Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Nwere Ndị Dị n’Otu n’Ụwa Nile Gịnị Nyeere Ha Aka Ịdị n’Otu?

E Nwere Ndị Dị n’Otu n’Ụwa Nile Gịnị Nyeere Ha Aka Ịdị n’Otu?

E Nwere Ndị Dị n’Otu n’Ụwa Nile Gịnị Nyeere Ha Aka Ịdị n’Otu?

OLEE otú ị ga-esi akọwa okwu ahụ bụ́ “ịdị n’otu”? Ụfọdụ ndị na-akọwa ya dị ka mgbe a na-anaghị alụ ọgụ ma ọ bụ na-ese okwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mba abụọ ma ọ bụ karịa abịanye aka n’akwụkwọ ma kwekọrịta na ha ga-adị n’udo, e nwere ike ikwu na ha dị n’otu. Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Ọ bụchaghị.

Tụlegodị nke a: Kemgbe ụwa, ọtụtụ mba abịanyela aka n’akwụkwọ ma kwekọrịta na ha ga-adị n’udo ma e mesịa ha adịghị eme ihe ha kwekọrịtara. Gịnị na-akpata ya? Ọ na-abụkarị n’ihi na ihe dị ndị ọchịchị ụwa mkpa abụghị ịhụ na e nwere udo ma ọ bụ na a dị n’otu kama ọ bụ igosi na ha karịrị ndị ọzọ. Ihe ọzọkwa bụ na egwu ji mba ụfọdụ n’ihi na ha amaghị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na mba ndị ọzọ akara ha nwee ngwá agha.

N’ihi ya, na mba abụọ anaghị alụ agha apụtaghị na ha dị n’udo. Ànyị nwere ike ikwu n’ezie na mmadụ abụọ tụgidere onwe ha égbè n’ihu nọ n’udo nanị n’ihi na ọ dịbeghị onye nke gbara nke ya? A pụrụ ikwu na echiche dị otú ahụ ezighị ezi. Ma ọ bụ otú ahụ ka ọtụtụ mba n’ụwa taa nọ. N’ihi otú mba dị iche iche si nnọọ na-enyo ibe ha enyo, ụjọ ji ha nile na otu ụbọchị a ga-atụpụ ngwá agha ọ gwụrụ mba. Gịnị ka e merela iji gbochie ụdị ihe a ime?

Ụjọ Bọmbụ Nuklia—Ihe Na-eme Ka A Ghara Ịdị n’Otu

Ọtụtụ mmadụ nwere olileanya na Nkwekọrịta Maka Ịkwụsị Mmụba Ngwá Agha Nuklia (Nuclear Non-Proliferation Treaty, nke a na-akpọ NPT), bụ́ nke a nabatara n’afọ 1968 ga-egbo mkpa a. E kwekọrịtara ka mba ndị na-enweghị ngwá agha nuklia ghara imepụta nke ha, machibidokwa mba ndị nwere ya ikesasị ya ebe nile. Ihe e bu n’obi nwee nkwekọrịta a, bụ́ nke mba dị otu narị na iri asatọ nabatarala ugbu a, bụ na a ga-emesi kwụsị imepụta ngwá agha nuklia ma napụchaa mba ndị nke nwere enwe nke ha.

Ọ bụ ezie na ihe a ha bu n’obi amaka, ma ụfọdụ ndị na-ekwu na nke a bụ atụmatụ ‘mba ndị nwere ngwá agha nuklia’ mere iji gbochie mba ndị na-enweghị ya imepụta nke ha. N’ihi ya, ụfọdụ na-eche na mba ndị bịanyerela aka n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ nwere ike ịgbanwe obi ha. N’ezie, mba ụfọdụ weere ya na e mejọrọ ha nke ukwuu site n’igbochi ha imepụta ngwá agha ha lere anya na ọ ga-enyere ha aka ichebe onwe ha.

Otu ihe mere ka okwu a sikwuo ike—ikekwe, nke mekwuru ka nsogbu a ka njọ—bụ na a machibidoghị mba ọ bụla iwu imepụta ikike nuklia nke na-emepụta ọkụ eletrik. Nke a emeela ka egwu jide ụfọdụ ndị na mba ụfọdụ na-eji ikike nuklia emepụta ihe ga-abara mba ha uru nweziri ike iji ya na-emepụta ngwá agha nuklia na nzuzo.

Mba ndị nweburu ngwá agha nuklia nwedịrị ike ịjụ ime ihe ha kwetaburu ime. Ndị na-akatọ nkwekọrịta ahụ na-ekwu na ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịtụwa anya na mba ndị nwejuru ngwá agha ga-ebibisị ngwá agha ha ma ọ bụ wepụ ụfọdụ n’ime ha. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, tupu e “nwee ike ime nke a . . . mba nile ga-adịrịrị n’ezigbo mma, ọ dịghịkwa nke ga na-enyo ibe ya enyo n’ime mba ndị na-ese okwu taa [o sikwara ike ikweta na] ihe dị otú a nwere ike ime eme.”

Mgbalị nile ụmụ mmadụ na-eme ịhụ na ụwa dị n’otu—n’agbanyeghị obi ọcha ha ji na-eme ya—akụọla afọ n’ala. Nke a adịghị eju ndị na-amụ Bible anya n’ihi na Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Bible kwukwara ya hoo haa, sị: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.” (Ilu 16:25) Ọchịchị ụmụ mmadụ agaghị emeli ka e nwee udo kpamkpam. Ma nke ahụ apụtaghị na olileanya adịghịzi.

Onye Na-eme Ka A Dị n’Otu n’Ezie

Bible na-akọrọ anyị nkwa ndị Chineke kwere na ụwa ga-adị n’otu, ma ọ gwakwara anyị na ọ bụghị n’aka ụmụ mmadụ ka ọ ga-esi mezuo. Onye Okike, onye ọ bụ nzube ya ka ụmụ mmadụ biri n’udo n’ụwa nile, ga-eme ihe ụmụ mmadụ na-agaghị emeli. Ọ ga-esiri ụfọdụ ndị ike ikweta na ihe a ga-eme. Kemgbe e kere ụwa, nzube Chineke bụ na ụmụ mmadụ ga-ebi n’udo ma dịrị n’otu. * Ọtụtụ ebe na Bible na-egosi na ọ ka bụkwa nzube Chineke ka mmadụ nile dịrị n’otu. Ka anyị tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ole na ole kwuru ihe a:

• “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, Onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọala nile n’ọkụ.”—ABỤ ỌMA 46:8, 9.

• “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—AỊSAỊA 11:9.

• “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile; ịta ụta nke ndị Ya ka Ọ ga-ewezụgakwa n’elu ụwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.”—AỊSAỊA 25:8.

• “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.”—2 PITA 3:13.

• “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—MKPUGHE 21:4.

Obi siri anyị ike na nkwa ndị a ga-emezu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova Chineke bụ́ Onye Okike nwere ikike ime ka ụmụ mmadụ dịrị n’otu. (Luk 18:27) Ọ na-agụkwa ya agụụ ime ya. Bible kwudịrị na ọ bụ “dị ka ihe dị [Chineke] ụtọ si dị . . . ịchịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.”—Ndị Efesọs 1:8-10.

Nkwa Chineke kwere na a ga-enwe “ụwa ọhụrụ” nke “ezi omume gajekwa ibi n’ime ha” abụghị nrọ efu. (2 Pita 3:13) Jehova Chineke kwuru banyere ihe o kwere ná nkwa, sị: “Ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.

Ndị Okwu Chineke Mere Ka Ha Dị n’Otu

Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, okpukpe na-ekewakarị ụmụ mmadụ kama ime ka ha dị n’otu. Okwu a kwesịrị ka anyị chebara ya echiche, n’ihi na ọ bụrụ na anyị kweere na e nwere Onye Okike, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na ndị na-efe ya ga-adị n’udo ma dịrị n’otu? O kwesịrị nnọọ ịdị otú ahụ!

Nkewa okpukpe kpatarala n’etiti ụmụ mmadụ agbasaghị Jehova Chineke na Okwu ya. Kama ọ bụ okpukpe ka ụta dịịrị n’ihi na ha na-akwado mgbalị ụmụ mmadụ na-eme ka ụwa nile dịrị n’otu kama ime ihe bụ́ nzube Chineke. Jizọs kpọrọ ndị ndú okpukpe nke oge ya “ndị ihu abụọ” ma sị ha: “Aịzaịa buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ. Ọ bụ n’efu ka ha nọgidere na-efe m ofufe, n’ihi na ha na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu dị ka ozizi.’”—Matiu 15:7-9.

N’aka nke ọzọ, ezi ofufe na-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu. Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọ ga-ekpekwa ikpe n’etiti mba nile, dozikwaara ọtụtụ ndị dị iche iche okwu ha: ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:2, 4.

N’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ taa, Ndịàmà Jehova na-erube isi ná ndụmọdụ Jehova Chineke na-enye banyere ụzọ a ga-esi na-adị n’otu. Olee ihe bụ́ isi mere ha ji dịrị n’otu? Pọl onyeozi dere, sị: “Yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) E nwere ike iji akwara ndị dị n’ahụ́ mmadụ kọwaa okwu Grik Pọl ji mee ihe n’ebe a, nke a sụgharịrị ịbụ “nkekọ.” Akwara ndị a na-esi ike ka ụdọ, ha na-arụkwa ọrụ abụọ dị oké mkpa. Ha na-enyere ihe ndị dị n’ahụ́ aka ịnọ ebe ndị ha kwesịrị ịnọ, na-ejikọkwa ọkpụkpụ ndị dị n’ahụ́.

Otú ahụ ka ọ dịkwa ịhụnanya. Ọ bụghị nanị na ịhụnanya na-egbochi ndị mmadụ igbu ibe ha, kamakwa ịhụnanya yiri nke Kraịst na-eme ka ndị si ná mba dị iche na-emekọ ihe n’udo. Dị ka ihe atụ, ọ na-enyere ndị mmadụ aka ime ihe Ụkpụrụ Ọma ahụ kwuru. Dị ka e dekọrọ ya na Matiu 7:12, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” Ime ihe a e kwuru ebe a enyerela ọtụtụ ndị aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị.

“Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu”

Ndịàmà Jehova dị njikere igosi na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst site n’ime ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ha egosipụtala ịhụnanya dị otú a n’ụzọ ndị pụtara nnọọ ìhè ná mba ebe otu agbụrụ na ibe ya na-alụ ọgụ nakwa mgbe e nwere ọgba aghara n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1994 mgbe otu agbụrụ gbalịrị igbuchapụ agbụrụ ibe ya na Rwanda, Ndịàmà Jehova gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ndịàmà ndị Hutu dị njikere ịnwụ iji chebe ụmụnna ha ndị Tutsi!

N’ezie, ịtụwa anya na mba ndị dị n’ụwa ga-amụta ịhụ ibe ha n’anya ruo ókè nke na ụwa nile ga-adị n’otu bụ ihe na-agaghị eme eme. Dị ka Bible kwuru, ọ bụ Chineke ga-eme ka e nwee udo n’ụwa nile n’oge ọ chọrọ ya. Ma ka ọ dịgodị, ụmụ mmadụ nwere ike ịmụta iyikwasị onwe ha ịhụnanya ma na-adị n’otu.

N’afọ gara aga, Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu ijeri awa kwusaara ndị mmadụ ozi ọma, na-akọrọ ha ihe Bible kwuru na uru ọ ga-abara ha ná ndụ. Inwe ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke emeela ka ọtụtụ nde mmadụ dịrị n’otu, ụfọdụ n’ime ha bụkwa ndị kpọburu ibe ha asị. Ndị a gụnyere ndị Arab na ndị Juu, ndị Armenia na ndị Turkey, ndị Germany na ndị Russia. À ga-ekwudị ole ghara ole?

Ị̀ ga achọ ịmụtakwu otú Okwu Chineke bụ́ Bible si eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu? Ọ bụrụ na ị chọrọ, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị, ma ọ bụ detara anyị akwụkwọ ozi n’otu n’ime adres ndị e depụtara na peeji nke 2 na magazin a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 12 Iji matakwuo ihe bụ́ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ, gụọ isi nke atọ nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe Odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

A bịanyela aka n’ọtụtụ puku akwụkwọ nkwekọrịta udo ma e mesịa e meghị ihe e kwekọrịtara

[Ihe Odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Itinye ihe Bible kwuru n’ọrụ arụpụtala ihe ọchịchị ụmụ mmadụ na-enweghị ike ịrụpụta

[Foto dị na peeji nke 5]

Okwu Chineke na-agwa anyị Onye ga-eme ka anyị dị n’otu n’ezie

[Foto dị na peeji nke 7]

Ebe Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Hutu na ndị Tutsi so na-arụkọ ụlọ ebe ha na-efe ofufe