Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọ bụrụ na nwanna na-ele ndị gba ọtọ, ò nwere ebe ọ ga-eleru ya, ya emee ka a chụọ ya n’ọgbakọ?
▪ Ee, o nwere. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị jisie ike zere ihe ọ bụla gbasara ndị gba ọtọ, ma è dere ya ede ma è sere ya n’akwụkwọ ma è gosiri ya na fim ma ọ bụ n’Ịntanet.
Foto ndị gba ọtọ juru ebe niile n’ụwa taa. Ịntanet emeela ka ọtụtụ ndị nwee ike ịna-ele ndị gba ọtọ, meekwa ka ndị na-ele ya dị ọtụtụ. Ụfọdụ ndị, ma ndị na-eto eto ma ndị katarala ahụ́, ahụla ndị gba ọtọ n’Ịntanet na mberede. E nwere ndị na-akpachara anya aga n’ụdị ebe ahụ n’Ịntanet mgbe ọ bụla ha chọrọ ile ndị gba ọtọ ma ọ bụ ịgụ banyere ya n’ihi na ha nwere ike ime otú ahụ mgbe naanị ha nọ n’ụlọ ha ma ọ bụ n’ọfịs ha. Gịnị mere Ndị Kraịst ekwesịghị iji ihe a gwurie egwu?
Otu ihe kpatara ya bụ ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Mat. 5:28) N’eziokwu, ọ bụghị ihe ọjọọ ma di na nwunye nwee mmekọahụ. Ọ na-emekwa ha obi ụtọ. (Ilu 5:15-19; 1 Kọr. 7:2-5) Ma ụdị mmekọahụ ahụ na ile ndị gba ọtọ abụghị otu ihe. Kama nke ahụ, ile ndị gba ọtọ na-eme ka mmadụ hụ ebe a na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, bụ́ ihe Jizọs gwara anyị ka anyị zere. O doro anya na ile ndị gba ọtọ ma ọ bụ ịgụ banyere ya megidere iwu Chineke nyere, nke bụ́: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.”—Kọl. 3:5.
Ọ́ bụrụkwanụ na Onye Kraịst lere ndị gba ọtọ otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ? E nwere ike iji ihe o mere tụnyere nsogbu ọbụ abụ bụ́ Esaf nwere mgbe o kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, ọ fọrọ nke nta ka m zọhie ụkwụ, ọ fọrọ obere ka ụkwụ m gbụchapụ.” Olee otú Onye Kraịst ahụ ga-esi nwee akọnuche dị ọcha, ya na Chineke adịkwa ná mma, ma ọ bụrụ na o lere foto ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị gba ọtọ ma ọ bụ na-ele ebe a na-egosi ndị na-akwa iko? Obi erughịkwa Esaf ala. O kwuru, sị: “A na-eti m ihe otiti ogologo ụbọchị dum, a na-agbazikwa m kwa ụtụtụ.”—Ọma 73:2, 14.
Onye Kraịst nke na-eme ụdị ihe ọjọọ ahụ kwesịrị iteta n’ụra ma ghọta na e kwesịrị inyere ya aka. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ tupu ya amara na ọ zọhiere ụkwụ, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, gbalịanụ iji mmụọ dị nwayọọ gbazie onye ahụ. Ka onye ọ bụla n’ime unu lekwasị onwe ya anya, a dịghị ama ama, a nwaakwa onye ahụ.” (Gal. 6:1) Otu okenye ma ọ bụ okenye abụọ nwere ike inyere ya aka, ‘jirikwa okwukwe kpee ekpere ga-eme ka ahụ́ dị onye ahụ mma, Jehova agbagharakwa ya.’ (Jems 5:13-15) Ndị garala ka ndị okenye nyere ha aka ịkwụsị ile ndị gba ọtọ achọpụtala na ịbịaru Chineke nso dị ha mma otú ahụ ọ dị Esaf.—Ọma 73:28.
Ma, Pọl onyeozi kwuru na ụfọdụ ndị mere mmehie ‘echegharịghị n’adịghị ọcha na ịkwa iko na omume rụrụ arụ ha nọ na-eme.’ * (2 Kọr. 12:21) Otu prọfesọ aha ya bụ Marvin R. Vincent kwuru na okwu Grik e si sụgharịta “adịghị ọcha” pụtara “adịghị ọcha n’ihe banyere mmekọahụ jọgburu onwe ya.” Ọ dị mwute na ihe ụfọdụ ndị na-ele abụghị naanị ndị gba ọtọ ma ọ bụ ebe nwoke na nwaanyị na-akwa iko, kama ha na-ele ihe jọkarịrị ihe ndị ahụ ná njọ. Ụfọdụ na-ele ebe nwoke na-edina nwoke, ebe ọtụtụ ndị na-enwe mmekọahụ, ebe mmadụ na-edina anụmanụ, ebe a na-edina nwata, ebe ọtụtụ ụmụ nwoke na-edina otu nwaanyị n’ike, ebe a na-etirụsị ụmụ nwaanyị ahụ́, ebe e kere mmadụ agbụ na-edina ya, ma ọ bụ ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ. N’oge Pọl, ụfọdụ ndị uche ha gbara ọchịchịrị bụ ndị ‘mmehie ha na-adịghị ewute, ha mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ, jiri anyaukwu na-eme ụdị omume adịghị ọcha niile.’—Efe. 4:18, 19.
Pọl kwukwara banyere “adịghị ọcha” ná Ndị Galeshia 5:19. Otu onye Briten nke na-akọwa Baịbụl kwuru na n’amaokwu ahụ, “adịghị ọcha” “nwere ike ịbụ ụdị agụụ mmekọahụ ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị.” Ihe ndị ahụ e kwuru okwu ha jọgburu onwe ha, na-awụkwa akpata oyi. È nwere Onye Kraịst ga-asị na ile ụdị ihe ahụ abụghị inwe ‘agụụ mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị,’ nakwa na ọ jọgbughị onwe ya? Ná Ndị Galeshia 5:19-21, Pọl kwuru na “ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.” N’ihi ya, ọ bụrụ na ile ụdị ihe ndị ahụ jọgburu onwe ha amarala mmadụ ahụ́, ikekwe ya abụrụ na onye ahụ eleela ya ogologo oge, ma o kweghị echegharị, chigharịakwa, e kwesịghị ịhapụ ya n’ọgbakọ Ndị Kraịst. E kwesịrị ịchụ ya n’ọgbakọ ka ọgbakọ wee dị ọcha, ka e chebekwa ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ.—1 Kọr. 5:5, 11.
Anyị kwesịrị icheta na ụfọdụ ndị lere ụdị ihe ndị ahụ jọgburu onwe ha gakwuuru ndị okenye, ha enyekwara ha aka ịgbanwe. Jizọs rịọrọ Ndị Kraịst nọ na Sadis n’oge ochie, sị: ‘Meenụ ka ihe ndị fọdụrụ, bụ́ ndị na-achọ ịnwụ anwụ, dị ike, na-echetanụ ihe unu natara na ihe unu nụrụ, na-edebekwanụ ya, ma chegharịanụ. N’ezie, ọ bụrụ na unu etetaghị, unu agaghị ama oge awa m ga-abịakwasị unu.’ (Mkpu. 3:2, 3) Mmadụ nwere ike ichegharị, nke ga-eme ka a dọpụta ya n’ọkụ.—Jud 22, 23.
Ma, ọ ga-aka mma ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike na ya agaghị etinye aka n’ụdị nsogbu ahụ. N’eziokwu, anyị kwesịrị ikpebisi ike izere ihe ọ bụla gbasara ile ndị gba ọtọ!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Ị chọọ ịmata ihe dị iche ‘n’adịghị ọcha na ịkwa iko na omume rụrụ arụ,’ gụọ Ụlọ Nche July 15, 2006, peeji nke 29-31.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]
Onye Kraịst nke na-eme ihe ọjọọ kwesịrị iteta n’ụra ma ghọta na e kwesịrị inyere ya aka