Na-enye Chineke Otuto Kwa Ụbọchị
Na-enye Chineke Otuto Kwa Ụbọchị
DEVID kpere ekpere, sị: “Mee ka m nụrụ obiọma gị n’ụtụtụ . . . Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ije ije na ya.” (Ọma 143:8) Mgbe i biliri n’ụtụtụ wee kelee Jehova maka na i tetara ụra n’udo, ị̀ na-arịọ ya arịrịọ ka o nyere gị aka ime mkpebi ndị dị mma na ime ihe ndị ziri ezi, dị ka Devid rịọrọ ya? O doro anya na ị na-eme otú ahụ.
Anyị bụ́ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ya kwesịrị ịgba mbọ ‘na-eme ihe niile iji nye Chineke otuto’ “ma [ànyị] na-eri ihe ma [ànyị] na-aṅụ ihe ọnụnụ ma [ànyị] na-eme ihe ọ bụla ọzọ.” (1 Kọr. 10:31) Anyị ma na otú anyị si ebi ndụ kwa ụbọchị nwere ike iwetara Jehova otuto ma ọ bụ nkọcha. Anyị na-echetakwa na Okwu Chineke kwuru na Setan na-ebo ụmụnna Kraịst na ndị ohu Chineke niile nọ n’ụwa ebubo “ehihie na abalị.” (Mkpu. 12:10) Ya mere, anyị ekpebiwo ime ka Jehova nwee ihe ọ ga-aza Setan maka ebubo o boro ya, kpebiekwa ime ka obi Jehova ṅụrịa site n’ijere Nna anyị nke eluigwe ozi dị nsọ “ehihie na abalị.”—Mkpu. 7:15; Ilu 27:11.
Ka anyị tụlee na nkenke ụzọ abụọ dị mkpa anyị ga-esi na-enye Chineke otuto kwa ụbọchị. Nke mbụ bụ anyị ịmata ihe ndị ka mkpa ná ndụ, ebe nke abụọ bụ iche banyere ọdịmma ndị ọzọ.
Ime Ihe Anyị Kwere ná Nkwa
Mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova, anyị ji obi anyị niile gwa ya na anyị chọrọ ife ya. Anyị kwekwara Jehova nkwa na anyị ga na-eje ije n’ụzọ ya “kwa ụbọchị” ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 61:5, 8) Oleekwanụ otu anyị ga-esi na-eme nkwa a anyị kwere Jehova? Olee otu anyị ga-esi na-egosi kwa ụbọchị na anyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya?
Baịbụl gosiri anyị kpọmkwem ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme. (Diut. 10:12, 13) E depụtara ụfọdụ n’igbe bụ́ “Ihe Chineke Chọrọ Ka Anyị Na-eme,” nke dị na peeji nke 22. Ha niile dị mkpa n’ihi na ọ bụ Chineke gwara anyị ka anyị na-eme ha. Mgbe e nwere ihe abụọ dị mkpa ka anyị mee n’otu oge, olee otú anyị ga-esi ekpebi nke anyị ga-ebu ụzọ eme?
Anyị ga-ebu ụzọ eme ihe ndị metụtara ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova. Ha gụnyere ịmụ Baịbụl, ikpe ekpere, ịga ọmụmụ ihe, na ịga ozi ọma. (Mat. 6:33; Jọn 4:34; 1 Pita 2:9) Ma, nke a apụtaghị na ọ bụ naanị ihe ndị a ka anyị ga na-eme site n’ụtụtụ ruo n’abalị. Anyị kwesịrị inwe oge anyị ga-eji na-arụ ọrụ ego, na-aga akwụkwọ, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ e nwere n’ụlọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịhụ na ọrụ anyị ji akpata ego nakwa ihe ndị ọzọ anyị na-eme anaghị egbochi anyị ijere Jehova ozi dị nsọ, dị ka ịga ọmụmụ ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-achọ ịga njem, anyị ga-agbalị hụ na ọ danyeghị n’oge onye nlekọta sekit ga-abịa n’ọgbakọ anyị, mgbe anyị ga-enwe mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ sekit ma ọ bụkwanụ mgbakọ distrikti. Oge ụfọdụ, anyị nwere ike iji otu okwute tụgbuo nnụnụ abụọ. Dị ka ihe atụ, ezinụlọ anyị nwere ike ịga zaa Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị nwekwara ike iji oge anyị ji ezu ike n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ kwusaara ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị ozi ọma. Mgbe ọ bụla anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme, dị ka ụdị ọrụ anyị ga-arụ, ebe anyị ga-agụru akwụkwọ ma ọ bụkwanụ ụdị ndị ga-abụ ndị enyi anyị, anyị kwesịrị icheta ihe kacha mkpa, ya bụ, ofufe anyị na-efe Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova.—Ekli. 12:13.
Na-eche Banyere Ọdịmma Ndị Ọzọ
Jehova chọrọ ka anyị jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe, chọọkwa ka anyị na-emere ha ihe ọma. Ma, Setan na-eme ka ndị mmadụ na-eche banyere naanị onwe ha. “Ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya,” “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya” na “ndị na-agha mkpụrụ maka anụ ahụ́” juru n’ụwa Setan. (2 Tim. 3:1-5; Gal. 6:8) Ọtụtụ ndị anaghị eche otú ihe ha na-eme nwere ike isi metụta ndị ọzọ. “Ọrụ nke anụ ahụ́” juru ebe niile.—Gal. 5:19-21.
Ma, ndị mmụọ Jehova na-edu na-akpa àgwà dị nnọọ iche. Ha hụrụ ndị ọzọ n’anya, nwee obiọma, na-emesokwa ha ihe n’ụzọ dị mma. (Gal. 5:22) Baịbụl gwara anyị ka anyị bute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Ya mere, anyị kwesịrị ịna-emere ndị ọzọ ihe ndị na-egosi na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ, ma, anyị ekwesịghị ịna-etinye anya n’ihe na-agbasaghị anyị. (1 Kọr. 10:24, 33; Fil. 2:3, 4; 1 Pita 4:15) Ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụnna anyị ka anyị ga-aka na-eche banyere ha, anyị kwesịkwara ịgba mbọ ka anyị na-enyere ndị na-abụghị ụmụnna anyị aka. (Gal. 6:10) Ì nwere ike ịchọ otú ị ga-esi emere onye ọzọ ihe ọma taa?—Gụọ igbe bụ́ “Na-eche Banyere Ọdịmma Ha,” nke dị na peeji nke 23.
Gal. 6:2; Efe. 5:2; 1 Tesa. 4:9, 10) Kama nke ahụ, anyị ga-agbalị kwa ụbọchị ka anyị mata ihe na-akpa ndị ọzọ ma nyere ha aka, n’agbanyeghị na o nwere ike isiri anyị ike ime otú ahụ. Anyị kwesịrị iwepụta oge nyere ndị ọzọ aka, nye ha ihe ndị na-akpa ha, meekwa ka ha mụta ihe ga-abara ha uru. Jehova kwere anyị nkwa na ya ga-enye anyị ihe n’ụba ma ọ bụrụ na anyị na-enye ndị ọzọ ihe n’ụba.—Ilu 11:25; Luk 6:38.
Anyị ekwesịghị inwe oge pụrụ iche anyị ga-eji na-emere ndị ọzọ ihe ọma. (Ije Ozi Dị Nsọ “Ehihie na Abalị”
Ànyị ga-enweli ike ijere Jehova ozi dị nsọ “ehihie na abalị”? Ee, anyị ga-emeli ya ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-eme ihe ndị na-egosi na anyị na-efe Jehova. (Ọrụ 20:31) Anyị kwesịrị ịna-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche na ya, kwesịkwa ịna-ikpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị. Anyị kwesịkwara ịgba mbọ na-aga ọmụmụ ihe niile, jirikwa oge ọ bụla dapụtara na-ekwusa ozi ọma.—Ọma 1:2; Luk 2:37; Ọrụ 4:20; 1 Tesa. 3:10; 5:17.
Onye ọ bụla n’ime anyị ọ̀ na-eme ihe ndị a na-egosi na anyị na-ejere Jehova ozi dị nsọ? Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, otú anyị si ebi ndụ kwa ụbọchị ga-egosi na anyị chọrọ ime uche ya nakwa na anyị chọrọ ka o nwee ihe ọ ga-aza Setan na-ebo ya ebubo. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-enye Jehova otuto n’ihe niile anyị na-eme n’agbanyeghị ọnọdụ ọ bụla anyị nọ na ya. Anyị ga na-ekwu okwu ma na-akpa àgwà ka ndị na-agụ Okwu ya, mkpebi ndị anyị na-eme ga-egosikwa na anyị na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ma jiri ike anyị dum na-ejere ya ozi, nke a ga-egosi na anyị na-ekele ya maka otú o si na-elekọta anyị ma na-enyere anyị aka. Anyị kwesịkwara ịnabata ndụmọdụ ya na ịdọ aka ná ntị mgbe anyị mere ihe na-adịghị mma n’ihi ezughị okè.—Ọma 32:5; 119:97; Ilu 3:25, 26; Kọl. 3:17; Hib. 6:11, 12.
Ka anyị na-enye Chineke otuto kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị ga-enweta ume, Nna anyị nke eluigwe ga na-elekọtakwa anyị ruo mgbe ebighị ebi.—Mat. 11:29; Mkpu. 7:16, 17.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]
Ihe Chineke Chọrọ Ka Anyị Na-eme
• Na-ekpechi ekpere anya.—Rom 12:12.
• Na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya, na-emekwa ihe ị mụtara.—Ọma 1:2; 1 Tim. 4:15.
• Na-agachi ọmụmụ ihe anya.—Ọma 35:18; Hib 10:24, 25.
• Na-enye ezinụlọ gị ihe na-akpa ha, na-eme ka obi na-adị ha mma, na-amụkwanụ Baịbụl.—1 Tim. 5:8.
• Na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, na-emekwa ndị na-eso ụzọ.—Mat. 24:14; 28:19, 20.
• Anyị kwesịrị ịna-enye ahụ́ anyị ihe na-akpa ya, na-amụ Baịbụl, na-emekwa ihe ga na-eme anyị obi ụtọ, nke gụnyere iji ihe ndị kwesịrị ekwesị na-atụrụ ndụ.—Mak 6:31; 2 Kọr. 7:1; 1 Tim. 4:8, 16.
• Na-arụ ọrụ e nwere n’ọgbakọ.—Ọrụ 20:28; 1 Tim. 3:1.
• Na-edebe ụlọ gị nakwa Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha.—1 Kọr. 10:32.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]
Na-eche Banyere Ọdịmma Ha
• Nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị merela agadi.—Lev. 19:32.
• Onye na-arịa ọrịa ma ọ bụ onye obi na-adịghị mma.—Ilu 14:21.
• Nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nke i nwere ike igbo mkpa na-akpa ya.—Rom 12:13.
• Onye ezinụlọ gị.—1 Tim. 5:4, 8.
• Nwanna di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ.—1 Tim. 5:9.
• Okenye nke na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ ị nọ.—1 Tesa. 5:12, 13; 1 Tim. 5:17.