Tụkwasị Jehova, Bụ́ “Chineke Nke Nkasi Obi Niile,” Obi
Tụkwasị Jehova, Bụ́ “Chineke Nke Nkasi Obi Niile,” Obi
“Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile bụrụ onye a gọziri agọzi.”—2 KỌR. 1:3.
1. Olee ihe dị mmadụ ọ bụla mkpa n’agbanyeghị afọ ndụ ya?
NKASI obi dị anyị niile mkpa, malite mgbe a mụrụ anyị gawa. Nwa a mụrụ ọhụrụ na-ebe àkwà iji gosi na ya chọrọ ka a kasie ya obi. Ikekwe ọ chọrọ ka e kuru ya ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na agụụ na-agụ ya. Nkasi obi na-adịkarịkwa anyị mkpa ka anyị na-eto. Ọ na-adị anyị mkpa karịchaa mgbe ihe na-esiri anyị ike.
2. Olee otú Jehova si kwe ndị tụkwasịrị ya obi nkwa na ya ga-akasi ha obi?
2 Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike ịkasi anyị obi. Ma, mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ enweghị ike inyere anyị aka n’ihe ụfọdụ na-akpatara anyị nsogbu. Ọ bụ naanị Chineke nwere ike ịkasi anyị obi n’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị. Okwu ya na-emesi anyị obi ike. Ọ sịrị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, . . . ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti.” (Ọma 145:18, 19) N’eziokwu, “anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.” (Ọma 34:15) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nyere anyị aka ma kasie anyị obi, anyị ga-atụkwasịrịrị ya obi. Ọbụ abụ bụ́ Devid mere ka nke a doo anya mgbe ọ na-abụ abụ. Ọ sịrị: “Jehova ga-abụrụ onye ọ bụla e gburu mmụọ ya ebe dị elu e wusiri ike, ebe dị elu e wusiri ike n’oge ahụhụ. Ndị maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, n’ihi na gị onwe gị, Jehova, agaghị ahapụ ndị na-achọ gị.”—Ọma 9:9, 10.
3. Olee ihe Jizọs ji mee ihe atụ otú Jehova si hụ ndị ohu ya n’anya?
3 Ndị ohu Jehova dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. Jizọs mere ka nke a doo anya mgbe ọ sịrị: “A na-ere nza ise mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali naanị ihe dị nta, ka ọ́ bụghị ya? Ma a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke. Ma a gụwo ọbụna ntutu isi niile unu ọnụ. Unu atụla egwu; unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Luk 12:6, 7) Jehova si n’ọnụ Jeremaya gwa ndị ohu ya n’oge ochie, sị: “Enwere m ịhụnanya na-adịru mgbe ebighị ebi n’ebe ị nọ. Ọ bụ ya mere m ji were obiọma dọta gị.”—Jere. 31:3.
4. Gịnị mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi na ọ ga-eme ihe ndị o kwere ná nkwa?
4 Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, kwerekwa na ọ ga-emezu ihe ndị o kwere ná nkwa, nke a nwere ike ịkasi anyị obi mgbe anyị nwere nsogbu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi otú Jọshụa si tụkwasị ya. Jọshụa sịrị: “Ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.” (Jọsh. 23:14) Ihe ọzọkwa bụ na obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụgodị na nsogbu ndị na-abịara anyị emee ka anyị daa mbà n’obi mgbe ụfọdụ, “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi” ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-ejere ya ozi.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.
5. Olee otú anyị ga-esi nwee ike ịkasi ndị ọzọ obi?
5 Pọl onyeozi kpọrọ Jehova “Chineke nke nkasi obi niile.” Nke a pụtara na Jehova ga-akasi ndị ihe na-esiri ike ma ọ bụ ndị na-eru uju obi. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) O nweghị ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla nwere ike igbochi Nna anyị nke eluigwe ime ihe ọ chọrọ ime, n’ihi ya, ọ ga-eme ihe ọ bụla dị mkpa iji kasie ndị hụrụ ya n’anya obi. Anyịnwa nwekwara ike ịkasi ndị kwere ekwe ibe anyị “nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla” obi. Anyị ga-esi “ná nkasi obi nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị” na-eme otú a. Nke a gosiri n’eziokwu na o nweghị ihe ga-egbochili Jehova ịkasi ndị nwere nsogbu obi!
Idi Ihe Ndị Na-akpata Nsogbu
6. Kwuo ihe ụfọdụ ndị nwere ike ịkpata nsogbu.
6 E nwere ọtụtụ ihe ndị na-eme ka nkasi obi dị anyị mkpa ná ndụ. Otu n’ime ihe ndị kacha eme ka anyị na-eru uju bụ ma onye anyị hụrụ n’anya nwụọ, karịchaa ọ bụrụ na onye ahụ bụ di ma ọ bụ nwunye anyị ma ọ bụkwanụ nwa anyị. E nwekwara ndị e kwesịrị ịkasi obi n’ihi na a na-asọ ha asọ, ma ọ bụ na a kpọrọ ha asị. Ihe ndị ọzọ ndị nwekwara ike ime ka ndị mmadụ chọọ ka a kasie ha obi bụ ọrịa, nká, ịda ogbenye, nsogbu dị n’etiti ha na di ma ọ bụ nwunye ha, ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị ọzọ juru n’ụwa.
7. (a) Olee ihe mere o ji dị anyị mkpa ka a kasie anyị obi mgbe nsogbu bịaara anyị? (b) Olee ihe Jehova nwere ike ime iji gwọọ obi “tiwara etiwa, nke nọ ná mwute”?
7 Nkasi obi dị anyị mkpa mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị. Ihe mere o ji dị anyị mkpa n’oge a bụ n’ihi na obi anaghị adị anyị mma ma nsogbu bịara anyị, uche anaghịkwa ezu anyị ike. Nsogbu ahụ nwekwara ike ịkpatara anyị ọrịa, nweekwa ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere obi anyị. Baịbụl kwuru na obi nwere ike ‘itiwa etiwa, nọrọkwa ná mwute.’ (Ọma 51:17) Jehova ga-enyeliri anyị aka ma nke a mee n’ihi na “ọ na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” (Ọma 147:3) Ihe sigodị oké ike, Chineke nwere ike ịkasi onye obi ya tiwara etiwa obi ma ọ bụrụ na onye ahụ ejiri obi ike kpekuo ya ekpere ma na-eme ihe o nyere n’iwu.—Gụọ 1 Jọn 3:19-22; 5:14, 15.
8. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka mgbe anyị nwere ihe ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị?
8 Nkasi obi dịkwa anyị mkpa mgbe ọtụtụ nsogbu mere ka uche ghara izu anyị ike. O nwere ike anyị agaghị edili nsogbu ndị a n’ike aka anyị. Ma, otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.” (Ọma 94:19) Pọl dere, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 4:6, 7) Ịgụ Akwụkwọ Nsọ na ịtụgharị uche n’ihe anyị gụrụ nwere ike inyere anyị ezigbo aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị.—2 Tim. 3:15-17.
9. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ma anyị nwee ihe na-enye anyị nsogbu n’obi?
9 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike inwe ihe ga-akụda anyị mmụọ nke na anyị nwere ike ịmalite chewe echiche na-ezighị ezi. Ikekwe o nwere ike ịdị anyị ka anyị agaghị emeli ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme ma ọ bụkwanụ na anyị agaghị arụli ọrụ e nyere anyị n’ọgbakọ. Jehova nwekwara ike ịkasi anyị obi ma nyere anyị aka na nke a. Dị ka ihe atụ, mgbe a họpụtara Jọshụa ka o duo ndị Izrel ka ha merie mba ndị iro ha dị ike, Mozis gwara ụmụ Izrel, sị: “Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike. Atụla egwu, amakwala jijiji n’ihu ha, n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka gị na ya so na-aga. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.” (Diut. 31:6) Jehova nyeere Jọshụa aka ya eduru ndị Izrel baa n’Ala Nkwa ahụ, meriekwa ndị iro ha niile. Jehova nyekwaara Mozis aka n’Oké Osimiri Uhie.—Ọpụ. 14:13, 14, 29-31.
10. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ma ọ bụrụ na e nwee ihe ndị kpataara anyị ọrịa?
10 Ihe ndị na-eme ka obi ghara iru anyị ala nwekwara ike ịkpatara anyị ọrịa. Iri ihe nke ọma, izu ezigbo ike, imega ahụ́, na idebe onwe anyị ọcha nwere ike inyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu, 2 Kọr. 4:8, 9.
ọ ga-enye aka eme ka ahụ́ gbasie anyị ike. N’ihi ya, ọ bụrụ na ihe na-esiri anyị ike, ọ ga-adị mma ma anyị cheta Pọl, chetakwa okwu na-agba ume o kwuru. Ọ sịrị: “A na-akpagide anyị n’ụzọ niile, ma a kpagideghị anyị nke na anyị enweghị ike imegharị ahụ́; anyị na-enwe mgbagwoju anya, ma ọ bụghị n’enwetụghị ụzọ mgbapụ; a na-akpagbu anyị, ma a dịghị ahapụ anyị; a na-akwada anyị, ma a dịghị ebibi anyị.”—11. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ma anyị rịawa ọrịa ime mmụọ?
11 Ụfọdụ nsogbu nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ. Jehova nwekwara ike inyere anyị aka ma nke a mee. Okwu ya mesiri anyị obi ike, sị: “Jehova na-akwado ndị niile na-ada ada, ọ na-ekulitekwa ndị niile huuru ehuru.” (Ọma 145:14) Ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa ime mmụọ, anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka. (Jems 5:14, 15) Ịnọkwa na-eche banyere olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi nwere ike inye aka mee ka okwukwe anyị sie ike mgbe ọnwụnwa bịaara anyị.—Jọn 17:3.
Ihe Atụ Ndị Na-egosi Otú Chineke Si Akasi Anyị Obi
12. Kọwaa otú Jehova si kasie Ebreham obi.
12 Otu ọbụ abụ sịrị: “Cheta okwu ị [Jehova] gwara ohu gị, bụ́ nke i mere ka m chere. Nke a bụ ihe na-akasi m obi mgbe m nọ ná mmekpa ahụ́, n’ihi na okwu gị echebewo m ndụ.” (Ọma 119:49, 50) Taa, anyị nwere Okwu Jehova e dere ede, bụ́ nke nwere ọtụtụ ihe atụ ndị na-egosi otú Chineke si akasi anyị obi. Dị ka ihe atụ, ọ ga-abụ na obi adịghị Ebreham mma mgbe ọ nụrụ na Jehova na-aga ibibi Sọdọm na Gọmọra. Nna ochie a kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ Chineke, sị: “Ị̀ ga-ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume?” Jehova kasiri Ebreham obi site n’imesi ya obi ike na ya agaghị ebibi Sọdọm ma e nweta naanị iri ndị ezi omume ise. Ma, Ebreham jụrụ Jehova ajụjụ a ugboro ise ọzọ. Ọ jụrụ ya ma ọ̀ ga-ebibi obodo ahụ ma e nweta mmadụ iri anọ na ise, mmadụ iri anọ, mmadụ iri atọ, mmadụ iri abụọ, ma ọ bụ mmadụ iri? Na nke ọ bụla n’ajụjụ ndị a, Jehova ji nnọọ ndidi mesie Ebreham obi ike na ya agaghị ebibi Sọdọm ma e nweta mmadụ ole ọ jụrụ ajụjụ ha. N’agbanyeghị na e nwedịghị mmadụ iri n’obodo ahụ, Jehova chebere Lọt na ụmụ ya.—Jen. 18:22-32; 19:15, 16, 26.
13. Olee otú Hana si gosi na ya tụkwasịrị Jehova obi?
13 Nwunye Elkana bụ́ Hana chọsiri ike ịmụta nwa. Ma, ọ mụtaghị nwa, nke a 1 Sam. 1:8, 17, 18) Hana tụkwasịrị Jehova obi, ma hapụrụ ya ihe niile. N’agbanyeghị na Hana amaghị ihe ga-emecha mee, obi ruru ya ala. Ka oge na-aga, Jehova zara ekpere ya. Ọ tụụrụ ime, mụọ nwa nwoke, gụọ ya Samuel.—1 Sam. 1:20.
nyekwara ya nsogbu n’obi nke ukwuu. O kpekuru Jehova ekpere maka nke a. Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ịlaị gwakwara ya, sị: “Ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.” Nke a kasiri Hana obi, “ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” (14. Gịnị mere Devid ji chọọ ka a kasie ya obi, ònyekwa ka ọ gakwuuru?
14 Eze Devid nke Izrel oge ochie bụ onye ọzọ Chineke kasiri obi. Ebe ọ bụ na Jehova “na-ahụ ihe dị n’obi,” mgbe ọ họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze, ọ ma na Devid chọrọ ime ihe ziri ezi, chọọkwa ife ya ofufe. (1 Sam. 16:7; 2 Sam. 5:10) Ma, Devid mechara ya na Bat-shiba akwaa iko, ya egbuokwa di nwaanyị ahụ ka o kpuchie ihe o mere. Mgbe Devid chọpụtara otú ihe o mere jọruru njọ, ọ rịọrọ Jehova n’ekpere, sị: “Hichapụ mmebi iwu m dị ka ebere gị si dị ukwuu. Sachaa m nke ọma ka njehie m pụọ n’ahụ́ m, sachapụ m mmehie m. N’ihi na mụ onwe m maara mmebi iwu m, mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe niile.” (Ọma 51:1-3) Devid chegharịrị n’eziokwu, Jehova gbaghakwaara ya. Ma, Devid tara ahụhụ ihe ọjọọ o mere. (2 Sam. 12:9-12) Ma, ebere Jehova kasiri ohu ya dị obi umeala obi.
15. Olee otú Jehova si nyere Jizọs aka tupu Jizọs anwụọ?
15 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ya. Chineke kwere ka ọnwụnwa ndị a bịara Jizọs, Jizọs kwesịkwara ntụkwasị obi. O gosiri na ya bụ nwoke zuru okè nke nwere ike ịtụkwasị Jehova obi ma rubere ya isi ruo ọnwụ. Tupu a rara Jizọs nye ndị iro ya ma gbuo ya, o kpekuru Jehova ekpere, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” Otu mmụọ ozi bịakwuteziri Jizọs ma mee ka okwukwe ya sie ike. (Luk 22:42, 43) Chineke kasiri Jizọs obi, mee ka okwukwe ya sie ike, nyekwara ya aka, bụ́kwanụ ihe ndị dị ya mkpa n’oge ahụ.
16. Olee ihe Chineke nwere ike ime ma ọ bụrụgodị na a chọọ igbu anyị n’ihi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi?
16 Jehova ga-enyeliri anyị aka ịnọgide na-eme uche ya ọ bụrụgodị na a chọọ igbu anyị n’ihi okwukwe anyị. O doro anya na ọ ga-enyere anyị aka. Ihe ọzọkwa na-akasi anyị obi bụ olileanya mbilite n’ọnwụ. Anyị na-atụsikwa anya ike mgbe “a ga-eme ka ọnwụ,” bụ́ onye iro ikpeazụ, “ghara ịdị irè.” (1 Kọr. 15:26) Jehova ga-echeta ndị ohu ya nwụrụla anwụ, nakwa ndị ọzọ, ma kpọlite ha n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Nkwa Jehova kwere na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ na-akasi anyị obi, ọ na-emekwa ka anyị nwee olileanya mgbe a na-akpagbu anyị.
17. Olee otú Jehova nwere ike isi kasie anyị obi mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ?
17 N’eziokwu, ọmụma anyị ma na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ nwere ike isi n’ọnwụ bilie ma dịrị ndụ n’ụwa mgbe ọ ghọrọ paradaịs mara mma, ebe nsogbu na nhụsianya ndị dị taa na-agaghị adị, na-akasi obi. “Oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị ohu Jehova, ga-enwekwa ihe ùgwù ịlanahụ mbibi a ga-ebibi ụwa ochie a ma nabata ndị e si n’ọnwụ kpọlite ka ha biri n’ụwa, kụziekwara ha ihe.—Mkpu. 7:9, 10.
Ogwe Aka Chineke nke Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi Dịkwa n’Okpuru
18, 19. Olee otú e sirila kasie ndị ohu Chineke obi mgbe a na-akpagbu ha?
18 Mozis dere abụ na-akasi obi. O mesiri Diut. 33:27) Samuel onye amụma mechara gwa ndị Izrel, sị: “Unu ahapụkwala iso Jehova, jirikwanụ obi unu dum jeere Jehova ozi. . . . Jehova agaghị agbahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya.” (1 Sam. 12:20-22) Ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-efe Jehova, ọ gaghị agbahapụ anyị. Ọ ga na-enyere anyị aka mgbe ọ bụla anyị nọ ná mkpa.
ndị Izrel obi ike, sị: “Chineke nke dị adị site n’oge ochie bụ ebe nzuzo, ogwe aka nke na-adịru mgbe ebighị ebi dịkwa n’okpuru.” (19 Chineke na-enyere ndị ya aka ma na-akasi ha obi n’ụbọchị ikpeazụ a tara akpụ. Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, a kpagbuola ọtụtụ puku Ndị Kraịst ibe anyị n’ụwa niile, tụọkwa ọtụtụ ndị mkpọrọ, n’ihi na ha na-ejere Jehova ozi. Otú ihe si gaara ha gosiri na Jehova na-akasi ndị ohu ya obi n’oge ihe siri ike. Dị ka ihe atụ, a mara otu n’ime ụmụnna anyị ikpe ịga mkpọrọ afọ iri abụọ na atọ n’ebe bụ́bu Sọviet Yuniọn n’ihi okwukwe ya. Ma, a chọtara otú e si na-enye ya nri ime mmụọ nke kasiri ya obi, meekwa ka okwukwe ya sie ike. O kwuru, sị: “N’afọ ndị ahụ niile, amụtara m ịtụkwasị Jehova obi, o nyekwara m ume.”—Gụọ 1 Pita 5:6, 7.
20. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova agaghị ahapụ anyị?
20 N’agbanyeghị nsogbu ndị ka ga-abịara anyị, anyị kwesịrị icheta ihe na-akasi obi otu ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Jehova agaghị ahapụ ndị ya.” (Ọma 94:14) Ọ bụ eziokwu na nkasi obi dị anyị niile mkpa n’otu n’otu, anyị nwekwara ihe ùgwù nke ịkasi ndị ọzọ obi. Dị ka isiokwu na-eso nke a na-egosi, anyị niile nwere ike iso na-akasi ndị na-eru uju obi n’ụwa a nsogbu juru.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịna-enye anyị nsogbu?
• Olee otú Jehova si akasi ndị ohu ya obi?
• Gịnị nwere ike ịkasi anyị obi ọ bụrụgodị na a chọọ igbu anyị?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 25]
OTÚ ANYỊ GA-ESI EDI IHE NDỊ NWERE IKE . . .
▪ itiwa anyị obi Ọma 147:3; 1 Jọn 3:19-22; 5:14, 15
▪ ime ka uche ghara izu anyị ike Ọma 94:19; Fil. 4:6, 7
▪ ime ka anyị na-eche echiche na-ezighị ezi Ọpụ. 14:13, 14; Diut. 31:6
▪ ịkpatara anyị ọrịa 2 Kọr. 4:8, 9
▪ ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ Ọma 145:14; Jems 5:14, 15