Idi Ihe Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Mere Gị
Idi Ihe Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Mere Gị
NKIRU na di ya, bụ́ Ikenna, jere ozi oge niile ọtụtụ afọ. * Ma, ka obere oge gafere mgbe ha mụrụ nwa mbụ ha, Ikenna malitere ịjụ oyi n’ọgbakọ. Ka oge na-aga, ọ malitere ibi ndụ rụrụ arụ e wee chụọ ya n’ọgbakọ. Nkiru sịrị: “Mgbe ihe a niile mere, ọ dị m ka m na-aga ịnwụ. Obi gbawara m, amaghịkwa m ihe m ga-eme.”
Ozugbo Ijeọma lụchara di, di ya malitere imegbu ya. Ọ malitere iti ya ihe. Ijeọma sịrị: “Ọ tụrụ m n’anya ụbọchị mbụ o tiri m ihe, o wutere m ma mee ka ihere ju m ihu. Ọ na-arịọ m mgbaghara mgbe ọ bụla o tiri m ihe. Obi m gwara m na m kwesịrị ịna-agbaghara ya ma chefuo ihe ọ bụla o mere m n’ihi na abụ m Onye Kraịst. M chekwara na ọ bụ ime di m ihe ọjọọ ma m gwa onye ọzọ, ọbụna ndị okenye ọgbakọ anyị, nsogbu anyị na-enwe. Ruo ọtụtụ afọ, ọ na-abụ ya tie m ihe mụ agbaghara ya. N’oge ahụ niile, m chere na a ga-enwerịrị ihe m ga-emere di m ka o wee malite ịhụ m n’anya. Mgbe o mechara hapụ mụ na nwa anyị nwaanyị, obi m malitere ịma m ikpe na emeghị m ihe m kwesịrị
ime ma ọ bụkwanụ kwuo ihe m kwesịrị ikwu iji mee ka anyị ghara itisa.”Dị ka ọ dị Nkiru na Ijeọma, o nwere ike ịbụ na, n’ihi ihe di gị na-eme gị, ị naghị enwe obi ụtọ, ihe ana-esiri gị ike, ozi ị na-ejere Jehova ana-ajụkwa oyi. Ọ bụrụ na ị bụ di, o nwere ike obi adịghị gị mma, ihe ana-esikwara gị ike n’ihi na nwunye gị kwara iko. O doro anya na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ’ dị ka Baịbụl buru n’amụma. Amụma a na-egosi na “n’oge ikpeazụ” a, ihe agaghị na-agazi otú o kwesịrị n’ọtụtụ ezinụlọ nke na ọtụtụ ndị agaghị enwe obi mmadụ n’ezinụlọ ha. Ụfọdụ ndị bụ́ ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke na-eme ihe na-egosi na ha anaghị efe ya n’ezie. (2 Tim. 3:1-5) Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndị Kraịst na-enwekwa nsogbu ndị a; n’ihi ya, gịnị ga-enyere gị aka idi ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị mere gị?
Na-ele Onwe Gị Anya Otú Jehova Si Ele Gị
Ná mmalite, o nwere ike isiri gị ike ikweta na onye ị hụrụ n’anya ga-eme gị ihe ga-ewute gị nke ukwuu. I nwere ike ịmalite iche na ọ bụ gịnwa mere ihe o ji na-akpa àgwà ọjọọ.
Ma, cheta na ọ bụ onye Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè, tụkwasịrị obi ma hụ n’anya raara ya nye ndị Juu. Tupu Jizọs ahọpụta ezigbo ndị enyi ya, ya bụ, ndịozi ya, o bu ụzọ chebara ya echiche ma kpee ekpere maka ya. N’oge ahụ, mmadụ iri na abụọ ahụ bụ ndị ohu Jehova, ha kwesịkwara ntụkwasị obi. Ya mere, o doro anya na o wutere Jizọs nke ukwuu mgbe Judas ‘raara ya nye’ ndị Juu. (Luk 6:12-16) Ma, Jehova ataghị Jizọs ụta n’ihi àgwà ọjọọ Judas.
Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị di ma ọ bụ nwunye zuru okè ugbu a. Ha ga na-emejọ ibe ha. Otu ọbụ abụ kwuru eziokwu mgbe o ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo?” (Ọma 130:3) Di na nwunye kwesịrị ime ka Jehova, ya bụ, ha kwesịrị ịna-agbaghara ibe ha.—1 Pita 4:8.
Ma, “onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Rom 14:12) Ọ bụrụ na mmadụ na-agwakarị di ya ma ọ bụ nwunye ya okwu mkparị, ma ọ bụkwanụ na-akpaso ya àgwà ọjọọ, ọ ga-aza Jehova ajụjụ maka nke a. Jehova kpọrọ ime ihe ike na okwu mkparị asị, n’ihi ya, o nweghị ezigbo ihe mere mmadụ ga-eji kpaso di ya ma ọ bụ nwunye ya àgwà ọjọọ a, bụ́ nke na-egosi na ọ hụghị ya n’anya nakwa na ọ naghị akwanyere ya ùgwù. (Ọma 11:5; Efe. 5:33; Kọl. 3:6-8) N’eziokwu, ọ bụrụ na Onye Kraịst akpọọ ekwo nkụ na-ewe iwe ọkụ, a ga-achụpụrịrị ya n’ọgbakọ. (Gal. 5:19-21; 2 Jọn 9, 10) Di ma ọ bụ nwunye nke kọọrọ ndị okenye banyere àgwà ọjọọ a a na-akpaso ya ekwesịghị iche na ya mere nwunye ya ma ọ bụ di ya ihe ọjọọ. N’eziokwu, Jehova na-emetere ndị a na-eme ụdị ihe a ebere.
Ọ bụrụ na di mmadụ ma ọ bụ nwunye ya akwaa iko, o mehiere nwunye ya ma ọ bụ di ya, mehiekwa Jehova. (Mat. 19:4-9; Hib. 13:4) Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ahụ aka ya dị ọcha na-eme ihe Baịbụl kwuru, o kwesịghị iche na ọ bụ ya kpatara ihe onye nke ọzọ ji kwaa iko.
Cheta na Jehova ma otú obi dị gị. O kwuru na ya bụ di nwe mba Izrel. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ebe e kwuru okwu ndị na-emetụ n’ahụ́, bụ́ ndị na-egosi ụdị mwute ọ na-enwe mgbe ọ bụla mba Izrel hapụrụ ya gaa fewe chi ọzọ. (Aịza. 54:5, 6; Jer. 3:1, 6-10) Obi sie gị ike na Jehova ma mwute ị na-enwe ma ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpaso gị àgwà ọjọọ. (Mal. 2:13, 14) Ọ ma na nkasi obi na agbamume dị gị mkpa.
Otú Jehova Si Akasi Anyị Obi
Ọgbakọ Ndị Kraịst bụ otu n’ime ihe Jehova ji akasi anyị obi. Ijeọma nwetara ụdị nkasi obi a. Ọ sịrị: “Onye nlekọta sekit anyị letara 1 Ndị Kọrịnt 7:15 gbaa m ume. Amaokwu ndị ahụ na okwu o ji obiọma gwa m mere ka obi dị m mma m wee kwụsị iche na ọ bụ m kpatara ihe di m ji eti m ihe.” *
ọgbakọ anyị mgbe obi na-adịghị m mma. Ọ ma na akwụkwọ di m gbara m ka mụ na ya gbaa alụkwaghịm na-ewute m. N’ihi ya, o wepụtara oge jiri amaokwu ndị dị kaNkiru, bụ́ onye anyị kwuru banyere ya ná mmalite, chọpụtakwara na Jehova na-esi n’ọgbakọ Ndị Kraịst enyere anyị aka. Ọ sịrị: “Mgbe o doro onye ukwu na onye nta anya na di m enweghị nchegharị, akpọọrọ m ụmụ m kwaga ebe ọzọ. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, m nwetara ọnụ ụlọ abụọ. N’echi ya, ka m ji iwe na-akwapụta ngwongwo anyị, mmadụ kụrụ aka n’ụzọ. M chere na ọ bụ nwaanyị nwe ụlọ ahụ, bụ́ onye bi n’ọnụ ụlọ dị nke anyị nso. Ọ tụrụ m n’anya ịhụ na ọ bụ nwanna nwaanyị mụụrụ mama m ihe, nke nyeere ezinụlọ anyị aka ịnata eziokwu. Ọ tụghị anya ịhụ m, ọ bụ nwaanyị nwe ụlọ ahụ anyị bi ka ọ bịara ịhụ n’ihi na ọ na-amụrụ ya ihe. Obi dajụrụ m. M gwara ya otú ihe si dịrị m, anyị abụọ wee bewe ákwá. O mere ndokwa ozugbo ka anyị gaa ọmụmụ ihe n’ụbọchị ahụ. Ndị ọgbakọ ahụ nabatara anyị, ndị okenye mekwara ndokwa otú ha ga-esi nyere ezinụlọ m aka ka anyị wee nọsie ike n’ọgbakọ.”
Otú Ndị Ọzọ Ga-esi Enye Aka
E nwere ọtụtụ ụzọ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst si enyere ndị nwere ụdị nsogbu a aka. Dị ka ihe atụ, Nkiru malitere ịchọ ọrụ. Otu ezinụlọ kwere ya nkwa na ha ga na-elekọta ụmụ ya mgbe ọ bụla ha chọrọ enyemaka ma ha lọta akwụkwọ.
Nkiru sịrị: “Ihe na-akacha eme m obi ụtọ bụ ụmụnna ikwu ka mụ na ha ma ọ bụkwanụ ka ha na ụmụ m soro gaa ozi ọma.” Mgbe ụmụnna na-enyere ndị ọzọ ụdị aka a, ha ‘na-eburịta ibu arọ nke ibe ha,’ si otú a “na-emezu iwu nke Kraịst.”—Gal. 6:2.
Obi na-adị ndị na-ata ahụhụ n’ihi mmehie ndị ọzọ mere ezigbo ụtọ ma a na-enyere ha ụdị aka a. Ngọzi, bụ́ onye di ya gbahapụrụ wee hapụrụ ya ụmụ anọ na ụgwọ ha ji, nke dị ihe dị ka nde naịra abụọ, narị puku abụọ na puku naịra ise, sịrị: “Ụmụnna hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Amaghị m ihe m gaara eme ma e wezụga aka ha na-enyere anyị. M ma na ọ bụ Jehova mere ka ezigbo ụmụnna ndị a, bụ́ ndị na-enyere ụmụ m aka, nọrọ n’ọgbakọ anyị. Obi Mak 10:29, 30.
na-atọ m ụtọ ịhụ otú enyemaka a si mee ka ụmụ m nọsie ike n’ọgbakọ. Ndị okenye na-enye m ndụmọdụ mgbe ọ bụla ọ dị mkpa. Ha na-egekwa m ntị ma m chọọ ịkọrọ ha mkpa m.”—Ezigbo enyi na-ama mgbe ọ na-ekwesịghị ikwulitewe ihe na-ewute enyi ya. (Ekli. 3:7) Nkiru sịrị: “Ọ na-amasịkarị m ka mụ na ụmụnna nwaanyị ndị nọ n’ọgbakọ a anyị sozi amụ ihe na-ekwu banyere ihe ọ bụla ọzọ, dị ka, ozi ọma, ọmụmụ ihe anyị na-eduziri ndị mmadụ, nakwa banyere ụmụ anyị, ma e wezụga nsogbu m. Obi dịkwa m ụtọ na ha mere ka m chefuo nsogbu ndị m nwere n’oge gara aga ma malite ibi ndụ ọhụrụ.”
Gbalịa Ka Ị Ghara Imegwara
Mgbe ụfọdụ, i nwere ike na-eche na ọ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị mere ka ị na-ata ahụhụ ị na-ata ugbu a, kama iche na ọ bụ gị mere ihe o ji tinye aka ná mmehie. O nwere ike isiri gị ike irubere Jehova isi ma ọ bụrụ na i wepụghị echiche a n’obi gị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike na-eche otú ị ga-esi megwara di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe o mere gị.
Ọ bụrụ na ị na-enwe ụdị echiche a, cheta ihe mere Jọshụa na Keleb. Ndị a na-eme uche Chineke tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ wee gaa ledoo Ala Nkwa ahụ. Ndị ha na ha so gaa ledo ala ahụ enweghị okwukwe, ha mere ka ụmụ Izrel nupụrụ Jehova isi. Ụfọdụ ụmụ Izrel chọdịrị iji nkume tụgbuo Jọshụa na Keleb mgbe ha gbara ha ume ka ha tụkwasị Jehova obi. (Ọnụ Ọgụ. 13:25–14:10) N’ihi ihe a ụmụ Izrel mere, Jọshụa na Keleb, bụ́ ndị aka ha dị ọcha, so ha wagharịa n’ala ịkpa iri afọ anọ.
O nwere ike ịbụ na iso ụmụ Izrel na-awagharị n’ala ịkpa ahụ adịghị Jọshụa na Keleb mma n’obi, ma, ha ekweghị ka mmehie ụmụnne ha mere mee ka ha nwebiga mwute ókè. Ihe bụ́ mkpa ha n’oge ahụ bụ ime ihe dị Chineke mma. Ná ndị ọgbọ ahụ niile, ọ bụ naanị ha na ndị Livaị bụ ndị banyere n’Ala Nkwa ahụ mgbe ha gagharịchara iri afọ anọ n’ala ịkpa.—Ọnụ Ọgụ. 14:28-30; Jọsh. 14:6-12.
Ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị mere nwere ike ime ka ị tatee ahụhụ aka. O nwere ike ịbụ na unu abụghịzi di na nwunye, ma, ị na-echegbuzi onwe gị, na-enwekwa ihe isi ike. Kama ịnọ na-echegbu onwe gị mgbe niile, cheta na Jehova ma otú ọ ga-esi akwụ ndị kpachaara anya na-emebi iwu ya ụgwọ, otú ahụ o si kwụọ ụmụ Izrel ahụ nupụụrụ ya isi n’ala ịkpa.—Hib. 10:30, 31; 13:4.
Ị Ga-edili Ya!
Kama ịnọ na-echegbu onwe gị, na-atụgharị uche n’okwu Jehova. Ijeọma sịrị: “Ọ bụ igere Ụlọ Nche na Teta! a gụnyere na teepụ nyeere m aka idi nsogbu m. Ọmụmụ ihe nyekwaara m nnukwu aka. Iji obi m niile nọrọ n’ọmụmụ ihe ma na-aza ajụjụ mere ka m na-echefu nsogbu m. Ịga ozi ọma nyekwaara m aka. Okwukwe m na-esi ike mgbe m na-akụziri ndị ọzọ otú ha ga-esi nwee okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ịmụrụ ndị mmadụ ihe mere ka obi m dịrị n’ihe ndị ka mkpa ná ndụ.”
Ngọzi, bụ́ onye anyị kwuru banyere ya ná mbụ, sịrị: “Ịgachi ọmụmụ ihe anya na ịga ozi ọma otú ike kwere m na-enyere m aka idi nsogbu m. Ezinụlọ m adịkwuola n’otu, anyị na ọgbakọ na-agakwa ụkwụ na ụkwụ. Nsogbu m enyerela m aka ịchọpụta ebe ndị m na-anaghị eme nke ọma. A nwaala m ọnwụnwa, ma, Jehova enyerela m aka idi ya.”
I nwekwara ike idi ụdị ọnwụnwa ndị a. N’agbanyeghị nsogbu ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị mere gị kpataara gị, gbalịa ka ị na-eme ihe Pọl dụrụ anyị n’ọdụ mgbe ọ sịrị: “Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”—Gal. 6:9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Aha a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere nkewa na ịgba alụkwaghịm, gụọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” peeji nke 125-130, 219-221.
[Foto dị na peeji nke 31]
Obi na-adị ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha hapụrụ mma ma ha na ndị ọzọ soro na-aga ozi ọma