Gịnị Ka Alaeze Chineke Bụ?
Gịnị Ka Alaeze Chineke Bụ?
GỊNỊ bụ isiokwu ozi ọma Jizọs kwusara? Jizọs kwuru na ọ bụ Alaeze Chineke. (Luk 4:43) Mgbe ndị mmadụ na-ege ya ntị, ha na-anụ ka ọ na-akpọ Alaeze ahụ aha ugboro ugboro. Ọ̀ gbagwojuru ha anya? Hà jụrụ ya ihe Alaeze ahụ bụ? Ee e. Ajụjụ dị otú ahụ adịghị na Matiu, Mak, Luk, ma ọ bụ na Jọn. N’ihi ya, ndị ahụ hà maara ihe Alaeze Chineke bụ?
Eziokwu bụ na Akwụkwọ Nsọ ochie ahụ ndị Juu na-akwanyere ùgwù maka na ọ dị nsọ kọwara Alaeze ahụ, kwuokwa hoo haa ihe ọ bụ na ihe ọ ga-eme. Taa, ọ bụkwa otú ahụ ka anyị nwere ike isi mụtakwuo banyere Alaeze ahụ, ya bụ, ịga na Baịbụl. Ka anyị tụlee ihe asaa dị oké mkpa Baịbụl na-akụziri anyị banyere Alaeze ahụ. Ndị Juu ndị nọ ndụ n’oge Jizọs nọ n’ụwa ma ọ bụ ndị nke nọrọ ndụ tupu ya abịa maara banyere ihe atọ anyị ga-ebu ụzọ tụlee. Ọ bụ Kraịst ma ọ bụ ndịozi ya ndị biri ndụ na narị afọ mbụ mere ka a mara ihe atọ ndị nke ọzọ. A matara nke ikpeazụ n’oge anyị a.
1. Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị, nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. Amụma mbụ e buru na Baịbụl mere ka a mara na Chineke ga-ezite onye ga-anapụta ụmụ mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Onye ahụ a kpọrọ “mkpụrụ” ga-eme ka nsogbu nnupụisi Adam, Iv, na Setan kpatara ghara ịdịkwa. (Jenesis 3:15) Ka ọtụtụ afọ gachara, a gwara Eze Devid bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi ihe na-akpali mmasị banyere “mkpụrụ” a, ma ọ bụ Mesaya. Ọ ga-abụ eze ga-achị otu Alaeze. Ọchịchị a ga-adị iche n’ọchịchị ọzọ niile. Ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.—2 Samuel 7:12-14.
2. Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile. E mere ka Daniel onye amụma hụ ọchịchị dị iche iche n’ọhụụ, bụ́ ndị ga na-achị malite n’oge ahụ ruo n’oge anyị a. Leekwa ihe magburu onwe ya mechara mee n’ọhụụ ahụ: “N’ụbọchị ndị eze ahụ [ya bụ, ndị ikpeazụ ga-achị n’ụwa], Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” Ya mere, a ga-ebibi alaeze, ma ọ bụ ọchịchị, niile na-achị n’ụwa a, kwụsịkwa ma agha ha na-alụ, ma mmegbu ha na-emegbu ndị mmadụ, ma nrụrụ aka ha, ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka amụma Daniel gosiri, Alaeze Chineke ga-achị ụwa dum n’oge na-adịghị anya. (Daniel 2:44, 45) Ọ bụghị naanị na alaeze a ga-achị achị, kama ọ bụ naanị ya ga na-achị ụwa. *
3. Alaeze Chineke ga-eme ka agha, ọrịa, ụnwụ, ọbụna ọnwụ, ghara ịdịkwa. Amụma magburu onwe ha ndị dị na Baịbụl na-eme ka a mara ihe Alaeze Chineke ga-eme n’ụwa a. Ọchịchị ahụ ga-eme ihe ọchịchị ụmụ mmadụ na-emetụbeghị ma ọ bụ ihe ha na-enweghị ike ime. Chegodị nke a n’echiche—a ga-ebibi ngwá agha niile ka ha ghara ịdịkwa ruo mgbe ebighị ebi! “Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) A gakwaghị enwe ndị dọkịta, ụlọ ọgwụ, ma ọ bụ ụdị ọrịa ọ bụla. “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’” (Aịzaya 33:24) Ụnwụ, ụkọ nri, erighị nri na-edozi ahụ́, ma ọ bụ ịkwụ agụụ, agaghị adịkwa. “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa.” (Abụ Ọma 72:16) Olili ozu, ịmụrụ onye nwụrụ anwụ anya abalị, ebe a na-eli ozu, ebe a na-edebe ozu, agaghị adịkwa, ma ọ bụ nhụsianya ha na-akpata. A ga-emecha merie onye iro anyị ike na-adịghị agwụ agwụ, bụ́ ọnwụ. Chineke “ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.”—Aịzaya 25:8.
4. Ọ bụ Chineke họpụtara Onye ọchịchị nke Alaeze ya. Ọ bụghị Mesaya ahụ họpụtara onwe ya, ọ bụghịkwa ụmụ mmadụ na-ezughị okè họpụtara ya. Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke ji aka ya họpụta ya. Utu aha ya bụ́ Mesaya na Kraịst na-egosi na nke a bụ eziokwu. Okwu abụọ a pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” Ya mere, ọ bụ Jehova tere Eze a mmanụ, ma ọ bụ họpụta ya ka ọ rụọ ọrụ pụrụ iche. Chineke kwuru banyere ya, sị: “Lee! Ohu m, nke m jidesiri aka ike! Onye m họọrọ, bụ́ onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m! Etinyewo m mmụọ m n’ime ya. Ọ bụ ikpe ziri ezi ka ọ ga-ewetara mba niile.” (Aịzaya 42:1; Matiu 12:17, 18) Ò nwere onye ka Onye kere anyị mara ụdị Onye ọchịchị kwesịrị ịchị anyị?
5. Onye ọchịchị nke Alaeze Chineke egosiwo ụmụ mmadụ niile na ya ruru eru ịchị. Ọ bụ Jizọs onye Nazaret bụ Mesaya ahụ e buru n’amụma. A mụrụ ya n’ezinụlọ nke Chineke kwuru na a ga-amụ Mesaya. (Jenesis 22:18; 1 Ihe E Mere 17:11; Matiu 1:1) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mezuru amụma ndị e dere banyere Mesaya ọtụtụ narị afọ tupu ya abịa n’ụwa. E sikwa n’eluigwe kwuo na ọ bụ Mesaya. Olee otú nke a si mee? Chineke si n’eluigwe kwuo na ọ bụ Ọkpara ya. Ndị mmụọ ozi kwuru na Jizọs bụ Mesaya ahụ e buru n’amụma. Ọtụtụ mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube, ọ rụrụ ha n’ihu ọtụtụ narị mmadụ ma ọ bụ ọbụna n’ihu ọtụtụ puku mmadụ. O doro anya na ọ bụ Chineke nyere ya ike o ji rụọ ha. * Ọtụtụ mgbe, Jizọs gosiri ụdị Onye ọchịchị ọ ga-abụ. Ọ bụghị naanị na o nwere ike ọ ga-eji nyere ndị mmadụ aka, kamakwa, ọ chọrọ inyere ha aka. (Matiu 8:1-3) Ọ chọghị ọdịmma onwe ya naanị. O nwere ọmịiko, nwee obi ike, dịkwa umeala n’obi. E dere otú o si bie ndụ mgbe ọ nọ n’ụwa na Baịbụl ka mmadụ niile wee na-agụ ya.
6. Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-achị n’Alaeze Chineke. Jizọs kwuru na ya na ndị ọzọ, tinyere ndịozi ya, ga-achị n’eluigwe. Ọ kpọrọ ha “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) E mechara gwa Jọn onyeozi na ìgwè atụrụ nta a ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Ha ga-arụ ọrụ magburu onwe ya n’eluigwe, ya bụ, ha na Kraịst ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà.—Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3.
7. Alaeze Chineke, nke na-achị ugbu a n’eluigwe, adịla njikere ịmalite ịchị ụwa dum. Ihe nke asaa a na-akụziri anyị banyere Alaeze ahụ bụ otu n’ime ihe ndị kacha akpali mmasị anyị nwere ike ịmụta. E nwere ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru ndị na-egosi na e nyela Jizọs ikike ịbụ Eze n’eluigwe. Ọ na-achị achị n’ebe ahụ ugbu a, n’oge anyị a. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-amalite ịchị ụwa dum, mezuokwa amụma ndị ahụ magburu onwe ha anyị kwuru okwu ha na mbụ. Ma, olee otú anyị ga-esi jide n’aka na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a? Oleekwa mgbe ọ ga-amalite ịchị ụwa?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Amụma ndị dị ka nke a na-egosi na Alaeze Chineke abụghị ihe dị n’ime obi anyị, dị ka a kụziiri ọtụtụ ndị. Lee isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ,” nke dị na peeji nke iri na atọ.
^ par. 8 Dị ka ihe atụ, gụọ Matiu 3:17; Luk 2:10-14; Jọn 6:5-14.