Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ
Okwu Jehova Dị Ndụ
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ
AKWỤKWỌ Bible bụ́ Ndị Eze nke Abụọ malitere ebe Ndị Eze nke Mbụ kwụsịrị. Ọ kọrọ banyere ndị eze 29—12 sitere n’alaeze Izrel nke dị n’ebe ugwu, ebe 17 sitere n’alaeze Juda nke dị n’ebe ndịda. Ndị Eze nke Abụọ kọkwara banyere ọrụ ndị amụma bụ́ Ịlaịja, Ịlaịsha na Aịzaịa rụrụ. Ọ bụ ezie na e deghị ihe ndị dị na ya kpọmkwem n’usoro ha ji mee, ihe ndekọ ahụ gụnyere ihe ndị mere mgbe e bibiri Sameria na Jeruselem. N’ozuzu, Ndị Eze nke Abụọ were ihe dị ka narị afọ atọ na iri anọ—malite n’afọ 920 T.O.A. ruo afọ 580 T.O.A. bụ́ mgbe Jeremaịa onye amụma dechara akwụkwọ a.
Olee uru Ndị Eze nke Abụọ baara anyị? Gịnị ka ọ na-akụziri anyị banyere Jehova na otú o si mesoo ndị mmadụ ihe? Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndị eze, ndị amụma na ndị ọzọ a kpọrọ aha ha n’akwụkwọ a mere? Ka anyị lee ihe anyị pụrụ ịmụta site ná Ndị Eze nke Abụọ.
ỊLAỊSHA ANỌCHIE ỊLAỊJA
Eze Ehazaịa esi n’ụlọ elu ya dapụ ma malite ịrịa ọrịa. Ịlaịja onye amụma agwa ya na ọ ga-anwụ. Ehazaịa anwụọ, nwanne ya nwoke bụ́ Jehoram achịwa. Ka ọ dịgodị, Jehoshafat bụ eze Juda. E bulie Ịlaịja elu n’oké ifufe, oje ozi ya, bụ́ Ịlaịsha, anọchie ya dị ka onye amụma. N’ime ihe dị ka afọ 60 sochirinụ Ịlaịsha jere ozi, ya arụọ ọtụtụ ọrụ ebube.—Lee igbe bụ́ “Ọrụ Ebube Ndị Ịlaịsha Rụrụ.”
Mgbe otu eze Moab nupụụrụ Izrel isi, Jehoram, Jehoshafat na eze Idọm alụso ya agha. E kwe ka ha merie n’ihi ikwesị ntụkwasị obi Jehoshafat. Ka e mesịrị, eze Siria agbaa izu ịwakwasị Izrel na mberede. Otú ọ dị, Ịlaịsha emebie izu ahụ. Eze Siria ewee iwe ma “ziga ịnyịnya na ụgbọala na oké usuu ndị agha” ijide Ịlaịsha. (2 Ndị Eze 6:14) Ịlaịsha arụọ ọrụ ebube abụọ ma zilaga ndị Siria n’udo. Ka oge na-aga, Eze Siria bụ́ Ben-hedad anọchibido Sameria. Nke a emee ka e nwee oké ụnwụ nri, ma Ịlaịsha ebuo amụma na ụnwụ nri ahụ ga-akwụsị.
Obere oge ka e mesịrị, Ịlaịsha agaa Damaskọs. Eze Ben-hedad, nke na-arịa ọrịa mgbe ahụ, eziga Hazel ka ọ gaa jụta ma ya ga-agbake n’ọrịa ya. Ịlaịsha ebuo amụma na eze ahụ ga-anwụ, nakwa na Hazel ga-anọchi ya. N’echi ya, Hazel ejiri ‘ákwà’ ọ bịanyere na mmiri fụchigide eze ahụ n’ihu, o wee nwụọ, Hazel aghọọkwa eze. (2 Ndị Eze 8:15) Nwa Jehoshafat bụ́ Jehoram aghọọ eze na Juda, nwa ya nwoke bụ́ Ehazaịa anọchiekwa ya.—Lee igbe bụ́ “Ndị Eze Juda na Ndị nke Izrel.”
A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
2:9—Gịnị mere Ịlaịsha ji rịọ maka ‘òkè abụọ nke mmụọ Ịlaịja’? Iji rụọ ọrụ dị ka onye amụma n’Izrel, ọ dị Ịlaịsha mkpa inwe otu ụdị mmụọ ahụ Ịlaịja gosipụtara, mmụọ nke obi ike na nke atụghị ụjọ. Mgbe ọ ghọtara nke a, Ịlaịsha rịọrọ maka òkè abụọ nke mmụọ Ịlaịja. Ịlaịja họpụtara Ịlaịsha dị ka onye ga-anọchi ya, ọ bụwokwa oje ozi ya ruo afọ isii, n’ihi ya, Ịlaịsha weere Ịlaịja dị ka nna ime mmụọ ya; Ịlaịsha dịkwa ka ọkpara ime mmụọ Ịlaịja. (1 Ndị Eze 19:19-21; 2 Ndị Eze 2:12) Ya mere, dị ka onye bụ ọkpara n’ụzọ nkịtị na-enweta òkè abụọ nke ihe nketa nna ya, Ịlaịsha rịọrọ ka e nye ya òkè abụọ nke ihe nketa ime mmụọ Ịlaịja, o nwetakwara ya.
2:11—Olee “eluigwe” nke ‘Ịlaịja rịgooro n’oké ifufe’? Ọ bụghị akụkụ dị anya nke mbara igwe ma ọ bụ ebe obibi ime mmụọ nke Chineke na ụmụ ya ndị ikom bụ́ ndị mmụọ ozi. (Deuterọnọmi 4:19; Abụ Ọma 11:4; Matiu 6:9; 18:10) “Eluigwe” nke Ịlaịja rịgooro bụ mbara ikuku. (Abụ Ọma 78:26; Matiu 6:26) Ihe àmà na-egosi na ụgbọala ọkụ ahụ buuru Ịlaịja si na mbara ikuku gafere ma gaa n’akụkụ ọzọ nke ụwa, bụ́ ebe ọ nọgidere na-adị ndụ ruo oge ụfọdụ. N’ezie, ka ọtụtụ afọ gasịrị, Ịlaịja degaara Jehoram, bụ́ eze Juda, akwụkwọ ozi.—2 Ihe E Mere 21:1, 12-15.
5:15, 16—N’ihi gịnị ka Ịlaịsha ji jụ ịnara onyinye Neeman? Ịlaịsha jụrụ onyinye ahụ n’ihi na ọ maara na ọgwụgwọ a gwọrọ Neeman n’ụzọ ọrụ ebube sitere n’ike Jehova, ọ bụghị n’ike nke ya. Ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ya iji ọrụ Chineke nyere ya nweta uru. Ndị na-efe ezi ofufe taa adịghị achọ inweta uru nke onwe ha site n’ozi ha na-ejere Jehova. Ha na-eburu n’obi ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”—Matiu 10:8.
5:18, 19—Neeman ọ̀ nọ na-arịọ ka a gbaghara ya maka ikere òkè n’ihe omume okpukpe? O doro anya na eze Siria emewo agadi, ike adịghịzikwa ya, ọ ghaghịkwa ịdabere n’ahụ́ Neeman ka ọ ghara ịda. Mgbe eze ahụ na-ehulata isi iji fee Rimon ofufe, Neeman na-emekwa otú ahụ. Otú ọ dị, ihe Neeman na-eme bụ iji mezuo iwu, nanị iji jigide eze ahụ ka ọ ghara ịda, ọ bụghị iji fee ofufe. Neeman nọ na-arịọ Jehova ka ọ gbaghara ya maka ịrụ ọrụ a dịịrị ya. N’ikwere ihe Neeman kwuru, Ịlaịsha gwara ya, sị: “Laa n’udo.”
Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:
1:13, 14. Ịmụta ihe site n’ikiri ihe ndị na-emenụ na iji obi umeala na-eme ihe pụrụ ichebe ndụ.
2:2, 4, 6. Ọ bụ ezie na Ịlaịsha abụwo oje ozi Ịlaịja ikekwe ruo afọ isii, o siri ọnwụ na ya agaghị ahapụ Ịlaịja. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke iguzosi ike n’ihe na ọbụbụenyi nke a bụ!—Ilu 18:24.
2:23, 24. O yiri ka isi ihe kpatara akaje a e mere Ịlaịsha ọ̀ bụ na nwoke nwere isi nkwọcha yi uwe ọrụ Ịlaịja. Ụmụaka ahụ ma na Ịlaịsha bụ onye nnọchianya Jehova, ha achọtụghịkwa ka ọ bịa n’ógbè ha. Ha gwara ya ka “ọ rịgoo,” nke pụtara, ka ọ gbagowe Betel ma ọ bụ ka e bulie ya dị ka e buliri Ịlaịja. Ihe àmà na-egosi na ụmụaka ahụ gosipụtara omume ịkpọasị nke ndị mụrụ ha nwere. Lee otú o si dị oké mkpa ka ndị mụrụ ụmụ kụziere ụmụ ha ịkwanyere ndị nnọchianya Chineke ùgwù!
3:14, 18, 24. Okwu Jehova na-emezu mgbe nile.
3:22. Anyanwụ chara n’isi ụtụtụ ahụ mere ka mmiri ahụ yie ọbara, ikekwe n’ihi na ájá dị n’olulu ahụ e gwuru ọhụrụ na-acha ọbara ọbara. Jehova pụrụ ịhọrọ iji ihe ndị na-emere onwe ha mezuo nzube ya.
4:8-11. Otu nwanyị Shunem lere Ịlaịsha ọbịa mgbe ọ matara na ọ bụ “onye dị nsọ nke Chineke.” Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị imere ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova ofufe otu ihe ahụ?
5:3. Nwa agbọghọ nta Izrel ahụ nwere okwukwe na Chineke nwere ikike ịrụ ọrụ ebube. O nwekwara obi ike ikwupụta okwukwe ya. Unu bụ́ ndị na-eto eto, ùnu na-agbalị ime ka okwukwe unu nwere ná nkwa ndị Chineke kwere sikwuo ike ma jiri obi ike na-agwa ndị nkụzi unu na ụmụ akwụkwọ ibe unu banyere eziokwu ahụ?
5:9-19. Ọ̀ bụ na ihe atụ Neeman adịghị egosi na onye dị mpako pụrụ ịmụta ịdị umeala n’obi?—1 Pita 5:5.
5:20-27. Lee nnọọ ihe ọjọọ na-esi n’ịgha ụgha apụta! Icheta obi mgbawa na ọdachi ibi ụdị ndụ abụọ pụrụ ịkpata ga-enyere anyị aka izere ụdị ndụ ahụ.
A DỌRỌ IZREL NA JUDA N’AGHA GAA MBA ỌZỌ
E tee Jihu mmanụ ịbụ eze Izrel. O gbughị oge n’ikpochapụ ezinụlọ Ehab. Jihu ejiri akọ “kpochapụ Bel n’Izrel.” (2 Ndị Eze 10:28) Mgbe Atalaịa, bụ́ nne Ehazaịa, nụrụ na Jihu egbuola nwa ya nwoke, bụ́ Ehazaịa, ‘ya ebilie ime ka mkpụrụ nile nke ndị nwe alaeze Juda laa n’iyi’ ma weghara ọchịchị n’ike. (2 Ndị Eze 11:1) E chebe nanị nwa nwoke Ehazaịa nke obere, bụ́ Jehoash, ma mgbe e zosịrị ya ruo afọ isii, e tee ya mmanụ ịbụ eze Juda. Jehoash anọgide na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova n’ihi na ọ bụ onye nchụàjà bụ́ Jehoịada na-enye ya ntụziaka.
Mgbe Jihu nwụsịrị, ndị eze nile ọzọ bụ́ ndị chịrị Izrel emee ihe ọjọọ n’anya Jehova. Ịlaịsha anwụọ n’udo n’oge ọchịchị nwa nwa Jihu. Eze nke anọ nke Juda na-eso Jehoash bụ Ehaz, ma “o meghị ihe ziri ezi n’anya Jehova.” (2 Ndị Eze 16:1, 2) Otú ọ dị, nwa ya nwoke bụ́ Hezekaịa abụrụ eze nke ‘nọgidere na-arapara Jehova n’ahụ́.’ (2 Ndị Eze 17:20; 18:6) Na 740 T.O.A., mgbe Hezekaịa bụ eze Juda, Hoshea ana-achịkwa Izrel, eze Asiria bụ́ Shalmanesa ‘ewere Sameria ma mee ka Izrel gaa biri n’Asiria.’ (2 Ndị Eze 17:6) Mgbe e mesịrị, a kpọbata ndị mba ọzọ n’ókèala Izrel, okpukpe ndị Sameria amalitekwa.
N’ime ndị eze asaa bụ́ ndị sochiri Hezekaịa na Juda, ọ bụ nanị Josaịa mere ihe iji kpochapụ ofufe ụgha n’ala ahụ. N’ikpeazụ, na 607 T.O.A., ndị Babilọn eweghara Jeruselem, ‘Juda esikwa n’ala ya jee biri n’ala ọzọ.’—2 Ndị Eze 25:21.
A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
13:20, 21—Ọrụ ebube a ọ̀ na-akwado ife ihe oyiyi okpukpe ofufe? Ee e, ọ dịghị akwado ya. Bible adịghị egosi na ọ dị mgbe e fere ọkpụkpụ Ịlaịsha ofufe. Ọrụ ebube a sitere n’ike Chineke, dịkwa ka ọrụ ebube nile Ịlaịsha rụrụ mgbe ọ ka dị ndụ.
15:1-6—N’ihi gịnị ka Jehova ji jiri ekpenta tie Azaraịa (Ụzaịa) ihe otiti? “Mgbe [Ụzaịa] dị ike, obi ya dị elu . . . , o wee mekpuo emekpu megide Jehova bụ́ Chineke ya; o wee baa n’ụlọukwu Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” Mgbe ndị nchụàjà ‘guzooro imegide Ụzaịa’ ma gwa ya ka “ọ pụọ n’ebe nsọ,” o kosara ndị nchụàjà ahụ ọnụma, e tikwara ya ekpenta.—2 Ihe E Mere 26:16-20.
18:19-21, 25—Hezekaịa ò sooro Ijipt jikọọ aka? Ee e. Ebubo Rabshake bụ ụgha, dịkwa ka nzọrọ ọ zọọrọ na ọ bụ ‘Jehova sịrị’ ya bịa bụ. Eze Hezekaịa kwesịrị ntụkwasị obi dabeere kpamkpam na Jehova.
Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:
9:7, 26. Ikpe dị ukwuu a mara ezinụlọ Ehab na-egosi na Jehova kpọrọ ofufe ụgha na ịkwafu ọbara nke onye aka ya dị ọcha asị.
9:20. Àgwà Jihu nke ịnya ụgbọ ịnyịnya ọkụ ọkụ na-egosi na o ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ e nyere ya. À maara gị dị ka onye nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi?—2 Timoti 4:2.
9:36, 37; 10:17; 13:18, 19, 25; 14:25; 19:20, 32-36; 20:16, 17; 24:13. Anyị pụrụ inwe obi ike na ‘okwu nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ga-enwerịrị ihe ịga nke ọma.’—Aịsaịa 55:10, 11.
10:15. Dị nnọọ ka Jehonadab ji obi ya nile nakwere òkù Jihu kpọrọ ya ịrịgota n’ụgbọala ya, “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-eji ọchịchọ obi akwado Jizọs Kraịst, bụ́ Jihu nke oge a, na ụmụazụ ya e tere mmanụ.—Mkpughe 7:9.
10:30, 31. Ọ bụ ezie na e dekọkwara ihe ndị na-adịghị mma Jihu mere, Jehova ji ihe nile o mere kpọrọ ihe. N’eziokwu, ‘Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ anyị.’—Ndị Hibru 6:10.
13:14-19. Ebe nwa nwa Jihu bụ́ Jehoash na-etinyeghị mgbali siri ike, kama tie akụ́ n’ala ugboro atọ nanị, o meriri ndị Siria nanị ugboro ole na ole. Jehova na-atụ anya ka anyị jiri obi anyị nile na ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ o nyere anyị.
20:2-6. Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.
24:3, 4. N’ihi ikpe ọbara mara Manase, Jehova ‘ekweghị agbaghara’ Juda. Chineke na-akwanyere ọbara nke onye aka ya dị ọcha ùgwù. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-abọ ọbọ ọbara nke onye aka ya dị ọcha site n’ibibi ndị kwafuru ọbara ahụ.—Abụ Ọma 37:9-11; 145:20.
Ọ Baara Anyị Uru
Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ kọwara Jehova dị ka Onye Na-emezu nkwa ndị o kwere. Ndọrọ a dọọrọ ndị bi n’alaeze abụọ ahụ, ndị Izrel nakwa ndị Juda, n’agha na-eme nnọọ ka anyị mara otú ikpe amụma ahụ e dekọrọ na Deuterọnọmi 28:15–29:28 si mezuo. Ndị Eze nke Abụọ kọwara Ịlaịsha dị ka onye amụma na-anụ ọkụ n’obi nke ukwuu maka aha Jehova na maka ezi ofufe. A kọwara Hezekaịa na Josaịa dị ka ndị eze dị umeala n’obi bụ́ ndị kwanyeere Iwu Chineke ùgwù.
Ka anyị na-atụgharị uche n’àgwà na n’omume nke ndị eze, ndị amụma na ndị ọzọ a kpọrọ aha ná Ndị Eze nke Abụọ, ọ̀ bụ na anyị adịghị amụta ihe ndị bara uru banyere ihe ndị anyị ga-achụso na ihe ndị anyị ga-ezere? (Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:11) Ee, “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]
ỌRỤ EBUBE NDỊ ỊLAỊSHA RỤRỤ
1. E mee ka mmiri Jọdan kewaa.—2 Ndị Eze 2:14
2. E mee ka mmiri ọjọọ nke Jeriko bụrụ ihe na-enye ezi ndụ.—2 Ndị Eze 2:19-22
3. Anụ ọhịa bea adọgbuo ụmụaka na-enupụ isi.—2 Ndị Eze 2:23, 24
4. E nye ndị agha mmiri.—2 Ndị Eze 3:16-26
5. Nwanyị di ya nwụrụ enweta mmanụ e ji esi nri.—2 Ndị Eze 4:1-7
6. Nwanyị àgà nke Shunem amụọ nwa.—2 Ndị Eze 4:8-17
7. A kpọlite otu nwatakịrị n’ọnwụ.—2 Ndị Eze 4:18-37
8. Ofe na-egbu egbu aghọọ nke a na-eri eri.—2 Ndị Eze 4:38-41
9. E jiri ogbe achịcha 20 zụọ otu narị ndị ikom.—2 Ndị Eze 4:42-44
10. A gwọọ Neeman ekpenta.—2 Ndị Eze 5:1-14
11. Ekpenta Neeman agbaa Gihezi n’ahụ́.—2 Ndị Eze 5:24-27
12. E mee ka isi anyụike see n’elu mmiri.—2 Ndị Eze 6:5-7
13. Oje ozi ahụ ụgbọala ọkụ nke ndị mmụọ ozi.—2 Ndị Eze 6:15-17
14. E mee ka ndị agha Siria kpuo ìsì.—2 Ndị Eze 6:18
15. E mee ka ndị agha Siria hụwakwa ụzọ.—2 Ndị Eze 6:19-23
16. Onye nwụrụ anwụ adịghachi ndụ.—2 Ndị Eze 13:20, 21
[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 12]
NDỊ EZE JUDA NA NDỊ NKE IZREL
Sọl/Devid/Solomọn: 1117/1077/1037 T.O.A. *
ALAEZE JUDA AFỌ (T.O.A.) ALAEZE IZREL
Rehoboam ․․ 997 ․․ Jeroboam
Abaịja/Esa ․․ 980/978 ․․
․․ 976/975/952 ․․ Nedab/Beasha/Ila
․․ 951/951/951 ․․ Zimri/Omri/Tibni
․․ 940 ․․ Ehab
Jehoshafat ․․ 937 ․․
․․ 920/917 ․․ Ehazaịa/Jehoram
Jehoram ․․ 913 ․․
Ehazaịa ․․ 906 ․․
(Atalaịa) ․․ 905 ․․ Jihu
Joash ․․ 898 ․․
․․ 876/859 ․․ Jehoahaz/Jehoash
Amazaịa ․․ 858 ․․
․․ 844 ․․ Jeroboam nke Abụọ
Azaraịa (Ụzaịa) ․․ 829 ․․
․․ 803/791/791 ․․ Zekaraịa/Shalum/Menahem
․․ 780/778 ․․ Pekahaịa/Peka
Jotam/Ehaz ․․ 777/762 ․․
․․ 758 ․․ Hoshea
Hezekaịa ․․ 746 ․․
․․ 740 ․․ E weghara Sameria
Manase/Emọn/Josaịa ․․ 716/661/659 ․․
Jehoahaz/Jehoiakim ․․ 628/628 ․․
Jehoiakin/Zedekaịa ․․ 618/617 ․․
E bibie Jeruselem ․․ 607 ․․
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 66 Afọ ụfọdụ na-egosi afọ e chere na ọ bụ mgbe ụfọdụ n’ime ha malitere ọchịchị.
Neeman wedatara onwe ya ala, a gwọkwara ya site n’ike Jehova
Gịnị mere Ịlaịja ka ọ ‘rịgooro eluigwe n’oké ifufe’?