Bible Pụrụ Inyere Gị Aka Inwe Ọṅụ
Bible Pụrụ Inyere Gị Aka Inwe Ọṅụ
Ọ BỤ ezie na Bible abụghị akwụkwọ ahụ́ ike, o kwuru otú mmetụta uche—nke ziri ezi ma ọ bụ nke na-ezighị ezi—pụrụ isi metụta uche na ahụ́ ike mmadụ. Bible na-ekwu, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ́ dị mma: ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu na-amịkọ ọkpụkpụ.” Ọzọkwa, anyị na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” (Ilu 17:22; 24:10) Nkụda mmụọ pụrụ ime ka anyị gharazie inwe ume, na-eme ka anyị daa mbà ma nọrọ n’ihe ize ndụ, n’enweghịkwa ọchịchọ ọ bụla ime mgbanwe ma ọ bụ chọọ enyemaka.
Nkụda mmụọ pụkwara imetụta ọnọdụ ime mmụọ mmadụ. Ndị na-eche na ha abaghị uru na-echekarị na ọ dịghị mgbe ha na Chineke ga-enwe ezi mmekọrịta nakwa na ha agaghị enweta ihu ọma ya. Simone, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ, ekwetaghị na ya bụ “ụdị onye ga-enwe ihu ọma Chineke.” Otú ọ dị, mgbe anyị lebara anya n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, anyị na-achọpụta na Chineke na-ele ndị na-agbalị ime ihe na-atọ ya ụtọ anya ọma.
Chineke Na-eche Banyere Gị n’Ezie
Bible na-agwa anyị na “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” Chineke adịghị eleda “obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa” anya, kama ọ na-ekwe nkwa “ime ka mmụọ nke ndị dị umeala n’obi dị ndụ, na ime ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ.”—Abụ Ọma 34:18; 51:17; Aịsaịa 57:15.
N’otu oge, Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, hụrụ na ọ dị mkpa ime ka ndị na-eso ụzọ ya mara eziokwu ahụ bụ́ na Chineke na-ahụ ebe ndị Matiu 10:29-31) * Jizọs gosiri na n’agbanyeghị ihe ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ịdị na-eche banyere onwe ha, Chineke na-eji ndị nwere okwukwe akpọrọ ihe. N’ezie, Pita onyeozi na-echetara anyị na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
ohu Ya na-emezi emezi. N’iji ihe atụ mee ihe, o kwuru na Chineke na-ahụ mgbe otu nza dara n’ala—ihe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ga-ele anya dị ka ihe na-adịchaghị mkpa. O mekwara ka ọ pụta ìhè na Chineke maara ihe ndị dịkarịsịrị nta banyere ụmụ mmadụ, ọbụna ntutu isi ole dị ha n’isi. Jizọs mechiri ihe atụ ya site n’ikwu, sị: “Ya mere unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi
Okwu Chineke na-agba anyị ume ile onwe anyị anya n’ụzọ ziri ezi. Pọl onyeozi dere site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Site n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke e nyere m, ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche; kama ka ọ na-eche echiche iji wee nwee uche zuru okè, onye ọ bụla dị ka Chineke kenyeworo ya ọ̀tụ̀tụ̀ nke okwukwe.”—Ndị Rom 12:3.
N’ezie, anyị ekwesịghị ile onwe anyị anya dị ka ndị dị oké mkpa nke na onwe anyị na-ebu anyị isi; anyị ekwesịghịkwa ileda onwe anyị anya gabiga ókè ma chee na anyị abaghị uru. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịgbalị inwe echiche ziri ezi banyere onwe anyị, marakwa ihe ndị anyị ga-emeli na ndị anyị na-agaghị emeli. Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst si otú a kwuo ya: “Abụghị m ekwensu; abụghịkwanụ m mmụọ ozi. E nwere ebe ndị m na-emezi, nweekwa ebe ndị m na-emejọ, otú ahụkwa ka ọ dị ndị ọzọ.”
N’ezie, inwe echiche ziri ezi dị otú ahụ adịghị mfe. Ọ pụrụ ịchọ itinye mgbalị siri ike iji wepụ echiche na-ezighị nnọọ ezi anyị nwere banyere onwe anyị bụ́ nke ọ pụrụ ịbụ na anyị zụlitewere kemgbe ọtụtụ afọ. Otú o sina dị, site n’enyemaka Chineke, anyị pụrụ ịgbanwe ụdị onye anyị bụ nakwa otú anyị si ele ndụ anya. N’ezie, nke a bụ ihe Okwu Chineke na-agba anyị ume ime. Anyị na-agụ, sị: “Yipụ ụdị mmadụ ochie ahụ bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga, bụrụkwa nke a na-emerụ dị ka ọchịchọ aghụghọ ya si dị; kama . . . [meenụ] ka unu dị ọhụrụ n’ikike nke na-akwali uche unu, ka unu wee yikwasịkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.”—Ndị Efesọs 4:22-24.
Site n’itinye mgbalị iji gbanwee ‘ikike nke na-akwali uche’ anyị, ya bụ, ọchịchọ bụ́ isi nke obi anyị, anyị pụrụ ịgbanwe ụdị mmadụ anyị nke na-adịghị nnọọ mma ịghọ nke dị mma. Lena, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ, bịara ghọta na ọ gwụla ma ya kwụsịrị iche na ọ dịghị onye pụrụ ịhụ ya n’anya ma ọ bụ nyere ya aka, ọ dịghị ihe ga-eme ka ya gbanwee otú ya si ele onwe ya anya. Olee ndụmọdụ dị irè dị na Bible nke nyeere Lena,
Simone, na ndị ọzọ aka ime mgbanwe ndị dị otú ahụ?Ụkpụrụ Bible Ndị Na-eme Ka E Nwee Ọṅụ
“Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) N’ụzọ bụ́ isi, ekpere pụrụ inyere anyị aka inwe ezi ọṅụ. Simone na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla m nwere nkụda mmụọ, ana m agakwuru Jehova n’ekpere ma rịọ ya maka enyemaka. Ọ dịbeghị ọnọdụ m nọrọ na ya ma ghara inweta ume na nduzi ọ na-enye.” Mgbe ọbụ abụ ahụ na-agba anyị ume ịtụkwasị Jehova ibu anyị, ọ na-echetara anyị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na ọ bụghị nanị na Jehova na-eche banyere anyị kamakwa ọ na-ele anyị anya dị ka ndị ruru eru inweta enyemaka na nkwado ya. N’abalị Ememe Ngabiga nke afọ 33 O.A., ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere mwute n’ihi ihe Jizọs kwuru banyere ọnwụ ya na-eru nso. Jizọs gbara ha ume ikpegara Nna ahụ ekpere, ma gbakwụnyezie, sị: “Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezu.”—Jọn 16:23, 24.
“A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Dị ka Jizọs kụziri, inye ihe bụ ihe bụ́ isi na-eweta ezi obi ụtọ ná ndụ. Itinye eziokwu a sitere na Bible n’ọrụ na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’igbo mkpa ndị ọzọ karịa ilekwasị anya n’erughị eru anyị. Mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka ma na-ahụ ka ha na-egosipụta ekele, anyị na-enwe obi ụtọ banyere onwe anyị. Lena kwetara na izi ndị agbata obi ya ozi ọma sitere na Bible mgbe mgbe na-enyere ya aka n’akụkụ abụọ. Ọ na-ekwu, sị: “Nke mbụ, ọ na-eme ka m nwee ụdị obi ụtọ na afọ ojuju ahụ Jizọs kwuru banyere ya. Nke abụọ, ndị ọzọ na-emesokwa m ihe n’ụzọ dị mma, bụ́ nke na-enyere m aka inwe ọṅụ.” Site n’iwepụta onwe anyị inyere ndị ọzọ aka, anyị ga-ahụ na ihe ahụ e kwuru n’Ilu 11:25 bụ eziokwu. Ọ na-asị: “Onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”
“Ụbọchị nile nke onye e wedara n’ala jọrọ njọ: ma onye obi ya dị mma na-eri oké oriri mgbe nile.” (Ilu 15:15) Anyị nile pụrụ ịhọrọ otú anyị ga-esi ele onwe anyị na ọnọdụ anyị anya. Anyị pụrụ ịdị ka onye na-ele ihe nile anya n’ụzọ na-ezighị ezi ma na-eche na e wedara ya n’ala, ma ọ bụkwanụ anyị pụrụ ịhọrọ inwe echiche ziri ezi, ‘obi ana-adị anyị mma,’ anyị ana-enwekwa ọṅụ dị ka à ga-asị na anyị na-eri oké oriri. Simone na-ekwu, sị: “Ana m agbalị ịdị na-enwe echiche ziri ezi ruo n’ókè o kwere mee. Ana m enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya ma na-aga ozi ubi mgbe nile, na-anọgidesikwa ike n’ekpere. Ana m agbalịkwa iso ndị na-enwe echiche ziri ezi akpakọrịta, ana m agbalịkwa inyere ndị ọzọ aka.” Àgwà dị otú ahụ na-eweta ezi ọṅụ, dị nnọọ ka Bible na-agba anyị ume, sị: “Ṅụrịanụ ọṅụ na Jehova, tegharịakwanụ egwú ọṅụ, unu ndị ezi omume: tiekwanụ mkpu ọṅụ, unu nile ndị ziri ezi n’obi.”—Abụ Ọma 32:11.
“Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” (Ilu 17:17) Ịkọrọ onye anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ onye anyị tụkwasịrị obi nsogbu anyị pụrụ inyere anyị aka ịlụso echiche na-ezighị ezi ọgụ ma wepụ ya n’obi anyị tupu ya erikpuo anyị. Ịkọrọ ya ndị ọzọ pụrụ inyere anyị aka ile ihe anya n’ụzọ ziri nnọọ ezi. Simone kwetara, sị: “Ịkọrọ ndị ọzọ nsogbu gị na-enye aka nke ukwuu. Ọ dị mkpa ka ị kọọrọ onye ọzọ mmetụta ị na-enwe. Mgbe mgbe, nanị ihe dị gị mkpa ime bụ ịkọrọ ya onye ọzọ.” Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịhụta eziokwu dị n’ilu ahụ na-asị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.”—Ilu 12:25.
Ihe Ị Pụrụ Ime
Anyị atụlewo nanị ole na ole n’ime ọtụtụ ụkpụrụ Bible ndị magburu onwe ha ma dị irè, bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka ịkwụsị inwe echiche na-ezighị ezi na inwe ezi obi ụtọ. Ọ bụrụ na i so ná ndị ha na mmetụta nke ịbụ ndị na-erughị eru na-alụ, anyị na-agba gị ume inyochakwu Okwu Chineke, bụ́ Bible. Mụta ịhụ onwe gị otú ị dị n’ezie na inwekwu echiche ziri ezi banyere onwe gị nakwa banyere mmekọrịta gị na Chineke. Anyị nwere olileanya na site ná nduzi sitere n’Okwu Chineke, ị ga-enweta ezigbo ọṅụ n’ihe nile ị na-eme.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 A tụlere akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n’ụzọ zuru ezu na peeji nke 22 na nke 23.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible na-eme ka e nwee ọṅụ