AKỤKỌ NDỤ
Icheta Ịhụnanya Mbụ M Na-enyere M Aka Ịna-atachi Obi
N’IHE dị ka n’ọnwa isii n’afọ 1970, edina m n’otu ụlọ ọgwụ gọọmenti, n’ebe a na-akpọ Finiksvil, Pensụlvenịa, dị n’Amerịka. Ná nkeji iri atọ ọ bụla, otu nwoke bụ́ nọọsụ na-abịa ele otú obi m si akụ. N’oge ahụ, abụ m onye agha na-arịa ajọ ọrịa na-efe efe. Adị m afọ iri abụọ. Nọọsụ ahụ ji obere ihe tọọ m. Ma ọ chị obi n’aka. M jụrụ ya, sị: “Ọ̀ kwa mmadụ anwụtụbeghị n’ihu gị?” Ụjọ bịara ya, ya asị m, “Mba.”
N’oge ahụ, ike ụwa gwụrụ m. Ma, olee otú m si hụzie onwe m n’ụlọ ọgwụ? Ka m kọtụrụ gị gbasara ndụ m.
OTÚ M SI MATA OTÚ AGHA NA-ADỊ
Ọrịa bịara m mgbe m na-arụ ọrụ n’ebe a na-anọ awa ndị mmadụ ahụ́ n’oge a na-alụ agha Vietnam. Obi na-adị m ụtọ inyere ndị ọrịa ma ọ bụ ndị e merụrụ ahụ́ aka. Ekpebiri m na m ga-abụ dọkịta na-awa ahụ́. M gara Vietnam n’ọnwa Julaị afọ 1969. Ebe ahụ na-ekpo ezigbo ọkụ. Oge ha dịkwa iche. A hapụrụ m ka m jiri otu izu mee ka obodo ahụ mara m ahụ́. Ọ bụ ihe a na-emere ndị niile bịara ọhụrụ.
M mechara gaa n’ebe e nyere m ọrụ, ya bụ, n’otu ụlọ ọgwụ a na-anọ awa ndị mmadụ ahụ́, n’ebe a na-akpọ Mekọng Delta, nke dị n’obodo Dọng Tam. Ọ dịghị anya, e jiri ọtụtụ ụgbọelu bute ndị agha e gburu egbu na ndị e merụrụ ahụ́. Ahụrụ m obodo m n’anya, ịrụ ọrụ na-atọkwa m ụtọ. N’ihi ya, m chọsiri ike iso nye aka ozugbo. A kwadebere ndị ahụ e merụrụ ahụ́ ma buga ha ozugbo n’obere ebe a ga-anọ waa ha ahụ́. Ndị dọkịta abụọ na ndị nọọsụ abụọ na-anọ ná ntakịrị ebe ahụ na-anwa ike ha ịzọ ndụ ndị agha ahụ. Achọpụtara m na e nwere nnukwu akpa ojii ndị a na-ebupụtaghị n’ụgbọelu ndị ahụ. A gwara m na ihe dị na ha bụ akụkụ ahụ́ ndị agha a gbajasịrị n’ọgbọ agha. Esi m otú ahụ mata otú agha na-adị.
M MALITERE ỊCHỌ CHINEKE
Mgbe m bụ nwa okorobịa, e nwere eziokwu Baịbụl ndị m mụtara n’aka Ndịàmà Jehova. Ha na-abịa amụrụ mama m ihe. Ma, o nweghị ọganihu ọ bụla, nke o ji eme baptizim. N’oge ahụ, ọ na-atọ m ụtọ ịnọ mgbe ha na-amụrụ mama m
ihe. E nwere otu ụbọchị mụ na di mama m so na-agafe otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, mụ ajụọ ya, sị, “Olee ebe dị ihe a?” Ya asị m, “Anwala anwa gaa ndị a nso.” Ahụrụ m di mama m n’anya ma tụkwasị ya obi. N’ihi ya, m mere ihe ahụ ọ gwara m. Malite mgbe ahụ, o nweghịzi ihe jikọrọ mụ na Ndịàmà Jehova.Mgbe m si agha Vietnam lọta, aghọtara m na m kwesịrị ịmata onye Chineke bụ. Ihe ndị mere n’agha ahụ mere ka obi gbawaa m. O yiri ka o nweghị onye ghọtara ihe na-eme na Vietnam. Echetara m oge ndị e mere ngagharị iwe, ndị mmadụ ana-akpọ ndị agha Amerịka ‘ndị na-egbu ụmụaka,’ n’ihi na ha nụrụ na a na-egbu ọtụtụ ụmụaka na-enweghị ihe ha mere n’agha ahụ.
Amalitere m ịga chọọchị dị iche iche n’ihi na m chọrọ ịmata Chineke. M hụrụ Chineke n’anya kemgbe, ma ihe m hụrụ na chọọchị gwụrụ m ike. Emechara m gaa n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị na Flọrịda. Ọ bụ n’ụbọchị Sọnde n’ọnwa Febụwarị afọ 1971.
M batara mgbe ọ fọrọ obere ka e kwuchaa okwu ihu ọha. M nọzi a mụọ Ụlọ Nche. Echetaghị m isiokwu a mụrụ, ma m ka na-echeta otú ụmụaka si na-asapeta ebe a ga-agụ na Baịbụl ha. Ọ tọgburu m atọgbu. M gere ntị nke ọma, leruokwa anya n’ihe a na-eme. Mgbe m chọrọ ịla, otu nwanna nwoke dị ihe dị ka afọ iri asatọ bịakwutere m. Aha ya bụ Jim Gardner. O nyere m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi ma sị m, “Biko, were akwụkwọ a.” Mụ na ya kwuziri na ọ ga-abịa n’ụtụtụ Tọzdee ka anyị malite ịmụ ihe.
M gara ọrụ n’abalị Sọnde ahụ. M na-arụ n’ebe a na-edewe ndị ihe gbata gbata mere n’otu ụlọ ọgwụ na-abụghị nke gọọmenti na Flọrịda. M na-amalite ọrụ n’elekere iri na otu nke abalị, mechie n’elekere asaa nke ụtụtụ. M gụrụ akwụkwọ ahụ n’ihi na enweghị m ọtụtụ ọrụ n’abalị ahụ. Otu nọọsụ ka m n’ọkwá bịara napụ m akwụkwọ ahụ, lee azụ ya anya, sị m, “Ị̀ chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova?” M naara ya akwụkwọ ahụ, sị ya, “Naanị ọkara ya ka m gụrụla, ma o yiri ka m ga-abụ.” Ọ hapụrụ m pụwa. Agụchara m ya n’abalị ahụ.
Ihe mbụ m jụrụ Nwanna Gardner mgbe anyị chọrọ ịmalite ịmụ ihe bụ, “Ehee, gịnịdị ka anyị ga-amụ?” Ọ sịrị, “Akwụkwọ ahụ m nyere gị.” Mụ asị ya, “Agụchaala m ya.” Nwanna Gardner weturu obi sị m, “Ka anyị mụgodị isi nke mbụ.” Ọ tụrụ m n’anya na e nwere ọtụtụ ihe m na-aghọtaghị mgbe m gụrụ ya. Ọ gwara m ka m jiri Baịbụl King James m gụọ ọtụtụ amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m mechara mụwa banyere ezi Chineke bụ́ Jehova. Ihe m na-akpọ Nwanna Gardner bụ Jim n’ihi na anyị dị n’ezigbo mma. N’ụtụtụ ahụ, anyị mụrụ isi nke mbụ ruo nke atọ n’akwụkwọ ahụ. Ụtụtụ Tọzdee
ọ bụla, anyị na-amụ isiokwu atọ. Ihe anyị na-amụ tọrọ m ezigbo ụtọ. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na nwanna ahụ mụụrụ m ihe bụ onye e tere mmanụ, marakwa Nwanna Charles T. Russell.Ka izu ole na ole gachara, e mere m onye nkwusa. Jim nyeere m aka ma n’ozi ụlọ n’ụlọ ma n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ siiri m ike. (Ọrụ 20:20) Ka mụ na ya na-eso aga ozi ọma, ikwusa ozi ọma malitere ịtọ m ụtọ. M ka weere ikwusa ozi ọma ka ihe ùgwù kachanụ m nwere. Obi dị m ezigbo ụtọ na mụ na Chineke na-arụkọ ọrụ.—1 Kọr. 3:9.
ONYE MBỤ M HỤRỤ N’ANYA BỤ JEHOVA
Ka m kọziere gị banyere ihe dị m ezigbo mkpa, ya bụ, ịhụnanya m nwere na mbụ n’ebe Jehova nọ. (Mkpu. 2:4) Ịhụnanya ahụ nyeere m aka idi ihe ndị m na-echeta mere n’oge agha nakwa ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ.—Aịza. 65:17.
Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ nyeere m aka idi ihe ndị m na-echeta mere n’oge agha nakwa ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ
M na-echeta otu ụbọchị pụrụ iche n’afọ 1971. Ọ dịbeghị anya mama m na di ya chụpụrụ m n’ebe ha nyere m ka m biri. Di mama m achọghị ka Onyeàmà Jehova biri n’ụlọ ya. Ego m nwere mgbe ahụ enweghị ihe ọ bụ. Ụlọ ọgwụ ebe ahụ m na-arụ na-akwụ m ụgwọ izu abụọ ọ bụla. Eji m ego a kwụrụ m zụọ uwe m ga-eyi na-aga ozi ọma, ka m dịtụkwanụ ka onye na-efe Jehova. Ego m dewere dị n’otu ụlọ akụ̀ dị na Michigan, bụ́ ebe m nọ too. N’ihi ya, m rahụrụ n’ụgbọala m ụbọchị ole na ole. Ọ na-abụ m chọọ ịkpụ afụ ọnụ ma ọ bụ ịsa ahụ́, mụ agaa n’ebe a na-asa ahụ́ dị n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala.
Otu ụbọchị n’oge ahụ m na-ehi n’ụgbọala m, m gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze awa ole na ole tupu a malite nzukọ ozi ubi. M ka rụchara ọrụ m na-arụ n’ụlọ ọgwụ. Ka m nọ ọdụ n’azụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe mmadụ na-agaghị ahụ m, ihe ndị
mere n’agha Vietnam bịara ju m isi, ma ísì ahụ́ mmadụ ọkụ na-ere ma ọbara ndị mmadụ m hụrụ. Ọ dị m ka m̀ na-anụ olu ụmụ okorobịa, na-ahụkwa ha ka onye nke ọ bụla na-asị m, “M̀ ga-adị ndụ? M̀ ga-adị ndụ?” Ama m na ha ga-anwụ. Ma, m gbalịrị ịkasi ha obi otú m nwere ike, jidekwa onwe m ka ihu m ghara ime ka ha mata na ha ga-anwụ. Ka m nọ ebe ahụ, o nweghị ụdị ihe na-abataghị m n’obi.M na-agbalịsi ike ka m ghara ịkwụsị ịhụ Jehova n’anya otú m hụrụ ya na mbụ, karịchaa, mgbe nsogbu na ọnwụnwa bịaara m
Anya mmiri juru m anya, mụ ekpewe ekpere. (Ọma 56:8) M malitere ichesi echiche ike banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na Jehova Chineke ga-eji mbilite n’ọnwụ mee ka ndị ahụ niile e gburu n’agha dị ndụ ọzọ, meekwa ka mụ na ndị ọzọ chefuo ihe ọjọọ ahụ niile. Chineke ga-akpọlite ụmụ okorobịa ndị ahụ n’ọnwụ, a kụziere ha eziokwu banyere ya. (Ọrụ 24:15) Eji m obi m niile kelee Jehova, sikwa n’ala ala obi m hụkwuo ya n’anya. Anaghị m echefu ụbọchị ahụ echefu. Kemgbe ahụ, m na-agbalịsi ike ka m ghara ịkwụsị ịhụ Jehova n’anya otú m hụrụ ya na mbụ, karịchaa, mgbe nsogbu na ọnwụnwa bịaara m.
JEHOVA NA-ELEKỌTA M NKE ỌMA
N’oge agha, o nweghị ụdị arụrụala ndị mmadụ na-anaghị arụ. Esokwa m rụọ ụfọdụ arụrụala. Ma, ihe nyeere m aka bụ ịtụgharị uche n’ebe abụọ na-amasị m na Baịbụl. Nke mbụ bụ Mkpughe 12:10, 11. Ebe ahụ kwuru na ọ bụghị naanị ozi ọma anyị na-ezi ka e ji emeri Ekwensu, kama e jikwa ọbara Nwa Atụrụ ahụ emeri ya. Nke abụọ bụ Ndị Galeshia 2:20. Amaokwu ahụ mere ka m ghọta na Kraịst Jizọs nwụrụ “maka m.” Jehova agbagharala m ihe niile m mere n’ihi àjà Jizọs ji ọbara ya chụọ. Ihe a m ghọtara emeela ka akọnuche m ghara ịna-ama m ikpe, meekwa ka m na-eme ihe ọ bụla m nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka ịmata eziokwu banyere Jehova Chineke onye obi ebere.—Hib. 9:14.
M cheta ihe ndị mere ná ndụ m, m na-aghọta na Jehova na-elekọta m mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ụbọchị Jim chọpụtara na ọ bụ n’ụgbọala m ka m na-ehi, ọ kpọgara m na nke otu nwanna nwaanyị nwere ụlọ ebe ndị mmadụ na-ebi. Ama m na Jehova ji Jim na nwanna nwaanyị ahụ nye m ebe dị mma m ga-ebi. Jehova dị nnọọ obiọma. Ọ na-elekọta ndị ji obi ha niile efe ya.
ỊNỤ ỌKỤ N’OBI MA DỊ AKỌ
N’ọnwa Mee afọ 1971, m gara Michigan ịrụ ọrụ. Tupu mụ ahapụ ọgbakọ ahụ dị na Flọrịda, m kpojuru akwụkwọ anyị na buutu ụgbọala m, tinye isi n’ụzọ awara awara gawara n’ebe ugwu. Akwụkwọ ahụ gwụrụ mgbe m na-agabeghịdị ọkara ebe m na-aga. M ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’ụdị ebe ọ bụla. M kwụsịtụrụ n’ụlọ mkpọrọ zie ndị mmadụ ozi ọma. M nyedịrị ụfọdụ ndị traktị n’ebe ndị na-aga ihe na-akwụsịtụ anyụ mamịrị. Ruo taa, m ka na-eche ma è nwere nke pulitere n’ime mkpụrụ ndị ahụ m kụrụ.—1 Kọr. 3:6, 7.
Mgbe m mụtara eziokwu, otú m si edowe ọnụ ezi ndị mmadụ ozi ọma adịghị mma, karịchaa ndị ezinụlọ anyị. N’ihi otú m si jiri obi m niile hụ Jehova n’anya kemgbe m mụtara eziokwu, m ji obi ike na-ekwusa ozi ọma n’ezoghị ọnụ. M hụrụ ụmụnne m abụọ, bụ́ John na Ron, n’anya nke ukwuu. Eji m oké ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ha ozi ọma. M mechara rịọ ha mgbaghara maka otú m si dowe ọnụ na-ezi ha ozi ọma. Ma, m ka na-ekpe ekpere ka ha mụta eziokwu Baịbụl. Kemgbe ahụ, Jehova na-akụziri m ihe. Amụtakwuola m otú m ga-esi jiri akọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, na-akụzikwara ha ihe.—Kọl. 4:6.
NDỊ ỌZỌ M HỤRỤ N’ANYA
Ọ bụ eziokwu na m na-echeta ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ, anaghị m echefu ndị ọzọ m hụrụ n’anya. Onye mbụ n’ime ha bụ ezigbo nwunye m, bụ́ Susan. Ama m na m chọrọ ịlụ onye ga-enyere m aka n’ọrụ gbasara Alaeze Chineke. Susan ji obi ya niile hụ Jehova n’anya. M chetara ụbọchị m gara n’ụlọ ha mgbe anyị na-akpa. Susan nọ n’ihu ụlọ ha dị na Kranstịn, na steeti a na-akpọ Rod Aịland, na-agụ Ụlọ Nche. O jikwa Baịbụl ya. Ihe masịrị m bụ na ihe ọ na-agụ bụ isiokwu ndị ọzọ dị n’Ụlọ Nche ahụ, na-agụkwa amaokwu Baịbụl ndị e dere na ha. M gwara onwe m, sị, ‘Nwanna nwaanyị a hụrụ Jehova n’anya.’ Anyị lụrụ n’ọnwa Disemba afọ 1971. Obi dị m ụtọ na ọ na-akwado m kemgbe ahụ. Ihe na-eme m ezigbo obi ụtọ bụ na ọ bụ eziokwu na ọ hụrụ m n’anya, nke ọ hụrụ Jehova ka.
Mụ na Susan mụtara ụmụ nwoke abụọ. Aha ha bụ Jesse na Paul. Ka ha na-eto, Jehova nọnyeere ha. (1 Sam. 3:19) Ebe ọ bụ na ha jisiri eziokwu anyị kụziiri ha ike, anyị ji ha eme ọnụ. Ha ka na-efe Jehova n’ihi na ha na-echeta ịhụnanya mbụ ha nwere n’ebe ọ nọ. Onye nke ọ bụla n’ime ha ejeela ozi oge niile ihe karịrị iri afọ abụọ. Ejikwa m ndị nwunye ụmụ m eme ọnụ. Aha ha bụ Stephanie na Racquel. M weere ha ka ụmụ m. Ndị ụmụ m lụrụ bụ ụmụ nwaanyị ji obi ha niile hụ Jehova Chineke n’anya.—Efe. 6:6.
Mgbe e mechara m baptizim, m jere ozi afọ iri na isii na Rod Aịland. M metara ọtụtụ ndị enyi n’ebe ahụ. Obi na-adị m ụtọ ma m cheta ọtụtụ ndị okenye ma nke a na-akọ mụ na ha jekọrọ ozi. Obi dịkwa m ụtọ maka imirikitiimi ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ndị m mụtara ezigbo ihe n’aka ha. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ bụ ndị na-ekweghị ka ịhụnanya mbụ ha nwere n’ebe Jehova nọ nyụọ ka ọkụ. N’afọ 1987, anyị kwagara n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Nọt Karolaịna. Anyị nwetakwara ọtụtụ ndị enyi n’ebe ahụ. *
N’ọnwa Ọgọst afọ 2002, a kpọrọ mụ na Susan ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị na Patasịn, n’Amerịka. M rụrụ ọrụ na Ngalaba Ije Ozi, Susan arụọ n’ebe a na-asa ákwà. Ịrụ ọrụ n’ebe ahụ tọgburu ya atọgbu. N’ọnwa Ọgọst afọ 2005, a họpụtara m ka m soro n’Òtù Na-achị Isi. Ọ dị m ka mụ erughị eru ịrụ ọrụ a. Ihe ùgwù a riri nwunye m ọnụ, ma ọrụ dị na ya ma ebe ndị anyị ga na-aga. Ụjọ ụgbọelu na-atụ Susan, ma anyị na-aba ya ugboro ugboro. Susan kwuru na ihe ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ di ha so n’Òtù Na-achị Isi gwara ya enyerela ya aka ikpebisi ike iji obi ya niile na-akwado m n’ọrụ a. Ọ na-eme otú ahụ n’eziokwu, m hụkwara ya n’anya maka ya.
N’ọfis m, e nwere ọtụtụ foto m na-anaghị eji egwu egwu. Ha na-echetara m ndụ bara uru m birila. Jehova emeerela m ọtụtụ ihe ọma maka na m ji obi m niile na-echeta ịhụnanya mbụ m nwere n’ebe ọ nọ.
^ para. 31 A kọrọ ọtụtụ ihe gbasara ozi oge niile Nwanna Morris jere n’Ụlọ Nche Mach 15, 2006, peeji nke 26.