Jehova Ji Nrubeisi Gị Kpọrọ Ihe
Jehova Ji Nrubeisi Gị Kpọrọ Ihe
“Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”—ILU 27:11.
1. Olee mmụọ jupụtara n’ụwa taa?
MMỤỌ nnwere onwe na nke nnupụisi jupụtara ebe nile n’ụwa taa. Pọl onyeozi kọwara ihe mere o ji dị otú ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, bụ́ ebe o kwuru, sị: “Unu jere ije . . . n’otu mgbe dị ka usoro ihe nke ụwa a si dị, dị ka onye na-achị ikike nke ikuku ahụ si dị, bụ́ mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” (Ndị Efesọs 2:1, 2) Ee, a pụrụ ikwu na Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ “onye na-achị ikike nke ikuku,” echeela ụwa dum mmụọ nke nnupụisi dị ka mmiri. Ọ nọ na-eme otú ahụ na narị afọ mbụ, ọ nọwokwa na-eme otú ahụ ọbụna karị kemgbe e si n’eluigwe chụpụ ya n’ihe dị ka n’oge Agha Ụwa Mbụ.—Mkpughe 12:9.
2, 3. Olee ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-erubere Jehova isi?
2 Otú ọ dị, dị ka Ndị Kraịst, anyị maara na ọ bụ Jehova Chineke ka anyị kwesịrị iji obi anyị nile rubere isi n’ihi na ọ bụ ya bụ Onye Okike anyị, Onye ji anyị ndụ, Eze ji ịhụnanya na-achị anyị, na Onye Nnapụta anyị. (Abụ Ọma 148:5, 6; Ọrụ 4:24; Ndị Kọlọsi 1:13; Mkpughe 4:11) Ndị Izrel nke oge Mozis maara na ọ bụ Jehova bụ Onye nyere ha ndụ na Onye napụtara ha. N’ihi ya, Mozis gwara ha, sị: “Unu ga-elezikwa anya ime dị ka Jehova, bụ́ Chineke unu, nyeworo unu iwu.” (Deuterọnọmi 5:32) Ee, ha kwesịrị irubere Jehova isi. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nupụụrụ Eze ha ahụ isi n’oge na-adịghị anya.
3 Olee otú nrubeisi anyị dịruru Onye kere eluigwe na ụwa ná mkpa? Ọ dị mgbe Chineke gwara onye amụma bụ́ Samuel ka ọ gwa Eze Sọl, sị: “Ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà.” (1 Samuel 15:22, 23) N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?
Otú Nrubeisi Si “Dị Mma Karịa Ịchụ Àjà”
4. Olee otú anyị nwere ike isi nye Jehova ihe?
4 Ebe ọ bụ Jehova kere ihe nile, ọ bụ ya nwe ihe nile anyị nwere. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ dị ihe anyị nwere ike inye ya? Ee, anyị nwere ike inye ya otu ihe dị oké ọnụ ahịa. Gịnị ka ọ bụ? Anyị ga-achọta azịza ya na ndụmọdụ na-esonụ: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Anyị nwere ike inye Chineke nrubeisi anyị. Ọ bụ ezie na ọnọdụ anyị nile na nzụlite anyị abụghị otu, ọ bụrụ na onye nke ọ bụla n’ime anyị ana-erube isi, anyị ga-enye azịza maka ajọ ebubo ahụ Setan bụ́ Ekwensu boro nke bụ́ na ụmụ mmadụ agaghị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ma ọ bụrụ na e lee ha ule. Lee ihe ùgwù nke ahụ bụ!
5. Olee otú nnupụisi si emetụta Onye Okike anyị? Nye ihe atụ.
5 Chineke nwere mmasị ná mkpebi ndị anyị na-eme. Ọ bụrụ na anyị enupụ isi, ọ na-emetụta ya. Olee otú o si emetụta ya? Ọ na-ewute ya ịhụ onye ọ bụla na-akpa àgwà nzuzu dị otú ahụ. (Abụ Ọma 78:40, 41) Ka e were ya na onye nwere ọrịa shuga hapụrụ ịdị na-eri ezi ihe oriri dọkịta sịrị ya na-eri ma nọgide na-eri nri ndị ga-eme ka ọrịa ya ka njọ. Olee otú ọ ga-adị dọkịta ya ma ọ bụrụ na ọ na-eche banyere onye ọrịa ahụ? O kwesịrị ido anyị anya na ọ na-ewute Jehova mgbe ụmụ mmadụ na-enupụrụ ya isi, n’ihi na ọ maara ihe ga-esi n’anyị ileghara ihe ndị ọ gwara anyị mee anya pụta.
6. Olee ihe ga-enyere anyị aka irubere Chineke isi?
6 Olee ihe ga-enyere onye nke ọ bụla n’ime anyị aka irube isi? O kwesịrị ekwesị ka onye nke ọ bụla n’ime anyị rịọ Chineke ka o nye ya “obi na-anụ ihe,” dị ka Eze Solomọn rịọrọ. Ọ rịọrọ maka ụdị obi ahụ ka o wee nwee ike “ịghọta ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ” iji kpee ndị Izrel ibe ya ikpe. (1 Ndị Eze 3:9) “Obi na-anụ ihe” dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ n’ụwa nke mmụọ nnupụisi jupụtara. Chineke enyela anyị Okwu ya, ihe ndị e ji amụ Bible, ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, na ndị okenye ọgbakọ na-eche banyere anyị ka anyị wee nwee ike inweta “obi na-anụ ihe.” Ànyị ji ihe ndị dị otú ahụ o ji ịhụnanya nye anyị na-eme ihe nke ọma?
7. N’ihi gịnị ka Jehova ji nwee mmasị ná nrubeisi karịa n’àjà?
7 Cheta na mgbe Jehova na-agwa ndị ya n’oge ochie banyere ihe metụtara nke a, ọ gwara ha na nrubeisi dịdị mkpa karịa àjà e ji ụmụ anụmanụ achụ. (Ilu 21:3, 27; Hosea 6:6; Matiu 12:7) N’ihi gịnị ka Jehova ji kwuo otú ahụ ebe ọ bụ ya nyere ndị ya iwu ka ha na-achụ ụdị àjà ndị ahụ? Ihe anyị kwesịrị ịjụ bụ, Olee ihe bụ́ ebumnobi nke onye na-achụ àjà ahụ? Ọ̀ na-achụ ya iji mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ? Ka ọ̀ na-achụ ya nanị iji mezuo iwu? Ọ bụrụ na onye ahụ na-achụ àjà na-achụ ya iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ ga-akpachara anya irubere iwu nile Chineke nyere isi. Àjà ụmụ anụmanụ adịghị Chineke mkpa, ma nrubeisi anyị bụ otu ihe dị oké ọnụ ahịa anyị nwere ike inye ya.
Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị
8. Olee ihe mere Chineke ji napụ Sọl eze?
8 Ihe Bible kọọrọ anyị banyere Eze Sọl na-egosi nnọọ mkpa ọ dị irube isi. Mgbe Sọl malitere ịchị Izrel, ọ dị umeala n’obi, ‘bụrụ onye nta n’anya ya onwe ya.’ Ma ka oge na-aga, mpako na echiche na-ezighị ezi malitere ịchịkwa mkpebi ndị ọ na-eme. (1 Samuel 10:21, 22; 15:17) N’otu oge, Sọl na-akwado ịga buso ndị Filistia agha. Samuel gwara eze ahụ ka o chere ka ya bịa chụọrọ Jehova àjà ma nye ya ntụziaka ndị ọzọ. Otú ọ dị, Samuel abịaghị mgbe a tụrụ anya ya, ndị Izrel malitekwara ịgbasa. Mgbe Sọl hụrụ nke a, o “wee suree àjà nsure ọkụ ahụ.” Ihe a o mere were Jehova iwe. Mgbe Samuel mesịrị bịarute, eze ahụ malitere ịgọpụrụ onwe ya, sị na n’ihi na Samuel abịaghị n’oge, ya ‘jisiri onwe ya ike’ chụọrọ Jehova àjà nsure ọkụ iji mee ka ihu Jehova dajụọ. Ịchụ àjà ahụ dị Eze Sọl mkpa karịa irube isi ná ntụziaka ahụ e nyere ya nke bụ́ ka o chere ka Samuel bịa chụọ àjà ahụ. Samuel gwara ya, sị: “I mewo ihe nzuzu: i debeghị ihe Jehova, bụ́ Chineke gị, nyere n’iwu, bụ́ nke O nyere gị n’iwu.” Inupụrụ Jehova isi mere ka a napụ Sọl eze.—1 Samuel 10:8; 13:5-13.
9. Olee otú Sọl si gosi na inupụrụ Chineke isi amarala ya ahụ́?
9 Eze ahụ ọ̀ mụtara ihe n’ihe a mere ya? Ee e! Ka e mesịrị, Jehova nyere Sọl iwu ka o 1 Samuel 15:1-15.
tigbuo mba Amalek, bụ́ ndị lụsorola ndị Izrel ọgụ n’enweghị ihe ndị Izrel mere ha. A gwadịrị Sọl ka ọ ghara ịhapụ ụmụ anụmanụ ha ndụ. O rubetụrụ isi site ‘n’itigbu Amalek site na Havila ruo Shua.’ Mgbe Samuel bịakwutere eze ahụ, obi ụtọ nọ na-eme eze ahụ n’ihi mmeri ahụ o nwere, ya asịkwa Samuel: “Onye a gọziri agọzi n’ebe Jehova nọ ka ị bụ: emewo m ka okwu Jehova guzosie ike.” Ma, Sọl mere ihe megidere ntụziaka doro anya e nyere ya n’ihi na ya na ndị obodo ya hapụrụ Eze Egag na “anụ kachasị mma nke ìgwè ewu na atụrụ . . . na . . . ụmụ anụ mara abụba na . . . ụmụ atụrụ . . . na . . . ihe nile dị mma” ndụ. Eze Sọl gọpụụrụ isi ahụ o nupụrụ site n’ikwu, sị: “Ndị Izrel nwere ọmịiko n’ahụ́ anụ kachasị mma nke ìgwè ewu na atụrụ na nke ìgwè ehi, ka ha wee chụọrọ Jehova, bụ́ Chineke gị, àjà.”—10. Olee ihe Sọl na-amụtaghị?
10 Mgbe Sọl kwuru nke ahụ, Samuel gwara ya, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà ọzọ, hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka ige ntị olu Jehova? Lee, ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu.” (1 Samuel 15:22) Ebe ọ bụ na Jehova ekpebiela na a ga-ebibi anụmanụ ndị ahụ, ọ gaghị ekwe ka e jiri ha chụọrọ ya àjà.
Na-erube Isi n’Ihe Nile
11, 12. (a) Olee otú Jehova si ele mgbalị ndị anyị na-eme iji mee ihe na-atọ ya ụtọ n’ofufe anyị na-efe ya anya? (b) Olee otú mmadụ nwere ike isi ghọgbuo onwe ya site n’iche na ya na-eme uche Chineke mgbe ọ na-enupụ isi?
11 Lee ka obi na-esi atọ Jehova ụtọ ịhụ ka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi na-akwụsi ike n’akụkụ ya n’agbanyeghị mkpagbu, na-ekwusa banyere Alaeze ya n’agbanyeghị na ndị mmadụ achọghị ịnụ, ma na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst n’agbanyeghị na inweta ihe ha na-eri na-esiri ha ike! Anyị irube isi n’akụkụ ndị dị otú ahụ nke ozi anyị na-ejere ya na-eme ka obi ya ṅụrịa! Jehova na-eji mgbalị ndị anyị na-eme n’ife ya ofufe akpọrọ nnọọ ihe ma ọ bụrụ na ọ bụ ịhụnanya na-akpali anyị ime ha. Ụmụ mmadụ nwere ike ileghara ọrụ anyị anya, ma Chineke na-ahụ ihe ndị anyị ji obi anyị nile na-enye ya ma na-echeta ha.—Matiu 6:4.
12 Ma, iji mee ka obi Chineke ṅụrịa n’ezie, anyị aghaghị ịdị na-erube isi n’akụkụ nile nke ndụ anyị. Anyị agatụghị aghọgbu onwe anyị site n’iche na anyị pụrụ ileghara iwu ụfọdụ nke Chineke anya ma ọ bụrụhaala na anyị na-efe ya n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ anyị. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịghọgbu onwe ya site n’iche na ọ bụrụ na ya na-efe Chineke n’akụkụ ụfọdụ nke ndụ ya, na ya nwere ike ịdị na-akwa iko ma ọ bụ na-eme mmehie ọzọ dị oké njọ n’enweghị ihe ga-eme ya. Lee ka Ndị Galeshia 6:7, 8.
nke ahụ ga-esi bụrụ ihie ụzọ!—13. Mgbe anyị nọ nanị anyị, olee otú e nwere ike isi lee nrubeisi anyị nye Jehova ule?
13 N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ na-erubere Jehova isi ná ndụ m na-adị kwa ụbọchị, ọbụna n’ihe ndị yiri ihe zoro ezo?’ Jizọs kwuru, sị: “Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta na-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’oké ihe, onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe kasị nta na-abụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.” (Luk 16:10) Ànyị ‘na-ejegharị n’ikwesị ntụkwasị obi nke obi’ ọbụna ‘n’ime ụlọ anyị,’ bụ́ ebe ndị ọzọ na-anaghị ahụ anyị? (Abụ Ọma 101:2) Ee, e nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa ịghara ikwesị ntụkwasị obi mgbe anyị nọ n’ime ụlọ anyị. N’ọtụtụ ala bụ́ ebe ndị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nwere kọmputa n’ụlọ ha, mmadụ nwere nnọọ ike ịhụ onyinyo ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ site n’ịpị aka na bọtịn kọmputa ya. Afọ ole na ole gara aga, mmadụ enweghị ike ịhụ ihe ndị dị otú ahụ ma ọ́ gaghị n’ebe ndị a na-egosi ihe ntụrụndụ rụrụ arụ. Ànyị ga-eji nrubeisi buru okwu ndị a Jizọs kwuru n’obi: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya”? Ee, ànyị ga-ajụ iletụdị onyinyo ndị rụrụ arụ anya? (Matiu 5:28; Job 31:1, 9, 10; Abụ Ọma 119:37; Ilu 6:24, 25; Ndị Efesọs 5:3-5) Oleekwanụ banyere ihe ndị a na-eme na TV bụ́ ndị na-egosi ime ihe ike? Ànyị dị ka Chineke anyị, bụ́ onye mkpụrụ obi ya ‘na-akpọ onye na-ahụ ime ihe ike n’anya asị’? (Abụ Ọma 11:5) Ma ọ bụ olee banyere ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè mgbe anyị nọ nanị anyị? Bible kwuru okwu megide ịṅụbiga mmanya ókè, ma ọ dọkwara Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ghara ịdị na-aṅụ “oké mmanya.”—Taịtọs 2:3; Luk 21:34, 35; 1 Timoti 3:3.
14. Olee ebe ụfọdụ anyị pụrụ igosipụta na anyị na-erubere Chineke isi n’ihe ndị metụtara ego?
14 Ebe ọzọ anyị kwesịrị ịkpachara anya bụ mgbe a bịara n’ihe banyere ego. Dị ka ihe atụ, ànyị ga-etinye aka n’azụmahịa zụọ taa baa echi nke fọrọ obere ka ọ gụnye ịghọ ndị ọzọ aghụghọ? À na-anwa anyị ọnwụnwa iji ụzọ ndị iwu na-akwadoghị zere ịtụ ụtụ isi anyị? Ka ànyị na-eji akọnuche dị ọcha erubere iwu ahụ e nyere anyị isi nke bụ́ ‘inye mmadụ nile ihe ndị ruuru ha, inye onye chọrọ ụtụ isi, ụtụ isi’?—Ndị Rom 13:7.
Nrubeisi Ịhụnanya Kpaliri
15. Olee ihe mere i ji erubere iwu Jehova isi?
15 Irube isi n’ụkpụrụ Chineke na-eweta ngọzi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ezere iji ụtaba eme ihe, na-ebi ndụ dị ọcha, ma na-akwanyere ọbara ùgwù dị ka ihe dị nsọ, anyị nwere ike izere ọrịa ụfọdụ. Ọzọkwa, site n’ibi ndụ kwekọrọ n’eziokwu Bible n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ, o nwere ike ịbara anyị uru n’ụzọ akụnụba, ná mmekọrịta nke anyị na ndị ọzọ, nakwa n’ụlọ anyị. (Aịsaịa 48:17) Anyị nwere nnọọ ike iwere abamuru ọ bụla dị otú ahụ a na-ahụ anya dị ka ihe na-egosi na iwu Chineke dị irè. N’agbanyeghị nke ahụ, isi ihe mere anyị ji erubere Jehova isi bụ na anyị hụrụ ya n’anya. Anyị anaghị ejere Chineke ozi nanị n’ihi ihe anyị pụrụ inweta n’aka ya. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Chineke kere anyị inwere onwe anyị irubere onye ọ bụla anyị chọrọ isi. Anyị họọrọ irubere Jehova isi n’ihi na anyị chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ, nakwa n’ihi na anyị na-achọ ime ihe ziri ezi.—Ndị Rom 6:16, 17; 1 Jọn 5:3.
16, 17. (a) Olee otú Jizọs si rubere Chineke isi n’ihi ịhụnanya sitere n’ala ala obi o nwere n’ebe Ọ nọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs?
16 Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè n’irubere Jehova isi n’ihi ịhụnanya sitere n’ala ala obi o nwere n’ebe Ọ nọ. (Jọn 8:28, 29) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ “mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara.” (Ndị Hibru 5:8, 9) N’ụzọ dị aṅaa? Jizọs “wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.” (Ndị Filipaị 2:7, 8) Ọ bụ ezie na Jizọs na-erubebu isi n’eluigwe, e lekwuru nrubeisi ya ule n’ụwa. Anyị ji n’aka na Jizọs ruru nnọọ eru n’ụzọ ọ bụla ịbụrụ ụmụnna ya e tere mmanụ nakwa ndị ọzọ kwere ekwe n’etiti ụmụ mmadụ Nnukwu Onye Nchụàjà.—Ndị Hibru 4:15; 1 Jọn 2:1, 2.
17 Oleekwanụ maka anyị? Anyị nwere ike iṅomi Jizọs site n’idebe irubere uche Chineke isi n’ọkwá mbụ. (1 Pita 2:21) Anyị pụrụ inwe afọ ojuju mgbe ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali anyị ime ihe Jehova nyere n’iwu, ọbụna mgbe ụfọdụ a nwara anyị ọnwụnwa ime ihe megidere iwu ya. (Ndị Rom 7:18-20) Nke a gụnyere anyị ịdị njikere ime ihe ndị na-edu ndú n’ezi ofufe gwara anyị mee, n’agbanyeghị na ha bụ ndị na-ezughị okè. (Ndị Hibru 13:17) Jehova ji nnọọ isi anyị na-erubere ya mgbe anyị nọ nanị anyị akpọrọ ihe.
18, 19. Olee ihe anyị isi n’ala ala obi anyị erubere Chineke isi na-arụpụta?
18 Taa, anyị irubere Jehova isi nwere ike ịgụnye idi mkpagbu iji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. (Ọrụ 5:29) Ọzọkwa, anyị irubere iwu Jehova nyere anyị ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe isi chọrọ ka anyị tachie obi ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (Matiu 24:13, 14; 28:19, 20) Ntachi obi dị anyị mkpa iji nọgide na-eso ụmụnna anyị na-agbakọta, n’agbanyeghị na ụwa ga na-achọ ime ka anyị ghara ime otú ahụ. Chineke anyị na-ahụ n’anya maara nke ọma mgbalị ndị anyị na-eme irubere ya isi n’akụkụ ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ iruberu isi ala, anyị aghaghị ịlụso anụ ahụ́ anyị na-eme mmehie ọgụ ma zere ime ihe ọjọọ ka anyị na-amụta ịhụ ezi ihe n’anya.—Ndị Rom 12:9.
19 Mgbe anyị ji ịhụnanya na obi ekele na-efe Jehova, “ọ [na-aghọrọ anyị] onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọ dị mkpa dịkwa mma ịchụ àjà ụfọdụ, ma ihe kasị eme Jehova obi ụtọ bụ irubere ya isi n’ihi ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ.—Ilu 3:1, 2.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na anyị nwere ihe anyị ga-enye Jehova?
• Olee ihe Sọl mejọrọ?
• Olee otú i nwere ike isi gosi na i kweere na nrubeisi dị mma karịa àjà?
• Olee ihe na-akpali gị irubere Jehova isi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 26]
Olee otú dọkịta na-eche banyere onye ọrịa ya ga-esi lee onye ọrịa ahụ anya ma ọ bụrụ na ya ajụ ime ihe dọkita gwara ya?
[Foto dị na peeji nke 28]
Olee ihe mere Jehova ji weso Eze Sọl iwe?
[Foto ndị dị na peeji nke 30]
Ị̀ na-erubere iwu Chineke isi mgbe ị nọ nanị gị n’ime ụlọ gị?