Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Jehova Na-aṅụrị Ọṅụ Ma I Guzosie Ike n’Ezi Ihe

Obi Jehova Na-aṅụrị Ọṅụ Ma I Guzosie Ike n’Ezi Ihe

Obi Jehova Na-aṅụrị Ọṅụ Ma I Guzosie Ike n’Ezi Ihe

“Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”—ILU 27:11.

1, 2. (a) Olee ebubo Setan boro ụmụ mmadụ nke e dere n’akwụkwọ Job? (b) Gịnị na-egosi na Setan ka na-akwa Jehova emo kemgbe Job nwụrụ?

JEHOVA kwere ka Setan nwaa ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Job, ọnwụnwa iji mara ma ọ ga-eguzosi ike n’ezi ihe. Setan bibiri anụ ụlọ niile Job nwere, gbuo ụmụ ya, meekwa ka ọ daa ọrịa. Ma, ọ bụghị naanị Job ka Setan bu n’obi mgbe o kwuru na ihe mere Job ji erubere Chineke isi abụghị na ọ hụrụ Jehova n’anya. Ọ sịrị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.” Ọ bụghị naanị Job ka o boro ebubo a, ọ gbasara ndị niile dịrị ndụ kemgbe Job nwụrụ, ruokwa ugbu a.—Job 2:4.

2 Ka ihe dị ka narị afọ isii gafere mgbe Setan nwara Job ọnwụnwa, Sọlọmọn ji ike mmụọ dee, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.” (Ilu 27:11) O doro anya na n’oge Sọlọmọn nọ ndụ, Setan ka na-ekwu na ihe mere ndị ohu Jehova ji erubere Jehova isi abụghị na ha hụrụ Jehova n’anya. Ihe ọzọ bụ na n’ọhụụ e kpugheere Jọn onyeozi, ọ hụrụ ka Setan nọ na-ebo ndị ohu Chineke ebubo mgbe e si n’eluigwe chụda Setan mgbe obere oge gafere ka e guzobechara Alaeze Chineke n’afọ 1914. Ọbụna ugbu a ọtụtụ afọ gaferela kemgbe oge ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a malitere, Setan ka na-ekwu na ndị ohu Chineke anaghị erubere Chineke isi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya!—Mkpu. 12:10.

3. Olee ihe ndị dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ Job?

3 Chebara ihe atọ dị mkpa n’ime ihe ndị anyị mụtara n’akwụkwọ Job echiche. Nke mbụ, ọnwụnwa a nwara Job mere ka anyị mata onye bụ́ onye iro ụmụ mmadụ na onye na-emegide ndị Chineke. Onye iro ahụ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Nke abụọ, n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị, ọ bụrụ na anyị na Chineke dị ná mma, anyị ga-enwe ike iguzosi ike n’ezi ihe. Nke atọ, mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, Chineke na-enyere anyị aka idi ya dị ka o nyeere Job. Taa, Jehova ji Okwu ya, nzukọ ya, na mmụọ nsọ ya eme nke a.

Echefula Onye Bụ́ Onye Iro Anyị

4. Ònye mere ka ọnọdụ ụwa dị otú ọ dị ugbu a?

4 Ọtụtụ ndị ekweghị na Setan dị. N’agbanyeghị na otú ọnọdụ ụwa dị na-enye ha nsogbu n’obi, ha amaghị onye kpatara ihe na-emenụ: Na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ụmụ mmadụ na-akpata ọtụtụ n’ime nsogbu ndị anyị na-enwe. Nne na nna mbụ anyị, bụ́ Adam na Iv, họọrọ ịna-eme ihe ha chọrọ kama ime ihe Onye kere ha chọrọ. Kemgbe ahụ, ọtụtụ mmadụ anọwo na-eme ihe ndị amamihe na-adịghị na ha. Ma, ọ bụ Ekwensu ghọgburu Iv o wee nupụrụ Chineke isi. Ọ bụ ya mere ụwa a ọ na-achị, bụ́ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ́ ndị na-anwụ anwụ, bi na ya ji dịrị otú ọ dị ugbu a. Ebe ọ bụ na Setan bụ “chi nke usoro ihe a,” ọtụtụ mmadụ nwere àgwà ndị ahụ o nwere, ya bụ, mpako, esemokwu, ekworo, anyaukwu, aghụghọ, na nnupụisi. (2 Kọr. 4:4; 1 Tim. 2:14; 3:6; gụọ Jems 3:14, 15.) Àgwà ndị a na-eme ka a na-enwe esemokwu n’ọchịchị nakwa n’okpukpe. Ọ na-emekwa ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị, na-arụrụ aka, ma na-eme aghara, bụ́cha ihe ndị na-ewetara ụmụ mmadụ nnukwu nsogbu.

5. Olee ihe anyị ga-eji ihe bara uru anyị ma mee?

5 Ihe a anyị, bụ́ ndị ohu Jehova, ma bara ezigbo uru. N’eziokwu, anyị ma onye mere ụwa ji dị njọ. N’ihi ya, ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka anyị na-aga ozi ọma iji mee ka ndị mmadụ mata onye kpatara nsogbu ndị anyị na-enwe n’ụwa? Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ ikwado ezi Chineke, bụ́ Jehova, wee mee ka ndị ọzọ mata otú ọ ga-esi bibie Setan nakwa otú ọ ga-esi kwụsị nsogbu ndị mmadụ na-enwe?

6, 7. (a) Ònye ka mkpagbu a na-akpagbu ezi ndị Chineke si n’aka? (b) Olee otú anyị ga-esi mee ka Elaịhu oge ochie?

6 Ọ bụ Setan kpatara ọtụtụ n’ime nsogbu dị n’ụwa a, ọ bụkwa ya ka mmegide a na-emegide ndị Chineke si n’aka. Mkpa ya niile bụ ịnwa anyị ọnwụnwa. Jizọs Kraịst gwara Pita onyeozi, sị: “Saịmọn, Saịmọn, lee! Setan achọsiwo ike ka a yọchaa unu dị ka ọka wit.” (Luk 22:31) N’otu aka ahụ, ọ ga-enwerịrị ka ọnwụnwa ga-esi bịara onye ọ bụla n’ime anyị, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs. Pita ji Ekwensu tụnyere “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” Pọl sịkwara: “A ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.”—1 Pita 5:8; 2 Tim. 3:12.

7 Mgbe nwanna anyị nwere ọdachi, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ma onye wetara ọdachi ahụ? Kama ịgbara nwanna ahụ ọsọ, anyị kwesịrị ime ka Elaịhu oge ochie, bụ́ onye gwara Job okwu otú ezigbo enyi mmadụ kwesịrị isi gwa ya okwu. Anyị kwesịrị inyere nwanna anyị ahụ aka ka o merie ọnwụnwa ahụ onye iro anyị, bụ́ Setan, wetaara ya. (Ilu 3:27; 1 Tesa. 5:25) Ihe mere anyị ji na-eme nke a n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu anyị, bụ iji nyere nwanna anyị aka ka o guzosie ike n’ezi ihe. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, ọ ga-eme ka onye ahụ mee ka obi Jehova ṅụrịa.

8. Gịnị mere Setan emelighị ka Job kwụsị irubere Jehova isi?

8 Ihe mbụ Setan lara n’iyi bụ anụ ụlọ Job. Anụ ụlọ ndị ahụ baara Job uru, ikekwe, ha bụ ihe o ji akpata ego. Job jikwa ha efe Chineke. Job mechaa ka ụmụ ya dị ọcha, “ọ na-ebili n’isi ụtụtụ chụọ àjà nsure ọkụ dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị; n’ihi na, Job na-asị, ‘ma eleghị anya, ụmụ m emehiewo ma kọchaa Chineke n’obi ha.’ Otú ahụ ka Job na-eme mgbe niile.” (Job 1:4, 5) Nke a na-egosi na Job na-eji ụmụ anụmanụ achụrụ Jehova àjà mgbe niile. Ọ kwụsịrị ime nke a mgbe ahụ Ekwensu nọ na-anwa ya ọnwụnwa. Job enweghịzi ihe “dị oké ọnụ ahịa” ọ ga-eji na-asọpụrụ Jehova. (Ilu 3:9) Ma, ọ ka nwere ike iji egbugbere ọnụ ya na-asọpụrụ Jehova. O mekwara otú ahụ.

Gbalịsie Ike Ka Gị na Jehova Dị ná Mma

9. Olee ihe kacha baa uru n’ihe niile anyị nwere?

9 Ma ànyị bara ọgaranya ma ànyị bụ ndị ogbenye, ma ànyị bụ ndị ntorobịa ma ànyị bụ ndị katarala ahụ́, ma ahụ́ ọ̀ dị anyị ma ọrịa ọ̀ na-arịa anyị, anyị nwere ike ime ka anyị na Jehova dị ná mma. N’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị, ọ bụrụ na anyị na Chineke dị ná mma, anyị ga-enwe ike iguzosi ike n’ezi ihe ma mee ka obi Jehova ṅụrịa. Ọbụna ndị ụfọdụ natara eziokwu ọhụrụ diri ọnwụnwa ndị bịaara ha ma guzosie ike n’ezi ihe.

10, 11. (a) Olee ihe otu nwanna anyị nwaanyị mere mgbe a na-akpagbu ya? (b) Olee otú nwanna nwaanyị a si gosi na Setan bụ onye ụgha?

10 Tụlee banyere Nwanna Nwaanyị Valentina Garnovskaya, bụ́ otu n’ime ọtụtụ Ndịàmà nọ na Russia. O guzosiri ike n’ezi ihe dị ka Job, n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị siri ike bịaara ya. N’afọ 1945, mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ, otu nwanna nwoke ziri ya ozi ọma. Nwanna nwoke ahụ gara nletaghachi n’ụlọ ya ugboro abụọ. Ma, ka oge na-aga, ha ahụghịzi onwe ha ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Valentina malitere izi ndị agbata obi ya ozi ọma. Nke a mere ka e jide ya ma maa ya ikpe ịga mkpọrọ afọ asatọ. Mgbe o si n’ụlọ mkpọrọ pụta n’afọ 1953, ọ maliteghachiri ozugbo izi ndị mmadụ ozi ọma. E jidere ya ọzọ wee tụọ ya mkpọrọ. Na nke ugbu a, a tụrụ ya mkpọrọ afọ iri. Mgbe ọ nọrọ ọtụtụ afọ n’otu ụlọ mkpọrọ, a kpọgara ya n’ụlọ mkpọrọ ọzọ. Ụmụnna nwaanyị ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ nwere otu Baịbụl. Otu nwanna nwaanyị gosiri Valentina Baịbụl ahụ otu ụbọchị. Nke a mere ka obi dị ya ụtọ nke ukwuu! E wezụga Baịbụl ahụ e gosiri ya, Baịbụl ọzọ Valentina hụtụrụla bụ nke ahụ nwanna nwoke ahụ ji zie ya ozi ọma n’afọ 1945!

11 Valentina si n’ụlọ mkpọrọ pụta n’afọ 1967, e mee ya baptizim iji gosi na ọ rarala onwe ya nye Jehova. O ji ịnụ ọkụ n’obi jiri ohere ahụ o nwere mgbe a hapụrụ ya na-ezi ozi ọma ruo n’afọ 1969. Ma, e jidere ya ọzọ n’afọ ahụ wee maa ya ikpe na ọ ga-aga mkpọrọ afọ atọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Valentina nọgidere na-ezi ozi ọma. Tupu ya anwụọ n’afọ 2001, o nyeere mmadụ iri anọ na anọ aka ịnata eziokwu. Ọ nọrọ mkpọrọ afọ iri abụọ na otu. Ọ hapụrụ ihe niile, dịkwa njikere ịga mkpọrọ, iji nwee ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. Mgbe Valentina na-achọ ịnwụ, ọ sịrị: “Enweghị m ụlọ. Ihe niile m nwere dị n’otu igbe, n’agbanyeghị nke ahụ, obi dị m ụtọ, enwekwara m afọ ojuju na m fere Jehova ofufe.” Valentina gosiri na Setan bụ onye ụgha, bụ́ onye kwuru na ụmụ mmadụ agaghị anọgide na-erubere Chineke isi ma ọnwụnwa bịara ha. (Job 1:9-11) O doro anya na Valentina mere ka obi Jehova ṅụrịa. Jehova na-atụsikwa anya ike oge ọ ga-akpọlite Valentina na ndị ọzọ niile kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ.—Job 14:15.

12. Olee otú ịhụnanya ga-esi mee ka anyị na Jehova dịrị ná mma?

12 Anyị na Jehova bụ enyi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Àgwà Chineke masịrị anyị, anyị na-emekwa ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji na-akpa àgwà kwekọrọ ná nzube ya. Iji gosi na ihe Ekwensu kwuru abụghị eziokwu, anyị ji obi anyị dum hụ Jehova n’anya. Ịhụnanya a na-eme ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị. Jehova “ga-echekwa ụzọ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche.”—Ilu 2:8; Ọma 97:10.

13. Olee otú Jehova si ele ihe anyị na-emere ya anya?

13 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-enyere anyị aka ịsọpụrụ aha ya, n’agbanyeghị na anyị nwere ike iche na ọ dịghị oké ihe anyị ga-emeli. Ọ na-ahụ na anyị bu ezi ihe n’obi, ọ naghịkwa ama anyị ikpe ma ọ bụrụ na ike adịghị anyị imezu ihe bụ́ ọchịchọ anyị. Ihe dị ya mkpa abụghị naanị ihe anyị mere, kamakwa ihe mere anyị ji mee ihe ahụ. N’agbanyeghị na ihe ndị mere Job nọ na-ewute Job, ya ana-edikwa ọtụtụ ihe bịara ya, ọ gwara ndị nọ na-ebo ya ebubo na ya hụrụ ụzọ Jehova n’anya. (Gụọ Job 10:12; 28:28.) N’isi ikpeazụ nke akwụkwọ Job, Chineke kwuru na iwe na-ewe ya n’ihi na Elifaz, Bildad, na Zofa ekwughị eziokwu. Ma, Jehova gosiri na ihe Job dị ya mma site n’ịkpọ ya “ohu m” ugboro anọ nakwa site n’ịgwa Job ka o kpeere ndị ajọ omume ahụ ekpere. (Job 42:7-9) Ka anyị na-eme dị ka Job ka ihe anyị wee dị Jehova mma.

Jehova Na-enyere Ndị Ohu Ya Kwesịrị Ntụkwasị Obi Aka

14. Olee otú Jehova si nyere Job aka ile ihe anya otú o kwesịrị?

14 Job guzosiri ike n’ezi ihe n’agbanyeghị na o zughị okè. Mgbe ụfọdụ, mgbe ihe siiri ya nnọọ ike, ọ na-eche echiche n’ụzọ na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Jehova, sị: “M na-etiku gị maka enyemaka, ma ị dịghị aza m . . . I ji ike gị dum na-ebuso m iro.” Ihe dị Job ezigbo mkpa bụ igosi na aka ya dị ọcha. Ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe m mejọrọ.” Ọ sịkwara na “ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ọbụ aka m, ekpere m dịkwa ọcha.” (Job 10:7; 16:17; 30:20, 21) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ji obiọma nyere Job aka site n’ịjụ ya ọtụtụ ajụjụ ndị mere ka Job kwụsị iche na ya dị mkpa. Ajụjụ ndị ahụ nyekwaara Job aka ịhụ nke ọma na Chineke dị elu nakwa na a gaghị eji mmadụ tụnyere ya. Job nabatara ntụziaka ahụ wee kweta na ya mere ihe na-ezighị ezi.—Gụọ Job 40:8; 42:2, 6.

15, 16. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si enyere ndị ohu ya aka taa?

15 Taa, Jehova na-eji obiọma enyekwa ndị ohu ya ndụmọdụ siri ike. Anyị na-eritekwa uru na ndụmọdụ ya. Dị ka ihe atụ, Jizọs Kraịst chụrụ àjà mgbapụta, nke mere ka Chineke na-agbaghara anyị mmehie. Anyị na Chineke nwere ike ịdị ná mma n’ihi àjà mgbapụta a n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Jes. 4:8; 1 Jọn 2:1) Mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịaara anyị, anyị na-ekpekwa ekpere ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka ịkwụsi ike. Anyị nwekwara Baịbụl zuru ezu, ọ bụrụkwa na anyị na-agụ ya ma na-atụgharị uche na ya, anyị ga-adị njikere maka ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara anyị. Ịmụ Baịbụl na-enyere anyị aka ịmata ihe ahụ na-ese okwu banyere onye kwesịrị ịchị eluigwe na ala, ọ na-enyekwara anyị aka iguzosi ike n’ezi ihe.

16 Anyị na-eritekwa uru dị ukwuu n’ihi na anyị so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, bụ́ ndị Jehova na-enye nri ime mmụọ site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” (Mat. 24:45-47) Ndịàmà Jehova nwere ihe dị ka otu narị puku ọgbakọ n’ụwa dum. N’ọgbakọ ndị a, anyị na-amụ ihe ndị na-ewusi okwukwe anyị ike imeri ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Ihe mere na klas Sheila ha, bụ́ Onyeàmà na-erubeghị afọ iri abụọ, nke bi na Germany, na-egosi na nke a bụ eziokwu.

17. Kọọ ihe atụ na-egosi na ọ dị mma ka anyị na-abịachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya.

17 E nwere otu ụbọchị onye nkụzi na-anọghị na klas Sheila ha. Ụmụ klas ha wepụtara ihe e ji eme anwansi, were ya mewe anwansi. Sheila pụrụ na klas ahụ ozugbo. Mgbe ọ nụrụ ihe mere na klas ha, o nwere obi ụtọ na ya pụrụ tupu ihe ahụ emee. Mgbe ụmụ akwụkwọ ndị ahụ nọ na-eme anwansi, e nwere otú ahụ si mewe ụfọdụ n’ime ha ka à ga-asị na ndị mmụọ ọjọọ nọ n’etiti ha. Ụjọ tụrụ ha, ha agbapụ na klas ha. Ọ̀ bụ gịnị nyeere Sheila aka ikpebi ịpụ na klas ahụ n’egbughị oge? Sheila sịrị: “Obere oge tupu ihe ahụ emee, anyị mụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze banyere ihe nwere ike ime ma e jiri ihe ahụ ha ji mee anwansi mewe anwansi. Ya mere, ama m ihe m kwesịrị ime. Achọrọ m ime ihe dị Jehova mma, dị ka Baịbụl kwuru n’Ilu 27:11.” Ọ dị nnọọ mma na Sheila gara ọmụmụ ihe ụbọchị ahụ ma gee ntị nke ọma n’ihe a mụrụ!

18. Gịnị ka i kpebiri ime?

18 Ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike irube isi ná ntụziaka ọgbakọ Chineke na-enye anyị. Anyị ga-enweta nduzi na enyemaka dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-agụ Baịbụl mgbe niile, na-amụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-ekpe ekpere, ma na-emete Ndị Kraịst tozuru okè enyi. Jehova chọrọ ka anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe, obi sikwara ya ike na anyị ga na-erubere ya isi. Anyị nwere nnukwu ihe ùgwù nke ito aha Jehova, iguzosi ike n’ezi ihe, nakwa ime ka obi Jehova ṅụrịa.

Ị̀ Chetara?

• Olee nsogbu na ọnwụnwa ndị Setan na-ewetara ụmụ mmadụ?

• Olee ihe kacha ihe niile anyị nwere baa uru?

• Gịnị ga-eme ka anyị na Jehova dị ná mma?

• Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si enyere anyị aka taa?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 8]

Ọ̀ na-emetụ gị n’obi ịgwa ndị ọzọ ihe dị mkpa ị ma?

[Foto dị na peeji nke 9]

Anyị nwere ike inyere ụmụnna anyị aka iguzosi ike n’ezi ihe

[Foto dị na peeji nke 10]

Valentina hapụrụ ihe niile iji nwee ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe