“Ṅụrịakwa Ọṅụ Na Nwunye Ị Lụrụ n’Okorobịa”
“Ṅụrịakwa Ọṅụ Na Nwunye Ị Lụrụ n’Okorobịa”
“Ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa . . . N’ihi gịnị ka ị ga-eji nwanyị na-abụghị nwunye gị wagharịa, nwa m?”—ILU 5:18, 20.
1, 2. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya mmekọahụ nke di na nwunye na-enwe bụ ihe a gọziri agọzi?
BIBLE ezoghị ọnụ n’ikwu ihe banyere mmekọahụ. Anyị na-agụ n’Ilu 5:18, 19, sị: “Ka isi iyi gị bụrụ ihe a gọziri agọzi; ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa. Dị ka nne ele nke na-ahụ n’anya na nne ewu ọhịa mara mma, ka ara ya abụọ na-eju gị afọ na mgbe nile; nanị n’ịhụnanya ya ka ị ga na-awagharị mgbe nile.”
2 Okwu ahụ bụ́ “isi iyi” e ji mee ihe ebe a na-ezo aka n’ihe mmadụ ji emejụ agụụ mmekọahụ. Ọ bụ ihe a gọziri agọzi n’ihi na ịhụnanya mmekọahụ na obi ụtọ di na nwunye na-enweta ná mmekọahụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. Otú ọ dị, ọ bụ nanị di ma ọ bụ nwunye mmadụ ka ya na ya ga-enwe mmekọahụ. N’ihi ya, Eze Solomọn nke Izrel oge ochie, bụ́ onye dere akwụkwọ Ilu jụrụ, si: “N’ihi gịnị ka ị ga-eji nwanyị na-abụghị nwunye gị wagharịa, nwa m? N’ihi gịnị ka ị ga-agbakụ nwanyị na-abụghị nwunye gị obi?”—Ilu 5:20.
3. (a) Olee ọnọdụ na-agbawa obi nke ọtụtụ alụmdi na nwunye nọ na ya? (b) Olee otú Chineke si ele ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye anya?
3 N’ụbọchị nwoke na nwanyị gbara akwụkwọ, ha kwesiri onwe ha nkwa ike ịhụ ibe ha n’anya na ikwesị ntụkwasị obi nye ibe ha. Ka o sina dị, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye na-etisa ọtụtụ alụmdi na nwunye. N’ezie, mgbe otu onye na-eme nchọpụta nyochasịrị ihe ọmụmụ 25 e mere, o kwubiri na “pasent 25 nke ụmụ nwanyị lụrụ di na pasent 44 nke ụmụ nwoke ji nwanyị akwaala iko.” Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom e debere maka mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom, . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Nke ahụ doro nnọọ anya. Di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko bụ mmehie dị oké njọ n’anya Chineke, ndị na-efe Chineke ezi ofufe aghaghịkwa izere ekwesịghị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye ha. Gịnị ga-enyere anyị aka ime ka ‘alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ihe ndina alụmdi na nwunye bụrụkwa ihe na-enweghị mmerụ’?—Ndị Hibru 13:4.
Ekwela Ka Obi Dị Aghụghọ Duhie Gị
4. Olee ụzọ ụfọdụ Onye Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi nwewe mmasị mmekọahụ n’ahụ́ onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya n’amaghị ama?
4 N’ụwa nke oge a rụrụ arụ n’omume, ọtụtụ ndị “nwere anya jupụtara n’ịkwa iko, gharakwa inwe ike iwepụ aka ná mmehie.” (2 Pita 2:14) Ha na-ama ụma eso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha akwa iko. Ná mba ụfọdụ, ọtụtụ ụmụ nwanyị amalitela ịrụ ọrụ Bekee, ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ịrụkọkwa ọrụ otú ahụ emeela ka ọ dịrị ha mfe inwe mmasị mmekọahụ n’ahụ́ ibe ha. Ọzọkwa, ebe ndị a na-akparịta ụka n’Intanet emeela ka ọ dịrị ọbụna ndị kasị eme ihere mfe inweta ndị enyi ha na ha na-ekwurịta ihe ndị miri emi n’Intanet. Ọtụtụ ndị lụrụ di na nwunye na-eso ndị na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha enwe mkparịta ụka dị otú ahụ n’Intanet n’amaghị na ha na-abanye ná nsogbu.
5, 6. Olee otú otu nwanyị Onye Kraịst si daba n’ọnọdụ gaara eduba ya ná nsogbu, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?
5 Tụlee otú otu Onye Kraịst anyị ga-akpọ Mary si banye ná mmekọrịta nke fọrọ nnọọ obere ka o mee ka ọ kwaa iko. Di ya bụ́ onye na-abụghị Onyeàmà Jehova ahụchaghị ezinụlọ ya n’anya. Mary chetara afọ ole na ole gara aga mgbe ya na otu nwoke ya na di ya na-arụkọ ọrụ matara. Nwoke ahụ na-ekele nnọọ mmadụ nke ọma, n’oge ọzọkwa, o gosidịrị mmasị n’ihe okpukpe Mary na-akụzi. Mary kwuru, sị: “Ọ bụ nnọọ ezigbo mmadụ, ọ dịtụghị ka di m.” N’oge na-adịghị anya, Mary na nwoke ahụ ya na di ya na-arụkọ ọrụ malitere inwe ịhụnanya mmekọahụ. Mary chere, sị: “Mụ na ya akwabeghị iko, o nwekwara mmasị na Bible. Ma eleghị anya, enwere m ike inyere ya aka.”
6 Mary ghọtara onwe ya tupu ịhụnanya mmekọahụ a o nwere eduba ya n’ikwa iko. (Ndị Galeshia 5:19-21; Ndị Efesọs 4:19) Akọnuche Mary malitere rụwa ọrụ, ọ gbanwekwara àgwà ya. Ihe mere Mary na-egosi na “obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị.” (Ilu 4:23) Olee otú anyị nwere ike isi mee nke ahụ?
‘Onye Nwere Ezi Uche Na-ezobe Onwe Ya’
7. Olee ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu mgbe anyị na-enyere onye nwere nsogbu alụmdi na nwunye aka?
7 Pọl onyeozi dere, sị: “Ka onye na-eche na ya na-eguzo lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrint 10:12) Ilu 22:3 kwukwara, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.” Kama inwe obi ike gabiga ókè ma na-ekwu, sị, ‘Ọ dịghị ihe ga-eme m,’ ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịma ọnọdụ ndị nwere ike itinye gị ná nsogbu. Dị ka ihe atụ, ekwela ka ọ bụrụ nanị gị ka onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwanyị ibe gị nke ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya nwere nsogbu tara akpụ ga na-akọsara nsogbu ya. (Ilu ) Gwa ya na ndị ọ kasị mma ka ya na ha kwurịta nsogbu alụmdi na nwunye ya bụ di ma ọ bụ nwunye ya, Onye Kraịst tozuru okè bụ́ nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya bụ́ onye na-echere ha echiche ọma, ma ọ bụ ndị okenye. ( 11:14Taịtọs 2:3, 4) Ndị okenye ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-esetịpụ ezi ihe nlereanya na nke a. Mgbe ọ dị mkpa ka otu okenye na nanị nwanna nwanyị kparịta ụka, ha na-anọ ebe ndị mmadụ ga na-ahụ ha—dị ka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
8. Olee ihe dị mkpa anyị ga-akpachara anya maka ya n’ebe anyị na-arụ ọrụ?
8 N’ebe ị na-arụ ọrụ na n’ebe ndị ọzọ, zere ọnọdụ ndị nwere ike ime ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị kpachiwe anya. Dị ka ihe atụ, gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị ịrụkọ ọrụ mgbe a gbasara ọrụ nwere ike iduba gị n’ọnwụnwa. Dị ka onye ji nwanyị ma ọ bụ onye nọ na di, i kwesịrị ime ka o doo anya site n’okwu ọnụ na omume gị na i nweghị mmasị ná mmekọrịta ọ bụla pụrụ iduga n’ịkwa iko. Dị ka onye na-atụ egwu Chineke, i kwesịtụghị ime ihe ga-eme ka onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị kpawa gị nso otú na-ekwesịghị ekwesị site n’ịchụ ya ma ọ bụ iyi uwe na iji ejiji ndị na-adịghị mma n’anya. (1 Timoti 4:8; 6:11; 1 Pita 3:3, 4) Idowe foto di gị ma o bụ nwunye gị na nke ụmụ gị n’ebe ị na-arụ ọrụ ga na-echetara gị na ndị ọzọ mgbe nile na ezinụlọ gị ka gị mkpa. Kpebisie ike na ọ dịghị mgbe ị ga-eme ihe onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị ga-eji nwewe mmasị n’ahụ́ gị ma ọ bụ nabata mmasị na-ezighị ezi o gosiri n’ebe ị nọ.—Job 31:1.
“Dị Ndụ Ọṅụ, Gị na Nwunye nke Ị Hụrụ n’Anya”
9. Olee otú otu ihe nwere ike isi duga n’ibe ya ma mee ka ndọrọ mmekọahụ malitere ọhụrụ sie ike?
9 Ichebe obi anyị karịrị izere ọnọdụ ndị pụrụ itinye anyị ná nsogbu. Mmadụ inwe ịhụnanya mmekọahụ n’ahụ́ onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya pụrụ igosi na di na nwunye adịghị elebara mkpa ibe ha anya. O nwere ike ịbụ na di na-eleghara nwunye ya anya mgbe nile ma ọ bụ na nwunye na-akatọkarị di ya. Na mberede, onye ọzọ—ma ọ̀ bụ onye ya na mmadụ na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ọbụna onye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst—eyie ya ka ò nwere nnọọ àgwà ndị di ma ọ bụ nwunye ya na-enweghị. N’oge na-adịghị anya, mmadụ abụọ ahụ amalite ịkpachi anya, ọbụbụenyi ọhụrụ ahụ abịakwa sie nnọọ ike. Otú a otu ihe na-esi eji nwayọọ nwayọọ eduga n’ibe ya na-egosi na ihe a Bible kwuru bụ eziokwu: “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà.”—Jems 1:14.
10. Olee otú di na nwunye nwere ike isi mee ka mmekọrịta ha sikwuo ike?
10 Kama di na nwunye ilewe anya n’èzí iji mejụọ ọchịchọ ha—ma ọ̀ bụ ọchịchọ maka ịhụnanya, ọbụbụenyi, ma ọ bụ nkwado mgbe ha nwere nsogbu tara akpụ—ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike iji mee ka ịhụnanya dị n’etiti ha sikwuo ike. Ya mere, na-agbalisinụ ike iwepụta oge iji nọkọọ ọnụ ma na-anọkwunu ibe unu nso. Na-echeta ihe mere i ji hụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya na mbụ. Gbalịa ịhụghachi di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya otú ahụ ị hụrụ ya tupu unu alụọ. Chee echiche banyere oge unu jirila nọkọta ọnụ ma kporie ndụ. Kpegara Chineke ekpere banyere ya. Ọbụ abụ bụ́ Devid kpekuru Jehova ekpere, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) Kpebisie ike ‘ịdị ndụ ọṅụ, gị na nwunye nke ị hụrụ n’anya n’ụbọchị nile nke ndụ gị nke Chineke nyeworo gị n’okpuru anyanwụ.’—Eklisiastis 9:9.
11. Olee ọrụ ihe ọmụma, amamihe, na nghọta na-arụ n’ime ka alụmdi na nwunye sikwuo ike?
11 Ihe ndị ọzọ a na-ekwesịghị ileghara anya n’ime ka alụmdi na nwunye sikwuo ike bụ uru ihe ọmụma, amamihe, na nghọta bara. Ilu 24:3, 4 kwuru, sị: “Amamihe ka e ji ewu ụlọ; ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike: sitekwa n’ihe ọmụma ka ime ụlọ ya nile na-ejupụta n’akụ̀ nile dị oké ọnụ ahịa dịkwa ụtọ.” Ịhụnanya, egwu Chineke, na okwukwe so n’akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa na-ejupụta n’ezinụlọ e nwere obi ụtọ na ya. Inweta àgwà ndị ahụ na-achọ mmadụ inweta ihe ọmụma banyere Chineke. N’ihi ya, ndị di na nwunye kwesịrị ịdị na-amụchi Bible anya. Oleekwa otú amamihe na nghọta dịruru ná mkpa? Ọ dị anyị mkpa inwe amamihe, nke bụ́ ikike nke iji ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ eme ihe, iji merie nsogbu ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị. Onye nwere nghọta na-enwe ike ịghọta echiche na mmetụta nke di ma ọ bụ nwunye ya. (Ilu 20:5) Jehova si n’aka Solomọn kwuo, sị: “Nwa m, ṅaa ntị n’amamihe m; tọọ ntị gị n’ala nye nghọta m.”—Ilu 5:1.
Mgbe “Mkpagbu” Bịara
12. N’ihi gịnị ka o ji ghara ịbụ ihe ijuanya na ndị di na nwunye na-enwe nsogbu?
12 Ọ dịghị alụmdi na nwunye zuru okè. Bible kwudịrị na ndị di na nwunye ga-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Nchegbu, ọrịa, mkpagbu, na ihe ndị ọzọ nwere ike iweta nsogbu n’alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, mgbe nsogbu bịara, ọ dị unu mkpa ịgbakọ aka ọnụ n’ịchọ ihe ga-edozi ya dị ka di na nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi nye ibe ha ma na-achọ ime ihe Jehova na-achọ.
13. Olee ebe ndị di na nwunye nwere ike inyocha onwe ha?
13 Gịnị ma e nwee nsogbu n’alụmdi na nwunye n’ihi otú di na nwunye si emeso ibe ha omume? Ọ ga-achọ ha n’aka ime mgbalị siri ike iji chọta ihe ngwọta ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na okwu ọjọọ ejirila nwayọọ nwayọọ bata n’alụmdi na nwunye ha ma mara ha ahụ́. (Ilu 12:18) Dị ka e kwuru n’isiokwu bú nke a ụzọ, nke ahụ pụrụ imebi ihe n’ezinụlọ. Otu ilu Bible kwuru, sị: “Ọ dị mma ịnọ n’ala bụ́ nanị ọzara, karịa ịnọnyere nwanyị na-ese okwu na-akpasukwa iwe.” (Ilu 21:19) Ọ bụrụ na ị bụ nwunye n’alụmdi na nwunye dị otú ahụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Àgwà m ọ̀ na-eme ka di m na-agbara m ọsọ?’ Bible gwara ndị bụ́ di, sị: “Nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, unu adịkwala na-eweso ha iwe n’ụzọ dị ilu.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Ọ bụrụ na ị bụ di, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-eleghara nwunye m anya, bụ́ nke na-eme ka ọ chọwa onye ọzọ ga-ahụ ya n’anya?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị ihe ga-eme ka o zie ezie di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko. Ma, ebe ihe ọjọọ dị otú ahụ nwere ike ime eme, di na nwunye kwesịrị iji obi ọcha kwurịta nsogbu ndị ha nwere.
14, 15. N’ihi gịnị ka mmadụ ịkpa onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nso gabiga ókè na-ejighị bụrụ ihe ngwọta nke nsogbu alụmdi na nwunye?
14 Mmadụ ịchọ iji mmekọrịta nke ya na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya kasie onwe ya obi agaghị eme ka nsogbu o nwere n’alụmdi na nwunye ya kwụsị. Olee ebe mmekọrịta dị otú ahụ nwere ike iduga mmadụ? Ọ̀ ga-eduga n’alụmdi na nwunye ọzọ ka nke onye ahụ nọ na ya ugbu a mma? Ụfọdụ nwere ike iche otú ahụ. Ha na-ekwu, sị: ‘A sị ka e kwuwe, onye a nwere nnọọ àgwà ndị m chọrọ na di ma ọ bụ nwunye.’ Ma, nke ahụ bụ ụgha, n’ihi na onye ọ bụla nke ga-ahapụ di ma ọ bụ nwunye ya—ma ọ bụ gbaa gị ume ịhapụ nke gị—ejitụghị ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye kpọrọ ihe. Ọ bụ iberibe iche na mmekọrịta dị otú ahụ ga-eduga n’alụmdi na nwunye ka mma.
15 Mary, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’elu, chebaara ihe ga-esi n’omume ya pụta echiche, nke gụnyere ma eleghị anya Chineke iwesawa ya ma ọ bụ onye ọzọ iwe. (Ndị Galeshia 6:7) O kwuru, sị: “Ka m malitere inyocha ịhụnanya m hụrụ nwoke ahụ ya na di m na-arụkọ ọrụ, achọpụtara m na ọ bụrụ na ọ dị mgbe nwoke a ga-abịa mata eziokwu, ịhụnanya a m hụrụ ya ga-egbochi ya. Mụ na ya ime ihe ọjọọ ga-ewute ndị nile ọ gbasara ma mee ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ!”—2 Ndị Kọrint 6:3.
Ihe Ga-akasị Nyere Anyị Aka
16. Olee ụfọdụ nsogbu omume rụrụ arụ na-akpata?
16 Bible dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Egbugbere ọnụ nke nwanyị na-abụghị nwunye gị na-abụsị mmanụ aṅụ, ihe kwọrọ mụrụmụrụ karịa mmanụ ka okpo ọnụ ya dịkwa: ma ikpeazụ ya na-elu ilu dị ka wormwood, ọ dị nkọ dị ka mma agha ihu abụọ.” (Ilu 5:3, 4) Ihe na-esi n’omume rụrụ arụ apụta na-agbawa obi, o nwekwara ike ịkpata ọnwụ. Ọ na-agụnye obi amamikpe, ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ, na obi mgbawa ọ na-ebutere di ma ọ bụ nwunye nke onye ahụ kwara iko. N’ezie, nke a bụ ihe mere anyị na-ekwesịghị iji mee ihe nwere ike iduba anyị n’ịkwa iko.
17. Gịnị bụ ihe kasị mkpa mere anyị kwesịrị iji kwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye anyị?
17 Isi ihe mere o ji dị njọ di ma bụ nwunye ịkwa iko bụ na Jehova, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye na Onye nyere di na nwunye ikike inwe mmekọahụ, kpọrọ ya asị. O si n’ọnụ Malakaị onye amụma kwuo, sị: “M ga-abịakwute unu nso ikpe ikpe; M ga-abụkwa onye àmà dị ngwa megide . . . ndị na-akwa iko.” (Malakaị 3:5) Banyere ihe ndị Jehova na-ahụ, Ilu 5:21 na-ekwu, sị: “N’ihu anya Jehova ka ụzọ nile nke mmadụ dị, okporo ụzọ ya nile ka Ọ na-eme ka ha dị larịị.” Ee, “ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Ihe kasị mkpa anyị kwesịrị iji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye anyị bụ ịghọta na n’agbanyeghị otú e si kwaa iko na nzuzo, n’agbanyeghịkwa otú o si yie ihe na-agaghị akpatacha nsogbu anụ ahụ́ ma ọ bụ ihe na-agaghị emebicha aha anyị n’obodo, iko ọ bụla anyị kwara na-emebi mmekọrịta anyị na Jehova.
18, 19. Gịnị ka anyị mụtara n’akụkọ Josef na nwunye Pọtịfa?
18 Ihe atụ Josef, bụ́ nwa nna ochie bụ́ Jekọb, na-egosi na anyị ịchọ ịnọgide na-abụ enyi Chineke ga-enyere anyị nnọọ aka ikwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye anyị. Mgbe Josef nwetara amara n’ihu Pọtịfa, bụ́ onye na-arụ n’obí Fero, Josef bịara bụrụ onye na-elekọta ụlọ Pọtịfa. Josef “makwara mma n’ahụ́, maakwa mma ile anya,” nwunye Pọtịfa chọpụtakwara nke ahụ. Kwa ụbọchị, ọ gbara mbọ ịrata Josef, ma mbọ ya nile kụrụ afọ n’ala. Gịnị mere Josef ji jụ ịdara ya? Bible na-agwa anyị, sị: ‘Ọ jụrụ, sị nwunye nke onye nwe ya, Lee onye nwe m egbochighị ihe ọ bụla n’ebe m nọ ma ọ́ bụghị nanị gị, n’ihi na gị onwe gị bụ nwunye ya: m̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?’—Jenesis 39:1-12.
19 Josef bụ́ nwa okorobịa na-alụbeghị nwanyị nọgidere na-eme omume dị ọcha site n’ịjụ ịkwaso nwunye onye ọzọ iko. Ilu 5:15 gwara ndị di, sị: “Ṅụọ mmiri sitere n’olulu nke aka gị, na mmiri na-eru eru site n’ime olulu mmiri nke aka gị.” Ekwela ka ị malite inwe mmasị mmekọahụ n’ahụ́ onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị, ọbụna n’amaghị ama. Gbalịa ime ka ịhụnanya ị hụrụ di ma ọ bụ nwunye gị sikwuo ike, gbalịsiekwa ike idozi nsogbu ọ bụla unu nwere n’alụmdi na nwunye unu. Mee ihe nile i nwere ike ime iji ‘ṅụrịa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa.’—Ilu 5:18.
Gịnị Ka Ị Mụtara?
• Olee otú e nwere ike isi rata Onye Kraịst iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ?
• Olee ịdọ aka ná ntị ndị nwere ike inyere mmadụ aka ịghara inwe ịhụnanya mmekọahụ n’ahụ́ onye na-abụghị di ma o bụ nwunye ya?
• Gịnị ka di na nwunye kwesịrị ime mgbe ha na-enwe nsogbu?
• Olee ihe kasị mkpa mere anyị ga-eji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye anyị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 26]
Ọ dị mwute ikwu na ebe ọrụ pụrụ ime ka ọ dịrị mmadụ mfe ịmalite inwe ịhụnanya mmekọahụ n’ahụ́ onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya
[Foto dị na peeji nke 28]
‘Site n’ihe ọmụma ka ime ụlọ nile na-ejupụta n’ihe dị ụtọ’