Jehova Kụziiri M Ime Uche Ya
Akụkọ Ndụ
Jehova Kụziiri M Ime Uche Ya
Akụkọ Max Lloyd kọrọ
N’otu abalị n’afọ 1955, mụ na onye ozi ala ọzọ ibe m nọ n’ebe anyị na-eje ozi na Paragụwaị, n’Ebe Ndịda Amerịka. Ìgwè mmadụ iwe juru obi gbara ụlọ ebe anyị nọ gburugburu, na-eti mkpu, sị: “Chi anyị bụ chi na-aṅụ ọbara, ọ chọrọ ọbara ndị mbịarambịa.” Olee otú anyị bụ́ ndị mbịarambịa si bịa ebe a?
IHE ahụ niile malitere ọtụtụ afọ gara aga n’Ọstrelia, bụ́ ebe m toro nakwa ebe Jehova malitere ịkụziri m ime uche ya. Papa m natara otu Onyeàmà Jehova akwụkwọ bụ́ Enemies n’afọ 1938. Ike onye ụkọchukwu nọ n’obodo ahụ gwụrụ ya na mama m. Ụkọchukwu ahụ na-ekwu na ihe ụfọdụ e dere na Baịbụl bụ akụkọ ifo. Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, e mere ndị mụrụ m baptizim iji gosi na ha ararala ndụ ha nye Jehova. Malite mgbe ahụ, ime uche Jehova ghọrọ ihe kacha mkpa n’ezinụlọ anyị. Onye ọzọ e mere baptizim bụ nwanne m nwaanyị ji afọ ise tọọ m. Aha ya bụ Lesley. E mere m baptizim n’afọ 1940 mgbe m dị afọ itoolu.
Oge na-adịghị anya ka Agha Ụwa nke Abụọ malitechara, a machibidoro akwụkwọ Ndịàmà Jehova ji amụ Baịbụl iwu n’Ọstrelia. N’ihi ya, mgbe m dị obere, amụtara m iji naanị Baịbụl akọwa ihe m kweere. Ana m ejikarị Baịbụl m aga ụlọ akwụkwọ ka m jiri ya gosi ndị ọzọ ihe mere na anaghị m egbupụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ akwado agha ụwa a na-alụ mgbe ahụ.—Ọpụ. 20:4, 5; Mat. 4:10; Jọn 17:16; 1 Jọn 5:21.
Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ibe m na-agbara m ọsọ n’ihi na ha sịrị na m bụ onye nledo na-arụrụ ndị Jamanị ọrụ. N’oge ahụ, a na-egosi fim n’ụlọ akwụkwọ. Tupu a malite igosi ya, onye ọ bụla kwesịrị ibili ọtọ ma bụọ abụ e ji eto mba. Mgbe m na-ebilighị ọtọ, ụmụ okoro abụọ ma ọ bụ atọ na-ejide m ná ntutu isi m dọlie m elu. E mechara chụpụ m n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ekweghị m ahapụ ihe m kweere, bụ́ ihe ndị si na Baịbụl. Ma, m mechara nweta ụlọ akwụkwọ ji akwụkwọ ozi na-akụziri m ihe.
IHE M MECHARA MEE
Ekpebiri m na m ruo afọ iri na anọ, m ga-amalite ozi oge niile. N’ihi ya, iwe were m mgbe ndị mụrụ m kwuru na m ga-ebu ụzọ nweta ọrụ ma rụwa ya. Ha kwusiri ike na m ga-anọ n’ụlọ anyị na-akwụ ụgwọ ụlọ, na-akpatakwa ihe m ga-eri. Ma, ha kwere m nkwa na m ga-amalite ịsụ ụzọ ma m ruo afọ iri na asatọ. N’ihi ya, mụ na ha kparịtara ụka ugboro ugboro banyere otú m ga na-eme ego m na-arụta. Agwara m ha na m chọrọ ịna-edewe ya maka mgbe m ga na-asụ ụzọ, ma ha na-anara m nke ọ bụla m rụtara.
Mgbe oge ruru ka m malite ịsụ ụzọ, papa m na mama m kpọrọ m ma gwa m na ha deweere m ego ahụ niile n’ụlọ akụ̀. Ha nyere m ha niile ka m jiri ya zụrụ uwe na ihe ndị ọzọ m ga-eji na-asụ ụzọ. Ha ji ihe ahụ ha mere kụziere m ka m jiri aka m na-egboro onwe m mkpa m kama ilewe ndị ọzọ anya ka ha na-egboro m mkpa m. Achọpụtala m ugbu a na ihe ahụ ha kụziiri m baara m ezigbo uru.
Mgbe mụ na Lesley ka na-eto eto, ndị ọsụ ụzọ na-ehikarị n’ụlọ anyị, obi na-adịkwa anyị ụtọ iso ha gaa ozi ọma. Ná ngwụcha izu, anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, na-agba àmà okporo ámá, na-amụkwara ndị mmadụ Baịbụl. N’oge ahụ, ihe onye nkwusa na-enye kwa ọnwa bụ iri awa isii. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mama m na-arụzu ya mgbe niile. Mụ na Lesley mụtara iṅomi ya.
ỊSỤ ỤZỌ NA TAZMENIA
Ebe mbụ m sụrụ ụzọ bụ na Tazmenia, bụ́ agwaetiti dị n’Ọstrelia. Ebe ahụ ka m sonyeere nwanne m nwaanyị na di ya. Ma ha hapụrụ m n’ebe ahụ n’oge na-adịghị anya, gawa klas nke iri na ise n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. N’oge ahụ, m na-eme ihere, ahapụtụbeghị m ụlọ anyị gaa biri ebe ọzọ. Ụfọdụ ndị kwuru na agaghị m anọfe ọnwa atọ n’ebe ahụ. Ma n’ime otu afọ, ya bụ, n’afọ 1950, a họpụtara m ịbụ ohu ọgbakọ, nke a na-akpọzi onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ. E mechara họpụta m ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, nwanna ọzọ bụ́ nwa okorobịa abụrụkwa ọsụ ụzọ ibe m.
E zigara anyị n’otu obodo dịpụrụ adịpụ, bụ́ ebe a na-egwute ọla kọpa. E nweghị Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. Anyị ji bọs ruo ebe ahụ n’ehihie. Anyị rahụrụ n’otu họtel ochie n’abalị ụbọchị ahụ. N’echi ya, ka anyị na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, anyị jụrụ ndị anyị ziri ozi ọma ma hà nwere ụlọ ha ga-enye anyị. Mgbe chi jiwere n’ụbọchị ahụ, otu nwoke gwara anyị na e nwere ebe mmadụ na-ebighị n’ụlọ ụkọchukwu dị n’akụkụ chọọchị ndị Presbiterian, gwakwa anyị ka anyị gaa gwa dikọn ha. Ọ nabatara anyị, nyekwa anyị ụlọ ahụ. O nwere otú ọ dịcha isi n’ụlọ ụkọchukwu na-apụta kwa ụbọchị, na-aga ekwusa ozi ọma.
Ndị bi n’ebe ahụ gere anyị ntị. Anyị na ọtụtụ n’ime ha kparịtara ihe si na Baịbụl, anyị amalitekwara ọtụtụ ndị ọmụmụ Baịbụl. Mgbe ndị isi chọọchị nọ n’isi obodo ahụ nụrụ ihe a, nụkwa na Ndịàmà Jehova bi n’ụlọ ụkọchukwu ha, ha nyere dikọn ahụ iwu ka ọ chụpụ anyị ozugbo. Anyị malitekwara ịchọ ụlọ!
Mgbe anyị kwusachara ozi ọma ruo n’etiti ehihie n’echi ya, anyị malitere ịchọ ebe anyị ga-arahụ. Ebe kacha mma anyị hụrụ bụ ebe ndị mmadụ na-anọ ekiri ihe a na-eme n’otu ámá egwuregwu. Anyị zoro akpa uwe anyị n’ebe ahụ, gaghachi ozi ọma. Chi ejiwela, ma anyị kpebiri ịgakwu n’ụlọ ole na ole fọrọ n’okporo ámá anyị na-arụ. N’otu ụlọ anyị banyere, otu nwoke nyere anyị obere ọnụ ụlọ abụọ dị n’azụ ụlọ ya!
ỌRỤ SEKIT NA ỊGA GILIED
Mgbe m jere ozi ebe ahụ ihe dị ka ọnwa asatọ, e si n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Ọstrelia zitere m akwụkwọ ozi ka m bụrụ onye nlekọta sekit. O riri m ọnụ, n’ihi na adị m naanị iri afọ abụọ. Mgbe a zụchara m izu ole na ole, m malitere ileta ọgbakọ dị iche iche ma na-agba ha ume. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ niile tọrọ m. Ma ha eledaghị m anya n’ihi na m bụ nwata, kama ha kwanyeere ọrụ m na-arụ ùgwù.
Ka m na-esi n’otu ọgbakọ aga n’ọgbakọ ọzọ, nsogbu ndị m na-enwe na-adị iche iche! N’otu izu, m na-aba bọs. N’izu ọzọ, m na-aba ụgbọ okporo ígwè. N’izu na-eso ya, mụ abaa ụgbọala ma ọ bụ nọrọ n’ọgba tum tum, mụ na akpa uwe m na akpa ozi ọma m ana-alụ. Ịnọ n’ụlọ ụmụnna na-atọ m ezigbo ụtọ. Otu nwanna bụ́ ohu ọgbakọ n’oge ahụ chọsiri ike ka m nọrọ n’ụlọ ya n’agbanyeghị na a rụchabeghị ya. N’izu ahụ, m rahụrụ n’ebe a na-asa ahụ́, ma izu ahụ gbara anyị niile ezigbo ume!
Ihe ọzọ juru m anya nke mere n’afọ 1953 bụ na e nyere m akwụkwọ m ga-edejupụta maka ịga klas nke iri abụọ na abụọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ma, obi dị m ụtọ n’agbanyeghị na ụjọ na-atụtụ m. Mgbe nwanne m nwaanyị na di ya gụchara akwụkwọ na Gilied n’abalị iri atọ n’ọnwa Julaị n’afọ 1950, e zigara ha Pakịstan. Tupu otu afọ agachaa, Lesley rịara ọrịa ma nwụọ n’ebe ahụ. Anọ m na-eche otú obi ga-adị papa m na mama m ma m gaa ná mba ọzọ ozugbo ahụ. Ma, ha gwara m, sị: “Gaa jeere Jehova ozi n’ebe ọ bụla o zigara gị.” Ahụghị m papa m ọzọ. Ọ nwụrụ n’afọ 1957.
N’oge na-adịghị anya, mụ na ụmụnna ise ndị ọzọ bụ́ ndị Ọstrelia banyere ụgbọ mmiri na-aga Niu Yọk Siti. Ije ahụ were anyị izu isii. Mgbe anyị nọ n’ụzọ, anyị gụrụ Baịbụl, mụọ ihe, ziekwa ndị ọzọ nọ n’ụgbọ ahụ ozi ọma. Tupu anyị agawa Saụt Lansin, dị na Niu Yọk, bụ́ ebe ụlọ akwụkwọ ahụ dị, anyị gara mgbakọ mba niile e nwere n’Ámá Egwuregwu Yanki n’ọnwa Julaị n’afọ 1953. Ndị bịara mgbakọ ahụ dị otu narị puku, iri puku isii na ise, narị asatọ na iri abụọ na itoolu!
Ụmụ klas anyị dị otu narị na iri abụọ. Anyị niile si n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ọ bụ n’ụbọchị anyị gụchara akwụkwọ ka a gwara anyị ebe e zigara anyị. Ozugbo ahụ, anyị gbagara n’ọ́bá akwụkwọ Gilied ka anyị mata ihe ụfọdụ banyere mba ebe e zigara anyị. Achọpụtara m na a na-agbanwekarị ọchịchị na Paragụwaị, bụ́ ebe e zigara m. Obere oge ka m ruru ebe ahụ, ajụrụ m ndị ozi ala ọzọ ibe m n’otu ụtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji na-eme mkpọtụ n’abalị ka ndị na-eme ememme. Ha mụmụrụ ọnụ ọchị ma gwa m, sị: “Ihe ahụ bụ mgbanwe nke mbụ ị na-ahụ. Lepụ anya n’èzí.” Ndị agha nọcha n’ebe ọ bụla!
IHE M NA-AGAGHỊ ECHEFU ECHEFU
E nwere mgbe m so onye nlekọta sekit gaa ileta otu ọgbakọ dịpụrụ adịpụ ma gosi ha fim bụ́ The New World Society in Action. Ije ebe ahụ were anyị
awa asatọ ma ọ bụ itoolu. Anyị bu ụzọ banye ụgbọ okporo ígwè, mechaa banye ụgbọ ịnyịnya na-adọkpụ. Anyị bu ígwè na-enye ọkụ na ihe e ji egosi fim. Mgbe anyị mechara ruo ebe ahụ, anyị gara n’ugbo dị iche iche n’echi ya, na-akpọ mmadụ niile ka ha bịa lee fim ahụ n’abalị ụbọchị ahụ. Ihe dị ka mmadụ iri na ise bịara.Mgbe e gosiri fim ahụ ihe dị ka nkeji iri abụọ, a gwara anyị ka anyị banye n’ụlọ n’egbughị oge. Anyị buuru ihe ahụ e ji egosi fim banye n’ụlọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị mmadụ malitere iti mkpu, na-agba égbè, na-agụ egwú, sị: “Chi anyị bụ chi na-aṅụ ọbara, ọ chọrọ ọbara ndị mbịarambịa.” E nwere naanị ndị mbịarambịa abụọ n’ebe ahụ, abụkwa m otu n’ime ha! Ndị bịara ile fim ahụ ekweghị ka ìgwè mmadụ ahụ wabata n’ụlọ ahụ. Ma ndị mmegide ahụ bịaghachiri n’ihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, na-agba égbè ma na-ekwu na ha ga-ejide anyị n’ụzọ mgbe anyị ga-alawa n’ụbọchị ahụ.
Ụmụnna kpọtụụrụ ndị uwe ojii, otu n’ime ha ejiri ịnyịnya abụọ bịa n’ehihie ka o buga anyị n’obodo mepere emepe. Mgbe anyị na-aga, anyị ruwe ebe ọ bụla ọhịa dị ma ọ bụ ebe osisi juru, ọ na-ahapụ anyị, were égbè ya gbara ịnyịnya gaa lee ma è nwere ndị nọ n’ụzọ. Ahụrụ m na ndị mmadụ na-ejikarị ịnyịnya aga ebe ha chọrọ ịga. N’ihi ya, emechara m zụta otu.
E ZITEKWURU NDỊ OZI ALA ỌZỌ
Anyị nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ndị ụkọchukwu nọ na-emegide anyị. N’afọ 1955, e zitere ụmụnna ise bụ́ ndị ozi ala ọzọ, ndị ka gụchara akwụkwọ na klas nke iri abụọ na ise n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Otu n’ime ha bụ nwanna nwaanyị onye Kanada aha ya bụ Elsie Swanson. Anyị niile nọtụrụ n’alaka ụlọ ọrụ tupu e ziga ya obodo ọzọ. O ji ndụ ya niile na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị na ndị mụrụ ya anaghị enyechara ya aka. O nweghịkwa mgbe ha natara eziokwu. N’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Disemba n’afọ 1957, mụ na Elsie lụrụ. Naanị anyị gara biri n’ebe ndị ozi ala ọzọ na-ebi n’ebe ndịda Paragụwaị.
E nweghị mmiri pọmpụ n’ebe ahụ anyị bi; naanị ihe e nwere bụ olulu mmiri dị n’azụ ụlọ ahụ. N’ihi ya, ụlọ mposi na ebe a na-asa ahụ́ dị n’èzí, e nweghị ígwè e ji asa ákwà, e nweghịkwa friji. N’ihi ya, kwa ụbọchị, anyị na-azụ ihe anyị ga-esi. Ma obi dị anyị abụọ ezigbo ụtọ n’oge ahụ n’ihi na anyị enweghị ihe ndị na-eri anyị oge, anyị na ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị dịkwa ná mma.
N’afọ 1963, anyị laghachiri Ọstrelia ka anyị leta mama m. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịrịa ọrịa obi. Ọ dị ka ọ̀ bụ n’ihi na obi dị ya ụtọ ịhụ nwa ya ọ na-ahụbeghị kemgbe afọ iri. Mgbe oge ruwere ka anyị laghachi Paragụwaị, bụ́ ebe anyị na-eje ozi, o siiri anyị ezigbo ike ikpebi ihe anyị ga-eme. Ànyị ga-ahapụ mama m n’ụlọ ọgwụ, buru n’obi na onye ọzọ ga na-elekọta ya, ma laghachi Paragụwaị, bụ́ ebe anyị na-eje ozi na-atọ anyị ụtọ? Mgbe anyị kpechara ekpere ugboro ugboro, mụ na Elsie kpebiri ka anyị nọrọ lekọtawa mama m. Anyị mere otú ahụ ma ka na-eje ozi oge niile ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1966.
Ọ bụụrụ m ihe ùgwù ịbụ onye nlekọta sekit na onye nlekọta distrikti n’Ọstrelia ruo ọtụtụ afọ, kụziekwara ndị okenye ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. E mechara gbanweere anyị ọrụ ọzọ. A họpụtara m ka m soro na Kọmitii Alaka mbụ e nwere n’Ọstrelia. Mgbe a chọrọ ịrụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ, a họpụtara m ka m bụrụ onyeisi oche na kọmitii ga-ahụ maka ọrụ ahụ. E nwere ọtụtụ ndị ọrụ ma ihe, bụ́ ndị ji otu obi arụ ọrụ. Ha niile nyere aka rụọ alaka ụlọ ọrụ mara mma.
Ebe ọzọ e kenyere m ịrụ ọrụ bụ ná Ngalaba Ije Ozi, nke na-elekọta ozi ọma a na-ekwusa. Ihe ùgwù ọzọ e nyere m bụ ịbụ onye nlekọta zoonu nke na-aga eleta alaka ụlọ ọrụ ndị ọzọ n’ụwa niile iji nyere ha aka ma gbaa ha ume. Eletara m mba ụfọdụ ebe e nwere ụmụnna ndị nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ogige ịta ahụhụ ọtụtụ afọ n’ihi na ha ji obi ha niile na-erubere Jehova isi. Ụdị nleta ahụ mere ka okwukwe m sie ezigbo ike.
EBE ANYỊ NA-EJE OZI UGBU A
N’afọ 2001, mgbe m gara letachaa otu mba ma lọta, ahụrụ m otu akwụkwọ ozi e ziteere anyị ma gwa anyị ka anyị bịa Bruklin dị na Niu Yọk ma jewe ozi na Kọmitii Alaka nke Amerịka, nke e hiwere ọhụrụ. Mụ na nwunye m kpere ekpere ma chebara akwụkwọ ozi ahụ echiche. Anyị ji obi ụtọ nara ọrụ ahụ. Kemgbe ihe karịrị afọ iri na otu, anyị ka nọ na Bruklin.
Obi dị m ezigbo ụtọ na alụtara m nwunye nke na-eji obi ụtọ eme ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka e mee. Mụ na Elsie dị ihe karịrị iri afọ asatọ ugbu a, ma ahụ́ ka sitụrụ anyị ike. Anyị na-atụ anya na Jehova ga na-akụziri anyị ihe ruo mgbe ebighị ebi, anyị esorokwa na-enweta ngọzi niile ndị na-eme uche ya ga-enweta.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]
N’otu izu, m na-aba bọs. N’izu ọzọ, m na-aba ụgbọ okporo ígwè. N’izu na-eso ya, mụ abaa ụgbọala ma ọ bụ nọrọ n’ọgba tum tum, mụ na akpa uwe m na akpa ozi ọma m ana-alụ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]
Anyị na-atụ anya na Jehova ga na-akụziri anyị ihe ruo mgbe ebighị ebi
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
N’aka ekpe: Mgbe m bụ onye nlekọta sekit n’Ọstrelia N’aka nri: Mụ na papa m na mama m
[Foto dị na peeji nke 20]
N’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ, na Disemba 31, 1957