Ì Chetara?
Ì Chetara?
Ì medala obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a:
• Ònye bụ Olivétan, oleekwa ihe mere ihe ọ rụrụ ji kwesị ịmasị anyị?
Ọ bụ onye Frans aha ya bụ́ Pierre Robert ka a na-akpọ Olivétan. N’oge ahụ e nwere mgbanwe ụfọdụ n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, ọ sụgharịrị Baịbụl gaa n’asụsụ French. O dere okwu bụ́ “onye nlekọta” kama ide “bishọp,” deekwa okwu bụ́ “ọgbakọ” kama ide “chọọchị.” N’ebe ụfọdụ, ihe o dere bụ́ aha Chineke bụ “Jehova.”—9/1, peeji nke 18-20.
• Olee ihe Chineke bu n’obi mgbe ọ gwara ndị Livaị, sị: “Abụ m òkè [unu]”?
Ebo ọ bụla dị n’Izrel ketara ala, ma, ọ bụ Jehova bụ “òkè” ndị Livaị. (Ọnụ Ọgụ. 18:20) Ha agaghị eketa ala, ma ha nwere ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche. N’agbanyeghị na ha eketaghị ala, Jehova gbooro ha mkpa ha. Taa, obi kwesịrị isi ndị ohu Chineke ike, bụ́ ndị nwere ihe ùgwù ime ka ọrụ ndị gbasara Alaeze Chineke na-aga n’ihu, na Jehova ga na-egboro ha mkpa ha.—9/15, peeji nke 7-8, 13.
• Olee otú anyị si mara mgbe ndị Babịlọn bibiri Jeruselem oge ochie?
Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ ndị dịrị ndụ obere oge ka e bibichara Jeruselem, enweghị otu olu n’ihe ha dere banyere ndị eze chịrị Babịlọn na oge ha chịrị ụwa. Ma, ndị ọkà mmụta kweere na Saịrọs nke Abụọ meriri Babịlọn n’afọ 539 T.O.A., bụ́ afọ ihe dị mkpa mere. A tọhapụrụ ndị Juu, ha erutekwa n’ala ha n’afọ 537 T.O.A. Baịbụl kwuru na ha nọrọ afọ iri asaa n’ebe a dọọrọ ha n’agha gaa. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. (2 Ihe 36:21, 22; Jere. 29:10; Dan. 9:1, 2)—10/1, peeji nke 26-31.
• Gịnị nwere ike inyere Onye Kraịst aka ịma ma ihe ụfọdụ e ji atụrụ ndụ hà bara uru ma ọ bụ na ha abaghị?
Iji mara ma ihe anyị họọrọ iji atụrụ ndụ ọ̀ na-amasị Chineke ma ọ bụ na ọ naghị amasị ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị sị, Olee ụdị ntụrụndụ ọ bụ? Ole mgbe m ga-eji atụrụ ndụ? Ole ndị ka mụ na ha ga-eso atụrụ ndụ?—10/15, peeji nke 9-12.
• Olee ihe mere o ji dị njọ ite ime?
Chineke weere ndụ ka ihe dị nsọ, werekwa nwa e bu n’afọ ka onye bụ mmadụ. (Ọma 139:16) Igbu nwa e bu n’afọ bụ igbu ọchụ. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na Iwu e nyere ụmụ Izrel kwuru na onye gburu nwa e bu n’afọ ga-aza ajụjụ maka ya. (Ọpụ. 21:22, 23)—11/1, peeji nke 6.
• Olee otú ihe e dere n’Ilu 7:6-23 nwere ike isi nyere anyị aka ịghara ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ?
N’ebe ahụ, a kọrọ banyere otu nwa okorobịa nọ na-aga n’ebe nwaanyị na-akwa iko bi. Nwaanyị ahụ ratara ya. Taa, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ịga ebe ndị e nwere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Ịntanet, kwesịkwa ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka mgbe anyị na-agawabeghịdị ebe ihe ndị ahụ dị n’Ịntanet.—11/15, peeji nke 9-10.
• Olee otú anyị si mara ma ụwa ọ̀ ga-agwụ n’afọ 2012 ma ọ bụ na ọ gaghị agwụ?
Ụfọdụ chere na ụwa ga-agwụ n’afọ 2012 n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka afọ e nwere na kalenda ndị Maya oge ochie ga-agwụ. Ma, nke ahụ agaghị eme, n’ihi na Jehova kere ụwa ka e biri n’ime ya. Baịbụl kwuru na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Ekli. 1:4; Aịza. 45:18)—12/1, peeji nke 10.
• Olee ndị so dee Baịbụl bụ́ ndị nọ ya na Pentikọst 33 O.A.?
O yiri ka mmadụ isii n’ime ndị so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nọ ya. Mmadụ atọ n’ime ndịozi, ya bụ, Matiu, Jọn, na Pita, nọ ya. Abụọ n’ime ụmụnne Jizọs, ya bụ, Jems na Jud, nọkwa ya. O yikwara ka nwa okorobịa ahụ bụ́ Mak ọ̀ nọkwa ya.—12/1, peeji nke 22.