Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntụziaka Bụ́ Ịgba Maka Ịzụ Ụmụ

Ntụziaka Bụ́ Ịgba Maka Ịzụ Ụmụ

Ntụziaka Bụ́ Ịgba Maka Ịzụ Ụmụ

MGBE Ruth dị ime nwa mbụ ya, o kwuru, sị: “Adị m afọ iri na itoolu, ọ dịtụghị onye ikwu m mụ na ya bi nso, akwadoghịkwa m akwado.” Ebe ọ bụ na ọ bụ nanị ya ka nne na nna ya mụrụ, o chebarachaghi ihe ịbụ nne gụnyere echiche. Olee ebe ọ pụrụ ịga iji nweta nduzi bụ́ ịgba?

Jan, bụ́kwa onye ụmụ abụọ ọ mụrụ torola kwuru, sị: “Obi siri m ike ná mmalite. Ma n’oge na-adịghị anya, abịara m chọpụta na ọ dịghịdị ihe m ma.” Ma ndị nne na nna hà nwere mgbagwoju anya ná mmalite banyere ụzọ kasị mma isi zụọ ụmụ ma ọ bụ na mgbagwoju anya ahụ bịara ka ha na-azụ ụmụ ha, olee ebe ha pụrụ isi nweta enyemaka iji zụọ ụmụ ha?

Taa, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị nne na nna na-aga n’Intanet. Ma ị pụrụ ịdị na-eche otú nduzi ndị a pụrụ inweta n’ebe ahụ ga-esi bụrụ ezigbo ya. E nwere ezi ihe mere e kwesịrị iji kpachara anya. Ị̀ maara n’ezie ndị na-enye gị ntụziaka n’ebe ahụ? Olee ihe ịga nke ọma ndị ha nwerela n’ịzụ ụmụ nke ha? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i kwesịrị ịkpachara anya mgbe ị na-achọ ntụziaka banyere otú ị ga-esi zụọ ụmụ nke gị. Dị ka isiokwu bu ụzọ gosiri, ọbụna ntụziaka ndị ọkachamara nyere na-emebi ihe mgbe ụfọdụ. Oleezi ebe ị pụrụ isi nweta nduzi ka mma?

Jehova Chineke onye malitere ezinụlọ bụ onye bụ́ isi na-enye ntụziaka n’ịzụ ụmụ. (Ndị Efesọs 3:15) Ọ bụ nanị ya bụ ezigbo ọkachamara. N’Okwu ya, bụ́ Bible, o nyere ntụziaka bụ́ ịgba nke a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke na-arụpụta nnọọ ihe dị mma. (Abụ Ọma 32:8; Aịsaịa 48:17, 18) Ma ọ dịzi anyị n’aka itinye ya n’ọrụ.

A jụrụ ọtụtụ ndị di na nwunye ihe ha mụtara ka ha na-azụ ụmụ ha ịbụ ndị na-eme nke ọma na ịghọ ndị dimkpa na-atụ egwu Chineke. Ha kwuru na ihe bụ́ isi nyeere ha aka inwe ihe ịga nke ọma bụ itinye ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ. Ha chọpụtara na ndụmọdụ ndị dị na Bible ka bara nnọọ uru dị ka ha bara mgbe mbụ e dere Bible.

Wepụta Oge Soro Ụmụ Gị Nọrịa

Mgbe a jụrụ Catherine, bụ́ onye mụrụ ụmụ abụọ, ndụmọdụ kasị nyere ya aka, ọ kpọturu Deuterọnọmi 6:7 uche ozugbo. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a kwuru, sị: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” Catherine ghọtara na ịgbaso ndụmọdụ ahụ pụtara na ọ ga-ewepụta oge iji soro ụmụ ya na-anọ.

I nwere ike ịdị na-eche na nke ahụ dị mfe ikwu ekwu karị ime eme. Olee otú ndị nne na nna ọrụ zuru ahụ́ ga-esi wepụtakwuo oge iji soro ụmụ ha na-anọ ebe ha abụọ na-achụ ego ha ga-eji gboo mkpa ezinụlọ? Torlief, bụ́ onye nwa ya nwoke na-azụ ụmụ nke ya ugbu a, kwuru na isi ihe na-enye aka bụ ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị na Deuterọnọmi. Kpọrọ ụmụ gị na-aga ebe ọ bụla ị chọrọ ịga, ohere iso ha kwurịta okwu ga-abịara onwe ya. Torlief kwuru, sị: “Mụ na nwa m nwoke rụkọrọ ọrụ ndị dị n’ụlọ ọnụ. Ezinụlọ anyị mekọrọ njem ọnụ. Anyị rikọkwara nri ọnụ.” O kwukwara, sị: ‘Nke a na-emekarị ka ahụ́ ruo nwa anyị nwoke ala ịgwa anyị ihe dị n’obi ya.’

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ndị ezinụlọ ike ikwurịta okwu? Nke a na-eme mgbe ụfọdụ ka ụmụaka na-etolite. Ọzọkwa, iwepụtakwu oge iji soro ha na-anọkọ pụrụ inye aka. Di Catherine, bụ́ Ken, kwuru na mgbe nwa ha nwanyị gbara afọ iri na ụma, o mere mkpesa na Ken adịghị ege ya ntị ma ya na-ekwu okwu. Nke a bụ mkpesa ndị nọ n’afọ iri na ụma na-emekarị. Gịnị ka Ken mere? Ken kwuru, sị: “Ekpebiri m iwepụtakwu oge ka nanị mụ na ya na-ekwurịta okwu, anyị na-ekwurịta ihe ndị dị ya n’obi, otú o si ele ihe anya, na nsogbu ndị ọ na-enwe. Nke ahụ nyere nnọọ aka.” (Ilu 20:5) Otú ọ dị, Ken ghọtara na ihe mere nke a ji rụpụta ihe dị mma bụ n’ihi na ha na-ekwurịta okwu n’ezinụlọ ha. O kwuru, sị: “Mụ na nwa m nwanyị na-enwekarị mmekọrịta dị mma, nke a mere ka ahụ́ ruo ya ala ịgwa m okwu.”

Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ikwu na nchọpụta e mere na nso nso a gosiri na o yiri ka ndị dị afọ iri na ụma bụ́ ndị na-ekwu na ndị nne na nna na ụmụ ha adịghị anọkọkarị ga-eji okpukpu atọ karịa ndị nne na nna na-ekwu otú ahụ. Ya mere, ì cheghị na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịgbaso ndụmọdụ Bible? Wepụta nnọọ oge soro ụmụ gị na-anọ ókè ọ bụla o kwere mee—mgbe unu na-ezu ike na mgbe unu na-arụ ọrụ, mgbe unu nọ n’ụlọ na mgbe unu na-eme njem, mgbe unu tetara ụra n’ụtụtụ na n’abalị tupu unu alakpuo ụra. Ọ bụrụ na o kwe mee, kpọrọ ha gawa ebe ọ bụla ị na-aga. Dị ka Deuterọnọmi 6:7 gosiri, ọ dịghị ihe ị ga-eji dochie anya iso ụmụ gị na-anọkọ.

Kụziere Ha Ụkpụrụ Ndị Ziri Ezi

Mario, onye bụ́ nna mụrụ ụmụ abụọ tụkwara aro, sị: “Gosi ụmụaka na ị hụrụ ha n’anya nke ukwuu ma na-agụrụ ha ihe.” Otú ọ dị, ebe okwu biri abụghị nanị n’inyere ha aka inwe ọgụgụ isi. I kwesịrị ịkụziri ha ụzọ isi mata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Mario gbakwụnyere, sị: “Na-amụrụ ha Bible.”

N’ihi ya, Bible gbara ndị nne na nna ume, sị: ‘Unu akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.’ (Ndị Efesọs 6:4, Bible Nsọ nke Union Version) N’ọtụtụ ezinụlọ taa, adịghị akụziri ụmụaka ime omume ọma. Ụfọdụ kweere na mgbe ụmụaka tolitere, ha ga-enwe ike ikpebiri onwe ha ụdị ụkpụrụ ndị ha ga-agbaso. Nke a ọ̀ dị gị ka ihe ezi uche dị na ya? Dị nnọọ ka ahụ́ nwatakịrị si chọọ nri ndị na-edozi ahụ́ iji gbasie ike ma nwee ezi ahụ́ ike, n’otu aka ahụ uche na obi ụmụaka chọrọ nduzi. Ọ bụrụ na ị kụzirighị ụmụ gị uru ime omume ọma bara n’ụlọ, eleghị anya, ha ga-anakwere echiche nke ụmụ akwụkwọ ibe ha na nke ndị nkụzi ha ma ọ bụkwanụ nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi.

Bible pụrụ inyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha otú ha ga-esi mata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (2 Timoti 3:16, 17) Jeff, onye bụ́ okenye nwere ahụmahụ nke zụrụ ụmụ abụọ, tụrụ aro ka e jiri Bible na-akụziri ụmụaka ime omume ọma. O kwuru, sị: “Iji Bible akụziri ụmụaka ihe na-eme ka ha ghọta otú Onye Okike si ele ihe anya, ọ bụghị nanị otú papa ha na mama ha si ele ihe anya. Anyị chọpụtara na Bible na-akpa ike dị egwu n’uche na n’obi. Iji gbazie àgwà ọjọọ ma ọ bụ echiche ọjọọ, anyị na-ewepụta oge iji chọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị. Mgbe ahụzi, anyị na-agwa nwa ahụ ka ọ gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ mgbe nanị anyị na ya nọ. Ihe na-esikarị na nke a apụta bụ na nwa ahụ na-amalite ibe ákwá ma ọ gụchaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Nke a na-eju anyị anya. Bible pụrụ iru nnọọ n’obi karị ihe ọ bụla anyị chere na anyị gaara ekwu ma ọ bụ mee.”

Ndị Hibru 4:12 kwuru, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” N’ihi ya, ihe ndị dị na Bible abụghị ihe mmadụ chepụtara n’onwe ya ma ọ bụ ahụmahụ nke ndị ahụ Chineke jiri dee ya nwere. Kama ọ nọchiri anya echiche Chineke n’okwu ndị metụtara omume. Nke a mere ka ọ dị iche ná ndụmọdụ ọ bụla ọzọ. Site n’iji Bible na-ezi ụmụ gị ihe, ị na-enyere ha aka ịma otú Chineke si ele ihe anya. Ha ga-ejikwu ọzụzụ ị na-enye ha kpọrọ ihe, ị ga-enwekwukwa ike iru n’obi ụmụ gị.

Catherine, bụ́ onye a kpọtụrụ uche ná mmalite kwetara na nke a bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ka ihe na-esiwanye ike, otú ahụkwa ka anyị na-achọkwu nduzi n’Okwu Chineke—ọ rụpụtakwara ihe dị mma.” Ị̀ pụrụ iji Bible na-akụziri ụmụ gị otú ha ga-esi mata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ?

Jiri Ezi Uche Na-eme Ihe

Pọl onyeozi kwuru ụkpụrụ ọzọ dị mkpa na-enye aka n’ịzụ ụmụ. Ọ gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ka inwe ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara.” (Ndị Filipaị 4:5) N’ezie, nke ahụ na-agụnye ikwe ka ụmụ anyị hụ na anyị ji ezi uche eme ihe. Chetakwa na inwe ezi uche bụ igosipụta “amamihe nke sitere n’elu.”—Jems 3:17.

Olee ihe jikọrọ ezi uche na ịzụ ụmụ anyị? Ọ bụ ezie na anyị na-enyere ha aka n’ụzọ nile anyị nwere ike, anyị adịghị achịkwa ihe nile ha na-eme. Dị ka ihe atụ, Mario bụ́ onye a kpọtụrụ uche ná mmalite bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, o kwuru, sị: “Anyị na-agbakarị ụmụ anyị ume iche echiche banyere ime baptizim, ije ozi oge nile na isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ metụtara ozi Chineke. Ma anyị na-eme ka o doo ha anya na ọ bụ ha ga-eme nhọrọ ndị ahụ mgbe oge ha ruru.” Gịnị siri na ya pụta? Ụmụ ha abụọ ahụ na-ejecha ozi ugbu a dị ka ndị ozi oge nile.

Ndị Kọlọsi 3:21, Bible dọrọ ndị nna aka ná ntị, sị: “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.” Catherine ji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ kpọrọ nnọọ ihe. Mgbe ihe ụmụaka na-eme na-ekweghịzi ndị nne na nna ha odidi, ndị nne na nna na-ewekarị iwe ma ọ bụ tie iwu ndị siri ike. Ma Catherine kwuru, sị, “atụla anya na ụmụ gị ga-eme ihe otú gị onwe gị ga-esi eme ya.” Catherine bụkwa otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ gbakwụnyekwara, sị: “Mee ka ijere Jehova ozi bụrụ ihe na-enye obi ụtọ.”

Jeff, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite mere nchọpụta a bara uru, o kwuru, sị: “Ka ụmụ anyị na-etolite, otu ezigbo enyi anyị gwara anyị na ya chọpụtara na e nwere ọtụtụ mgbe ya jụrụ imere ụmụ ya ihe ha rịọrọ ya. Nke a na-eme ka obi ghara ịdị ha mma, na-eme ka ha na-eche na a na-emegbu ha emegbu. Iji zere nke a, ọ tụụrụ anyị aro ịgbalị ịdị na-emere ụmụ anyị ihe ndị ha rịọrọ anyị.”

Jeff kwuru, sị: “Anyị chọpụtara na aro a dị nnọọ mma. Anyị bịaziri na-achọ ohere ụmụ anyị ga-eji soro ụmụaka ndị ọzọ na-eme ihe ndị anyị lere anya na ha adịghị njọ. Ya mere, anyị na-agakwuru ha ma jụọ ha, sị: ‘Ùnu maara na onye dị otú a na-eme ihe dị otú a ma ọ bụ ihe dị otú a? Ùnu ga-achọ ịga?’ Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na e nwee ebe ụmụ anyị rịọrọ anyị ka anyị kpọrọ ha gaa, anyị na-agbalị ịkpọrọ ha gaa ọbụna ma a sị na ike gwụrụ anyị. Anyị na-eme ya iji hụ na anyị asịghị ha ee e.” Nke ahụ bụ ihe iji ezi uche eme ihe pụtara—ọ chọrọ ka anyị na-echebara ụmụ anyị echiche ma na-ekwe ka ha mee ihe ndị ha chọrọ ime ọ bụrụhaala na o megideghị ụkpụrụ Bible.

Uru Ntụziaka Bụ́ Ịgba Na-aba

Ọtụtụ n’ime ndị di na nwunye ndị a enweela ụmụ ụmụ ugbu a. Ha na-enwe obi ụtọ ịhụ ka ụkpụrụ Bible ndị a nyeere ha aka na-enyekwara ụmụ ha aka inwe ihe ịga nke ọma dị ka ndị nne na nna. Ị̀ pụrụ irite uru ná ntụziaka Bible na-enye?

Mgbe Ruth, bụ́ onye a kpọtụrụ uche ná mmalite ghọrọ nne, ya na di ya nwere mgbe ụfọdụ ha chere na ha enweghị onye enyemaka. Ma ha nwere. Ha nwere ntụziaka bụ́ ịgba site n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ndịàmà Jehova ebipụtawo ọtụtụ akwụkwọ ndị mara nnọọ mma e ji amụ Bible, bụ́ ndị pụrụ inyere ndị nne na nna aka. Ha gụnyere Mụta Ihe Site nAka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, Akwukwọm nke Akukọ Bible, Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, na Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Di Ruth, bụ́ Torlief, kwuru, sị: “Taa, ndị nne na nna nwere imerime ndụmọdụ ndị sitere na Bible. Ọ bụ nanị mgbe ha ji ya na-eme ihe, ka ọ pụrụ inyere ha aka ịzụ ụmụ n’akụkụ nile nke ndụ.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ihe NDỊ ỌKACHAMARA Kwuru . . . Ihe BIBLE Kwuru

Banyere Igosipụta Ịhụnanya:

Dr. John Broadus Watson gbara ndị nne na nna ume n’akwụkwọ bụ́ The Psychological Care of Infant and Child (1928), sị: ‘Ya adịla mgbe unu ga-amakụ ụmụ unu ma sutụ ha ọnụ. Ya adịla mgbe unu ga-eku ha n’apata ụkwụ unu.’ Otú ọ dị, n’oge na-adịchabeghị anya, Dr. Vera Lane na Dr. Dorothy Molyneaux kwuru na magazin bụ́ Our Children (March 1999), sị: “Nnyocha ndị e mere egosiwo na ụmụaka a na-adịghị ebitụ aka ma na-egosi ha na a hụrụ ha n’anya adịghị emesakarị ahụ́.”

N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Aịsaịa 66:12 kwuru otú Chineke si gosi na ya hụrụ ndị ya n’anya site n’iji okwu ndị na-egosi ịhụnanya nne na nna na-enwe n’ebe nwa ha nọ mee ihe. N’otu aka ahụ, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs chọrọ igbochi ndị mmadụ ịkpọtara Jizọs ụmụaka, ọ gbaziri ndị na-eso ụzọ ya site n’ịgwa ha, sị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha.” Mgbe ahụ ‘o kuuru ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha.’—Mak 10:14, 16.

Banyere Ịkụzi Àgwà Ndị Ziri Ezi:

N’otu isiokwu gbara na New York Times Magazine na 1969, Dr. Bruno Bettelheim kọwara na “nwatakịrị nwere ikike isi nanị n’ahụmahụ o nwere kpebiere onwe ya ihe ọ ga-eme n’ekweghị ka ndị mụrụ ya bịa gwawa ya ihe ọ ga-eme.” Otú ọ dị, mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri atọ ka Dr. Bruno Bettelheim kwusịrị nke ahụ, Dr. Robert Coles, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ́ The Moral Intelligence of Children (1997), kwuru, sị: “Ụmụaka chọsiri mgbazi na nduzi ike ná ndụ, ya bụ, ụkpụrụ” ndị ndị nne na nna ha ma ọ bụ ndị ọzọ toworo eto lere anya na ha ziri ezi.

Ilu 22:6 na-agba ndị nne na nna ume, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” Okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “zụlite” pụtakwara “malite,” n’amaokwu a, ọ na-ezo aka n’ịmalite inye ụmụ ọhụrụ ntụziaka mbụ. N’ihi ya, a gbara ndị nne na nna ume ịmalite n’oge ụmụ ha bụ ụmụ ọhụrụ kụziwere ha ụkpụrụ ndị ziri ezi. (2 Timoti 3:14, 15) O yiri ka ihe ndị ha mụtara n’afọ ndị ahụ ha ka na-eto eto ọ̀ ga-adịgide n’uche ha.

Banyere Inye Ntaramahụhụ:

Dr. James Dobson dere n’akwụkwọ bụ́ The Strong-Willed Child (1978), sị: “Apịpịa bụ ihe ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya ji akụziri ụmụ ha ihe, iji gbochie ha ịkpa àgwà ọjọọ.” N’aka nke ọzọ, otu isiokwu e nwetara site ná mbipụta nke asaa nke otu akwụkwọ a ma ama bụ́ Baby and Child Care (1998), bụ́ nke Dr. Benjamin Spock dere, kwuru, sị: “Ịpịa ụmụaka ihe na-akụziri ha na onye toro eto nweere onwe ya ime ihe ọ bụla masịrị ya, ma ihe onye ahụ na-eme ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi.”

Mgbe a bịara n’ihe banyere inye ụmụaka ahụhụ, Bible na-ekwu, sị: “Mkpanaka na ịba mba na-enye amamihe.” (Ilu 29:15) Otú ọ dị, ọ bụghị ụmụaka nile ka ọ dị mkpa ka a na-apịa ihe. Ilu 17:10 gwara anyị, sị: “Ịbasi mba ike na-abami n’ime onye nghọta karịa ka [otu narị otiti] ga-aba n’ime onye nzuzu.”

[Foto]

Jiri Bible ruo n’obi nwa gị

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị nne na nna maara ihe na-ahaziri ụmụ ha ntụrụndụ