Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam

Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam

Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam

“Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”​—KỌL. 3:13.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbaghara ndị ọzọ?

Olee akụkọ Jizọs ji gosi na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ?

Olee uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ?

1, 2. Gịnị mere anyị ji kwesị iche echiche ma ànyị dị njikere ịgbaghara ndị ọzọ?

BAỊBỤL na-enyere anyị aka ịmụta otú Jehova si ele mmehie anya na ihe ọ na-eme mgbe mmadụ mehiere. Ọ gwakwara anyị na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị. N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị hụrụ ihe mere Jehova ji gbaghara Devid na Manase. Ihe ha mere wutere ha, ha ekwupụta mmehie ha ma kpebie na ha agaghị eme ya ọzọ. Ha ji obi ha niile chegharịa, Jehova wee meere ha amara.

2 Ka anyị tụlezie otú anyịnwa si agbaghara ndị ọzọ. Olee otú obi gaara adị gị ma a sị na onye ikwu gị nwụrụ n’ihi ihe Manase mere? Ị̀ gaara agbaghara Manase? Ajụjụ a dị mkpa ugbu a n’ihi na ọtụtụ ndị na-emebi iwu, na-eme ihe ike, na-achọkwa naanị uru nke ha. N’ihi ya, gịnị mere Onye Kraịst ji kwesị ịmụta ịgbaghara ndị ọzọ? Ọ bụrụ na mmadụ emee gị ihe ọjọọ, gịnị ga-enyere gị aka ijide onwe gị, mee ihe Jehova chọrọ ka i mee ma dị njikere ịgbaghara onye ahụ?

IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-AGBAGHARA NDỊ ỌZỌ

3-5. (a) Olee akụkọ Jizọs kọrọ iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta na ha kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kọrọ na Matiu 18:21-35?

3 Anyị kwesịrị ịdị njikere ịgbaghara ndị mere anyị ihe ọjọọ, ma hà bụ ụmụnna anyị ma ọ bụ na ha abụghị. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na Jehova na ndị mmadụ ibe anyị ga-adị n’udo, ma ndị ezinụlọ anyị ma ndị enyi anyị ma ndị ọzọ. Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ n’agbanyeghị ugboro ole ha mejọrọ anyị. Jizọs nyere ihe atụ gosiri na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ. Ọ kọrọ akụkọ banyere ohu nke ji nna ya ukwu ụgwọ buru ibu.

4 Ụgwọ ohu ahụ ji nna ya ukwu hiri nne nke na ọ ga-arụ ọrụ iri nde ụbọchị isii [ya bụ, ọtụtụ puku afọ] iji kwụọ ya. Ma, nna ya ukwu gbaghaara ya, gwa ya ka ọ ghara ịkwụ ụgwọ ahụ. Ohu ahụ mechara hụ ohu ibe ya nke ji ya ụgwọ. Mmadụ nwere ike iji naanị otu narị ụbọchị rụta ego ahụ o ji ya n’ụgwọ. Ohu ahụ ekweghị agbaghara ohu ibe ya, kama ọ tụrụ ya mkpọrọ n’agbanyeghị na ọ nọ na-arịọ ya ka o nweere ya ndidi. Ihe ohu ahụ mere were nna ya ukwu iwe. Nna ya ukwu jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ na gị onwe gị ekwesịghị imere ohu ibe gị ebere, dị ka m mekwaara gị ebere?” Baịbụl kwuru, sị: “Nna ya ukwu wee wee iwe, nyefee ya n’aka ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ, ruo mgbe ọ ga-akwụ ihe niile o ji n’ụgwọ.”—Mat. 18:21-34.

5 Gịnị ka Jizọs chọrọ ka anyị mụta n’akụkọ a? O kwuru, sị: “Otú ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi ya.” (Mat. 18:35) Ihe Jizọs kwuru doro anya. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị na-emehie mgbe ụfọdụ. Mmehie ndị anyị na-eme ugbu a anyị bụ ndị na-ezughị okè gosiri na anyị enweghị ike irubere Jehova isi n’emehieghị. Ma, Jehova dị njikere ịgbaghara anyị ma chefuo mmehie anyị ka à ga-asị na o hichara ya ehicha. N’ihi ya, onye chọrọ ịbụ enyi Jehova kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ ihe ha mere ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo n’Ozizi Elu Ugwu, sị: “Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.”—Mat. 6:14, 15.

6. Gịnị mere na ọ naghị adị mfe ịgbaghara ndị ọzọ?

6 I nwere ike ikwu, sị: ‘Ọ na-atọ ụtọ ma e kwuwe ya n’ọnụ, ma ime ya eme adịghị mfe.’ Ọ bụ n’ihi na o nwere ike iwute anyị nke ukwuu ma e mejọọ anyị. Dị ka ihe atụ, iwe nwere ike iwe anyị, o nwekwara ike ịdị anyị ka à gbara anyị mgba okpuru. Anyị nwekwara ike ịchọ ka a taa onye ahụ ahụhụ ma ọ bụ anyị achọọ imegwara ya. Ụfọdụ na-echedị na ha agaghị enwe ike ịgbaghara onye ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, gịnị ka i nwere ike ime ka i nwee ike ịna-agbaghara ndị ọzọ otú Jehova gwara anyị?

GHỌTA IHE MERE IWE JI NA-EWE GỊ

7, 8. Gịnị nwere ike inyere gị aka ịgbaghara onye mejọrọ gị?

7 Mgbe e mere anyị ihe ọjọọ ma ọ bụ mgbe anyị chere na e mejọrọ anyị, ezigbo iwe nwere ike iwe anyị. Otu nwa okorobịa kwuru ihe o mere mgbe ezigbo iwe were ya. O kwuru, sị: ‘Esi m n’ụlọ anyị pụọ, kwuo na agaghị m alọghachi ebe ahụ ọzọ. Oge ahụ bụ oge ọkọchị, anwụ na-achakwa n’ụbọchị ahụ. Agawara m n’otu okporo ụzọ mara ezigbo mma, nke dị jụụ. Ka m na-aga, iwe m ji nwayọọ nwayọọ na-adajụ. Emechara m laghachi n’ụlọ anyị, o wutekwara m na m were ụdị iwe ahụ.’ Ihe a nwa okorobịa a kọrọ gosiri na ọ bụrụ na anyị ewetuo obi, anyị ga-enwe ike ichebara ihe merenụ echiche nke ọma kama ime ihe ga-eme ka anyị kwaa mmakwaara.—Ọma 4:4; Ilu 14:29; Jems 1:19, 20.

8 Ma gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na iwe ka na-ewe gị n’agbanyeghị na ị gbalịala ime ka iwe gị dajụọ? Gbalịa chọpụta ihe mere iwe ji na-ewe gị. Ọ̀ bụ n’ihi na ihe e mere gị adịghị mma, ka ọ̀ bụ na a kparịrị gị? Ka ọ̀ bụ na i chere na onye ahụ kpachaara anya chọọ ịkpasu gị iwe? Ihe o mere gị ọ̀ dị njọ otú ahụ? I chee echiche ihe mere iwe ji na-ewe gị, i nwere ike icheta amaokwu Baịbụl ga-emeda gị obi, nyekwara gị aka ime ihe Jehova chọrọ. (Gụọ Ilu 15:28; 17:27.) Ọ bụrụ na i chebara ihe ndị ahụ echiche kama iche banyere otú obi dị gị, o nwere ike inyere gị aka ịgbaghara onye ahụ. Ime otú ahụ anaghị adị mfe. Ma, i mee ya, ọ ga-egosi na Baịbụl na-enyere gị aka inyocha ‘echiche gị na ihe i bu n’obi,’ na-enyekwara gị aka ịna-agbaghara ndị ọzọ otú Jehova si agbaghara gị.—Hib. 4:12.

IHE AHỤ Ò KWESỊRỊ IWE GỊ IWE?

9, 10. (a) Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ dị gị ka è mejọrọ gị? (b) Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na ị naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, na-adịkwa njikere ịgbaghara ndị ọzọ?

9 E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpasu anyị iwe. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-akwọ ụgbọala, o nwere ike ịfọ obere ka onye na-akwọ ụgbọala ọzọ suo ụgbọala gị. Gịnị ka ị ga-eme? O nwere ike ịbụ na ị gụọla banyere ndị were ezigbo iwe mgbe ha na-akwọ ụgbọala, nke mere ka ha tie ọkwọ ụgbọala ibe ha ihe. Ma ebe ị bụ Onye Kraịst, o doro anya na ị gaghị achọ ime otú ahụ.

10 Ọ ga-aka mma ka i chee echiche tupu i mee ihe ọ bụla. O nwere ike ịbụ na e nwere ihe ị na-emetaghị mgbe ị na-akwọ ụgbọala gị n’ihi na ihe megharịrị gị anya. O nwekwara ike ịbụ na ụgbọala nke ọzọ ahụ nwere nsogbu. Obi anyị nwere ike ịdajụ ma ọ bụrụ na anyị agbalịa ghọta ihe mere onye ahụ ji mee ihe o mere, cheta na anyị amaghị ihe niile, anyị adịrịkwa njikere ịgbaghara onye ahụ. Ekliziastis 7:9 kwuru, sị: “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.” Ekwela ka ihe ndị ọzọ mere kpasuo gị iwe. Ọtụtụ mgbe, anyị nwere ike iche na ndị ọzọ kpachaara anya mee ihe ga-akpasu anyị iwe. Ma, o nwere ike ịbụ na ha mejọrọ n’ihi ezughị okè. Ma eleghị anya, anyị aghọtachaghị ihe merenụ. N’ihi ya, cheta na o nwere ike ịbụ na ị machaghị ihe mere mmadụ ji kwuo ihe o kwuru ma ọ bụ mee ihe o mere. Gosi onye ahụ na ị hụrụ ya n’anya, gbagharakwa ya. Obi ga-adị gị ụtọ ma i mee otú ahụ.—Gụọ 1 Pita 4:8.

‘KA UDO UNU LAGHACHIKWUTE UNU’

11. Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị n’agbanyeghị ihe ndị mmadụ mere anyị n’ozi ọma?

11 Olee otú ị ga-esi jide onwe gị ma mmadụ gwa gị okwu ọjọọ mgbe ị nọ n’ozi ọma? Mgbe Jizọs zipụrụ iri mmadụ asaa ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ gwara ha, sị: “N’ebe ọ bụla unu banyere n’ụlọ, burunụ ụzọ sị, ‘Udo dịrị ụlọ a.’ Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-adịkwasị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nọghị, udo unu ga-alaghachikwute unu.” (Luk 10:1, 5, 6) Obi na-adị anyị ụtọ ma ndị mmadụ gee anyị ntị n’ozi ọma n’ihi na ihe ha nụrụ nwere ike ịbara ha uru. Ma, mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eme ihe nwere ike iwe anyị iwe. Gịnị ka anyị kwesịrị ime? Jizọs kwuru na udo anyị kwesịrị ịlaghachikwute anyị. N’agbanyeghị ihe ndị mmadụ mere anyị n’ozi ọma, obi kwesịrị ịdị anyị mma mgbe anyị si n’ụlọ ha na-apụ. Ọ bụrụ na anyị ewee iwe mgbe a gwara anyị okwu ọjọọ n’ozi ọma, anyị agaghịzi enwe udo ahụ Jizọs kwuru okwu ya.

12. Dị ka Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 4:31, 32, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?

12 Gbalịsie ike ka obi dị gị mma mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe ị gara ozi ọma. Ịgbaghara ndị ọzọ apụtaghị na ị ga-akwado ihe ọjọọ ha mere ma ọ bụ na ị ga-eme ka o nweghị ihe merenụ. Ma, ọ pụtara na ị ga-akwụsị iwe iwe n’ihi ihe ọjọọ ahụ ha mere. Ị ga-agbalịsi ike ka ọ ghara ịna-emebi gị obi. Ụfọdụ ndị na-echekata banyere ihe ọjọọ e mere ha, iwe ana-ewe ha mgbe niile. Ekwela ka iwe na-achị gị. Cheta na obi agaghị adị gị ụtọ ma ọ bụrụ na ị na-ebu iwe n’obi. N’ihi ya, na-agbaghara ndị ọzọ!—Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32.

NA-EME IHE GA-ATỌ JEHOVA ỤTỌ

13. (a) Olee otú Onye Kraịst si ‘ekpokwasị icheku ọkụ n’isi’ onye iro ya? (b) Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị emeere onye mere anyị ihe ọjọọ obiọma?

13 Mgbe ụfọdụ, onye na-abụghị Onye Kraịst nwere ike ime gị ihe ọjọọ. Ma i nwere ike inyere ya aka iji ihe Baịbụl na-akụzi kpọrọ ihe. Pọl onyeozi dere, sị: “‘Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ; n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.’ Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Rom 12:20, 21) Ọ bụrụ na i jiri olu ọma zaa ndị mmadụ mgbe ha na-eweso gị iwe, àgwà ha nwere ike ịgbanwe, ha emeere gị obiọma. Mmadụ mee gị ihe ọjọọ, gị ana-emere ya ihe ọma, na-enwekwara ya ọmịiko, i nwere ike inyere ya aka ịmụta eziokwu Baịbụl. N’agbanyeghị ihe o mere, obiọma gị nwere ike ime ka onye ahụ chebara omume ọma gị echiche.—1 Pita 2:12; 3:16.

14. N’agbanyeghị ihe ọjọọ mmadụ mere gị, gịnị mere na i kwesịghị iburu ya iwe n’obi?

14 Ma e nwere ndị anyị na ha na-ekwesịghị ịna-akpa. Dị ka ihe atụ, anyị na ndị a chụrụ n’ọgbakọ ekwesịghị ịna-akpa. Ihe mere e ji chụọ ha n’ọgbakọ bụ na ha mere mmehie dị oké njọ ma jụ ichegharị. Ọ bụrụ na ụdị onye ahụ mere ihe wutere gị, o nwere ike isiri gị ezigbo ike ịgbaghara ya. Ọ bụrụgodị na o chegharịa, ihe o mere nwere ike ka na-ewute gị. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, i kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịmụta ịgbaghara onye ahụ mere ihe ọjọọ ma mechaa chegharịa. I kwesịrị ịgbaghara ya n’ihi na ị maghị otú obi dị onye ahụ ugbu a ma ọ bụ ihe ọ na-eche. Ma, Jehova ma ihe niile. Ọ na-enyocha ihe mmadụ bu n’obi, na-enwekwara ndị mere ihe ọjọọ ndidi. (Ọma 7:9; Ilu 17:3) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. Na-emenụ ihe dị mma n’anya mmadụ niile. Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’” (Rom 12:17-19) Ì kwesịrị ikpe mmadụ ikpe? Mbanụ. (Mat. 7:1, 2) Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-ekpe ikpe ziri ezi.

15. Olee ihe ga-enye aka mee ka iwe anyị na-eweso onye mejọrọ anyị dajụọ?

15 Ọ bụrụ na i chere na e mejọrọ gị, ya esiekwara gị ike ịgbaghara onye mere ihe ọjọọ ma chegharịa, ọ ga-adị mma ka i cheta na e nwere ihe ya na onye ahụ na-alụ. Otú ahụ gị na ezughị okè na-alụ ka onye ahụ na ezughị okè na-alụkwa. (Rom 3:23) Jehova na-enwere mmadụ niile ọmịiko n’ihi na ha ezughị okè. N’ihi ya, anyị kwesịrị icheta onye ahụ mejọrọ anyị n’ekpere. Ọ bụrụ na anyị echeta mmadụ n’ekpere, iwe anyị na-eweso ya nwere ike ịdajụ. Jizọs mere ka o doo anya na anyị ekwesịghị iburu ndị ọzọ iwe n’obi, ọ bụrụgodị na ha mere anyị ihe ọjọọ. O kwuru, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.”—Mat. 5:44.

16, 17. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị okenye ekpebie na onye mere ihe ọjọọ echegharịala, n’ihi gịnịkwa?

16 N’ọgbakọ, ọ bụ ndị okenye ka Jehova nyere ọrụ ikpebi ma onye mere mmehie dị oké njọ ò chegharịala ka ọ̀ bụ na o chegharịbeghị. Ndị okenye abụghị Chineke, bụ́ onye ma ihe niile, ma ha na-agbalịsi ike iji ihe Baịbụl kwuru kpebie ihe a ga-eme, mmụọ nsọ na-enyekwara ha aka. N’ihi ya, ha rịọchaa Jehova n’ekpere ka o nyere ha aka n’ihe ha chọrọ ikpebi, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ha kpebiri bụ uche Jehova.—Mat. 18:18.

17 Ụdị ihe ahụ mee, anyị kwesịrị iji obi anyị niile kwado ihe ndị okenye kpebiri. Ọ bụrụ na ndị okenye ekpebie na mmadụ echegharịala, ị̀ ga-agbaghara onye ahụ ma gosi ya na ị hụrụ ya n’anya? (2 Kọr. 2:5-8) Ime otú ahụ anaghị adị mfe mgbe ụfọdụ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ mere kpataara gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu nsogbu. Ma, ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi nakwa n’otú o si edozi okwu n’ọgbakọ, ị ga-eme ihe i kwesịrị ime. Ị ga-egosi na ị na-eji obi gị niile agbaghara ndị ọzọ.—Ilu 3:5, 6.

18. Olee uru ndị ị ga-erite ma ọ bụrụ na ị na-agbaghara ndị ọzọ?

18 Ndị ọkachamara achọpụtala na ịgbaghara ndị ọzọ bara ezigbo uru. Ọ ga-eme ka obi ruo anyị ala n’ihi na anyị ga-ahapụ iwe na ọnụma. Ọ ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma. Ma ọ bụrụ na anyị anaghị agbaghara ndị ọzọ, ahụ́ agaghị adị anyị mma, obi agaghị na-eru anyị ala, anyị na ndị ọzọ agaghịkwa na-adị ná mma. Ma uru kachanụ anyị ga-erite n’ịgbaghara ndị ọzọ bụ na anyị na Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova ga na-adị ná mma.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:12-14.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 27]

Gịnị ka Jizọs chọrọ ka anyị mụta n’akụkọ a ọ kọrọ?

[Foto dị na peeji nke 30]

Cheta na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ