Na-azụnụ Ndị Ọzọ Ka Ha Ruo Eruo
Na-azụnụ Ndị Ọzọ Ka Ha Ruo Eruo
“Onye ọ bụla a kụziiri ihe n’ụzọ zuru okè ga-adị ka onye nkụzi ya.”—LUK 6:40.
1. Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, olee otú o si malite otu ọgbakọ pụrụ iche?
JỌN ONYEOZI kwuru ná ngwụcha Oziọma o dere, sị: “N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jizọs mere, bụ́ ndị, ọ bụrụ na e dee ha edee n’ụzọ zuru ezu, m chere na ụwa apụghị ịba akwụkwọ mpịakọta ndị e dere ha.” (Jọn 21:25) Ụfọdụ n’ime ihe niile Jizọs rụzuru mgbe o jere ozi pụrụ iche nke were obere oge bụ ịchọta ndị ikom ga-arụ ọrụ a, zụọ ha ma hazie otú ha ga-esi na-arụ ya ma ọ laghachi eluigwe. Tupu Jizọs alaghachi eluigwe n’afọ 33 O.A., ọ malitere ọgbakọ pụrụ iche nke ga-enwe ọtụtụ puku mmadụ n’oge na-adịghị anya.—Ọrụ 2:41, 42; 4:4; 6:7.
2, 3. (a) Olee ihe mere o ji dịsie mkpa ike ka ụmụnna nwoke ndị e mere baptizim gbalịa ruo eruo? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?
2 Taa, e nwere ihe karịrị nde mmadụ asaa na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile, bụ́ ndị nọ n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ. N’ihi ya, a chọrọ ụmụ nwoke ndị ga na-edu ndú n’ọgbakọ ndị a. Dị ka ihe atụ, a chọsiri ndị okenye ike. E kwesịrị ịja ndị na-agba mbọ ka ha ruo eruo ịrụ ọrụ a mma, n’ihi na “agụụ ezi ọrụ na-agụ” ha.—1 Tim. 3:1.
3 Ma, e nwere ihe nwoke ga-emerịrị tupu ya eruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye n’ọgbakọ. Ọ bụghị ebe mmadụ gụruru n’akwụkwọ ma ọ bụ ihe ndị ọ hụrụla ná ndụ ka Luk 6:40) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ụzọ ndị Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Ozizi Bụ́ Ọkà, si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka iru eru ịrụ ọrụ a, anyị ga-ahụkwa ihe anyị ga-amụta n’ihe o mere.
e ji ama onye ruru eru ịrụ ọrụ a. Nwoke chọrọ ịrụ ọrụ a nke ọma ga-abụrịrị onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ọ ga na-akpa àgwà ndị gosiri na ya na Jehova dị ná mma. Olee otú e nwere ike isi nyere ụmụnna nwoke aka ka ha ruo eruo? Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla a kụziiri ihe n’ụzọ zuru okè ga-adị ka onye nkụzi ya.” (“Ana M Akpọ Unu Ndị Enyi M”
4. Olee otú Jizọs si gosi na ya bụ ezigbo enyi ndị na-eso ụzọ ya?
4 Jizọs eledaghị ndị na-eso ụzọ ya anya, kama o mesoro ha ihe ka ndị enyi ya. Ya na ha nọrịrị, ọ tụkwasịkwara ha obi. O mekwara ka ha mara ‘ihe niile ọ nụrụ n’ọnụ Nna ya.’ (Gụọ Jọn 15:15.) Cheedị otú obi ga-esi tọọ ha ụtọ mgbe Jizọs zara ha otu ajụjụ ha jụrụ ya. Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Mat. 24:3, 4) O mekwara ka ha mara ihe ọ na-eche na otú obi dị ya. Dị ka ihe atụ, n’abalị ahụ a raara Jizọs nye ndị iro ya, ọ kpọọrọ Pita, Jems, na Jọn gawa n’ogige Getsemeni, bụ́ ebe ọ nọ kpee ekpere si ya n’obi n’oge ahụ ihe na-esiri ya ike. O nwere ike ịbụ na ndịozi atọ a anụghị ihe Jizọs nọ na-ekwu n’ekpere, ma ọ ga-abụ na ha ma na ihe na-esiri ya ezigbo ike mgbe ahụ. (Mak 14:33-38) Cheekwa otú obi dị ha atọ mgbe ha hụrụ ka Jizọs nwoghara. (Mak 9:2-8; 2 Pita 1:16-18) Otú Jizọs na ndị na-eso ụzọ si bụrụ ezigbo enyi nyeere ha aka mgbe ọ laghachiri eluigwe ịrụ ọrụ dị ezigbo mkpa o nyere ha.
5. Olee ụzọ ụfọdụ ndị okenye si ewepụta onwe ha enyere ndị ọzọ aka?
5 Ndị okenye ọgbakọ taa na-emeta ndị ọzọ enyi ka Jizọs ma na-enyere ha aka. Ha na-enwe mmasị n’ihe gbasara ụmụnna ha iji gosi na ha hụrụ ha n’anya. Ọ bụ eziokwu na ndị okenye ma na e nwere ihe ha na-ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ, ha anaghị ezo ihe niile ezo. Ndị okenye tụkwasịrị ụmụnna ha obi, ha na-akụzikwara ha eziokwu ndị ha mụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Ndị okenye anaghịkwa eleda ohu na-eje ozi nke ka na-eto eto anya. Kama nke ahụ, ha na-ele ya anya ka onye ji ofufe Jehova kpọrọ ihe, onye nwere ike ịna-enwe ọganihu, nakwa onye na-arụ ọrụ na-abara ọgbakọ uru.
“M Na-enye Unu Ihe Nlereanya”
6, 7. Kọwaa otú Jizọs si hapụrụ ndị na-eso ụzọ ya ezigbo ihe nlereanya nakwa otú ha si mee ka ya.
6 Ọ bụ eziokwu na ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ihe ndị gbasara ofufe Jehova kpọrọ ihe, mgbe ụfọdụ, otú e si zụlite ha na otú ndị obodo ha si ele ihe anya na-eme ka ha na-ele ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. (Mat. 19:9, 10; Luk 9:46-48; Jọn 4:27) Ma, Jizọs agaghị katọwa ha ma ọ bụ wesawa ha iwe. Ọ gwaghị ha mee ihe ha na-agaghị emeli, ọ gwaghịkwa ha ka ha mee ihe yanwa na-anaghị eme. Kama nke ahụ, Jizọs mere ihe ọ gwara ha ka ha mee.—Gụọ Jọn 13:15.
7 Olee ụdị ihe nlereanya Jizọs hapụụrụ ndị na-eso ụzọ ya? (1 Pita 2:21) Ọ chụwaghị ọtụtụ ihe n’ihi na ọ chọrọ inwe ohere jeere ndị ọzọ ozi. (Luk 9:58) Jizọs ma ebe ike ya ruru, ihe niile ọ kụziri sikwa n’Akwụkwọ Nsọ. (Jọn 5:19; 17:14, 17) Ahụ́ na-eru ndị ọzọ ala ịbịakwute ya, ọ dịkwa obiọma. Ihe mere o ji mee ihe niile o mere bụ n’ihi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya. (Mat. 19:13-15; Jọn 15:12) Ndịozi Jizọs mụtara ezigbo ihe n’aka Jizọs. Dị ka ihe atụ, ụjọ atụghị Jems mgbe a chọrọ igbu ya, o jegideere Chineke ozi ruokwa mgbe e gburu ya. (Ọrụ 12:1, 2) Jọn sochiri nzọụkwụ Jizọs anya ruo ihe karịrị afọ iri isii.—Mkpu. 1:1, 2, 9.
8. Olee otú ndị okenye nwere ike isi bụrụ ezigbo ihe nlereanya ụmụ nwoke ndị na-eto eto ga-eso?
8 Ndị okenye ndị hụrụ ndị ọzọ n’anya, dịrị umeala n’obi, ma jiri oge ha na ume ha na-enyere ndị ọzọ aka bụ ezigbo ihe nlereanya ụmụ nwoke ndị na-eto eto ga-eso. (1 Pita 5:2, 3) Ihe ọzọkwa bụ na obi na-adị ndị okenye ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ ana-eṅomi ha n’ihi na ha nwere okwukwe siri ike, mara akụzi ihe, na-ebi ndụ dị mma, na-emekwa nke ọma n’ozi ọma.—Hib. 13:7.
‘Jizọs Zipụrụ Ha Mgbe O Nyechara Ha Iwu’
9. Olee otú anyị si mara na Jizọs zụrụ ndị na-eso ụzọ ya ha amụta otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma?
9 Mgbe Jizọs jichara ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ruo ihe dị ka afọ abụọ, o mere ka ozi ọma ahụ gbasakwuo site n’izipụ ndịozi ya iri na abụọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ma, o bu ụzọ gwa ha otú ha ga-esi ekwusa ya. (Mat. 10:5-14) Mgbe Jizọs chọrọ ịrụ ọrụ ebube nye ọtụtụ puku mmadụ nri, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi hazie ndị mmadụ na otú ha ga-esi keere ha nri. (Luk 9:12-17) N’ihi ya, o doro anya na Jizọs zụrụ ndị na-eso ụzọ ya, gwa ha ihe ha ga-eme na otú ha ga-esi eme ya. Otú a o si zụọ ha, nakwa mmụọ nsọ e nyere ha, nyeere ha aka ka oge na-aga ịhazi ọrụ nkwusa ahụ na ikwusa ya n’ọtụtụ ebe n’afọ 33 O.A., nakwa mgbe ọ gachara.
10, 11. Olee otú ndị okenye na ndị ọzọ nwere ike isi na-azụ ndị ọhụrụ?
10 Taa, a na-amalite inye nwoke ọzụzụ ozugbo o kwere ka a mụwara ya Baịbụl. Anyị nwere ike inyere ya aka ka ọ mụta ịna-agụ ihe nke ọma. Anyị ga na-enyere ya aka n’ihe ndị ọzọ ka anyị na-amụrụ ya Baịbụl. Ọ bụrụ na ọ malite ịbịa ọmụmụ ihe, anyị ga na-azụ ya ya amalite ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, malitekwa ime ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na e mechaa ya baptizim, ụzọ ọzọ e nwere ike isi na-azụ ya bụ ịgwa ya ka ọ na-enye aka na-arụzi ihe ndị e kwesịrị ịrụzi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka oge na-aga, e nwere ike ịgwa ya ihe ọ ga-eme ka o ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi.
11 Ọ bụrụ na okenye na-enye nwanna nwoke e mere baptizim ọrụ, o kwesịrị ịkọwara ya otú nzukọ a chọrọ ka e si na-ahazi ihe, gwakwa ya ihe ndị ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ ya nke ọma. O kwesịrị ịhụ na nwanna ahụ ọ na-enye ọzụzụ ghọtara ihe a chọrọ ka o mee. Ọ bụrụ na ihe a sịrị ya mee na-esitụrụ ya ike, okenye dị obiọma agaghị ekwubi ozugbo ahụ na o rughị eru. Kama, ọ ga-eji obiọma gwa ya ebe ndị ọ ga-emezikwu ihe na otú ọ ga-esi eme ha. Ọ na-amasị ndị okenye inyere nwanna nwoke aka ka ọ rụọ ọrụ e nyere ya nke ọma n’ihi na ha ma na ijere ndị nọ n’ọgbakọ ozi ga-eme ka nwanna ahụ nwee obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.
“Onye Na-aṅa Ntị na Ndụmọdụ Maara Ihe”
12. Olee ihe mere ndụmọdụ Jizọs nyere ji baara ndị o nyere ya uru?
12 Otu ụzọ Jizọs si nye ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ bụ inye ha ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa ka o mee otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ baara Jems na Jọn mba mgbe ha chọrọ ka ọkụ si n’eluigwe bịa rechapụ ụfọdụ ndị Sameria na-ekweghị anabata Jizọs. (Luk 9:52-55) Mgbe nne Jems na Jọn bịakwutere Jizọs ma rịọchitere ụmụ ya arịrịọ ka Jizọs nye ha ọkwá dị mma n’Alaeze eluigwe, Jizọs gwara Jems na Jọn, sị: “Ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m na n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.” (Mat. 20:20-23) Ndụmọdụ niile Jizọs nyere ndị mmadụ doro anya ma baara ha uru. Ha niile sikwa n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-atụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya eme. (Mat. 17:24-27) Jizọs makwa na o nwere ihe ndị na-eso ụzọ ya na-agaghị emeli, o nweghịkwa mgbe ọ tụrụ anya ka ha mee ihe ha na-agaghị emeli. Ihe mere o ji nye ha ndụmọdụ bụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya.—Jọn 13:1.
13, 14. (a) Ònye ka e kwesịrị inye ndụmọdụ? (b) Kwuo ụdị ndụmọdụ okenye nwere ike inye onye na-anaghị eme nke ọma n’ọgbakọ.
13 A ga-enwerịrị oge ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ ga-adị nwanna nwoke ọ bụla na-agba mbọ ka ya ruo eruo ije ozi n’ọgbakọ mkpa. Ilu 12:15 kwuru, sị: “Onye na-aṅa ntị na ndụmọdụ maara ihe.” Otu nwanna nwoke na-eto eto kwuru, sị: “Achọpụtara m na ihe kacha siere m ike bụ na ọ na-adị m ka agaghị m eru eru ije ozi n’ọgbakọ. Ma, ndụmọdụ otu okenye nyere m mere ka m ghọta na m ga-emeli ya.”
14 Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na àgwà ụfọdụ na-adịghị mma onye na-eto eto na-akpa na-eme ka ọ ghara ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ, Gal. 6:1) Mgbe ụfọdụ, ndị okenye na-enye mmadụ ndụmọdụ iji nyere onye ahụ aka ịmụta iji ihe akpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na nwanna nwoke anaghị emerucha ihe otú o kwesịrị ime, ha nwere ike inyere ya aka ịghọta na Jizọs, bụ́ onye gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ. (Mat. 28:19, 20; Luk 8:1) Ọ bụrụ na ha achọpụta na e nwere nwanna nwoke na-achọ ịnọ n’isi, ha nwere ike ịgwa ya otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ka ha ghọta na ọ dị njọ mmadụ ịchọ ịbụ onye a ma ama. (Luk 22:24-27) Gịnịkwanụ ka ha ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere nwanna nwoke ọ na-esiri ike ịgbaghara ndị mejọrọ ya? Ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ohu ahụ nke na-ekweghị agbaghara onye ji ya obere ụgwọ n’agbanyeghị na a gbaghaara yanwa nnukwu ụgwọ o ji ga-enyere onye ahụ aka. (Mat. 18:21-35) Mgbe ọ bụla e nwere ihe ndị okenye kwesịrị ikwo nye ndụmọdụ, ha kwesịrị inye ya n’egbughị oge.—Gụọ Ilu 27:9.
ha na-eji mmụọ dị nwayọọ agbazi onye ahụ. (“Na-azụ Onwe Gị”
15. Olee otú ndị ezinụlọ nwanna nwoke nwere ike isi nyere ya aka ka ọ na-ejere ndị ọzọ ozi?
15 Ndị okenye na-agbasi mbọ ike ịzụ ụmụnna ndị nwoke ka ha ruo eruo ije ozi n’ọgbakọ. Ma, ndị ọzọ nwekwara ike inyere ha aka. Dị ka ihe atụ, ndị ezinụlọ onye ahụ nwere ike inyere ya aka iru eru, ha kwesịkwara ime otú ahụ. Ọ bụrụkwa na ọ bụ okenye, nwunye ya na ụmụ ya kwesịrị ịna-akwado ya. Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha dum kwe ka ọ na-arụrụ ọgbakọ ọrụ, nke a ga-eme ka ọ na-arụ ọrụ ya nke ọma. E wezụga yanwa, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu maka otú ndị ezinụlọ ya si ekwe ka ọ na-arụ ọrụ ya n’ọgbakọ.—Ilu 15:20; 31:10, 23.
16. (a) Olee onye ọ dị n’aka ịgbasi mbọ ike ruo eruo? (b) Olee otú nwanna nwoke nwere ike isi ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye?
16 Ọ bụ eziokwu na ndị ọzọ nwere ike inye aka, ọ bụ nwanna nwoke ahụ chọrọ iru eru ka ọ dịịrị ịgba mbọ ruo eruo. (Gụọ Ndị Galeshia 6:5.) Ọ bụghị naanị mgbe nwanna nwoke ghọrọ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye ka o nwere ike inyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ ịna-ejechi ozi anya. Ma, onye chọrọ ka a họpụta ya ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-eme ihe ndị ahụ e dere n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị ga-eme ka o ruo eruo. (1 Tim. 3:1-13; Taị. 1:5-9; 1 Pita 5:1-3) Ya mere, ọ bụrụ na nwanna nwoke chọrọ ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye ma a họpụtabeghị ya, o kwesịrị ileru anya mara ebe o kwesịrị imezikwu ihe ka e nwee ike ịhọpụta ya. Nke a pụtara na ọ ga na-agụchi Baịbụl anya, na-amụsi ihe ike, na-ewepụta oge atụgharị uche n’ihe ọ na-amụ, na-ekpechi ekpere anya, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma. Ọ bụrụ na ọ na-eme otú a, ọ na-eme ihe Pọl dụrụ Timoti ọdụ ka ọ na-eme. Ọ gwara ya, sị: “Na-azụ onwe gị ka i wee bụrụ onye na-asọpụrụ Chineke.”—1 Tim. 4:7.
17, 18. Gịnị ka nwanna nwoke e mere baptizim ga-eme ma ọ bụrụ na ọ dị ya ka ọ gaghị eruli eru ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye?
17 Ma, gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na nwanna nwoke ekweghị agba mbọ iru eru n’ihi na o chere na o nweghị ihe ya ga-eme ruo eruo? O kwesịrị ịtụgharị uche n’ihe Jehova Chineke na Jizọs Kraịst na-emere anyị. N’eziokwu, Jehova “na-eburu anyị ibu anyị kwa ụbọchị.” (Ọma 68:19) N’ihi ya, Nna anyị nke eluigwe nwere ike inyere nwanna nwoke aka ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere ya n’ọgbakọ. Nwanna nwoke na-abụghị ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye kwesịrị icheta na a chọsiri ụmụnna nwoke ndị ga-eje ozi n’ọgbakọ ike. Ichebara nke a echiche nwere ike ime ka nwanna nwoke kwụsị iche na o nweghị ihe ga-eme ka ya ruo eruo. O nwere ike ịrịọ Chineke ka o nye ya mmụọ nsọ n’ihi na ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ udo na njide onwe onye. Ihe ndị a ga-enyere mmadụ aka ịkwụsị iche na o nweghị ihe ga-eme ka ya ruo eruo. (Luk 11:13; Gal. 5:22, 23) Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi ndị niile bu ezigbo ihe n’obi na-agba mbọ iru eru.
18 O nwere ike ịbụ na ihe mere nwanna nwoke anaghị agba mbọ iru eru bụ n’ihi na ọ chọghị ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. Ya dị otú ahụ, gịnị nwere ike inyere ya aka? Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu, n’ihi ihe dị ya ụtọ, ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.” (Fil. 2:13) Ọ bụ Chineke na-eme ka mmadụ chọọ ijere ya ozi, mmụọ Jehova nwekwara ike ime ka onye ahụ nwee ume ọ ga-eji ejere ya ozi. (Fil. 4:13) Ihe ọzọkwa bụ na Onye Kraịst nwere ike ịrịọ Chineke ka o nyere ya aka ime ihe ziri ezi.—Ọma 25:4, 5.
19. Olee ihe ime ka “ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ee, ndị isi asatọ” bilie pụtara?
19 Jehova na-eme ka mgbalị ndị okenye na-eme iji zụọ ndị ọzọ gaa nke ọma. Ọ ga-agọzikwa ndị nabatara ọzụzụ e nyere ha ma gbaa mbọ ruo eruo ịbụ ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye n’ọgbakọ. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na a ga-eme ka “ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ee, ndị isi asatọ” bilie, ya bụ, ụmụ nwoke ole a chọrọ ka ha na-eje ozi n’ọgbakọ. Ha ga na-edu ndú ná nzukọ Jehova. (Maị. 5:5) Obi dị anyị nnọọ ụtọ na a na-azụ ọtụtụ ụmụnna nwoke, ha ejirikwa obi umeala na-agba mbọ iru eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye, bụ́ ihe ùgwù nke na-ewetara Jehova otuto!
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ha eruo eruo ịrụ ọrụ ndị ka mkpa?
• Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-eme ka Jizọs ka ha na-enyere ụmụnna ndị nwoke nọ n’ọgbakọ ha aka iru eru ije ozi n’ọgbakọ?
• Olee otú ndị ezinụlọ mmadụ nwere ike isi nyere ya aka iru eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye?
• Olee ihe nwanna nwoke nwere ike ime n’onwe ya iji ruo eruo?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Olee otú i nwere ike isi na-azụ onye ị na-amụrụ Baịbụl nke na-agba mbọ inwe ọganihu?
[Foto dị na peeji nke 32]
Olee otú ụmụnna nwoke nwere ike isi gosi na ha na-agba mbọ iru eru?