Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha “Teta n’Ụra”
Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha “Teta n’Ụra”
“Unu maara oge ahụ a kara aka, na oge awa ahụ eruwo ka unu teta n’ụra.”—ROM 13:11.
Ì NWERE IKE ỊKỌWA?
․․․․․
Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka Ndị Kraịst zere ụra ime mmụọ?
․․․․․
Olee ihe mere anyị kwesịrị iji mụrụ anya ma na-ege ntị nke ọma mgbe anyị nọ n’ozi ọma?
․․․․․
Olee uru obiọma bara n’ozi anyị?
1, 2. Olee ụdị ụra e kwesịrị ịkpọte ndị mmadụ na ya?
KWA afọ, ọtụtụ mmadụ na-anwụ n’ihi na ha roro ụra ma ọ bụkwanụ na ụra buuru ha mgbe ha na-akwọ ụgbọala. A na-achụkwa ụfọdụ ndị n’ọrụ n’ihi na ha etetaghị n’oge gaa ọrụ ma ọ bụ n’ihi na ụra buuru ha mgbe ha na-arụ ọrụ. Ma ụra ime mmụọ nwere ike ịkpata nsogbu karịa ụra nkịtị. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye mụ anya.”—Mkpu. 16:14-16.
2 Ka oké ụbọchị Jehova na-eru nso, ọtụtụ ndị na-ehi ụra ime mmụọ. Ụfọdụ ndị ndú Krisendọm ekwuodịla na ndị chọọchị ha na-ehi ụra. Gịnị bụ ụra ime mmụọ? Gịnị mere o ji dị mkpa ka ezi Ndị Kraịst mụrụ anya? Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka iteta n’ụra?
GỊNỊ BỤ ỤRA IME MMỤỌ?
3. Olee otú ị ga-esi kọwaa onye na-ehi ụra ime mmụọ?
3 Ndị nọ n’ụra anaghị arụ ọrụ. Ma ndị na-ehi ụra ime mmụọ nwere ike ịna-arụsi ọrụ ike. Ma ihe ha na-arụ agaghị eme ka ha na Chineke dị ná mma. Ha nwere ike ịna-echegbu onwe ha maka ihe ndị dịịrị ha, otú ha ga-esi kporie ndụ, nweta ọkwá ma ọ bụ akụnụba. Ihe ahụ niile na-eme ka ha ghara inwe efe ife Chineke. Ma ndị mụ anya n’ụzọ ime mmụọ maara na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” N’ihi ya, ha na-agbalịsi ike ime uche Chineke.—2 Pita 3:3, 4; Luk 21:34-36.
4. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi”?
4 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:4-8. N’ebe a, Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ ka ha ghara “ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi.” Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? Otu ụzọ anyị nwere ike isi “na-ehi ụra” bụ ileghara iwu Jehova anya. Ụzọ ọzọ bụ ichefu na oge Jehova ga-ebibi ndị na-anaghị asọpụrụ ya adịla nso. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ụdị ndị ahụ na-anaghị asọpụrụ Chineke ghara ime ka anyị mụta iche echiche na ịkpa àgwà ka ha.
5. Olee ihe ndị na-ehi ụra ime mmụọ na-eche?
5 Ụfọdụ ndị na-eche na e nweghị Chineke ga-ajụ ha ajụjụ maka ihe ndị ha na-eme. (Ọma 53:1) Ndị ọzọ chere na Chineke anaghị eche banyere ụmụ mmadụ, n’ihi ya, na ọ baghị uru ka anyị na-eche banyere Chineke. E nwekwara ndị chere na ọ bụ ịga chọọchị ga-eme ka ha bụrụ enyi Chineke. Ndị a niile na-ehi ụra ime mmụọ. Ha kwesịrị iteta. Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka?
ANYỊ KWESỊRỊ ỊMỤRỤ ANYA
6. Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịgbalịsi ike izere ụra ime mmụọ?
6 Anyị kwesịrị ịmụrụ anya, ka anyị nwee ike ịkpọte ndị ọzọ n’ụra. Gịnị ka ịmụ anya pụtara? Okwu Chineke kwuru na ndị na-arahụ ụra ime mmụọ na-arụ “ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị.” Ụfọdụ n’ime ọrụ ndị ahụ bụ oriri oké mkpọtụ, ịṅụ oké mmanya, mmekọahụ na-ezighị ezi, omume rụrụ arụ, esemokwu, na ekworo. (Gụọ Ndị Rom 13:11-14.) Izere ụdị omume ahụ nwere ike isiri anyị ike. Ịmụ anya dị anyị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na ọkwọ ụgbọala echee na o nweghị ihe ga-eme ya ma ụra buru ya mgbe ọ na-akwọ ụgbọala, o ji ndụ ya egwuri egwu. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka Onye Kraịst ghọta na ụra ime mmụọ nwere ike ịkpatara ya ọnwụ!
7. Ọ bụrụ na anyị echee na ndị mmadụ enweghị ike ịgbanwe, olee otú anyị nwere ike isi na-eje ozi anyị?
7 Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst nwere ike iche na ndị niile nọ n’ókèala ya enweghịzi mmasị n’ozi ọma nakwa na ha agaghị agbanwe. (Ilu 6:10, 11) O nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na o nweghị onye ga-ege ntị, gịnị mere m ga-eji na-agbalịsi ike inyere ndị mmadụ aka?’ Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị nwere ike ịna-arahụ ụra ime mmụọ ugbu a, ma ọnọdụ ha na àgwà ha nwere ike ịgbanwe. Ụfọdụ na-emecha teta ma nabata ozi ọma anyị. Anyị nwekwara ike inyere ha aka ma ọ bụrụ na anyị mụ anya. Otú anyị nwere ike isi nyere ha aka bụ ịmụta ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi zie ha ozi ọma, ya eruo ha n’obi. Otu ihe ga-egosi na anyị mụ anya bụ icheta ihe mere ozi anyị ji dị ezigbo mkpa.
GỊNỊ MERE OZI ANYỊ JI DỊ EZIGBO MKPA?
8. Gịnị mere ozi ọma anyị na-ekwusa ji dị ezigbo mkpa?
8 Cheta na n’agbanyeghị otú ndị mmadụ si ele ozi anyị anya ugbu a, ozi ọma anyị na-ekwusa na-ewetara Jehova otuto, o sokwa na-emezu nzube ya. N’oge na-adịghị anya, ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma. Ihe a ga-eji kpee ndị mmadụ ikpe bụ ma hà nabatara ozi ọma anyị na-ezi ha ma ọ bụ na ha anabataghị ya. (2 Tesa. 1:8, 9) Onye Kraịst ekwesịghịkwa iche na ikwusasi ozi ọma ike abaghị uru ebe ọ bụ na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Okwu Chineke mere ka anyị ghọta na ndị Jizọs kpọrọ “ewu” “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.” Ozi ọma anyị na-ekwusa na-egosi na Chineke nwere obi ebere. Ọ na-eme ka ndị mmadụ gbanwee ma nweta “ndụ ebighị ebi.” (Mat. 25:32, 41, 46; Rom 10:13-15) Ọ bụrụ na anyị ekwusaghị ozi ọma, olee otú ndị mmadụ ga-esi nụ ozi ahụ nke nwere ike ime ka ha nweta ndụ?
9. Olee otú ikwusa ozi ọma sirila baara gị na ndị ọzọ uru?
9 Izisa ozi ọma na-abakwara anyịnwa uru. (Gụọ 1 Timoti 4:16.) Ị́ chọpụtabeghị na ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova na Alaeze ya na-eme ka okwukwe gị sikwuo ike, meekwa ka ị hụkwuo Chineke n’anya? Ọ̀ bụ na o nyebereghị gị aka ịmụta àgwà Ndị Kraịst? Obi ọ́ naghị adị gị ụtọ n’ihi na ị na-aga ozi ọma iji gosi na ị hụrụ Chineke n’anya? Obi dị ọtụtụ ndị ụtọ n’ihi na mmụọ nsọ Chineke nyeere ndị ha kụziiri eziokwu Baịbụl aka ịgbanwe otú ha si ebi ndụ.
KA ANYA NA-ERU GỊ ALA
10, 11. (a) Olee otú Jizọs na Pọl si gosi na anya ruru ha ala? (b) Kọwaa otú ozi anyị nwere ike isi ka mma ma ọ bụrụ na anya na-eru anyị ala.
10 E nwere ụzọ dị iche iche e nwere ike isi mee ka ndị mmadụ malite inwe mmasị n’ozi ọma. N’ihi ya, anya kwesịrị ịna-eru Ndị Kraịst ala mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. Anya ruru Jizọs ala. Ebe ọ bụ onye zuru okè, ọ ma mgbe iwe dị otu onye Farisii n’obi, mara mgbe otu nwaanyị bụ́ onye mmehie ji obi ya niile chegharịa, marakwa na otu nwaanyị di ya nwụrụ ji ihe niile o nwere nye onyinye. (Luk 7:37-50; 21:1-4) Jizọs nyeere onye ọ bụla n’ime ha aka n’ihi na ọ maara ihe dị ha mkpa. Anya nwekwara ike iru anyị ala n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. Anya ruru Pọl onyeozi ala. Ọ gbanwere otú o si ezi ozi ọma iji ruo n’obi ụdị ndị dị iche iche.—Ọrụ 17:22, 23, 34; 1 Kọr. 9:19-23.
11 Ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ ileru anya ala dị ka Jizọs na Pọl, anyị ga-ama otú anyị ga-esi mee ka ndị mmadụ nwekwuo mmasị n’ozi ọma anyị na-ezi ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-eru mmadụ nso, legharịa anya ma è nwere ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata omenala ya, ihe ndị na-amasị ya, ma ọ̀ lụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ọ lụbeghị, ma ọ bụkwanụ ma ò nwere ụmụ. I nwere ike ịhụ ihe ọ na-eme mgbe ahụ ma kwuo ihe ọma banyere ya mgbe ị na-amalite ịgwa ya okwu.
12. Mgbe anyị nọ n’ozi ọma, gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya n’ihe anyị na-akparịta?
12 Onye anya ruru ala anaghị ekwe ka ihe ọ bụla megharịa ya anya. Mgbe anyị nọ n’ozi ọma, mkparịta ụka anyị na onye anyị na ya na-arụ nwere ike ịgba anyị ume. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ekwesịghị ichefu na ihe mere anyị ji aga ozi ọma bụ ka anyị zie ndị ọzọ ozi ọma. (Ekli. 3:1, 7) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ihe anyị na-akparịta mgbe anyị na-aga ozi ọma ghara igbochi anyị izi ndị ọzọ ozi ọma. Otu ihe ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ozi anyị bụ ikwurịta ihe ndị anyị ga-agwa ndị nwere mmasị. Ọ bụ eziokwu na ekwe ntị nwere ike inyere anyị aka n’ozi ọma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ime ka anyị kwụsịtụ mkparịta ụka anyị na onye nwe ụlọ.
CHEBARA NDỊ Ị NA-EZI OZI ỌMA ECHICHE
13, 14. (a) Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ihe na-amasị mmadụ? (b) Gịnị nwere ike ime ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ihe gbasara Chineke?
13 Ọ bụrụ na anyị mụ anya, anya ana-erukwa anyị ala, anyị ga na-ege ndị anyị na-ezi ozi ọma ntị. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ mmadụ n’ókèala anyị iji mee ka o kwuo otú obi dị ya? Ihe na-echu ya ụra ọ̀ bụ ọtụtụ okpukpe e nwere, ihe ike a na-eme n’ebe o bi, ka ọ̀ bụ otú ndị ọchịchị si kụọ afọ n’ala? Ì nwere ike ịgwa ya banyere ihe ndị dị ebube Chineke kere ma ọ bụ otú ndụmọdụ Baịbụl si baa uru, nke ga-eme ka ọ malite inwe mmasị n’ihe gbasara Chineke? Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ekpere na-amasị ndị si n’obodo ọ bụla, ọ na-amasịkwa ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke dị. Ọtụtụ ndị na-eche ma è nwere onye na-anụ ekpere. Ndị ọzọ nwere ike ịna-ajụ onwe ha, sị: ‘Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile? Ọ bụrụ na ọ naghị anụ ekpere niile, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka ọ nụ nke anyị?’
14 Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe banyere otú e si amalite mkparịta ụka ma ọ bụrụ na anyị eleruo anya n’otú ndị nkwusa bụ́ aka ochie si eme ya. Chọpụta otú ha si eme ka ọ ghara ịdị mmadụ ka hà na-ajụkasị ya ajụjụ ahụ́. Olee otú ụda olu Ilu 15:13.
ha na ihu ha si egosi na ha chọrọ ịghọta ihe onye nwe ụlọ bu n’obi?—JIRI OBIỌMA NA NKÀ NA-EZI OZI ỌMA
15. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obiọma mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?
15 Obi ọ̀ na-adị gị mma ma a kpọtee gị mgbe i himirila ụra? Ụfọdụ na-ewe iwe ma a kpọtee ha n’ike. Ọ na-akara ndị mmadụ mma ma e jiri nwayọọ kpọtee ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịkpọte ndị na-ehi ụra ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ ewee iwe mgbe ị gara izi ya ozi ọma, gịnị ka ọ ga-akacha mma ka i mee? Wetuo obi gwa ya na ị ghọtara otú obi dị ya, kelee ya maka ịgwa gị eziokwu, jirikwa nwayọọ lawa. (Ilu 15:1; 17:14; 2 Tim. 2:24) Obiọma i gosiri onye ahụ nwere ike ime ka o gee ntị mgbe Onyeàmà Jehova ọzọ bịara na nke ya.
16, 17. Olee otú anyị ga-esi jiri nghọta na-ezi ozi ọma?
16 N’oge ndị ọzọ, i nwere ike ikwu ihe ụfọdụ iji mee ka onye na-achọghị ige ntị gbanwee obi ya. Mmadụ nwere ike ịsị gị, “Biko gaanụ ziwe ndị ọzọ. Enwere m okpukpe nke m na-ekpe” ma ọ bụ, “Achọghị m ozi ọma unu” naanị n’ihi na o chere na o kwuhaala otú ahụ, unu alawa. Ma i nwere ike iji nkà na obiọma jụọ ya ajụjụ ga-eme ka ọ chọọ ige ntị n’ozi ọma.—Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.
17 Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ekwuo na ya enweghị efe, mgbe ụfọdụ, ọ ka mma ikweta ma hapụ ya. Ma, o nwere mgbe ị ga-enwe ike ikwu ihe ole na ole ga-abara onye ahụ uru. Ụmụnna ụfọdụ na-eji ihe na-erughị otu nkeji mepee Baịbụl ha, gụọ amaokwu ga-eme ka onye nwe ụlọ chee echiche, ma jụzie ya ajụjụ. Ime otú ahụ emeela ka ụfọdụ ndị nwe ụlọ kpebie na ha ga-egetụ ntị n’agbanyeghị ihe ha na-eme. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gbalịa mee otú ahụ mgbe o kwere omume?
18. Olee ihe anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike izikwu ozi ọma nke ọma mgbe anyị na-anọghị n’ozi?
18 Ọ bụrụ na anyị ejikere ikwusa ozi ọma mgbe ọ bụla, anyị ga-enwe ike ịgwa ndị anyị hụrụ mgbe anyị na-anọghị n’ozi ihe nwere ike ime ka ha nwee mmasị n’ozi ọma. Ọtụtụ ụmụnna na-etinye akwụkwọ anyị n’akpa ha ma ọ bụ n’akpa uwe ha. Ha nwekwara ike iburu n’uche otu amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ndị ọzọ ma ohere dapụta. I nwere ike ịgwa onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ unu ka ha nyere gị aka ịmụta otú e si eme ya.
JIRI NWAYỌỌ NA-AKPỌTE NDỊ IKWU GỊ
19. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịkwụsị ịgbalị inyere ndị ikwu anyị aka?
19 O doro anya na anyị chọrọ inyere ndị ikwu anyị aka ịnabata ozi ọma. (Jọsh. 2:13; Ọrụ 10:24, 48; 16:31, 32) Ọ bụrụ na ha egeghị anyị ntị mgbe mbụ anyị gbalịrị izi ha ozi ọma, o nwere ike ime ka anyị ghara ịchọ izi ha ozi ọma n’oge ọzọ. Anyị nwere ike iche na e nweghị ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụ kwuo nke ga-eme ka ha gbanwee. Ma, ihe ụfọdụ nwere ike ime nke ga-agbanwe ndụ ndị ikwu gị ma ọ bụ otú ha si eche echiche. O nwekwara ike ịbụ na ị mụtakwuola otú e si akọwa Baịbụl. N’ihi ya, ha nwere ike ige gị ntị ugbu a.
20. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri akọ na-agwa ndị ikwu anyị okwu?
20 Anyị ekwesịghị ileghara ihe ndị ikwu anyị chere anya. (Rom 2:4) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iwetu obi mgbe anyị na-agwa ha okwu otú ahụ anyị si eme mgbe anyị gara ozi ọma? Jiri obiọma na-agwa ha okwu, na-akwanyekwara ha ùgwù. Kama izi ha ozi ọma mgbe niile, ka omume gị gosi ha otú eziokwu ị mụtara sirila mee ka ndụ gị ka mma. (Efe. 4:23, 24) Mee ka ha hụ otú ndụ gị sirila gbanwee n’ihi na Jehova ‘kụziiri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.’ (Aịza. 48:17) Ka àgwà gị gosi ndị ikwu gị na ị bụ ezigbo Onye Kraịst.
21, 22. Olee ihe otu nwanna nwaanyị kọrọ nke gosiri na ọ bara uru ka anyị nọgide na-agbalị inyere ndị ikwu anyị aka ịmụta banyere Jehova?
21 Otu nwanna nwaanyị dere n’oge na-adịbeghị anya, sị: “O teela m gbalịwara izi ụmụnne m dị iri na atọ ozi ọma, ma n’àgwà m ma n’okwu ọnụ m. M na-edere ha niile akwụkwọ ozi kwa afọ. Ma, ọ bụ naanị m bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ anyị ruo iri afọ atọ.”
22 O kwukwara, sị: “Otu ụbọchị, m kpọrọ otu nwanne m nwaanyị bi n’ebe dị ezigbo anya n’ekwe ntị. Ọ gwara m na ya gwara onyeisi chọọchị ha ka ọ mụọrọ ya Baịbụl, ma o nweghị isi. Mgbe m sịrị ya na m ga-amụrụ ya Baịbụl, ya asị m: ‘Ọ dị mma, ma ihe m na-agwa gị bụ: O nweghị ihe ga-eme ka m bụrụ Onyeàmà Jehova.’ M zigaara ya akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, na-akpọkwa ya n’ekwe ntị kwa ụbọchị ole na ole. Ma, o mepebeghị akwụkwọ ahụ. M mechaziri gwa ya ka o weta akwụkwọ ya, anyị jikwa ihe dị ka nkeji iri na ise gụọ amaokwu ole na ole e depụtara na ya, kwurịtakwa banyere ha n’ekwe ntị. Mgbe anyị mere otú ahụ ugboro ole na ole, ọ chọrọ ka anyị na-ejizi ihe karịrị nkeji iri na ise na-amụ ihe. Ọ maliteziri iji aka ya akpọ m ka anyị mụọ ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akpọdị m mgbe m na-etetabeghị n’ụtụtụ ma ọ bụ ugboro abụọ n’ụbọchị. E mere ya baptizim n’afọ na-esonụ, mgbe otu afọ gakwara, ọ malitere ịsụ ụzọ.”
23. Gịnị mere na ike ekwesịghị ịgwụ anyị ka anyị na-agbalị inyere ndị mmadụ aka iteta n’ụra ime mmụọ?
23 Iji nyere ndị mmadụ aka iteta n’ụra ime mmụọ, anyị kwesịrị iji nkà na-ezi ha ozi ọma. Anyị kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike. Ọtụtụ ka na-abata n’ọgbakọ n’ihi ozi ọma anyị na-ezi. A na-eme ihe dị ka iri puku mmadụ abụọ baptizim kwa ọnwa. N’ihi ya, ka anyị cheta ndụmọdụ Pọl nyere Akịpọs, nke bụ́: “Na-eche ozi ahụ ị nabatara n’ime Onyenwe anyị nche, ka i wee jezuo ya.” (Kọl. 4:17) Isiokwu na-esonụ ga-eme ka anyị mata ihe iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma pụtara.
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Igbe dị na peeji nke 13]
IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA ỊMỤRỤ ANYA
▪ Na-eme uche Chineke mgbe niile
▪ Zere ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị
▪ Mata na ụra ime mmụọ nwere ike ịkpata ọnwụ
▪ Echela na ndị nọ n’ókèala unu enweghị ike ichegharị
▪ Mụta ụzọ ndị ọhụrụ ị ga-esi na-ezi ndị ọzọ ozi ọma
▪ Cheta na ozi gị dị mkpa