Ịchọ Ndị Kwesịrị Ekwesị n’Ógbè Dịpụrụ Adịpụ nke Australia
Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ịchọ Ndị Kwesịrị Ekwesị n’Ógbè Dịpụrụ Adịpụ nke Australia
NDỊ nwere mmasị n’otu akụkụ buru ibu nke ime obodo Australia na-akpọ ya ógbè dịpụrụ adịpụ. A gbabeghị àmà n’akụkụ ụfọdụ nke ógbè a dịpụrụ adịpụ kemgbe afọ 12. N’ihi ya Ndịàmà Jehova bi na Darwin, bụ́ isi obodo nke Northern Territory nke Australia, mere ndokwa maka mkpọsa zuru ezu ga-ewe ụbọchị itoolu iji chọpụta ndị kwesịrị ekwesị.—Matiu 10:11.
Ihe dị ka ọnwa 12 tupu oge mkpọsa ahụ, e ji nlezianya malite ime atụmatụ ya, gụnyere ise map nke ihe karịrị narị puku square kilomita asatọ—ógbè karịrị obodo New Zealand okpukpu atọ. Iji ghọtatụ otú ókèala a dịpụrụ adịpụ bururu n’ibu, buru n’uche na ọnụ ụzọ ámá nke ụlọ ndị dị n’ebe a na-azụ ehi na-adịkarị kilomita 30 site n’okporo ụzọ ruo n’ụlọ ahụ! Ọzọkwa, ebe ụfọdụ a na-azụ ehi dị ihe dị ka iri kilomita atọ site n’ibe ha.
Ngụkọta nke otu narị Ndịàmà na iri anọ na ise bụ́ ndị wepụtara onwe ha n’afọ ofufo keere òkè ná mkpọsa ahụ. Ụfọdụ sitere n’ebe dị nnọọ anya dị ka Tasmania bịa. Ụfọdụ ji ụgbọala jip bụ́ ndị a kwajuru ngwá ndị e ji ama ụlọikwuu, akụkụ ahụ́ ụgbọala na mmanụ ụgbọala bịa. Ndị ọzọ kwanyere ngwongwo ha n’ime ụlọ ndị e ji ụgbọala adọkpụ. Ọzọkwa, a natara ụgbọala bọs abụọ nke na-ebu mmadụ 22 ná ngo iji buru ndị na-enweghị ụgbọala jip kwesịrị ekwesị. Ndị ji bọs lekwasịrị anya n’ikwusara ndị bi n’obodo nta ndị dị n’ókèala ụfọdụ ozi ọma.
Tupu ha amalite njem, ụmụnna mere ndokwa maka okwu na ihe ngosi iji nye nduzi banyere otú a ga-esi kwusaa ozi ọma n’ókèala a pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, ikwusa ozi ọma n’ụzọ dị irè n’ógbè ndị Aborigine na-achọkarị ịgbaso ụkpụrụ ụfọdụ na ịma omenala ndị Aborigine. E kwurịtakwara ihe ndị metụtara ichebe ógbè iji nye aka chebe anụ ndị bi n’ọhịa.
E nwekwara ọtụtụ ahụmahụ ndị pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, n’otu ógbè nke ndị Aborigine, ụmụnna mere ndokwa ikwu okwu ihu ọha dabeere na Bible. Nwanyị bụ́ onyeisi n’ógbè ahụ jiri aka ya gakwuru Mak 12:30, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ị ghaghị iji obi gị dum, hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” O kwuru, sị: “Enwere m nnọọ mmasị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ.” Ka e sosịrị ya nwee mkparịta ụka were ogologo oge nke dabeere na Bible, ọ naara otu Bible ọhụrụ na akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible.
ndị mmadụ iji gwa ha banyere okwu ihu ọha ahụ. Mgbe e mesịrị, e nyefere ndị gere okwu ihu ọha ahụ akwụkwọ 5 na broshuọ 41. N’ógbè ọzọ, a kpọtụụrụ otu onye Aborigine. O nwedịrị Bible nke ya, Bible King James Version, ma o meela ochie ma dọkasịa adọkasịa. Mgbe a jụrụ ya ma ọ maara aha Chineke, ọ zara ee ma wepụta otu mbipụta Ụlọ Nche merela ochie. Ọ gụpụtara ihe dị na magazin ahụ, na-ehotaNa nso Ọwara Oké Osimiri Carpentaria, onyeisi nke ebe a na-azụ ehi nke dị narị puku hekta anọ gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Mgbe e gosiri ya mbipụta ndị bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible na Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, * ọ jụrụ ma è nwere akwụkwọ n’asụsụ Kriol. Nke a bụ ihe a na-adịghị ahụkebe n’ihi na ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị Aborigine na-asụ asụsụ Kriol, ọ bụ mmadụ ole na ole pụrụ ịgụ ya. A chọpụtara na ndị ọrụ 50 nile nọ n’ebe ahụ a na-azụ ehi pụrụ ịgụ asụsụ Kriol. Onyeisi ahụ nwere obi ụtọ inweta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’asụsụ Kriol ma jiri ọṅụ nye nọmba telifon ya ka e wee nwee ike kpọtụrụ ya.
N’ime ụbọchị itoolu ahụ e ji gbaa àmà zuru ezu, e nyefere otu narị na iri Bible abụọ, narị akwụkwọ asaa na iri asaa, narị magazin asaa na ise na otu puku na narị broshuọ itoolu na iri isii na ise, ná ngụkọta. Tụkwasị na nke a, e mere narị asaa na iri nletaghachi abụọ, duziekwa narị ọmụmụ Bible abụọ na iri na ise.
N’ezie, e mechaala na-egbo agụụ ime mmụọ nke ọtụtụ ndị kwesịrị ekwesị bụ́ ndị gbasara n’ógbè a buru ibu.—Matiu 5:6.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Map dị na peeji 30]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
AUSTRALIA
NORTHERN TERRITORY
Darwin
Ọwara Oké Osimiri Carpentaria
Sydney
TASMANIA