Mara Mkpa Ọ Dị Ịja Ndị Ọzọ Mma
Mara Mkpa Ọ Dị Ịja Ndị Ọzọ Mma
Ị̀ NỤTỤLA ka mmadụ na-eme mkpesa na onye weere ya n’ọrụ adịchaghị aja ya mma? Ọ̀ dịtụla mgbe i mere ụdị mkpesa a? Ma ọ bụkwanụ ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ọ̀ dịtụla mgbe i mere mkpesa na ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye nkụzi gị adịghị aja gị mma?
Ụfọdụ n’ime mkpesa ndị a a na-eme ziri ezi. Dị ka otu onye Germany na-akụzi otú e si akpali ndị mmadụ ịrụ ọrụ si kwuo, mgbe ọ bụla ndị e were n’ọrụ mere ụdị mkpesa a, ihe kasị ewute ha abụghị na onye ha na-arụrụ ọrụ ajaghị ha mma kama ọ bụ na onye ha na-arụrụ ọrụ adịghị egosi mmasị n’ebe ha nọ. Ka o sina dị, o doro anya na ọ dị ihe a na-emeghị. Ma ịja mma ma igosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ dịcha mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iso ha na-emekọrịta ihe n’ụzọ dị mma.
Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere ife Jehova ofufe. Ọgbakọ Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ebe a na-aja ndị mmadụ mma na ebe e ji obiọma na ịhụnanya emeso ndị ọzọ ihe. Itinye ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ na-enyere ndị nọ n’ọgbakọ aka ịnọgide na-eme ihe ndị a. Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú ịhụnanya si dịrị n’ọgbakọ anyị, a ka nwere ike ime ka ihe kakwuo mma. Buru nke a n’uche ka anyị na-atụle mmadụ atọ setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya n’ịja ndị ọzọ mma: Elaịhu onye bụ́ ohu Chineke nke biri ndụ tupu oge Ndị Kraịst, Pọl onyeozi, na Jizọs Kraịst n’onwe ya.
Iji Nkwanye Ùgwù Na-enye Ndụmọdụ
Elaịhu, onye yiri ka ọ bụ onye ikwu Ebreham, nyeere Job aka nke ukwuu ịghọta otú o kwesịrị isi na-ele Chineke anya. Elaịhu ji nkwanye ùgwù gwa Job okwu. O ji ndidi chere ka o ruo ya n’aka ịgwa Job okwu. Ọ bụ ezie na nanị ihe ndị ahụ sị na ha bụ ndị enyi Job mere bụ ịkatọ ya, Elaịhu egbughị oge n’ịja Job mma maka ezi ihe ndị o mere ma nyekwa ya ndụmọdụ. O meghị ka ndị enyi ụgha ahụ, kama ọ kpọrọ Job aha mgbe ọ na-agwa ya okwu, si otú a gosi na ọ bụ enyi nwere mmasị n’ebe enyi ya nọ. O ji nkwanye ùgwù gwa Job, sị: “Biko Job, nụrụ okwu m nile, ṅakwaa ntị okwu m nile.” Ọ dị ya ka ọ bụ ya ka ihe ahụ mere Job mere, o jikwa nnọọ nkwanye ùgwù gwa Job, sị: “Lee, mụ onwe m dị ka i si dị n’ebe Chineke nọ: site n’ụrọ ka a kpụrụ m, ọbụna mụ onwe m.” Mgbe o kwuchara nke a, ọ jara Job mma, sị: “Ọ bụrụ na okwu adị n’ọnụ gị, zaghachi m: kwuo, n’ihi na ọ dị m ụtọ ịgụ gị n’onye ezi omume.”—Job 33:1, 6, 32.
Iji nkwanye ùgwù na-emeso ndị ọzọ ihe bụ otu ụzọ isi na-aja ha mma. Ya bụ, ihe anyị na-agwa onye ahụ bụ, ‘I ruru nnọọ eru ka m nwee mmasị n’ebe ị nọ ma jiri nkwanye ùgwù mesoo gị ihe.’ Anyị si n’ụzọ dị otú a na-agwa onye ahụ na ọ bụ enyi anyị nakwa na anyị hụrụ ya n’anya.
Mgbe anyị ji nkwanye ùgwù na-emeso ndị ọzọ ihe, anyị ekwesịghị ime ya nanị iji
mezuo iwu. Iji ruo ndị ọzọ n’obi, nkwanye ùgwù anyị ga-abụrịrị nke ezigbo ya na nke si n’ezi obi. Ọ ga-abụrịrị ụdị na-egosi na anyị nwere ezigbo mmasị n’ebe onye ahụ nọ nakwa na anyị hụrụ ya n’anya.Iji Akọ Na-aja Ndị Ọzọ Mma
Ṗọl onyeozi gosiri mkpa iji akọ eme ihe dị mgbe anyị na-aja ndị ọzọ mma. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl na-ekwusa ozi ọma n’Atens na njem ozi ala ọzọ nke abụọ ya, ọ gbachiteere Iso Ụzọ Kraịst mgbe ọ na-agwa ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma Grik okwu. Hụwa ama otú o si jiri akọ mee ihe mgbe o zutere ọnọdụ a siri ike. “Ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma nke ma ndị òtù Epikurọs ma ndị òtù Stoik malitere iso ya na-arụrịta ụka, ụfọdụ na-asịkwa: ‘Gịnị ka onye nkwugheri a ga-achọ ikwu?’ Ndị ọzọ asị: ‘O yiri ka ọ bụ onye na-ekwusa chi ndị mba ọzọ.’” (Ọrụ 17:18) N’agbanyeghị ihe a nile ha kwuru, Pọl meturu obi zaa ha, sị: “Ndị ikom Atens, ahụrụ m na n’ihe nile o yiri ka unu na-atụ chi dị iche iche egwu karịa otú ndị ọzọ na-atụ.” Kama ịkatọ ha n’ihi na ha na-ekpere arụsị, Pọl jara ha mma maka otú ha si jiri okpukpe kpọrọ ihe.—Ọrụ 17:22.
Pọl ò mere omume ihu abụọ n’ebe a? Mba. Ọ maara na ọ bụghị ya ka ọ dịịrị ikpe ndị na-ege ya ntị ikpe; ọ makwaara nke ọma na ọ dịkwa mgbe ya na-amaghị eziokwu ahụ. Ọrụ ya bụ ikwusa ozi Chineke, ọ bụghị ikpe ndị ọzọ ikpe. Ọ maara site n’ahụmahụ ndị o nwetara mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst na ihe a Ndịàmà Jehova chọpụtarala taa bụ eziokwu: Ụfọdụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akwadosi okpukpe ụgha ike na-emecha ghọọ ndị kasị akwadosi ezi okpukpe ahụ ike.
Otú Pọl si zaghachi n’okwu ahụ dị nnọọ mma, ọ rụpụtakwara ihe ndị dị mma. “Ndị ikom ụfọdụ sonyeere ya wee ghọọ ndị kwere ekwe, ndị ụfọdụ n’ime hakwa bụ Daịọnisiọs, bụ́ ọkàikpe nke ụlọikpe Ariopagọs, na otu nwanyị aha ya bụ Damaris, nakwa ndị ọzọ ma e wezụga ha.” (Ọrụ 17:34) Kama ịkatọ ndị Atens na ha enweghị ezi ihe ọmụma, Pọl ji nnọọ amamihe mee ihe n’ịja ha mma maka ihe ndị ha kweere—ọ bụ ezie na ihe ndị ahụ ha kweere na ha bụ ụgha. Ọtụtụ ndị obi ha dị ọcha na-eme ihe na-ezighị ezi n’ihi na ndị ọzọ duhiere ha.
Pọl jikwa akọ mee ihe mgbe a kpọrọ ya ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ihu Herọd Agripa nke Abụọ. Ndị mmadụ maara na Herọd na nwanne ya nwanyị bụ́ Benis na-enwe mmekọahụ, nke bụ́ ihe Okwu Chineke katọrọ. Ma, Pọl akatọghịdị ya. Kama ịkatọ ya, ọ chọtara otu ebe Herọd na-eme nke ọma iji jaa ya mma. “Banyere ihe nile ndị Juu na-ebo m ebubo ha, Eze Agrịpa, ana m agụ onwe m n’onye nwere obi ụtọ na ọ bụ n’ihu gị ka m na-eme ngọpụ m taa, karịsịa ebe ị bụ ọkachamara n’omenala nile nakwa n’arụmarụ ndị dị n’etiti ndị Juu.”—Ọrụ 26:1-3.
Ọ ga-abụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị iji ụdị akọ a na-eme ihe mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe. Ịja onye agbata obi anyị, nwa akwụkwọ ibe anyị, ma ọ bụ onye ọrụ ibe anyị mma pụrụ ime ka anyị na ha dịrị n’udo, meekwa ka ha na-akpa àgwà ọma. Ọ bụrụ na anyị eruo n’obi ndị mmadụ site n’ịja ha mma mgbe o kwesịrị, anyị nwere ike ime ka ndị obi ha ziri ezi nweta ezi ihe ọmụma ma kwụsị ịdị na-eche ihe ọjọọ, kwụsịkwa ịkpa àgwà ọjọọ.
Ezi Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ n’Ịja Ndị Ọzọ Mma
Jizọs jara ndị ọzọ mma. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs bilitechara n’ọnwụ ma rịgoro n’eluigwe, site ná ntụziaka Chineke, o siri n’ọnụ Jọn onyeozi gwa ọgbakọ asaa ahụ dị n’Eshia Maịnọ okwu. Ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ ịja ndị kwesịrị ka a jaa ha mma mma. O jiri okwu ndị a na-esonụ jaa ọgbakọ dị n’Efesọs, Pergamum, na Taịataịra mma: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ndọgbu n’ọrụ na ntachi obi gị, nakwa na ị pụghị ịnagide ndị ajọ mmadụ”; “ị nọgidere na-ejidesi aha m ike, ị gọnarịghịkwa okwukwe gị n’ebe m nọ”; na “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ịhụnanya na okwukwe na ije ozi na ntachi obi gị, nakwa na ihe ndị ị na-eme n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị i mere n’oge Mkpughe 2:2, 13, 19; 3:4) Jizọs setịpụrụ nnọọ ihe nlereanya magburu onwe ya n’ịja mma!
gara aga.” Ọbụna n’ọgbakọ Sadis, bụ́ nke e kwesịrị ịbasiri mba ike, Jizọs chọpụtara ndị e kwesịrị ịja mma nọ na ya ma kwuo, sị: “Ka o sina dị, i nwere aha ole na ole na Sadis ndị na-emerụghị uwe elu ha, ha ga-eyikwa ndị nke na-acha ọcha soro m na-eje ije, n’ihi na ha kwesịrị ekwesị.” (Dị ka Jizọs mere, anyị ekwesịtụghị ịkatọ otu ndị nanị n’ihi na mmadụ ole na ole n’ime ha mere ihe na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ nyewe mmadụ ndụmọdụ n’ebughị ụzọ jaa onye ahụ mma. Otú ọ dị, anyị kwesịrị iburu n’uche na ọ bụrụ na anyị na-ajakarị mmadụ mma nanị mgbe anyị chọrọ inye onye ahụ ndụmọdụ, o nwere ike onye ahụ agaghị anabatacha ịja mma anyị. Na-aja ndị ọzọ mma mgbe ọ bụla o kwere gị mee! Nke a ga-eme ka ha dị njikere ịnabata ndụmọdụ gị mgbe ọ bụla i nyere ya.
Ndị Okenye Bụ́ Ndị Na-aja Mma Mgbe O Kwesịrị
Cornelia, nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Europe kwuru na ná mmalite afọ ndị 1970, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị jụrụ ya ma ọ̀ na-enwekwa ọmụmụ ihe onwe onye ma na-agụ magazin anyị. O kwuru, sị: “Ihere onwe m malitere ime m.” Ma Cornelia kwetara na ya adịghị agụcha isiokwu nile gbara na magazin anyị. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Kama ịkatọwa m, ọ jara m mma maka nke m gụrụ agụ. Mma a ọ jara m gbara m nnọọ ume, nke mere na kemgbe ahụ, ekpebisiela m ike ịgụ isiokwu nile pụtara na magazin anyị.”
Ray, onye na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Europe chetara ụbọchị mbụ ọ malitere ọrụ ịsụ ụzọ. Onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ ha, bụ́ nwoke na-arụ ọrụ ego nke nwekwara ezinụlọ na ọtụtụ ibu ọrụ ndị ọzọ n’ọgbakọ, batara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’uhuruchi ụbọchị ahụ Ray bidoro ọrụ ịsụ ụzọ ma jekwuru Ray ozugbo wee jụọ ya, sị, “Olee otú ozi gị siri gaa taa ị malitere ọrụ ọsụ ụzọ gị?” Ọ karịala afọ iri isii kemgbe okenye ahụ jụrụ Ray ajụjụ ahụ, ma Ray ka na-echeta ihe ahụ okenye ahụ jụrụ ya.
Dị ka anyị hụrụ n’ahụmahụ abụọ a, isite n’ala ala obi jaa mmadụ mma maka ihe o mere—ọ bụghị otuto elu ọnụ na-esighị n’obi—nwere ike ịrụpụta nnọọ ezigbo ihe. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eji maka ha jaa ndị kwere ekwe ibe anyị mma. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịja ha mma maka ọchịchọ ha nwere ijere Jehova ozi, azịza ndị ha kwadebere nke ọma zaa, otú ha si nwee ike ịkwụsị ịma ahụ́ jijiji mgbe ha na-eme ihe omume n’elu ịkpọ okwu, maka ịnụ ọkụ n’obi ha ji ekwusa ozi ọma nakwa maka mgbalị ndị ha na-eme iji bute Alaeze ahụ ụzọ na iji ruo ihe mgbaru ọsọ ha n’ozi Jehova. Anyị onwe anyị na-eritekwa uru dị ukwuu mgbe anyị jara ndị ọzọ mma. Ịja mma na-enye anyị obi ụtọ ma mee ka anyị na-ele ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—Ọrụ 20:35.
Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịdị na-aja ndị nọ n’ọgbakọ mma maka ọrụ ọma ha. Mgbe ọ bụlakwa ha chọrọ inye ndụmọdụ, ha kwesịrị iji ịhụnanya enye ya. N’aka nke ọzọ, ha ekwesịghị ịtụ anya na ndị nọ n’ọgbakọ ga-emetacha ihe nile otú ha chọrọ nke na ha ga-ewere ihe ọ bụla ha na-emetachaghi otú kwesịrịnụ dị ka nnukwu ihe.
Ọ bụrụ na ndị okenye eṅomie ihe nlereanya Elaịhu, bụ́ onye kwanyeere ndị ọzọ ùgwù ma jiri obiọma mesoo ha ihe, nke Pọl, bụ́ onye jiri akọ mee ihe, ṅomiekwa ịhụnanya Jizọs gosiri, nke a ga-agba ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha ume. Ịja ndị ọzọ mma ga-agba ha ume imekwu nke ọma, ọ ga-emekwa ka e nwee ọṅụ na ịdị n’otu. Chetụgodị ụdị ọṅụ Jizọs nwere mgbe e mere ya baptizim ịnụ ka Nna ya nke eluigwe ji okwu ndị a jaa ya mma: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; anwapụtawo m gị.” (Mak 1:11) Ka anyị mee ka obi ụmụnna anyị ṅụrịa site n’iji ezi obi na-aja ha mma.
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Iji akọ eme ihe mere ka Pọl nwee ihe ịga nke ọma, anyị ga-enwekwa ihe ịga nke ọma ma anyị jiri akọ na-eme ihe
[Foto dị na peeji nke 16]
Isi n’ala ala obi anyị na-aja ndị ọzọ mma nwere ike ịrụpụta ihe dị nnọọ mma