Obi Mgbawa nke Na-adịte Aka
Obi Mgbawa nke Na-adịte Aka
NA NSO nso a, otu onye na-eme nnyocha chọrọ ịma otú obi na-adị ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ mgbe ọtụtụ afọ gasịrị. O zigaara ndị nne na nna ụfọdụ ụmụ ha nwụrụ kemgbe ọtụtụ afọ ajụjụ ụfọdụ. Ma ọ bụghị ha nile zara ajụjụ ya. Otu nna aha ya bụ́ Vladimir, bụ́ onye nwa ya nwoke nwụrụ kemgbe afọ ise, kwuru na ọ ka na-esiri ya ike ikwute okwu nwa ya. *
Ndị nne na nna nwa ha nwụrụ na-eru uju ọnwụ nwa ha ruo ogologo oge dị ka Vladimir. Afọ iri gara aga, nwa nwoke William, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ, ṅụgburu ná mmiri. William dere, sị, “M ka na-eru uju ọnwụ ya, m ka ga na-erukwa uju ya ruo mgbe m ga-anwụ.” Ka ọ gafechara afọ ise ọrịa a na-atụghị anya ya gburu nwa nwoke Lucy, o dere, sị: “Ụbọchị ole na ole ka ọ nwụsịrị, ọ ka na-adị m ka ọ ka dị ndụ. Ọ dị m ka m nọ ná nrọ ọjọọ nakwa na m ga-eteta n’oge na-adịghị anya. Ma ka oge ụfọdụ gasịrị, ọ bịara doo m anya na ọ nwụọla n’ezie, nakwa na ọ gaghị alọghachi. O ruola afọ ise nwa m nwụrụ, ma m ka na-ebe ákwá ya mgbe ụfọdụ ma nanị m nọrọ.”
Gịnị mere ndị nne na nna nwa ha nwụnahụrụ, dị ka Vladimir, William, na Lucy, ji enwe nnọọ obi mgbawa ruo ogologo oge? Ngwa, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ kpatara ya.
Gịnị Mere Ndị Nne na Nna Ji Eru Uju nke Ukwuu?
Mgbe a mụrụ nwa ọhụrụ n’ezinụlọ, nne ya na nna ya na-enwe nnọọ obi ụtọ na-enweghị atụ. Ikuru nnọọ nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ n’aka, ikiri ya ka ọ na-ehi ụra, ma ọ bụ ịhụ ya ka o ji obi ụtọ na-achị ọchị, na-enye ndị nne na nna ahụ obi ụtọ na afọ ojuju dị ukwuu. Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya adịghị eji ha egwuri egwu. Ha na-azụ ha ka ha na-akpa ezi àgwà ma na-erube isi. (1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 11) Ka ụmụ ahụ na-etolite ma na-etinye ndụmọdụ ndị a a na-enye ha n’ọrụ, ndị mụrụ ha na-eji ha eme ọnụ ma na-atụ anya na ha ga-aghọ ezigbo mmadụ.
Ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-arụsi ọrụ ike iji na-enye ụmụ ha ihe ndị dị ha mkpa. Ha nwere ike ịdị na-edokọtara ụmụ ha ego ma ọ bụ ihe onwunwe iji nyere ha aka ịmalite ezinụlọ nke ha n’ọdịnihu. (2 Ndị Kọrịnt 12:14) Ụdị mmetụta a na-enweghị atụ ha na-enwe, ya na oge, mgbalị na ego ọ na-efu ha, na-eme ka otu ihe doo anya, ya bụ, na ndị nne na nna na-azụ ụmụ ha ka ha dị ndụ, ọ bụghị ka ha nwụọ. Ọ bụrụ na nwatakịrị anwụọ, ọzụzụ ya na-ebi n’ike, ihe nile ndị mụrụ ya na-atụ anya na ọ ga-aghọ n’ọdịnihu na-akụ afọ n’ala. Ọnwụ na-egbubi ịhụnanya ndị nne na nna nwere n’ebe nwa ha nọ n’ike. Ha enweghịzi ihe ga na-enye ha ụdị obi ụtọ nwa ahụ na-enyebu ha. Ndị nne na nna na-enwe nnọọ obi mgbawa nke na-esi ike odidi.
Bible gosiri na ndị nne na nna nwa ha nwụnahụrụ na-enwe obi mgbawa nke na-adịghị ala ala. Mgbe a na-akọ ihe mere mgbe nna ochie ahụ bụ́ Jekọb nụrụ na e gbuola nwa ya nwoke bụ́ Josef, Bible kwuru, sị: “Jekọb wee dọwaa uwe mgbokwasị ya nile, jere ákwà mkpe n’úkwù ya, ruoro nwa ya uju ọtụtụ ụbọchị. Ụmụ ya ndị ikom nile na ụmụ ya ndị inyom nile wee bilie ịkasi ya obi; ma ọ jụrụ, na a gaghị akasi ya obi; ọ sị, n’ihi na m ga-arịdakwuru nwa m ruo ala mmụọ [ma ọ bụ, ili] na-eru uju!’” Ka ọtụtụ afọ gasịrị, Jekọb ka nọgidere na-eru uju Josef, bụ́ onye o chere na ọ nwụọla. (Jenesis 37:34, 35; 42:36-38) Ihe atụ́ ọzọ dị na Bible bụ banyere otu nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ́ Naomi, onye ụmụ nwoke abụọ ọ mụrụ nwụnahụrụ. Ọnwụ ụmụ a wutere ya nke ukwuu nke na ọ chọrọ ịgbanwe aha ya bụ́ Naomi, nke pụtara “Ịdị Ụtọ M,” ka ọ bụrụzie Mara, nke pụtara “Ihe Ilu.”—Rut 1:3-5, 20, 21.
Ma ọ bụghị nanị mwute ndị nne na nna na-enwe mgbe nwa ha nwụrụ ka Bible kwuru okwu ya. O kwukwara otú Jehova si akasi ndị na-eru uju obi. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ụzọ ụfọdụ Chineke si akasi ndị na-eru uju obi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 A gbanweela aha ụfọdụ.