Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

N’EKPERE ọbụ abụ ahụ kpegaara Chineke, ọ jụrụ, sị: “À ga-akọ akụkọ ebere Gị n’ili? À ga-akọ akụkọ ikwesị ntụkwasị obi Gị n’ebe ịla n’iyi?” (Abụ Ọma 88:11) N’ezie, azịza ya bụ ee e. Anyị apụghị ito Jehova ma ọ bụrụ na anyị adịghị ndụ. Ito Jehova bụ ezi ihe mere anyị ga-eji dị ndụ, ndụ anyị dịkwanụ bụ ezi ihe mere anyị ga-eji na-eto ya.

Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma bụ́ nke malitere n’Abụ Ọma nke 73 ruo na nke 106, na-agwa anyị ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-eto Onye Okike anyị ma na-agọzi aha ya. Ichebara abụ ọma ndị a echiche kwesịrị ime ka anyị na-ekelekwu Chineke maka “okwu” ya ma kpalie anyị itokwu ya. (Ndị Hibru 4:12) Ka anyị buru ụzọ jiri mmasị miri emi leba anya ná Nkebi nke Atọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma.

“ỊBỊARU CHINEKE NSO DỊ M MMA”

(Abụ Ọma 73:189:52)

Ọ bụ Esaf ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya dere abụ ọma 11 mbụ dị ná nkebi nke atọ. Abụ e ji malite ya na-akọwa ihe zọrọ Esaf mgbe echiche na-ezighị ezi chọrọ idufu ya. O ruru ná nkwubi okwu kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ, sị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma.” (Abụ Ọma 73:28) Abụ Ọma nke 74 bụ abụ ákwá maka mbibi Jeruselem. Abụ Ọma nke 75, 76, na nke 77 kọwara Jehova dị ka Onyeikpe bụ́ onye ezi omume, Onye Nzọpụta nke dị umeala n’obi, na Onye Na-anụ ekpere. Abụ Ọma nke 78 tụleghachiri ihe ndị mere ụmụ Izrel, malite n’oge Mozis ruo n’oge Devid. Abụ Ọma nke 79 bụ abụ ákwá maka mbibi nke ụlọ nsọ ahụ. Abụ Ọma nke 80 bụ ekpere maka mweghachi nke ndị Chineke. Abụ Ọma nke 81 na-agba anyị ume irubere Jehova isi. Abụ Ọma nke 82 bụ ekpere e kpere ka Chineke gbuo ndị ikpe dị obi ọjọọ ebe nke 83 na-arịọ ka Chineke gbuo ndị iro Ya.

Abụ ụmụ Kora kwuru, sị: “Agụụ agụsiwo mkpụrụ obi m ike, ee, ọ gwụsịwokwa n’ịchọ ogige nile nke Jehova.” (Abụ Ọma 84:2) Abụ Ọma nke 85 bụ arịrịọ a rịọrọ Chineke ka ọ gọzie ndị ahụ si ná ndọrọ n’agha lọghachi. Abụ ọma a mere ka ọ pụta ìhè na ngọzi ime mmụọ bara uru karịa nke anụ ahụ́. N’Abụ Ọma nke 86, Devid rịọrọ Chineke ka o chebe ya ma zi ya ihe. Ihe dị n’Abụ Ọma nke 87 bụ abụ banyere Zaịọn na banyere ndị a mụrụ n’ebe ahụ, ekpere e kpegaara Jehova n’Abụ Ọma nke 88 sochikwara ya. N’Abụ Ọma nke 89, e kwusiri okwu ike banyere ebere Jehova, bụ́ nke pụtara ìhè n’ọgbụgba ndụ ya na Devid. Ọ bụ Itan, onye ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ otu n’ime ndị amamihe anọ dịrị ndụ n’oge Solomọn, dere ya.—1 Ndị Eze 4:31.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

73:9—Olee otú o si bụrụ na ndị na-emebi iwu “edowo ọnụ ha n’eluigwe, ire ha na-ejegharịkwa n’ụwa”? Ebe ọ bụ na ndị na-emebi iwu adịghị onye ha na-asọpụrụ ma n’eluigwe ma n’ụwa, ọ naghị ara ha ahụ́ iji ọnụ ha ekwulu Chineke. Ha na-ejikwa ire ha ekwutọ ndị mmadụ.

74:13, 14—Olee mgbe Jehova ‘tipịara isi nile nke ogologo anụ mmiri n’elu mmiri ma tipịasịa isi nile nke oké agụiyi’? A kpọrọ “Fero, eze Ijipt, . . . ogologo anụ ahụ nke na-amakpu n’etiti osimiri Naịl ya nile.” (Ezikiel 29:3) Oké agụiyi pụrụ ịnọchi anya ndị agha siri ike nke Fero. (Abụ Ọma 74:14) Ntipịa e tipịara isi ha yiri ka ọ̀ bụ ajọ mmeri e meriri Fero na ndị agha ya mgbe Jehova napụtara ụmụ Izrel n’agbụ Ijipt.

75:4, 5, 10—Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mpi” pụtara? Mpi anụmanụ bụ ngwá ọgụ siri ike. N’ihi ya, okwu ahụ bụ́ “mpi” na-apụta n’ụzọ ihe atụ, ike, ma ọ bụ ume. Jehova na-ebuli mpi nile nke ndị ya elu, na-eme ka ha dị elu, ebe ọ ‘na-ebipụ mpi nile nke ndị na-emebi iwu.’ A dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ‘ibuli mpi elu,’ nke pụtara na anyị ekwesịghị ịdị mpako. Ebe ọ bụ Jehova bụ onye na-ebuli anyị elu, e kwesịrị ile ihe ùgwù ndị a na-enwe n’ọgbakọ anya dị ka ihe ndị sitere n’aka ya.—Abụ Ọma 75:7.

76:10—Olee otú “ọnụma mmadụ” pụrụ isi kelee Jehova? Mgbe Chineke nyere ndị mmadụ ohere iweso anyị iwe n’ihi na anyị bụ ndị ohu ya, ihe dị mma pụrụ isi na ya pụta. Ihe isi ike ọ bụla anyị pụrụ inweta pụrụ ịzụ anyị n’ụzọ ụfọdụ. Jehova na-ekwe ka anyị taa ahụhụ ruo nanị n’ókè nke iji ya nye anyị ụdị ọzụzụ ahụ. (1 Pita 5:10) ‘Chineke na-eke ọnụma mmadụ nke fọdụrụ n’úkwù.’ Gịnị ma ọ bụrụ na anyị atagide ahụhụ nwụọ? Nke a pụkwara iwetara Jehova ekele, n’ihi na ndị hụrụ anyị ka anyị ji ndidi kwesị ntụkwasị obi pụrụ ịmalite inye Chineke otuto.

78:24, 25—N’ihi gịnị ka e ji kpọọ mana “ọka nke eluigwe” na “nri nke ndị dị ike [ma ọ bụ “ndị mmụọ ozi”]”? Ọ dịghị nke ọ bụla n’okwu abụọ ahụ pụtara na mana bụ nri ndị mmụọ ozi. Ọ bụ “nri nke eluigwe” n’ihi na o sitere n’eluigwe. (Abụ Ọma 105:40) Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ “ndị dị ike,” bi n’eluigwe, okwu ahụ bụ́ “Nri nke ndị dị ike” pụtara na ọ bụ Chineke, onye bi n’eluigwe zitere ya. (Abụ Ọma 11:4) Ọ pụkwara ịbụ na Jehova ziteere ụmụ Izrel mana ahụ site n’aka ndị mmụọ ozi.

82:1, 6—Olee ndị a kpọrọ “chi” na “ụmụ nke Onye kachasị ihe nile elu”? Okwu abụọ ahụ na-ezo aka n’ụmụ mmadụ bụ́ ndị ikpe n’Izrel. Nke a kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na ha ga-eje ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Chineke na ndị na-anọchi anya ya.—Jọn 10:33-36.

83:2—Gịnị ka mmadụ ‘ibuli isi ya’ na-egosi? Ime otú ahụ na-egosi na mmadụ adịla njikere ime ihe, nke na-abụkarị imegide onye ọzọ, ịlụso ya ọgụ, ma ọ bụ imegbu ya.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

73:2-5, 18-20, 25, 28. Anyị ekwesịghị inwewere ndị na-emebi iwu na-enwe ihe ịga nke ọma anyaụfụ ma ṅomiwe ụzọ ọjọọ ha. Ndị na-emebi iwu nọ n’ebe na-alọ alọ. Ha ‘ga-adarurịrị ntikpọ.’ Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ọchịchị ụmụ mmadụ na-ezughị okè apụghị iwepụ mmebi iwu, anyị ịdọgawa ime otú ahụ enweghị isi. Dị ka Esaf, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ma ọ bụrụ na anyị edie mmebi iwu site ‘n’ịbịaru Chineke nso’ na iso Ya na-enwe mmekọrịta chiri anya.

73:3, 6, 8, 27. Anyị aghaghị izere ịnya isi, mpako, ịkwa emo, na irigbu mmadụ. Anyị kwesịrị izere ha, n’agbanyeghị na ime ihe ndị dị otú ahụ pụrụ iyi ihe uru dị na ya.

73:15-17. Mgbe echiche anyị na-akpakọchaghị ọnụ, anyị ekwesịghị ikwupụta nchegbu anyị n’ihu ọha. Ịkọ “akụkọ otú a” ga-akụda ndị ọzọ obi. Anyị kwesịrị iji nwayọọ tụgharịa uche banyere ihe ndị ahụ na-echegbu anyị ma nweta nkasi obi site n’ịkpakwuru ndị kwere ekwe ibe anyị.—Ilu 18:1.

73:21-24. E ji mmadụ ikwe ka ‘obi ya gbaa ụka’ ma ọ bụ inwe obi ilu n’ihi ihe o lere anya dị ka ọganihu nke ndị na-emebi iwu tụnyere mmadụ ime ihe ka anụ ọhịa na-amaghị ihe. Ihe na-eme mmadụ ime otú ahụ bụ echeghị echiche eme ihe, onye ahụ ikwe ka iwe ya chịkwaa ya. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ikwe ka ndụmọdụ Jehova duzie anyị ma nwee nnọọ obi ike na ọ ‘ga-ejide anyị n’aka nri’ ma kwado anyị. Ọzọkwa, Jehova ‘ga-eji nsọpụrụ nara anyị,’ ya bụ, anyị na ya inwe mmekọrịta chiri anya.

77:6. Ichebara nnọọ eziokwu nke Okwu Chineke echiche na ịchọsi ya ike pụtara na anyị ga-ewepụtara ya oge iji mụọ ya na iji tụgharịa uche na ya. Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị na-ewepụta ohere iji nọọrọ onwe anyị kwa ụbọchị!

79:9. Jehova na-ege ntị n’ekpere anyị, karịsịa mgbe ekpere ndị ahụ bụ banyere ido aha ya nsọ.

81:13, 16. Ige ntị n’olu Jehova na ije ije n’ụzọ ya nile na-eweta ngọzi bara ụba.—Ilu 10:22.

82:2, 5. Ikpe na-ezighị ezi na-ewezụga “ntọala nile nke ụwa” n’ọnọdụ ha. Ikpe na-ezighị ezi na-ebute ọgba aghara n’obodo.

84:1-4, 10-12. Mmasị ndị ọbụ abụ ahụ nwere n’ebe a na-anọ efe Jehova na afọ ojuju ha nwere maka ihe ùgwù ndị ha nwere bụ ihe nlereanya nye anyị.

86:5. Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ na Jehova “na-agbaghara mmehie”! Ọ na-achọ ihe ọ ga-agbakwasị ụkwụ na ya meere ndị mere ihe ọjọọ chegharịrị echegharị ebere.

87:5, 6. Ọ̀ dị mgbe ndị ga-adị ndụ na Paradaịs elu ala ga-amata aha ndị a kpọlitere n’ọnwụ ịga eluigwe? Amaokwu ndị a na-egosi na nke a yiri ka ọ̀ ga-eme.

88:13, 14. Oge Jehova gburu tupu ya ana-aza ekpere anyị kpegaara ya maka otu nsogbu anyị nwere pụrụ ịbụ n’ihi na ọ chọrọ ka anyị gosipụta na ofufe anyị na-efe ya sitere anyị n’obi.

“KELEENỤ YA, GỌZIEKWANỤ AHA YA”

(Abụ Ọma 90:1106:48)

Tụlee ihe dị iche iche mere a ga-eji na-eto Jehova bụ́ ndị e kwuru ná nkebi nke anọ nke abụ ọma. N’Abụ Ọma nke 90, Mozis gosiri otú “Eze mgbe ebighị ebi” si dị elu karịa ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. (1 Timoti 1:17) N’Abụ Ọma 91:2, Mozis kọwara Jehova dị ka ‘ebe mgbaba ya na ebe ya e wusiri ike’—Onye na-echebe ya. Abụ ọma ole na ole sochiri ya kwuru banyere àgwà ndị magburu onwe ha nke Chineke, echiche ya nke karịrị nke mmadụ, na oké ọrụ ya. E ji okwu bụ́ “Jehova bụ eze,” malite abụ ọma atọ. (Abụ Ọma 93:1; 97:1; 99:1) Mgbe ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere Jehova dị ka Onye kere anyị, ọ gwara anyị ka anyị ‘kelee Ya, gọziekwa aha Ya.’—Abụ Ọma 100:4.

Olee otú onye ọchịchị na-atụ egwu Jehova kwesịrị isi na-achị? Abụ Ọma nke 101, nke Eze Devid dere, nyere azịza ya. Abụ Ọma nke 102 na-agwa anyị na Jehova ‘echewo ekpere nke onye na-enweghị ihe ihu, O ledaghịkwa ekpere ha anya.’ (Abụ Ọma 102:17) Abụ Ọma nke 103 kwuru banyere ebere na obi ebere Jehova. Mgbe ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere ọtụtụ ihe ndị Jehova kere n’ụwa, o tiri mkpu, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! n’amamihe ka I meworo ha nile.” (Abụ Ọma 104:24) Abụ ọma abụọ ikpeazụ dị ná nkebi nke anọ nke Abụ Ọma kelere Jehova maka oké ọrụ ya nile.—Abụ Ọma 105:2, 5; 106:7, 22.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

91:1, 2—Olee ihe bụ́ ‘ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu,’ oleekwa otú anyị si ‘ebi’ ebe ahụ? Nke a bụ ihe atụ nke ebe nchebe na obi iru ala n’ụzọ ime mmụọ—ọnọdụ nchebe pụọ ná mmerụ ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Ebe a bụ ebe nzuzo, n’ihi na ndị na-atụkwasịghị Chineke obi amaghị ya. Anyị na-eme Jehova ebe obibi anyị site n’iwere ya dị ka ebe mgbaba anyị na ebe anyị e wusiri ike, site n’ikele ya dị ka Eze Na-achị eluigwe na ala, na site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ahụ́ na-eru anyị ala n’ụzọ ime mmụọ n’ihi na anyị maara na Jehova dị njikere mgbe nile inyere anyị aka.—Abụ Ọma 90:1.

92:12—Olee otú onye ezi omume si ‘awa igu dị ka nkwụ’? Ihe e ji mara nkwụ bụ ịmị mkpụrụ ruo ọtụtụ afọ. Onye ezi omume dị ka nkwụ, n’ihi na ọ bụ onye ziri ezi n’anya Jehova, ọ na-anọgide na-amị “ezi mkpụrụ,” bụ́ nke na-agụnye ịrụ ezi ọrụ.—Matiu 7:17-20.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

90:7, 8, 13, 14. Mgbe ọ bụla anyị mere ihe ọjọọ, ọ na-emebi mmekọrịta anyị na ezi Chineke ahụ. Anyị apụghịkwa izonahụ ya mmehie ndị anyị mere na nzuzo. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị echegharịa n’ezie ma hapụ mmehie anyị, Jehova ga-agbaghara anyị, ‘were ebere ya mee ka afọ ju anyị.’

90:10, 12. Ebe ọ bụ na ndụ mmadụ dị mkpụmkpụ, anyị kwesịrị ‘ịgụta ụbọchị anyị.’ N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ime ka “obi amamihe bịa,” ma ọ bụ site n’iji amamihe na-eme ihe, ka ụbọchị anyị fọdụrụnụ ghara ifu na nkịtị, kama, ka anyị jiri ya mee ihe na-atọ Jehova ụtọ. Nke a na-achọ ka anyị bute ofufe Jehova ụzọ, ma jiri oge anyị na-eme ihe n’ụzọ na-egosi amamihe.—Ndị Efesọs 5:15, 16; Ndị Filipaị 1:10.

90:17. O kwesịrị ekwesị ka anyị na-ekpe ekpere ka Jehova “meekwa ka ọrụ aka anyị guzosie ike” ma gọzie mgbalị ndị anyị na-eme n’ozi.

92:14, 15. Site ná ndị agadi ịdị na-amụ Okwu Chineke mgbe nile ma na-eso ndị Jehova na-akpachi anya, ha na-anọgide na-abụ “osisi nke mmiri dị ha n’ahụ́ hie nne, nke nwezukwara akwụkwọ ndụ”—nke bụ́ ịgbasi ike n’ụzọ ime mmụọ—ha na-abakwara ọgbakọ uru.

94:19. N’agbanyeghị ihe kpatara “nchegbu” ndị anyị na-enwe, ịgụ na ịtụgharị uche n’okwu “nkasi obi” ndị dị na Bible ga-agụgụ anyị obi.

95:7, 8. Ige ntị na ndụmọdụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, ime ha eme, na ịdị njikere irube isi na ha, ga-eme ka anyị ghara inwe obi kpọrọ nkụ.—Ndị Hibru 3:7, 8.

106:36, 37. Amaokwu ndị a jikọtara ikpere arụsị na ịchụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà. Nke a na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ pụrụ ịmalite ịchịkwa onye na-ekpere arụsị. Bible dụrụ anyị ọdụ, sị: “Cheenụ onwe unu nche pụọ n’arụsị.”—1 Jọn 5:21.

“Toonụ Jaa!”

Abụ ọma atọ ikpeazụ nke dị ná Nkebi nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma ji ndụmọdụ a bụ́, “Toonụ Jaa,” mechie. Abụ ọma nke ikpeazụ jikwa ya meghee. (Abụ Ọma 104:35; 105:45; 106:1, 48) N’ezie, okwu ahụ bụ́ “Toonụ Jaa,” pụtara ugboro ugboro ná Nkebi nke Anọ, nke malitere n’abụ ọma nke 107 ruo na nke 150.

Anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji too Jehova. Abụ Ọma nke 73 ruo nke 106 enyewo anyị ọtụtụ ihe ndị anyị ga-echebara echiche, meekwa ka obi anyị jupụta n’ekele nye Nna anyị nke eluigwe. Mgbe anyị chetara ihe nile Jehova mewooro anyị na ndị nke ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu, ọ̀ bụ na ọ dịghị akpali anyị iji obi anyị nile ‘too Jaa’?

[Foto dị na peeji nke 10]

Dị ka Esaf, anyị pụrụ idi mmebi iwu site ‘n’ịbịaru Chineke nso’

[Foto dị na peeji nke 11]

E meriri Fero n’Oké Osimiri Uhie

[Foto dị na peeji nke 11]

Ị̀ maara ihe mere e ji kpọọ mana “nri nke ndị dị ike “?

[Foto dị na peeji nke 13]

Gịnị na-enye aka ịkwụsị “nchegbu” anyị?