Nwee Ịhụnanya nke Na-adịghị Ada Ada
Nwee Ịhụnanya nke Na-adịghị Ada Ada
‘Ịhụnanya na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada.’—1 KỌR. 13:7, 8.
1. (a) Gịnị ka ndị mmadụ na-ekwukarị banyere ịhụnanya? (b) Ònye ka ọtụtụ mmadụ hụrụ n’anya, gịnịkwa ka ha hụrụ n’anya?
NDỊ mmadụ ekwuola ọtụtụ ihe banyere ịhụnanya. E jirikwala ya gụọ ọtụtụ egwú. Ịhụnanya dị onye ọ bụla mkpa. Ma, e nwere ọtụtụ akwụkwọ n’ahịa, bụ́ ndị a kọrọ akụkọ ịhụnanya na ha. Fim ndị na-akọ banyere ịhụnanya jukwara n’ahịa. N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị ahụghị Chineke ma ọ bụkwanụ ndị agbata obi ha n’anya. Anyị na-ahụ ka ihe Baịbụl buru amụma na ha ga-eme n’oge ikpeazụ a na-emezu. Ndị mmadụ bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.”—2 Tim. 3:1-5.
2. Gịnị ka Baịbụl gwara anyị banyere ihe anyị na-ekwesịghị ịhụ n’anya?
2 E kere ụmụ mmadụ otú ha ga-enwe ike inwe ịhụnanya. N’agbanyeghị nke ahụ, Okwu Chineke gwara anyị ka anyị ghara ịhụ ihe anyị na-ekwesịghị ịhụ n’anya n’anya. Baịbụl gwakwara anyị ihe na-eme ma ụdị ịhụnanya a gbanye mgbọrọgwụ n’obi mmadụ. (1 Tim. 6:9, 10) Ì chetara ihe Pọl onyeozi dere banyere Dimas? N’agbanyeghị na e nwere mgbe Pọl na Dimas so na-aga ozi, Dimas malitere ịhụ ihe nke ụwa n’anya. (2 Tim. 4:10) Jọn onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha ghara ịhụ ihe nke ụwa n’anya. (Gụọ 1 Jọn 2:15, 16.) Ịhụ ụwa na ihe ya na otú e si ebi ndụ na ya n’anya, bụ́ ihe ndị na-agabiga agabiga, nakwa ịhụ Chineke na ihe si n’ebe ọ nọ n’anya anaghị agakọ.
3. Olee ihe anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike maka ya, oleekwa ajụjụ ndị nke a ga-akpali anyị ịjụ?
3 N’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa, anyị abụghị nke ụwa. N’ihi ya, anyị ga-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ile ịhụnanya anya otú na-ezighị ezi ụwa si ele ya anya. Ọ dị mkpa ka anyị ghara ịhụ ihe anyị na-ekwesịghị ịhụ n’anya n’anya. Ya mere, ònye ka anyị kwesịrị inwe ezigbo ịhụnanya n’ebe ọ nọ? Olee ihe ndị na-enyere anyị aka inwe ịhụnanya nke na-atachi obi n’ihe niile, nke na-adịghịkwa ada ada? Olee otú inwe ụdị ịhụnanya a ga-esi baara anyị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu? Azịza ndị kwekọrọ n’uche Chineke dị anyị mkpa ka anyị wee mee ihe kwesịrị ekwesị.
Otú Ị Ga-esi Hụ Jehova n’Anya
4. Olee otú anyị ga-esi hụkwuo Chineke n’anya?
4 Chegodị banyere onye ọrụ ugbo nke rụsiri ọrụ ike wee kọrie ala kụọ ya ihe. Ọ na-atụ anya ka ihe ahụ ọ kụrụ too. (Hib. 6:7) N’otu aka ahụ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ kwesịrị ịna-eto eto. Gịnị ga-enyere ya aka ito? Anyị aghaghị ịna-arụ ọrụ n’ala ihe atụ nke bụ́ obi anyị, bụ́ ebe a kụrụ mkpụrụ eziokwu Alaeze. Anyị ga-eme nke a ma ọ bụrụ na anyị na-amụsi Baịbụl ike ka anyị wee mara Chineke nke ọma. (Kọl. 1:10) Ịgachi ọmụmụ ihe anya na itinye ọnụ n’ihe a na-amụ ga-emekwa ka anyị nwekwuo amamihe. Onye ọ bụla n’ime anyị ọ̀ na-agbasi mbọ ike iji nwekwuo amamihe?—Ilu 2:1-7.
5. (a) Olee otú anyị nwere ike isi mara àgwà ndị bụ́ isi n’àgwà niile Jehova nwere? (b) Gịnị ka i nwere ike ikwu banyere ikpe ziri ezi, amamihe na ike Chineke?
5 Na Baịbụl, Jehova gwara anyị ụdị onye ọ bụ. Ọ bụrụ na anyị na-amụ Akwụkwọ Nsọ, anyị ga-eji nke nta nke nta mara ụdị onye Chineke bụ, ya bụ, mara àgwà ya bụ́ ikpe ziri ezi, ike, amamihe nakwa karịchaa, ịhụnanya ya na-enweghị atụ. Anyị na-ahụ n’otú niile Jehova si eme ihe nakwa n’iwu ya zuru okè na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Diut. 32:4; Ọma 19:7) Anyị nwere ike ichebara ihe niile Jehova kere eke echiche wee nye ya otuto maka amamihe ya na-enweghị atụ. (Ọma 104:24) Ihe dị n’eluigwe na ihe dị n’ụwa na-egosikwa na Chineke nwere ume na ike dị ukwuu.—Aịza. 40:26.
6. Olee otú Chineke sirila gosi na ya hụrụ anyị n’anya, oleekwa otú nke a dị gị?
6 Oleekwanụ maka àgwà bụ́ isi e ji mara Chineke, ya bụ, ịhụnanya? Ọ na-erute anyị niile. Ọ bụ ịhụnanya ahụ mere o ji nye ihe mgbapụta e ji gbapụta ụmụ mmadụ. (Gụọ Ndị Rom 5:8.) Chineke nyere ihe mgbapụta ahụ maka mmadụ niile nọ n’ụwa, ma, ọ bụ naanị ndị nabatara ịhụnanya ya ma nwee okwukwe n’Ọkpara ya ga-erite uru n’ihe mgbapụta ahụ. (Jọn 3:16, 36) Anyị kwesịrị ịhụ Chineke n’anya n’ihi na o ji Jizọs chụọ àjà ime udo maka mmehie anyị.
7, 8. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme iji gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya? (b) Olee ihe ndị na-anaghị egbochili ndị Chineke idebe ihe o nyere n’iwu?
7 Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya iji kelee ya maka ihe niile o meere anyị? Ihe Baịbụl zara anyị dị mkpa. Ọ sịrị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) N’eziokwu, otú Jehova Chineke si hụ anyị n’anya kwesịrị ime ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu. Nke a bụ otu n’ime ihe mere anyị ji ezi ndị ọzọ ozi ọma ka ha nụ banyere aha ya na Alaeze ya, bụ́ nke na-abara ha uru. Iji obi anyị niile na-eme nke a na-egosi na anyị ji obi ọcha na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu.—Mat. 12:34.
8 N’ụwa dum, ụmụnna anyị na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị enweghị mmasị n’ozi ọma Alaeze. Ha anaghị ada mbà na mbọ ha na-agba ijezu ozi ha. (2 Tim. 4:5) Ịhụnanya na-emekwa ka anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, ọ na-emekwa ka anyị debe ihe niile Chineke nyere n’iwu.
Ihe Mere Anyị Ji Hụ Onyenwe Anyị Bụ́ Jizọs Kraịst n’Anya
9. Gịnị ka Kraịst diri, oleekwa ihe mere o ji die ha?
9 E wezụga ịhụ Chineke n’anya, onye ọzọ anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji hụ ya n’anya bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụ ezie na anyị ahụtụbeghị Jizọs, ma, ọ bụrụ na anyị ana-amụ banyere ya, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. (1 Pita 1:8) Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị Jizọs diri? Ka Jizọs nọ na-eme nnọọ uche Nna ya, ndị mmadụ kpọrọ ya asị n’enweghị ihe o mere ha, ha kpagburu ya, boo ya ebubo ụgha, kwujọọkwa ya. E menyekwara ya ihere. (Gụọ Jọn 15:25.) Jizọs diri ọnwụnwa ndị a niile n’ihi na ọ hụrụ Nna ya n’anya. Ọ bụkwa n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ mere o ji were ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ọtụtụ n’ime ha.—Mat. 20:28.
10, 11. Gịnị ka anyị kpebiri ịna-eme n’ihi ihe Kraịst meere anyị?
10 Ihe Jizọs mere na-eme ka anyị hụ ya n’anya. Ka anyị na-echebara ihe Kraịst meere anyị echiche, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Anyị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị inwe ụdị ịhụnanya a Kraịst nwere ka anyị wee nọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze ma na-eme ndị na-eso ụzọ, bụ́ ihe o nyere anyị n’iwu.—Mat. 28:19, 20.
11 Tupu ọgwụgwụ usoro ihe a eruo, anyị ga-arụcha ọrụ ahụ Kraịst nyere anyị iji gosi na obi dị anyị mma maka ịhụnanya o nwere n’ebe mmadụ niile nọ. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.) Ịhụnanya Kraịst nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ bụ ihe nyeere ya aka ime ihe Chineke zubeere ụmụ mmadụ. Ihe nlereanya ahụ Kraịst setịpụụrụ anyị ka anyị gbasochie anya na-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka iso mezuo nzube Chineke. Nke a pụtara na anyị kwesịrị ịhụ Chineke n’anya ruo otú ọ ga-ekwe anyị omume. (Mat. 22:37) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Kraịst kụziiri anyị na ihe o nyere n’iwu, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya nakwa na anyị kpebisiri ike ịkwado ọchịchị Chineke n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, dị ka Jizọs mere.—Jọn 14:23, 24; 15:10.
Ije Ije n’Ụzọ ahụ Kasị Mma Bụ́ Ịhụnanya
12. Gịnị ka Pọl kpọrọ “ụzọ kasị mma”?
12 Pọl onyeozi ṅomiri Kraịst. Pọl ji nkwuwa okwu gwa ụmụnna ya ka ha bụrụ ndị na-eṅomi ya n’ihi na o sochiri nzọụkwụ Kraịst anya. (1 Kọr. 11:1) N’agbanyeghị na Pọl gbara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt ume ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-achọ onyinye dị iche iche mmụọ nsọ na-enye Ndị Kraịst na narị afọ mbụ, ya bụ, onyinye ndị dị ka ịgwọ ọrịa na ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, ọ gwara ha na o nwere ihe ọzọ ha kwesịrị inwe, bụ́ nke ka onyinye ndị ahụ mma. O kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 12:31, sị: “Ma m ga-egosi unu ụzọ kasị mma.” Ihe ndị o kwuru n’amaokwu ndị so nke a na-egosi na ụzọ ahụ kasị mma bụ ịhụnanya. Olee otú o si bụrụ ụzọ kasị mma? Pọl mere ihe atụ iji kọwaa ihe ọ nọ na-ekwu. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:1-3.) Ọ bụrụ na Pọl nwere ike pụrụ iche ma na-eme ọtụtụ ihe ịtụnanya, uru gịnị ka ihe ndị a baara ya ma ọ bụrụ na ọ hụghị ndị ọzọ n’anya? O nweghị! Mmụọ Chineke mere ka o nwee ike ịkọwa okwu a dị mkpa. Otú a o si kọwaa ịhụnanya ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ọ bụ nke ọma.
13. (a) Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 2010? (b) Olee otú o si bụrụ na ịhụnanya adịghị ada ada?
13 Pọl gara n’ihu ịgwa anyị ihe ịhụnanya na-eme na ihe ọ naghị eme. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8.) Leruo onwe gị anya ka i wee mara ma ị̀ hụrụ ndị ọzọ n’anya. Lekwasị anya ná nkebi ahịrịokwu ikpeazụ dị n’amaokwu nke asaa nakwa n’ahịrịokwu mbụ dị n’amaokwu nke asatọ, ya bụ, ‘ịhụnanya na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada,’ nke bụ́ isiokwu dịịrị afọ 2010. Cheta na Pọl kwuru n’amaokwu nke asatọ na a ga-ewepụ onyinye dị iche iche mmụọ nsọ nyere Ndị Kraịst, ndị dị ka ibu amụma, na ịsụ asụsụ dị iche iche, bụ́ ihe ndị e ji mara Ndị Kraịst mgbe ha malitere ọhụrụ. Ha ga-akwụsị. Ma, ịhụnanya ga-adịgide. Jehova bụ ịhụnanya, Jehova anaghịkwa anwụ anwụ. N’ihi ya, ịhụnanya agaghị ada ada ma ọ bụkwanụ kwụsị ịdị. Ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi maka na ọ bụ àgwà Chineke anyị, bụ́ onye na-anaghị anwụ anwụ.—1 Jọn 4:8.
Ịhụnanya Na-atachi Obi n’Ihe Niile
14, 15. (a) Olee otú ịhụnanya ga-esi mee ka anyị nwee ntachi obi ma ọnwụnwa bịara anyị? (b) Gịnị mere otu nwa okorobịa ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ime uche Chineke?
14 Gịnị na-enyere Ndị Kraịst aka ịtachi obi n’agbanyeghị ọnwụnwa, ihe isi ike ma ọ bụkwanụ nsogbu ọ bụla bịaara ha? Ọ bụ ezigbo ịhụnanya. Onye nwere ịhụnanya dị otú a na-atachi obi mgbe ihe karịrị ihe onwunwe ya funahụrụ ya. Ọ ga-eme ka onye ahụ di njikere iguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụ dị njikere ịnwụ n’ihi Kraịst. (Luk 9:24, 25) Chegodị banyere okwukwe Ndịàmà Jehova nwere, bụ́ ndị a tara ahụhụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, ma ọ bụkwanụ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ.
15 Okwukwe nke otu nwa okorobịa onye Germany bụ́ Onyeàmà Jehova aha ya bụ́ Wilhelm gosiri na nke a bụ eziokwu. Kama ịgbanwe obi ya, o guzosiri ike mgbe ndị ọchịchị Nazi chọrọ ịgbagbu ya n’ihi okwukwe ya. O dere n’akwụkwọ ozi o ji sị ndị ezinụlọ ha ka ha nọdụ nke ọma, sị: “Karịa ihe ọ bụla ọzọ, anyị aghaghị ịhụ Chineke n’anya dị ka Jizọs Kraịst Onye ndú anyị nyere anyị iwu. Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị akwụsie ike n’akụkụ ya.” Ka oge na-aga, otu onye nke si n’ezinụlọ ha dere n’Ụlọ Nche, sị: “N’oge ọgba aghara nile, dị ka ezinụlọ, anyị ahụwo na ịhụnanya anyị hụrụ Chineke na-ebute ụzọ mgbe nile.” Nke a bụkwa ihe ụmụnna ndị nọ mkpọrọ ugbu a n’ihi okwukwe ha n’Armenia, Eritrea, South Korea, nakwa ala ndị ọzọ kpebiri. Ha ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ha kwụsị ịhụ Jehova n’anya.
16. Olee ọnwụnwa bịaara ụmụnna anyị na Malawi?
16 N’ọtụtụ ebe, ụdị ọnwụnwa ọzọ na-abịara ụmụnna anyị. Ruo afọ iri abụọ na isii, Ndịàmà Jehova nọ na Malawi tachiri obi mgbe ndị ọchịchị machibidoro ọrụ ha iwu nakwa mgbe a kpagburu ha mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ nakwa mgbe a rụsara ha ọtụtụ arụrụala. Jehova gọziri ha n’ihi na ha tachiri obi. Mgbe mkpagbu ahụ malitere, ha dị ihe dị ka puku mmadụ iri na asatọ. Mgbe afọ iri atọ gafere, ọnụ ọgụgụ ha ji okpukpu abụọ karịa ka ọ ha na mbụ. Ha dị puku iri atọ na asatọ, narị atọ na iri itoolu na atọ. Ụdị ihe a na-emekwa n’ala dị iche iche.
17. Olee ọnwụnwa na-abịara ndị ụfọdụ ndị mụrụ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova, oleekwa ihe mere ha ji enwe ike atachi obi?
17 Ọ bụ ezie na mkpagbu a na-akpagbu ndị Mat. 10:35, 36) Ọtụtụ ndị nne na nna na-abụghị Ndịàmà Jehova na-akpagbu ụmụ ha ndị na-erubeghị afọ iri abụọ. A chụpụdịla ụfọdụ n’ime ha, ma ụmụnna anyị na-anabata ha n’ụlọ ha. Ndị nke ọzọ bụkwa ndị ndị mụrụ ha jụrụ ajụ. Olee ihe nyeere ndị a niile aka ịtachi obi? Ọ bụghị naanị n’ihi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, kama, ọ bụ n’ihi ịhụnanya na-enweghị atụ ha nwere n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ.—1 Pita 1:22; 1 Jọn 4:21.
Chineke siri ike, ma, mkpagbu nke na-esi n’aka ndị ezinụlọ onye Kraịst na-esikarị nke a n’ike. Ndị ezinụlọ mmadụ ma ọ bụkwanụ ndị ikwu ya nwere ike ịkpagbu ya. Ọ̀ bụ na Jizọs ebughị amụma na nke a ga-eme? O buru. Nke a emezuokwala n’ahụ́ ọtụtụ ụmụnna anyị. (18. Olee otú ịhụnanya nke na-atachi obi n’ihe niile ga-esi nyere Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye aka?
18 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwere ike ịbịara anyị, bụ́ ihe ndị ga-eme ka anyị gosi na anyị nwere ịhụnanya nke na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya ga-eme ka di na nwunye rube isi n’ihe ahụ Jizọs kwuru, mgbe ọ sịrị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:6) Ọ bụrụ na ndị lụrụ di na nwunye na-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha” ha kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova nwe ha. (1 Kọr. 7:28) Okwu ya sịrị na ‘ịhụnanya na-atachi obi n’ihe niile.’ Ọ bụrụkwa na di na nwunye eyiri àgwà a dị ka uwe, ha agaghị ahapụ ibe ha, o nweghịkwa ihe ga-eme alụmdi na nwunye ha.—Kọl. 3:14.
19. Olee ihe ndị ohu Chineke mere mgbe e nwere ọdachi ndị meere onwe ha?
19 Ịhụnanya na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ihe niile mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha dakwasịrị anyị. Nke a mere mgbe e nwere ala ọma jijiji n’ebe ndịda Peru nakwa mgbe e nwere Ajọ Ifufe Katrina n’ebe dị n’akụkụ oké osimiri na United States. Ọdachi ndị ahụ lara ihe onwunwe ọtụtụ ụmụnna anyị n’iyi. Ịhụnanya ụmụnna anyị nwere n’ebe ibe ha nọ mere ka ha si n’ebe dị iche iche n’ụwa gbatara ha ọsọ enyemaka, ọtụtụ n’ime ha wepụtakwara onwe ha ịrụziri ụmụnna ha ụlọ ha na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị mebiri emebiri. Nke a na-egosi na ụmụnna anyị hụrụ ibe ha n’anya nakwa na ha na-enyere ibe ha aka mgbe niile n’agbanyeghị ihe merenụ.—Jọn 13:34, 35; 1 Pita 2:17.
Ịhụnanya Adịghị Ada Ada
20, 21. (a) Gịnị mere ịhụnanya ji bụrụ ihe kasị mma? (b) Gịnị ka i ji kpebisie ike ịhụ ndị ọzọ n’anya?
20 Taa, n’etiti ndị Jehova, anyị na-ahụ ezigbo ihe na-esi ná ndị mmadụ ịga ije n’ụzọ ahụ kasị mma, bụ́ ịhụnanya, apụta. N’eziokwu, ọ dị mma n’ọnọdụ niile. Lee otú Pọl onyeozi si mee ka nke a pụta ìhè. O bu ụzọ kwuo na onyinye ndị ahụ mmụọ nsọ na-enye ga-akwụsị nakwa na ọgbakọ Ndị Kraịst ga-akwụsị ịbụ nwa ọhụrụ ma ghọọ dimkpa. O kwuziri, sị: “Otú ọ dị, ihe ndị fọdụrụ ugbu a bụ okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a; ma nke kasị n’ime ha bụ ịhụnanya.”—1 Kọr. 13:13.
21 Ka oge na-aga, ihe ndị anyị nwere okwukwe na ha ga-eme ga-emecha mee. Ọ bụrụkwa na ha emee, okwukwe ahụ anyị nweburu na ihe ndị a ga-eme agaghịzi adị. Mgbe a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ, anyị agakwaghị enwe olileanya ahụ anyị nweburu ịhụ mgbe a ga-emere anyị nkwa niile e kwere anyị. Ma, gịnị ga-eme ịhụnanya? Ọ gaghị ada ada, ma ọ bụkwanụ kwụsị. Ọ ga-adịrị na-aga. Mgbe anyị ga-adịrị ndụ ebighị na-aga, anyị ga-ahụkwu ma ghọtakwuo ihe ndị ọzọ banyere ịhụnanya Chineke. Ọ bụrụ na ị na-eme uche Chineke site n’ịga ije n’ụzọ kasị mma, bụ́ ịhụnanya na-adịghị ada ada, i nwere ike iketa ndụ ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Gịnị mere na anyị aghaghị izere ịhụ ihe anyị na-ekwesịghị ịhụ n’anya n’anya?
• Gịnị ka ịhụnanya nwere ike ime ka anyị die?
• Olee otú o si bụrụ na ịhụnanya adịghị ada ada?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 27]
Isiokwu dịịrị afọ 2010 bụ: ‘Ịhụnanya na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada.’ —1 Kọr. 13:7, 8.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-eme ka anyị na-ezi ozi ọma
[Foto dị na peeji nke 26]
Ịhụnanya na-adịghị ada ada nke ụmụnna anyị nwere mere ka ha die mkpagbu a kpagburu ha na Malawi