Otú Ị ga-esi Mee Ka Ihe Gaara Gị Nke Ọma
Otú Ị ga-esi Mee Ka Ihe Gaara Gị Nke Ọma
“Ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, . . . ị ga-eji amamihe mee ihe.”—JỌSH. 1:8.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
Olee otú ihe si gaara Sọlọmọn nke ọma?
Olee otú ihe si gaara Pọl nke ọma n’eziokwu?
Gịnị ka ị ga-eme ka ihe wee gaara gị nke ọma ruo mgbe ebighị ebi?
1, 2. (a) Gịnị ka ọtụtụ ndị chere ihe ịgara mmadụ nke ọma pụtara? (b) Olee otú ị ga-esi amata ihe i chere ihe ịgara mmadụ nke ọma pụtara?
GỊNỊ ka ihe ịgara mmadụ nke ọma pụtara? Ị jụọ ndị mmadụ ajụjụ a, ihe ha ga-aza gị ga-adị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị chere na onye ihe na-agara nke ọma bụ onye bụ́ ọgaranya ma ọ bụ onye nwere ezigbo ọrụ ma ọ bụkwanụ onye gụrụ oké akwụkwọ. Ndị ọzọ na-ekwu na onye ihe na-agara nke ọma bụ onye ya na ndị ezinụlọ ya, ndị enyi ya, na ndị ọrụ ibe ya dị ná mma. Onye na-efe Chineke nwedịrị ike iche na onye ihe na-agara nke ọma bụ onye nwere ihe ùgwù n’ọgbakọ ma ọ bụ onye rụrụ ihe a hụrụ anya n’ozi ọma.
2 Gịnị ka gịnwa chere ihe ịgara mmadụ nke ọma pụtara? Otu ụzọ ị ga-esi amata ihe dị gị n’obi bụ ide aha ndị i chere na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ndị ihe ha na-amasị gị, na ndị ị na-akwanyere ùgwù. Olee ụdị ndị ha bụ? Hà bụ ọgaranya, ka hà bụ ndị a ma ama? Ihe ị zara ga-egosi ihe dị gị n’obi. Ihe ndị na-amasị gị na ihe ndị i kpebiri ime ga-egosi ihe ndị i ji kpọrọ ihe.—Luk 6:45.
3. (a) Gịnị ka Jọshụa kwesịrị ime ka ihe gaara ya nke ọma? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?
3 Ihe kacha anyị mkpa bụ ma Jehova ọ̀ na-ele anyị anya ka ndị ihe na-agara nke ọma, n’ihi na ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi ma anyị mee uche ya. Mgbe Jehova nyere Jọshụa ọrụ iduba ndị Izrel n’Ala Nkwa, ọ gwara ya ka ọ na-agụ Iwu Mozis “ehihie na abalị” nakwa ka o lezie anya mee ihe e dere na ya. Chineke kwere ya nkwa, sị: “Mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.” (Jọsh. 1:7, 8) Ị manụ na ihe mechara gaara Jọshụa nke ọma. Ànyịnwa kwanụ? Olee otú anyị nwere ike isi mata ma ànyị na-ele ihe ịga nke ọma anya otú Chineke si ele ya? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee ihe ụmụ nwoke abụọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mere.
IHE Ọ̀ GAARA SỌLỌMỌN NKE ỌMA?
4. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na ihe gaara Sọlọmọn nke ọma?
4 E nwere ọtụtụ ụzọ na-enweghị atụ ihe si gaara Sọlọmọn nke ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ tụrụ egwu Jehova, rubekwara ya isi ruo ọtụtụ afọ, Jehova gọzikwara ya nke ukwuu. Cheta na mgbe Jehova gwara Eze Sọlọmọn ka ọ rịọ ihe ọ chọrọ, ọ rịọrọ ka Jehova nye ya amamihe ọ ga-eji na-edu ndị Izrel. Jehova zara ekpere ya ma nye ya amamihe na akụnụba. (Gụọ 1 Ndị Eze 3:10-14.) Amamihe ya “dịkwa ukwuu karịa amamihe ndị Ọwụwa Anyanwụ niile, karịakwa amamihe niile nke Ijipt.” Sọlọmọn dekwara “ude ná mba niile gbara ha gburugburu.” (1 Eze 4:30, 31) Sọlọmọn bara ezigbo ọgaranya. Kwa afọ, a na-ebutere ya ọlaedo dị narị talent isii na iri isii na isii n’ịdị arọ, nke karịrị otu narị ijeri naịra! (2 Ihe 9:13) Ọ rụrụ ọtụtụ ihe mara mma. Ya na ndị mba ọzọ mekọrọ ihe, zụkọọkwa ahịa nke ọma. N’eziokwu, ihe gaara Sọlọmọn nke ọma mgbe o ji obi ya niile na-efe Jehova.—2 Ihe 9:22-24.
5. Gịnị ka Sọlọmọn kwuru banyere ndị Chineke weere ka ndị ihe na-agara nke ọma?
5 Ihe Sọlọmọn dere n’akwụkwọ Ekliziastis gosiri na o cheghị na ndị ihe na-agara nke ọma na ndị na-enwe ọṅụ bụ naanị ndị ọgaranya na ndị a ma ama. O dere, sị: “Amatawo m na ọ dịghị ihe dịịrị ha mma karịa ịṅụrị ọṅụ na ime ihe ọma n’oge ndụ ha; nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.” (Ekli. 3:12, 13) Sọlọmọn ghọtara na naanị ihe ga-eme ka ihe ọma ndị ahụ mee mmadụ ezigbo obi ụtọ bụ onye ahụ na Chineke ịdị ná mma. O kwuru, sị: “Ebe a nụworo ihe a dum, ihe bụ́ nkwubi okwu bụ: Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.”—Ekli. 12:13.
6. Gịnị ka akụkọ Sọlọmọn na-akụziri anyị banyere ihe bụ́ ezigbo ihe ịga nke ọma?
6 Sọlọmọn tụrụ egwu Chineke, rubekwara ya isi ruo ọtụtụ afọ. Baịbụl kwuru na ‘ọ hụrụ Jehova n’anya site n’ije ije n’ụkpụrụ Devid bụ́ nna ya.’ (1 Eze 3:3) Í cheghị na ihe gaara ya nke ọma n’eziokwu? Sọlọmọn wuru ụlọ nsọ mara ezigbo mma a ga-anọ na-efe Chineke dị ka Chineke kwuru. O dekwara akwụkwọ atọ so na Baịbụl. O nwere ike anyị agaghị atụ anya ime ihe ndị ahụ Sọlọmọn mere. Ma ihe o mere mgbe o ji obi ya niile na-efe Chineke kwesịrị inyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi mata ihe ezigbo ihe ịga nke ọma pụtara na ihe anyị kwesịrị ime ka ihe gaara anyị nke ọma. Dị ka ihe atụ, Sọlọmọn si n’ike mmụọ nsọ dee banyere akụnụba, amamihe, ịbụ onye a ma ama, na ịdị ike. Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ inwe ihe ndị ahụ ga-egosi na ihe na-agara mmadụ nke ọma. Ma, Sọlọmọn kwuru na ndị na-agbalị inweta ha ‘na-achụso ifufe,’ ya bụ, na ha na-achụ ihe na-adịghị enye ezigbo ọṅụ. Ọ̀ bụ na ị chọpụtabeghị na ndị hụrụ akụ̀ n’anya na-achọsi ike inwetakwu ya? Ha na-echegbukwa onwe ha maka ihe ndị ha nwere. Otu ụbọchị, akụnụba ha ga-aghọkwa nke ndị ọzọ.—Gụọ Ekliziastis 2:8-11, 17; 5:10-12.
7, 8. Olee otú Sọlọmọn si kwụsị ikwesị ntụkwasị obi, gịnịkwa ka ọ kpataara ya?
7 Mgbe Sọlọmọn mere agadi, ọ kwụsịrị irubere Jehova isi. Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo mgbe Sọlọmọn na-eme agadi na ndị nwunye ya mere ka obi ya chigharịa soro chi ọzọ dị iche iche; obi ya dum adịghịkwa n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ dị ka obi Devid nna ya dịrị. . . . Sọlọmọn wee malite ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.”—1 Eze 11:4-6.
8 Ihe Sọlọmọn mere were Jehova iwe, o wee gwa ya, sị: “N’ihi ihe a i mere wee ghara idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m nke m nyere gị n’iwu, aghaghị m ịdọkapụ alaeze a n’aka gị, m ga-enyekwa ya onye 1 Eze 11:11) Ọ dị mwute! N’agbanyeghị na ihe gaara Sọlọmọn nke ọma n’ọtụtụ ụzọ, o mechara kpasuo Jehova iwe. Ihe agaaraghị Sọlọmọn nke ọma n’ihi na ọ kwụsịrị ime ihe kacha mkpa, ya bụ, irubere Jehova isi. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ kpebisiri ike iji ihe m mụtara n’akụkọ Sọlọmọn mee ka ihe gaara m nke ọma?’
na-ejere gị ozi.” (OTÚ IHE SI GAARA PỌL NKE ỌMA N’EZIOKWU
9. Ndị ụwa hà chere na ihe gaara Pọl nke ọma? Kọwaa.
9 Otú Pọl onyeozi si bie ndụ dị iche n’otú Eze Sọlọmọn si bie ndụ. Pọl ebighị n’obí eze. Ya na ndị eze erikọghị nri ma ọ bụ ṅụkọọ mmanya. Kama, e nwere oge ụfọdụ ọ na-ahụghị nri ọ ga-eri, mmiri ọ ga-aṅụ nakwa uwe ọ ga-eyi. E nwekwara mgbe oyi tụrụ ya. (2 Kọr. 11:24-27) Ozugbo Pọl ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, a kwụsịrị ịkwanyere ya ùgwù n’okpukpe ndị Juu. Kama, ndị ndú okpukpe ndị Juu kpọrọ ya asị. A tụrụ ya mkpọrọ, pịa ya ụtarị, tụọkwa ya nkume. Pọl kwuru na e kwujọrọ ya na Ndị Kraịst ibe ya, kpagbuo ha, kwutọọkwa ha. O kwukwara, sị, “Ruo ugbu a, anyị dị ka ihe ụwa kpofuru ekpofu, ihe e si n’ihe niile wụfuo.”—1 Kọr. 4:11-13.
10. Gịnị mere ụfọdụ nwere ike iji chee na Pọl achọghị ka ihe gaara ya nke ọma?
10 Mgbe Pọl onyeozi bụ nwa okorobịa, ya bụ, mgbe ọ na-aza Sọl, o yiri ka ihe ọ̀ na-agara ya nke ọma. Ọ dị ka à ma ndị ezinụlọ ha ama. Gameliel, bụ́ onye nkụzi a na-akwanyere ùgwù, kụziiri ya ihe. Pọl mechara dee, sị: “M nọkwa na-enwe ọganihu dị ukwuu n’okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ m.” (Gal. 1:14) Ọ na-asụ asụsụ Hibru na Grik nke ọma, bụrụkwa nwa amaala Rom, nke mere ka o nwee ọtụtụ ihe ùgwù ndị ọzọ na-achọ achọ. A sị na o kpebiri ịbụ onye a ma ama n’ụwa, o nwere ike ịbụ ezigbo ọgaranya, bụrụkwa onye mmadụ niile ga na-akwanyere ùgwù. Ma, o kpebiri ibi ụdị ndụ ndị ezinụlọ ha na ndị ọzọ nwere ike iche na ọ baghị uru. Gịnị mere o ji mee otú ahụ?
11. Olee ihe ndị Pọl ji kpọrọ ihe? Gịnị ka o kpebiri ime, n’ihi gịnịkwa?
11 Pọl hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ime ihe dị Chineke mma. Ọ chọghị ịbụ ọgaranya ma ọ bụ onye a ma ama. Mgbe Pọl mụtara eziokwu, ihe ndị o jizi kpọrọ ihe bụ àjà Kraịst chụrụ, ozi ọma Alaeze Chineke, na olileanya ibi n’eluigwe. Ọtụtụ ndị n’ụwa leghaara ihe ndị ahụ anya. Pọl ma ihe Setan kwuru banyere ụmụ mmadụ, ya bụ, na ya nwere ike ime ka ụmụ mmadụ kwụsị ife Chineke. (Job 1:9-11; 2:3-5) N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara Pọl, o kpebisiri ike iji obi ya niile na-efe Chineke ma na-atachi obi. Ọtụtụ ndị chọrọ ka ihe gaara ha nke ọma n’ụwa, ma ha achọghị ime otú ahụ.
12. Gịnị mere i ji kpebie ịtụkwasị Chineke obi?
12 Ihe ahụ Pọl kpebiri ime ọ̀ bụ ihe gịnwa kpebikwara ime? Ikwesị ntụkwasị obi anaghị adị mfe, ma anyị ma na ọ ga-eme ka anyị mee Jehova obi ụtọ, ya agọziekwa anyị. Ọ bụ ya bụ ihe ịgara mmadụ nke ọma n’eziokwu. (Ilu 10:22) Chineke na-agọzi anyị ugbu a. Obi siri anyị ike na ọ ga-agọzikwa anyị n’ọdịnihu. (Gụọ Mak 10:29, 30.) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị obi “ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ bụ́ onye na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” Anyị ga-esi otú ahụ ‘tọọrọ onwe anyị ezi ntọala maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka anyị wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’ (1 Tim. 6:17-19) Anyị mee otú ahụ, obi ga-esi anyị ike na otu narị afọ ma ọ bụ otu puku afọ n’ọdịnihu, anyị ga-enwe ike ikwu, sị: “Ihe m kpebiri ime emeela ka ihe gaara m nke ọma n’eziokwu!”
OLEE EBE AKỤ̀ GỊ DỊ?
13. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere banyere ịkpakọba akụ̀?
13 Jizọs kwuru banyere akụ̀, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa, ebe nla na nchara na-erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-awabakwa zuo ohi. Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi. N’ihi na n’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.”—Mat. 6:19-21.
14. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-akpakọba akụ̀ n’ụwa?
14 Akụ̀ mmadụ nwere n’ụwa nwere ike ọ gaghị abụ naanị ego. O nwere ike ịbụ ihe ndị dị ka ịbụ onye a ma ama na ịdị ike, bụ́ ihe ndị Sọlọmọn kwuru na ọtụtụ ndị na-ewere ka ihe ịga nke ọma. Jizọs kwuru ihe yiri ihe ahụ Sọlọmọn kwuru n’akwụkwọ Ekliziastis, ya bụ, na akụ̀ nke ụwa anaghị adịru mgbe ebighị ebi. Ị ma na ụdị akụ̀ ahụ nwere ike ibibi ọsọ ọsọ ma ọ bụ laa n’iyi n’egbughị oge. Otu prọfesọ aha ya bụ Dale Bruner dere banyere ihe ahụ Jizọs kwuru banyere akụ̀. O kwuru na mmadụ ịbụ onye a ma ama anaghị adịte aka. E nwere ike ịma mmadụ ama taa, o ruo echi, e chefuo ya. Ezigbo ego mmadụ kpatara n’afọ a nwere ike ịgwụ n’afọ ọzọ. Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha ka ha ghara ịna-agbalị ịbụ ndị ukwu n’ụwa, nke bụ́ ihe na-anaghị adịte aka, nke nwekwara ike ime ka obi koro ha n’elu. Nwoke ahụ kwukwara na Jizọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya kwaa mmakwaara. Ọtụtụ ndị kwetara ihe ahụ nwoke ahụ kwuru. Ma mmadụ ole na-ebi ụdị ndụ gosiri na ha kwetara ihe Jizọs kwuru? Ị̀ ga na-ebi ndụ gosiri na i kwetara ihe ahụ Jizọs kwuru?
15. Olee ụdị ihe ịga nke ọma anyị kwesịrị ịgbalịsi ike inweta?
15 Ụfọdụ ndị ndú okpukpe na-ekwu na
mmadụ ekwesịghị ịna-agba mbọ ka ihe gaara ya nke ọma. Ma, Jizọs ekwughị otú ahụ. Kama, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-agba mbọ ka ihe gaara ha nke ọma otú kwesịrị ekwesị. Ọ gbara ha ume ka ha na-akpakọba “akụ̀ n’eluigwe,” ya bụ, akụ̀ nke na-agaghị ala n’iyi. Ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ ịbụ ndị ihe na-agara nke ọma n’anya Jehova. Ihe Jizọs kwuru na-echetara anyị na onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi ihe ọ ga-eji ndụ ya mee. N’eziokwu, ọ bụ ihe dị anyị n’obi ma ọ bụ ihe anyị ji kpọrọ ihe ka anyị na-agbalịsi ike inweta.16. Gịnị ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi?
16 Ọ bụrụ na anyị kpebiri ime ihe dị Jehova mma, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga na-egboro anyị mkpa anyị. O nwere ike ikwe ka agụụ gụtụ anyị ma ọ bụ ka akpịrị kpọtụ anyị nkụ, dị ka Pọl onyeozi. (1 Kọr. 4:11) Ma, anyị kwesịrị ịtụkwasị ndụmọdụ Jizọs nyere obi. O kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa. Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.”—Mat. 6:31-33.
GBAA MBỌ KA IHE GAARA GỊ NKE ỌMA N’ANYA CHINEKE
17, 18. (a) Gịnị ka ihe ịgara mmadụ nke ọma n’eziokwu pụtara? (b) Gịnị ka ihe ịgara mmadụ nke ọma na-apụtaghị?
17 Ihe anyị kwesịrị iburu n’obi bụ na ihe ịgara mmadụ nke ọma n’eziokwu apụtaghị na onye ahụ bụ aka ji akụ̀ ma ọ bụ onye a ma ama n’ụwa a. Ọ pụtaghịkwa inwe ihe ùgwù n’ọgbakọ. Naanị ihe ga-eme ka ihe gaara anyị nke ọma n’eziokwu bụ irubere Chineke isi na iji obi anyị niile na-efe ya. Ọ gwara anyị, sị: “Ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-elekọta ụlọ bụ ka ha bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.” (1 Kọr. 4:2) Anyị kwesịrị ịtachi obi ma na-efe Jehova mgbe niile. Jizọs kwuru, sị: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” (Mat. 10:22) Ọ̀ bụ na i kwetaghị na o nweghị ihe ịga nke ọma karịrị ịbụ onye a zọpụtara?
18 Ihe ndị anyị tụlere gosiri na ihe ga-eme ka anyị kwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ abụghị ịbụ onye a ma ama, ịgụ akwụkwọ, ma ọ bụ ịba ọgaranya; ọ bụghịkwa amamihe ma ọ bụ nkà anyị nwere. N’agbanyeghị ọnọdụ anyị, anyị nwere ike ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ. N’oge ndịozi Jizọs, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ ndị ọgaranya, ụfọdụ abụrụ ndị ogbenye. Pọl gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị ọgaranya ka ha “na-arụ ọrụ ọma, ka ha bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ, ka ha na-emesapụ aka, ka ha dịrị njikere inye ndị ọzọ ihe.” Ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye nwere ike ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’ (1 Tim. 6:17-19) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọ bụ otu ihe ahụ ka Chineke chọrọ ka anyị niile mee, ya bụ, ikwesị ntụkwasị obi ma “bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ.” Anyị mee otú ahụ, anyị ga-abụ ndị ihe na-agara nke ọma n’anya Onye kere anyị, obi ga-adịkwa anyị ụtọ na anyị na-eme ihe dị ya mma.—Ilu 27:11.
19. Gịnị ka i kpebiri ime ka ihe wee gaara gị nke ọma?
19 O nwere ike anyị agaghị agbanweli otú ụwa si ele anyị anya, ma anyị nwere ike ịgbanwe otú anyị si ele ọnọdụ anyị anya. Na-agba mbọ ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ọnọdụ gị. Obi ga-adị gị ụtọ ma i mee otú ahụ. Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi gị ugbu a, nyekwa gị ndụ ebighị ebi. Echefula ihe Jizọs gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ọ gwara onye ọ bụla n’ime ha, sị: “Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enye gị okpueze bụ́ ndụ.” (Mkpu. 2:10) Ọ bụ ya bụ ihe ịga nke ọma n’eziokwu!
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 6]
N’anya ndị mmadụ, o yiri ka Sọl ọ̀ na-eme ihe ga-eme ka ihe gaara ya nke ọma
[Foto dị na peeji nke 7]
Ihe gaara Pọl nke ọma n’eziokwu