Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha —Na Maịkronishia
OTU nwa agbọghọ aha ya bụ Katherine toro n’Amerịka. E mere ya baptizim mgbe ọ dị afọ iri na isii, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. O ji obi ya niile na-eje ozi ọma. Ma, ndị mmadụ anaghị egecha ntị n’ebe ọ na-ekwusa ozi ọma. O kwuru, sị: “Agụrụ m gbasara ụfọdụ ndị kpere ekpere ka Chineke zitere ha onye ga-enyere ha aka ka ha mata ya. Ọtụtụ mgbe, ọ gụrụ m agụụ ịhụ ụdị onye ahụ, ma o nweghị nke m hụrụ.”
Mgbe Katherine kwusara ozi ọma ọtụtụ afọ n’ebe ahụ, ọ malitere iche otú ọ ga-esi kwaga n’ebe ndị mmadụ ga-enwe mmasị n’ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ọ nọ na-eche ma ọ̀ ga-emeli ya. Kemgbe a mụrụ ya, ọ bụ naanị otu ugboro ka ọ hapụrụ ụlọ ha gaa ebe ọzọ. N’oge ahụ, ọ nọrọ naanị izu abụọ n’ebe ọ gara. Agụụ ịhụ ndị ezinụlọ ya nọkwa na-agụ ya kwa ụbọchị. Ma, o kweghị ka ọ kụdaa ya obi n’ihi na ihe ka ya mkpa bụ obi ụtọ ọ ga-enweta ma o nyere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova. Mgbe o chechara ebe ndị o nwere ike ịkwaga, o degaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Gụwam akwụkwọ ozi. Ha zara ya ma gwa ya ihe ọ chọrọ ịmata. N’ọnwa asaa n’afọ 2007, ya bụ, mgbe ọ dị afọ iri abụọ na isii, ọ kwagara n’otu obodo a na-akpọ Saịpan, nke bụ́ agwaetiti dị n’Oké Osimiri Pasifik. Isi n’ụlọ ha gaa ebe ahụ dị ihe dị ka puku kilomita iri. Gịnị mere mgbe o ruru ebe ahụ?
OTÚ JEHOVA SI ZAA KATHERINE NA DORIS EKPERE HA
Obere oge Katherine gafere n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwaanyị dị ihe dị ka iri afọ anọ na ise aha ya bụ Doris. O kwere ka Katherine mụwara ya Baịbụl. Mgbe ha mụruru n’isi nke atọ n’akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi, Katherine malitere ichegbu onwe ya. O kwuru, sị: “Doris na-aghọta ihe a na-akụziri ya. Achọghị m ime ka mmasị o nwere nyụọ ka ọkụ. Tupu mụ ahụ Doris, o nwetụbeghị onye m na-amụrụ Baịbụl kwa izu. N’ihi ya, m chere na m kwesịrị ịchọta nwanna nwaanyị bụ́ aka ochie ga na-amụrụ ya ihe, ikekwe onye ya na ya bụ ọgbọ.” Katherine kpere ekpere ka Jehova nyere ya aka ka ọ chọta nwanna nwaanyị ọzọ ga na-amụrụ Doris Baịbụl. O kpebiri na ya ga-agwa Doris na ọ bụzi onye ọzọ ga na-amụrụ ya ihe.
Katherine kwuru, sị: “Tupu mụ agwawa Doris ihe m chọrọ ime, ọ gwara m na e nwere nsogbu ya chọrọ ịkọrọ m. Mgbe ọ kọchaara m ya, m gwara ya otú Jehova si nyere m aka mgbe m nwere ụdị nsogbu ahụ, ya ekelee m.” Doris gwaziri Katherine, sị: “Jehova ji gị na-enyere m aka. Tupu gị abịa n’ụlọ m ụbọchị mbụ ahụ, agụọla m Baịbụl m ọtụtụ awa. Anọ m na-ebe ákwá, na-arịọ Chineke ka o zitere m onye ga-enyere m aka ka m ghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Ihe m nụziri bụ aka ị kụrụ n’ọnụ ụzọ m. Jehova azala ekpere m.” Anya mmiri juru Katherine n’anya ka ọ na-akọ ihe mere n’ụbọchị ahụ. O kwuru, sị: “Ihe ahụ Doris kọrọ bụ otú Jehova si zaa ekpere m. Jehova mere ka m ghọta na m ga-amụliri ya Baịbụl.”
E mere Doris baptizim n’afọ 2010. Ọ na-amụziri ọtụtụ ndị Baịbụl. Katherine kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na ihe ahụ na-agụ m agụụ kemgbe emeela, ya bụ, inyere mmadụ aka ka ọ bịa fewe Jehova.” Katherine bụzi ọsụ ụzọ pụrụ iche. O ji obi ụtọ na-eje ozi n’otu obodo a na-akpọ Kọsraị, nke bụ́ agwaetiti dị n’Oké Osimiri Pasifik.
OTÚ E NWERE IKE ISI MERIE NSOGBU ATỌ NDỊ KWAGARA MBA ỌZỌ NA-ENWE
Ihe karịrị otu narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị esila ná mba ndị ọzọ kwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na Maịkronishia. Ha dị n’agbata afọ iri na itoolu na iri asaa na itoolu. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Erica dị afọ iri na itoolu mgbe ọ kwagara n’obodo Gụwam n’afọ 2006. O kwuru, sị: “Ịsụ ụzọ n’ebe ndị mmadụ chọrọ ịmụta eziokwu dị na Baịbụl na-atọ ụtọ. Obi dị m ụtọ na Jehova nyeere m aka ka m jewere ya ụdị ozi a. Ọ bụ ihe kacha mma mmadụ nwere ike iji ndụ ya mee.” Ihe a o kwuru bụ otú obi dị ndị ọzọ na-eje ozi n’ebe ahụ. Erica ji obi ụtọ na-eje ozi ugbu a n’otu obodo a na-akpọ Ibaị, nke dị na Mashal Aịlandz. E nwere nsogbu ụfọdụ ndị na-eje ozi ná mba ọzọ na-enwe. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha ma hụ otú ndị kwagara na Maịkronishia si merie ha.
Otú ihe dị n’ebe ahụ. E nwere otu nwanna nwoke dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Simon. Mgbe ọ kwagara n’agwaetiti a na-akpọ Palawụ n’afọ 2007, ọ chọpụtara na ego a na-akwụ ya ma ọ rụchaa ọrụ enweghị ebe o ruru ma e jiri ya tụnyere ego a na-akwụ ya n’Ingland o si bịa. O kwuru, sị: “Amụtara m ịna-azụ naanị ihe ndị dị m mkpa. M gaa ịzụ ihe m ga-eji esi nri, m na-asa anya ná mmiri họta nke dị mma. M na-ekwe ọnụ n’ebe dị iche iche ka m nwee ike inweta ya ọnụ ala. Ọ bụrụ na ihe m emebie, m na-aga zụrụ nke ochie m ga-eji arụzi ya, chọtakwa onye ga-enyere m aka rụzie ya.” Olee uru Simon ritere n’ụdị ndụ a ọ na-ebi? O kwuru, sị: “O mere ka m mata ihe ndị dị mkpa ná ndụ nakwa otú m ga-esi jiri obere ihe m nwere na-egbo mkpa m. Ihe ndị mere ugboro ugboro emeela ka m ghọta na Jehova na-elekọta m. Kemgbe afọ asaa m jewere ozi ebe a, o nweghị mgbe m na-enweghị ihe m ga-eri na ebe m ga-arahụ.” O doro anya na Jehova na-akwado ndị na-anaghị ebi ndụ okomoko n’ihi na ha chọrọ ibu ụzọ na-achọ Alaeze ya.—Mat. 6:32, 33.
Ọ na-agụ ha agụụ ịhụ ndị ezinụlọ ha. Erica kwuru, sị: “Mụ na ndị ezinụlọ m dị n’ezigbo mma. N’ihi ya, m ma na ịhụ ha anya ga na-agụsi m agụụ ike. M chere na ọ ga-eme ka obi m ghara ịdị n’ozi ọma m gara ikwusa.” Gịnị ka o mere? O kwuru, sị: “Tupu mụ agawa, m gụrụ isiokwu Ụlọ Nche ndị kwuru gbasara ndị nwere ụdị nsogbu ahụ. O nyeere m aka ka m jikere ejikere. N’otu isiokwu m gụrụ, otu nwanna nwaanyị mesiri nwa ya nwaanyị obi ike na Jehova ga-elekọta ya. Ọ sịrị ya: ‘Jehova ga-elekọta gị karịa otú mụnwa ga-esi elekọta gị.’ Ihe a ọ gwara nwa ya mere ka obi sie m ike.” E nwere nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Hannah. Ya na di ya bụ́ Patrick na-eje ozi n’obodo a na-akpọ Majuro, nke dị na Mashal Aịlandz. Ihe nyeere Hannah aka ka agụụ ịla ụlọ ghara ịna-agụ ya mgbe niile bụ ịna-eche otú ọ ga-esi nyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha aka. O kwuru, sị: “Ana m ekele Jehova mgbe niile maka ụmụnna anyị ndị nọ n’ụwa niile n’ihi na ha bụkwa ndị ezinụlọ m. E wepụ aka ha na-enyere m, agaraghị m ejeli ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma.”
Imete ndị enyi. Simon kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ akwaga ná mba ọzọ, otú e si eme ihe n’ebe ahụ na-adị iche n’otú e si eme ya n’ebe o bibu. Mgbe ụfọdụ, anaghị m ama otú m ga-esi gwa ndị mmadụ okwu ka ha chịa ọchị ma ọ bụkwanụ ka ha ghọta ihe m na-ekwu.” Erica kwuru, sị: “Mgbe m gara ebe ahụ ọhụrụ, ọ dị m ka m̀ bụ onye a jụrụ ajụ. Ma, o mere ka m chebara ihe mere m ji kwaga ebe ahụ echiche. Ihe mere m ji gaa bụ ka m jekwuoro Jehova ozi, ọ bụghị maka ihe m ga-enweta.” O kwukwara, sị: “Ka oge na-aga, enwetara m ezigbo ndị enyi m na-anaghị eji egwu egwu.” Simon gbara mbọ mụta asụsụ Palọwan a na-asụ ebe ahụ, ya emezie ka ọ na-agwa ụmụnna bi ebe ahụ ihe dị ya n’obi. (2 Kọr. 6:13) Mbọ ọ gbara ka ọ mụta asụsụ ahụ mere ka ụmụnna ndị bi ebe ahụ hụ ya n’anya. Ọ bụrụ na ndị kwagara ná mba ọzọ na ụmụnna ndị bi n’ebe ahụ ha kwagara ana-arụkọ ọrụ, ọ ga-eme ka ha niile bụrụ ezigbo enyi n’ọgbakọ. Olee uru ndị ọzọ ndị ji obi ha wepụta onwe ha ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na-erite?
‘ỊGHỌRỌ MKPỤRỤ N’ỤBA’
Pọl onyeozi kwuru, sị: ‘Onye na-agha mkpụrụ n’ụba ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.’ (2 Kọr. 9:6) Ihe a o kwuru na-emezukwa n’isi ndị wepụtara onwe ha na-ejekwuru Jehova ozi. E nwere ike iji uru ndị ha na-erite na Maịkronishia tụnyere ịghọrọ mkpụrụ n’ụba. Olee ụfọdụ n’ime uru ndị ahụ?
Na Maịkronishia, ọtụtụ ndị ka na-ekweta ka a mụwara ha Baịbụl. Ị gaa ebe ahụ, ị ga-eji anya gị hụ otú ndị mụtara eziokwu dị na Baịbụl ma mee ihe ha mụtara si na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ebe ọzọ Patrick na Hannah kwusara ozi ọma bụ n’otu obere agwaetiti a na-akpọ Angaụ. Ọ bụ naanị narị mmadụ atọ na iri abụọ bi n’ebe ahụ. Mgbe ha kwusara ozi ọma ebe ahụ ọnwa abụọ, ha hụrụ otu nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ ya. O kwere ozugbo ka a mụwara ya Baịbụl, kweta na ihe a na-akụziri ya bụ eziokwu ma gbanwee otú o si ebi ndụ. Hannah kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla anyị mụchaara ya ihe ma gbara ígwè anyị na-ala, anyị na-ele ibe anyị anya ma kwuo, sị: ‘Jehova, i meela.’” Hannah kwukwara, sị: “Ama m na Jehova gaara esi n’ụzọ ọzọ mee ka nwaanyị a bịa fewe ya. Ma, ozi anyị na-eje n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa mere ka anyị hụ onye a yiri atụrụ ma nyere ya aka ka ọ mata Jehova. Ihe a so n’ihe ndị kacha eme anyị obi ụtọ kemgbe anyị jewere ozi.” Erica kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i nyere mmadụ aka ka o fewe Jehova, ị ga-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ.”
Ị̀ GA-EMELI YA?
N’ọtụtụ mba, a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ì nwere ike iso ná ndị na-akwaga n’ụdị ebe ahụ? Rịọ Jehova ka o mee ka ị chọsie ike ijekwuru ya ozi. Kọtara ya ndị okenye ọgbakọ unu, onye nlekọta sekit unu, ma ọ bụ ndị jetụrụla ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ị malite ịhazi otú ị ga-esi kwaga ebe ahụ, degara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ebe ahụ ị chọrọ ịga akwụkwọ ozi ma jụta ha ihe ndị ọzọ. * Ọtụtụ puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ewepụtala onwe ha ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi ma ndị lụrụ di na nwunye ma ndị na-alụbeghị. Gịnwa nwekwara ike ‘ịghọrọ mkpụrụ n’ụba’ ma nwee ọṅụ.’
^ para. 17 Gụọ isiokwu bụ́ “Ì Nwere Ike ‘Ịgafe na Masedonia’?” nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Nọvemba 2011.