nwere nna, ka ọ̀ bụ onye mụrụ igirigi? Ònye tinyere amamihe n’ígwé ojii? . . . Ònye pụrụ iji amamihe ya kwuo ole ígwé ojii dị kpọmkwem, ma ọ bụ ite mmiri nke eluigwe—ònye pụrụ ikpu ha ihu?” (Olee Otú Mmiri Ozuzo Si Alaghachi n’Ebe O Si Bịa?
Ndị ọkà ihe ọmụma Gris kụziri na mmiri e nwere n’osimiri abụghị mmiri ozuzo, kama na ọ bụ mmiri si n’oké osimiri. Ha sịrị na mmiri oké osimiri na-esi n’ime ala sọruo n’ugwu dị iche iche, bụ́ ebe ha na-aghọ isi iyi. Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na ihe Sọlọmọn kwuru kwadoro nke a. Lebagodị anya n’ihe Sọlọmọn si n’ike mmụọ nsọ kwuo. Ọ sịrị: “Iyi niile na-asọba n’oké osimiri, ma oké osimiri adịghị eju eju. N’ebe iyi si asọpụta, n’ebe ahụ ka ọ na-asọghachi ka o wee sọpụta.” (Ekliziastis 1:7) Ihe Sọlọmọn kwuru ọ̀ pụtara na mmiri dị n’oké osimiri nwere otú o si esi n’ime ala asọru n’ugwu dị iche iche ghọọ isi iyi na-asọba n’osimiri? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba anya n’ihe ndị obodo Sọlọmọn kweere banyere otú mmiri ozuzo si alaghachi n’ebe o si bịa. Hà kweere ihe na-ezighị ezi banyere otú mmiri ozuzo si alaghachi n’ebe o si bịa?
Ihe na-erughị otu narị afọ Sọlọmọn dịchara ndụ, Ịlaịja onye amụma Chineke kwuru ihe ọ maara banyere ebe mmiri ozuzo si abịa. N’oge ọ dị ndụ, o nwere mgbe mmiri na-ataghị kpọm n’ala ha ruo ihe karịrị afọ atọ. (Jems 5:17) Jehova Chineke mere ka mmiri ghara izo n’ala ndị ya maka na ha hapụrụ ya fewe Bel, bụ́ chi ndị Kenan weere na ọ bụ chi mmiri ozuzo. Ma, Ịlaịja nyeere ụmụ Izrel aka ichegharị. Mgbe ha chegharịrị, o kpere ekpere ka mmiri zoo. Ka Ịlaịja na-ekpe ekpere, ọ gwara onye na-ejere ya ozi ka o lee anya “ná mpaghara oké osimiri.” Mgbe a gwara Ịlaịja na “e nwere obere ígwé ojii dị ka ọbụ aka mmadụ nke si n’oké osimiri na-apụta,” ọ matara na a zaala ekpere ya. Obere oge, “ígwé ojii na ifufe mere ka eluigwe gbachie, nnukwu mmiri wee malite izo.” (1 Ndị Eze 18:43-45) Ịlaịja si otú a gosi na ya maara otú mmiri ozuzo si abịa. Ọ maara na mmiri ga-esi n’oké osimiri rujuo n’ígwé, ikuku si n’ebe ọwụwa anyanwụ eburu ya gaa n’Ala Nkwa ahụ, ya ezoo. Ọ ka bụ otú ahụ ka mmiri si ezo n’ala ahụ taa.
N’ihe dị ka otu narị afọ Ịlaịja kpechara ekpere ahụ, Emọs, bụ́ onye ọrụ ubi na-enwechaghị Emọs 5:6, 8) Emọs mechara kwughachi eziokwu a magburu onwe ya banyere otú mmiri ozuzo si abịa na otú o si alaghachi ebe o si bịa. (Emọs 9:6) Emọs si otú ahụ gosi na oké osimiri bụ ebe bụ́ isi mmiri ozuzo si abịa.
ego, kwuru otu ihe dị mkpa banyere otú mmiri ozuzo si abịa. Chineke gwara Emọs ka o buo amụma ihe ga-eme ụmụ Izrel n’ihi otú ha si emegbu ndị ogbenye, na-efekwa chi ụgha. Emọs gbara ha ume ka ha ‘chọọ Jehova, wee dịrị ndụ,’ ma ọ́ bụghị ya, Chineke ga-ala ha n’iyi. Emọs kwuziri na ọ bụ naanị Jehova ka e kwesịrị ife ofufe n’ihi na ọ bụ Onye Okike, bụ́ “Onye na-akpọ oké osimiri òkù, ka o wee wụsa ya n’elu ụwa.” (N’afọ 1687, Edmond Halley ji nkà mmụta sayensị gosi na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ma, o wetụrụ oge tupu ndị ọzọ ekweta ihe Halley chọpụtara. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica Online kwuru, sị, “Ruo n’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, a ka nọ na-akụzi na mmiri si n’oké osimiri na-esi n’ime ala sọruo n’ugwu dị iche iche ma si n’ebe ahụ sọba n’osimiri.” N’ebe niile n’ụwa taa, a maara otú mmiri ozuzo si alaghachi n’ebe o si bịa. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Anwụ na-amịrị mmiri dị n’oké osimiri, e mechaa, ya erujuo n’ígwé, zoo n’Ụwa, sọba n’osimiri, sikwa n’osimiri sọbaghachi n’oké osimiri.” O doziri anya na mgbe Sọlọmọn kwuru n’Ekliziastis 1:7 na mmiri na-alaghachi n’ebe o si asọpụta, ihe ọ na-ekwu bụ mmiri iruju n’ígwé ma zoo.
Olee Ihe I Kwesịziri Ime?
Otu n’ime ọtụtụ ihe gbara ọkpụrụkpụ gosiri na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ nke Onye kere ụmụ mmadụ, bụ́ Jehova Chineke, bụ na ihe ndị so dee Baịbụl kwuru banyere otú mmiri ozuzo si alaghachi n’ebe o si bịa bụ eziokwu. (2 Timoti 3:16) N’eziokwu, otú ụmụ mmadụ sirila kpaa ụwa aka ọjọọ akpaghasịala ihu ígwé, mee ka mmiri na-ezofe ókè n’ebe ụfọdụ, a na-enwekwa oké ọkọchị n’ebe ndị ọzọ. Ma, Onye mere ka mmiri ozuzo na-alaghachi n’ebe o si bịa, bụ́ Jehova Chineke, kwere nkwa kemgbe na oge na-abịa mgbe ya ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.
Ka ọ dị ugbu a, olee otú i nwere ike isi kelee Chineke onye na-enye anyị ọtụtụ onyinye, dị ka mmiri ozuzo? Otú ị ga-esi eme ya bụ ịmụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na ime ihe ndị ị na-amụta. Ọ bụrụ na i mee ya, ị ga-enwe olileanya ịba n’ụwa ọhụrụ Chineke, bụ́ ebe onyinye niile Chineke na-enye ga-eru gị aka ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi na, n’eziokwu, “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè” si n’aka Onye na-enye mmiri ozuzo, bụ́ Jehova Chineke, abịa.—Jems 1:17.
[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 16, 17]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
← ← MMIRI NA-ERUJU N’ÍGWÉ ←
↓ ↑ ↑
MMIRI OZUZO ANWỤ NA-AMỊRỊ MMIRI N’AHỊHỊA ANWỤ NA-AMỊRỊ MMIRI
↓ MMIRI NA-ASỌBA N’OSIMIRI ↑
MMIRI DỊ N’IME ALA ↓
↓ → →
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Ka Ịlaịja na-ekpe ekpere, onye na-ejere ya ozi lere anya “ná mpaghara oké osimiri”