Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-abịa Ihe n’Oge?
Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-abịa Ihe n’Oge?
ỊBỊA ihe n’oge anaghị adịcha mfe. Ụfọdụ ihe ndị nwere ike ime ka ịbịa ihe n’oge na-esiri anyị ike gụnyere ibi ebe dị anya, ọtụtụ ụgbọala ịdị n’ụzọ ma ọ bụkwanụ iji ọtụtụ ihe n’aka. N’agbanyeghị ihe ndị a, ịbịa ihe n’oge dị mkpa. Dị ka ihe atụ, a na-ele onye na-abịa ọrụ n’oge anya dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi nakwa onye ji ọrụ ya kpọrọ ihe. Ma, onye na-anaghị abịa ọrụ n’oge nwere ike ịna-adọla ndị ọrụ ibe ya azụ, meekwa ka ha ghara ịna-arụpụta ezigbo ihe. Nwata akwụkwọ na-anaghị abịa akwụkwọ n’oge agaghị na-anọ ya mgbe a na-akụziri ibe ya ihe ụfọdụ, nke a ga-emekwa ka ọ ghara ịna-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. E nwere ike ghara inye mmadụ ọgwụ ma ọ bụ ghara ile ya ahụ́ n’ihi na ọ bịaghị ụlọ ọgwụ mgbe a gwara ya bịa.
Ma, n’ebe ụfọdụ, a naghị ele ịbịa ihe n’oge anya dị ka ihe dị mkpa. Ọ bụrụ na anyị bi n’ụdị ebe ahụ, ịbịa ihe n’azụ oge ga-amara anyị ahụ́. Ọ bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị ịmụwa otú anyị ga-esi na-abịa ihe n’oge. Anyị ga na-abịa ihe n’oge ma ọ bụrụ na anyị aghọta otú nke a si dị mkpa. Olee ihe ndị mere o ji dị mma ka anyị na-abịa ihe n’oge? Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịbịa ihe n’oge? Oleekwa uru ịbịa ihe n’oge ga-abara anyị?
Jehova Na-eme Ihe n’Oge
Ihe bụ́ isi mere anyị ji kwesị ịna-abịa ihe n’oge bụ na anyị na-eṅomi Chineke, bụ́ onye Efe. 5:1) Jehova kacha onye ọ bụla eme ihe n’oge. Ọ naghị eme ihe n’azụ oge. Ọ na-emezu ihe ọ bụla bụ́ nzube ya kpọmkwem n’oge ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova kpebiri na ya ga-eji iju mmiri bibie ndị ọjọọ n’oge Noa, ọ gwara Noa, sị: “Jiri osisi gofa rụọrọ onwe gị ụgbọ.” Mgbe ọ fọrọ obere ka iju mmiri ahụ malite, Jehova gwara Noa ka ha banye n’ụgbọ ahụ ma gwa ya, sị: “Ọ fọrọ naanị ụbọchị asaa ka m mee ka mmiri zoo n’elu ụwa ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị; m ga-ekpochapụkwa ihe ọ bụla dị ndụ m kere n’elu ala.” “Mgbe ụbọchị asaa gasịrị, mmiri nke iju mmiri ahụ zoro n’elu ụwa” kpọmkwem n’oge Chineke kwuru na ọ ga-ezo. (Jen. 6:14; 7:4, 10) Chegodị ihe gaara eme Noa na ndị ezinụlọ ya ma a sị na ha abanyeghị n’ime ụgbọ ahụ n’oge. Ha mere ihe n’oge ka Chineke ha na-efe, wee banye n’ụgbọ ahụ n’oge.
anyị na-efe. (Mgbe ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise gara ka e nwechara iju mmiri ahụ, Jehova gwara nna ochie bụ́ Ebreham na ọ ga-amụ nwa bụ́ onye Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esi n’ezinụlọ ya bịa. (Jen. 17:15-17) Chineke kwuru na a ga-amụ Aịzik “n’ụdị oge a n’afọ ọzọ.” Nke ahụ ò mere? Akwụkwọ Nsọ gwara anyị, sị: “Sera wee tụrụ ime mụọrọ Ebreham nwa nwoke n’agadi ya n’oge ahụ a kara aka nke Chineke gwara ya banyere ya.”—Jen. 17:21; 21:2.
Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe ndị na-egosi na Chineke na-eme ihe n’oge. (Jere. 25:11-13; Dan. 4:20-25; 9:25) Baịbụl gwara anyị ka anyị na-atụ anya ụbọchị Jehova ga-ekpe ụwa ikpe. Ọ bụrụgodị na o yie anyị ka ọ ‘na-egbu oge,’ Chineke mesiri anyị obi ike na “ọ gaghị anọ ọdụ.”—Hab. 2:3.
Ịbịa Ihe n’Oge Dị Mkpa n’Ofufe Anyị
Onye Izrel ọ bụla bụ́ nwoke kwesịrị ịga “ememme ndị a na-emere Jehova n’oge a kara aka,” o kwesịkwara ịga n’oge. (Lev. 23:2, 4) Chineke na-ekwukwa mgbe e kwesịrị ịchụrụ ya àjà dị iche iche. (Ọpụ. 29:38, 39; Lev. 23:37, 38) Ọ̀ bụ na nke a anaghị egosi na Chineke chọrọ ka ndị ohu ya na-eme ihe ndị metụtara ofufe ya n’oge e kwesịrị iji eme ha?
Na narị afọ mbụ, mgbe Pọl onyeozi gwara ndị Kọrịnt otú ha ga-esi na-enwe ọmụmụ ihe, ọ sịrị: “Ka e mee ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.” (1 Kọr. 14:40) Nke a pụtara na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-amalite ọmụmụ ihe n’oge a kara aka. Otú Jehova si ele ịbịa ihe n’oge anya agbanwebeghị. (Mal. 3:6) Olee ihe ndị anyị ga-eme ka anyị wee na-abịa ọmụmụ ihe n’oge?
Ihe Anyị Ga-eme Ka Anyị Wee Na-abịa Ihe n’Oge
Ụfọdụ ndị achọpụtala na ibu ụzọ mee atụmatụ ihe ha ga-aga na-enyere ha aka dị ukwuu. (Ilu 21:5) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịga ihe nwere oge a ga-eji malite ya, ọ̀ ga-adị mma ma anyị malite ịga ka anyị wee ruo n’ebe ahụ kpọmkwem mgbe a ga-amalite ihe ahụ? Ọ́ gaghị aka mma ma anyị pụọ n’oge ka anyị wee ghara ịbịa n’azụ oge, ọ bụrụgodị na “ihe a na-atụghị anya ya” emee n’ụzọ? (Ekli. 9:11) Otu nwa okorobịa aha ya bụ Emeka, * bụ́ onye na-abịakarị ihe n’oge, kwuru, sị: “Ihe nwere ike inyere onye ọ bụla aka ịbịa ihe n’oge bụ onye ahụ ịmara oge ọ ga-ewe ya ịgaru ebe ọ na-aga.”
O nwere ike ịdị mkpa ka ụfọdụ mee ndokwa ga-enyere ha aka ịna-ahapụ ebe ha na-arụ ọrụ n’oge ka ha wee ghara ịna-erute ọmụmụ ihe n’azụ oge. Nke a bụ ihe otu Onyeàmà nke nọ n’Itiopia mere mgbe ọ chọpụtara na otú e si hazigharịa oge ọrụ ha ga-eme ka ọ na-erute ọmụmụ ihe mgbe o ji nkeji iri anọ na ise gafee oge e ji amalite ọmụmụ ihe. O mere ndokwa ka otu onye ọrụ ha na-abịa ụbọchị ọmụmụ ihe na-agbanwe ya tupu oge o kwesịrị iji laa ọrụ eruo. Nwanna ahụ kwekwara ịna-arụ ọrụ awa asaa n’elu awa ole o ji arụ ọrụ iji kwụọ onye ọrụ ahụ ụgwọ ọrụ ọ rụchiteere ya.
Ọ ga-esikwuru anyị ike ịna-abịa ọmụmụ ihe n’oge ma ọ bụrụ na anyị na ụmụaka bi. Ijike ụmụaka ọmụmụ ihe na-abụkarị ọrụ dịịrị onye bụ́ nne, ma, ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ nwere ike inyere ya aka, ha kwesịrị ime nke a. Otu nwaanyị Meksiko, aha ya bụ Esperanza, nwere ụmụ asatọ naanị ya na-elekọta. Nwa ya nke obere dị afọ ise, ebe onye nke tọchara ha dị iri afọ abụọ na atọ. Esperanza kwuru ihe na-enyere ha aka ịbịa ọmụmụ ihe n’oge. Ọ sịrị: “Ụmụ m ndị nwaanyị toliterela na-enyere ndị nke obere aka ijikere. Ọ na-eme ka m nwee ike ịrụcha ihe ndị dịịrị m ịrụ n’ụlọ ma jikere ka anyị wee gaa ọmụmụ ihe n’oge.” Ezinụlọ a nwere oge ha kwuru ha na-eji ahapụ ụlọ ha, onye ọ bụla na-agbakwa mbọ ka ha nwee ike ịpụ n’oge ahụ ha kwuru.
Rite Uru n’Ịbịa Ọmụmụ Ihe n’Oge
Icheta ngọzi ndị anyị na-enweta ma anyị bịa ọmụmụ ihe n’oge ga-eme ka anyị kpebisie ike ime ihe niile anyị nwere ike ime iji na-abịa n’oge. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sandra, bụ́ onye na-abịa ọmụmụ ihe n’oge, kwuru, sị: “Ihe ịbịa ọmụmụ ihe n’oge ji amasị m bụ na ọ na-enyere m aka ikele ụmụnna m, mụ na ha akparịta ụka, mụ amatakwa otú ihe si agara ha.” Ọ bụrụ na anyị abịarute n’Ụlọ Nzukọ Hib. 10:24, 25.
Alaeze n’oge, anyị ga-erite uru ma anyị nụ otú ụmụnna ndị bịara ọmụmụ ihe si atachi obi nakwa otú ha si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi. Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ana-akparịta ụka wee na-agbarịta ibe anyị ume mgbe anyị bịara n’oge, anyị nwere ike ime ka okwukwe ha sikwuo ike. Anyị ‘ga-akpalikwa ha inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’—Abụ na ekpere e ji emeghe ọmụmụ ihe anyị bụ ihe ndị dị mkpa anyị ji efe Jehova. (Ọma 149:1) Abụ anyị dị iche iche na-eto Jehova, na-echetara anyị àgwà ndị anyị kwesịrị ịna-akpa, na-agbakwa anyị ume ka anyị jiri ọṅụ na-ekwusa ozi ọma. Oleekwanụ maka ekpere mmeghe? N’oge ochie, Jehova kpọrọ ụlọ nsọ ‘ụlọ ekpere m.’ (Aịza. 56:7) Taa, anyị na-ekpeku Chineke ekpere ma anyị zukọọ ịmụ ihe. E wezụga na anyị na-eji ekpere mmeghe arịọ Jehova ka o duzie ọmụmụ ihe anyị ma nye anyị mmụọ nsọ ya, ekpere mmeghe na-enyekwara anyị aka ịkwadebe obi anyị iji ghọta ihe anyị ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Anyị kwesịrị ikpebi ịna-abịa ọmụmụ ihe n’oge ka anyị wee soro bụọ abụ mmeghe ma nọrọ mgbe a ga-ekpe ekpere mmeghe.
Helen, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na atọ, kwuru ihe mere o ji abịa ọmụmụ ihe n’oge. Ọ sịrị: “M chere na ọ bụ otu n’ime ụzọ m si egosi na m hụrụ Jehova n’anya, ebe ọ bụ na ihe niile anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe si n’aka ya, tinyere abụ na ekpere mmeghe.” Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-eche otú a? Anyị kwesịrị. Ya mere, ka anyị gbalịsie ike malite n’oge na-eme ihe niile anyị na-eme, karịchaa ihe ndị nke metụtara ofufe ezi Chineke.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.
[Foto dị na peeji nke 26]
Buru ụzọ kwadebe nke ọma
[Foto dị na peeji nke 26]
Pụọ n’oge, a dịghị ama ama “ihe a na-atụghị anya ya” emee n’ụzọ
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Ị ga-erite uru ma ị bịa ọmụmụ ihe n’oge