Rụkọọnụ Ọrụ Ọnụ Ka Unu Wee Nwee Ọganihu
Rụkọọnụ Ọrụ Ọnụ Ka Unu Wee Nwee Ọganihu
NDỊ ezinụlọ kwesịrị ịna-arụkọ ọrụ ọnụ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ha jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe. Mgbe Jehova kere di na nwunye mbụ, o mere ka ha mata na ịrụkọ ọrụ ọnụ dị ezigbo mkpa. Iv na Adam ga na-arụkọ ọrụ ka Adam wee “zuo ezu.” (Jen. 2:18) Di na nwunye kwesịrị ịna-arụkọ ọrụ ọnụ ma na-enyere ibe ha aka. (Ekli. 4:9-12) Ọ bụrụkwa na nne na nna na ụmụ ha chọrọ ịrụ ọrụ Chineke nyere ha nke ọma, ha aghaghị ịna-arụkọ ọrụ ọnụ.
Ifekọ Chineke Ọnụ
Barry na Heidi mụrụ ụmụ ise. Ha chọpụtara na ịmụkọ ihe ọnụ na-eme ka ezinụlọ ha na-enwe ọganihu. Barry sịrị: “Site n’oge ruo n’oge, m na-enye ụmụ anyị obere ihe omume ha ga-eme n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị. Mgbe ụfọdụ, m na-agwa ha ka ha si n’isiokwu dị na Teta! kwadebe ihe ha ga-ekwu. Anyị na-amụgharịkwa otú anyị ga-esi ezi ozi ọma, ka ụmụ anyị wee mara ihe ha ga-ekwu mgbe anyị gara ozi ọma.” Heidi kwukwara, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe o dere ihe mgbaru ọsọ ya, anyị na-elebakwa ya anya site n’oge ruo n’oge ma anyị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ iji mara ma ànyị na-enwekwa ọganihu.” Di na nwunye a chọpụtakwara na tiivi ha na-anaghị agbanye ná mgbede ụfọdụ na-enyere onye ọ bụla n’ime ha aka ịgụ akwụkwọ.
Ọmụmụ Ihe Ọgbakọ
Mike na Denise mụrụ ụmụ anọ. Olee uru ezinụlọ ha ritere n’ịrụkọ ọrụ ọnụ? Mike sịrị: “Mgbe ụfọdụ, anyị na-aga ọmụmụ ihe n’azụ oge n’agbanyeghị atụmatụ ndị dị mma anyị mere. Ma, anyị chọpụtara na ịrụkọ ọrụ ọnụ nyeere anyị aka ịna-aga ọmụmụ ihe n’oge.” Denise sịrị: “Mgbe ụmụ anyị ka bụ ụmụaka, nke ọ bụla n’ime ha nwere ọrụ ọ na-arụ n’ụlọ. Nwa anyị nwaanyị, bụ́ Kim, na-enye aka esi nri, na-ebupụtakwa ya.” Nwa ha nwoke, bụ́ Michael, sịrị: “Anyị na-enwe ọmụmụ ihe ọgbakọ n’abalị Tuesday ọ bụla n’ụlọ anyị. N’ihi ya, anyị na-edewe ebe anyị na-anọ amụ ihe ọcha, na-ebupụtakwa oche ndị bịara ọmụmụ ihe ga-anọ.” Matthew, bụ́ nwa ha nwoke nke ọzọ, kwukwara, sị: “Papa anyị na-alọta ọrụ ngwa ngwa ụbọchị ọ bụla anyị ga-aga ọmụmụ ihe ná mgbede ka o wee nyere anyị aka ijikere.” Gịnị si na nke a pụta?
Mbọ Ha Gbara Alaghị n’Iyi
Mike sịrị: “Mụ na Denise malitere ịsụ ụzọ n’afọ 1987. N’oge ahụ, anyị na atọ n’ime ụmụ anyị ka bi. Abụọ n’ime ha mechara malite ịsụ ụzọ, e nwekwara mgbe ndị nke ọzọ so gaa wuo ụlọ na Betel. Ihe ọzọ na-eme ka ezinụlọ anyị na-enwe ọṅụ bụ na anyị enyerela mmadụ iri anọ aka ha ewee rara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim. Ezinụlọ anyị enwekwaala ihe ùgwù nke iso wuo ụlọ ụfọdụ e wurula n’ọgbakọ Jehova, ma ná mba anyị ma na mba dị iche iche.”
N’eziokwu, ezinụlọ ịrụkọ ọrụ ọnụ bara uru. Ò nwere ebe ndị ọzọ unu nwere ike ịna-arụkọ ọrụ ọnụ n’ezinụlọ unu? Ịrụkọ ọrụ ọnụ ga-enyere ezinụlọ gị aka inwe ọganihu n’ife Jehova.
[Foto dị na peeji nke 28]
Ịmụgharị otú a ga-esi zie ozi ọma na-eme ka e nwee ọganihu n’ikwusa ozi ọma