“Na-elenụ Ibe Unu Ọbịa”
“Na-elenụ Ibe Unu Ọbịa”
FIBI, bụ́ Onye Kraịst nke narị afọ mbụ, nwere otu nsogbu. Ọ na-eme njem site na Senkrea, nke dị na Gris, na-aga Rom, ma ọ maghị ndị kwere ekwe ibe ya bi n’obodo ahụ. (Ndị Rom 16:1, 2) “Ụwa ndị Rom [nke oge ahụ] jọrọ njọ ma nwee obi ịta mmiri,” ka onye nsụgharị Bible bụ́ Edgar Goodspeed na-ekwu, “n’ihi aha ọjọọ ụlọ ndị njem nwere, o yikwaghị ebe kwesịrị ekwesị maka nwanyị na-akpa ezi àgwà, karịsịa nwanyị bụ́ Onye Kraịst.” N’ihi ya, ebee ka Fibi ga-ehi?
Ndị mmadụ mere ọtụtụ njem n’oge Bible. Jizọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya mere otú ahụ iji kwusaa ozi ọma na Judia na Galili dum. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi ala ọzọ dị ka Pọl ji ozi ahụ na-aga n’ebe dị iche iche n’ógbè Mediterenian, gụnyere Rom, bụ́ isi obodo Alaeze Ukwu Rom. Mgbe Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere njem, ma ọ bụ n’ókèala ndị Juu ma ọ bụ n’ebe ọzọ, ebee ka ha hiri? Nsogbu ndị dị aṅaa ka ha chere ihu n’ịchọta ebe ihi ụra? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka ha n’ihe banyere ile ọbịa?
“Aghaghị M Ịnọ n’Ụlọ Gị Taa”
Ile ọbịa pụtara iji mmesapụ aka anabata ndị ọbịa nke ọma, ọ dịwokwa anya ọ bụ àgwà e ji mara ezi ndị na-efe Jehova ofufe. Dị ka ihe atụ, Ebreham, Lọt na Ribeka lechara ndị ọzọ ọbịa. (Jenesis 18:1-8; 19:1-3; 24:17-20) N’icheta àgwà ya n’ebe ndị ọbịa nọ, nna ochie bụ́ Job kwuru, sị: “Ọ bụghị n’èzí ka ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị; ana m emeghe ọnụ ụzọ m n’ebe ụzọ ámá dị.”—Job 31:32.
Mgbe mgbe nanị ihe ndị njem na-eme iji mee ka ndị Izrel ibe ha lee ha ọbịa bụ ịnọ n’ámá obodo ma chere ka a kpọbata ha. (Ndị Ikpe 19:15-21) Ndị ndị ọbịa bịara na nke ha na-asakarị ụkwụ ndị ọbịa ha ma nye ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, nyekwa anụ ụlọ ha nri. (Jenesis 18:4, 5; 19:2; 24:32, 33) Ndị njem na-achọghị ịghọrọ ndị ha bịara na nke ha ibu arọ na-ewere ihe ndị dị ha mkpa—achịcha na mmanya maka onwe ha na nri anụ ụlọ maka anụ ụlọ ha. Nanị ihe ha ga-achọ bụ ebe ha ga-ehi.
Ọ bụ ezie na Bible adịghị ekwukarị kpọmkwem ebe Jizọs hiri na njem nkwusa ya, ya na ndị eso ụzọ ya aghaghị inwe ebe ha na-ehi. (Luk 9:58) Mgbe ọ na-aga Jeriko, nanị ihe Jizọs gwara Zakịọs bụ: “Aghaghị m ịnọ n’ụlọ gị taa.” Zakịọs “jiri ọṅụ” nabata onye ọbịa ya. (Luk 19:5, 6) Jizọs nọrọ mgbe mgbe n’ụlọ ndị enyi ya bụ́ Mata, Meri na Lazarọs na Betani. (Luk 10:38; Jọn 11:1, 5, 18) O yikwara ka Jizọs ọ̀ nọrọ n’ụlọ Saịmọn Pita na Kapaniọm.—Mak 1:21, 29-35.
Ntụziaka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ 12 ya banyere ime nkwusa na-ekpughe ọtụtụ ihe banyere ụdị nnabata ha pụrụ ịtụ anya ya n’Izrel. Jizọs gwara ha, sị: “Unu ewerela ọlaedo ma ọ bụ Matiu 10:9-11) Ọ maara na ndị obi ha ziri ezi ga-akpọbata ndị na-eso ụzọ ya, nye ha nri, ebe ihi ụra na ihe ndị ọzọ dị mkpa.
ọlaọcha ma ọ bụ ọla kọpa iji tinye n’obere akpa nke ihe okike unu, ma ọ bụ obere akpa nri maka njem unu, ma ọ bụ uwe ime abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ ma ọ bụ mkpara; n’ihi na onye ọrụ kwesịrị nri ya. N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu na-abanye, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya, nọrọkwanụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu ga-apụ.” (Otú ọ dị, oge na-abịa mgbe ndị na-eme njem nkwusa ozi ọma na-aghaghị ilekọta onwe ha ma kwụọ ụgwọ mmefu ha. N’ihi iro a ga-ebuso ụmụazụ ya n’ọdịnihu na ọrụ nkwusa ahụ ịgbasa banye n’ebe ndị na-abụghị Izrel, Jizọs kwuru, sị: “Ka onye nke nwere obere akpa ego were ya, ya werekwa obere akpa nri.” (Luk 22:36) Ime njem na ịchọta ebe a ga-ehi ga-adị ezigbo mkpa n’ịgbasa ozi ọma ahụ.
“Na-agbasonụ Omume nke Ile Ọbịa”
Udo a kpaara ókè na ọtụtụ okporo ụzọ a wụrụ awụ e nwere n’Alaeze Ukwu Rom nile na narị afọ mbụ mere ka ọtụtụ ndị na-eme njem. * N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị na-eme njem, e nwere mkpa nke ebe ihi ụra. Ụlọ ndị njem e nwere n’okporo ụzọ ndị bụ́ isi, bụ́ ndị ji ihe dị ka njem otu ụbọchị dị anya site n’ibe ha, mere ka e nwee ebe ihi ụra. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ The Book of Acts in Its Graeco-Roman Setting na-ekwu, sị: “Ihe akwụkwọ dị iche iche na-ekwu banyere ebe ndị ahụ adịghị enye obi ụtọ. Akwụkwọ na ihe ndị e gwutere n’ala n’ozuzu na-egosi na ihe ndị e nwere n’ebe ahụ bụ ụlọ ndị na-adakasị adakasị na ndị na-adịghị ọcha, a naghị edozi ụlọ ndị ahụ edozi, e nwekwara chịnchị, nri na ihe ọṅụṅụ ndị na-adịghị mma, ndị nlekọta ụlọ na ndị ọrụ a na-apụghị ịtụkwasị obi, ndị ọbịa na-akpa àgwà ọjọọ, na ụkpụrụ omume na-adịkarị ala n’ebe ndị ahụ.” N’ụzọ kwere nghọta, onye njem nwere ezi àgwà ga-ezere ụlọ ndị ọbịa ndị dị otú ahụ mgbe ọ bụla o nwere ike ime otú ahụ.
Ka a sịkwanụ ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji gbaa Ndị Kraịst ume mgbe mgbe ịdị na-ele ndị ọzọ ọbịa. Pọl dọrọ Ndị Kraịst nọ na Rom aka ná ntị, sị: “Ka unu na ndị nsọ na-ekerịta ihe dị ka mkpa ha si dị. Na-agbasonụ omume nke ile ọbịa.” (Ndị Rom 12:13) O chetaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu, sị: “Unu echefula ile ọbịa, n’ihi na site na ya ụfọdụ, n’amaghị ama, lere ndị mmụọ ozi ọbịa.” (Ndị Hibru 13:2) Pita dọkwara ndị ya na ha na-efekọ ofufe aka ná ntị ịdị ‘na-ele ibe ha ọbịa n’emeghị ntakwuri.’—1 Pita 4:9.
Otú ọ dị, e nwere ọnọdụ ndị ọ na-agaghị ekwesị ekwesị ile ọbịa na ha. Banyere “onye ọ bụla nke na-agbaga n’ihu ma ghara ịnọgide n’ozizi nke Kraịst,” Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ya adịla mgbe unu ga-anabata ya n’ebe obibi unu ma ọ bụ kelee ya. N’ihi na onye kelere ya bụ onye na-ekere òkè n’ajọ ọrụ ya.” (2 Jọn 9-11) Banyere ndị mmehie na-enweghị nchegharị, Pọl dere, sị: “Ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ọbụna unu na onye dị otú a erikọla ihe.”—1 Ndị Kọrint 5:11.
Ọ ghaghị ịbụ na ndị nduhie na ndị ọzọ nwara irigbu ezi Ndị Kraịst n’ihi obiọma ha. Ihe odide narị afọ nke abụọ O.A., nke na-adabereghị na Bible nke na-ekwu banyere okpukpe Ndị Kraịst bụ́ nke a maara dị ka The Didache, ma ọ bụ Teaching of the Twelve Apostles, na-atụ aro ka e lekọta onye nkwusa na-ejegharị ejegharị “otu ụbọchị, ma ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.” Mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe ọ na-ala, “ya anarakwala ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga achịcha . . . Ọ bụrụ na ọ sị ka e nye ya ego, ọ bụ onye amụma ụgha.” Ihe odide ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ọ chọọ ibi n’etiti unu, ya abụrụkwa na o nwere aka ọrụ, ya kpara ihe ọ ga-eri. Ma ọ bụrụ na o nweghị aka ọrụ nyenụ ya ihe
ndị unu maara na-akpa ya, ka e wee ghara inwe onye bi n’etiti unu na-anọ nkịtị n’ihi na ọ bụ Onye Kraịst. Ọ bụrụ na ọ gaghị eme otú ahụ, o ji Kraịst agba mgbere; kpacharanụ anya n’ebe onye dị otú ahụ nọ.”Pọl onyeozi leziri anya ka ọ ghara ibo ndị lere ya ọbịa mgbe ọ nọrọ ogologo oge n’obodo dị iche iche ibu arọ. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-akpa ákwà ụlọikwuu iji lekọta onwe ya. (Ọrụ 18:1-3; 2 Ndị Tesalonaịka 3:7-12) Iji nyere ndị kwesịrị ekwesị nọ n’etiti ha bụ́ ndị na-eme njem aka, o yiri ka Ndị Kraịst oge mbụ hà jiri akwụkwọ ozi kọwaa ha, dị ka nkọwa Pọl kọwara Fibi. “Ana m akọwara unu nwanna anyị nwanyị bụ́ Fibi,” ka Pọl dere, “ka unu wee nabata ya n’ime Onyenwe anyị . . . nakwa ka unu wee nyere ya aka n’ihe ọ bụla nke unu pụrụ ịdị ya mkpa.”—Ndị Rom 16:1, 2.
Ngọzi Ndị Na-abịa Site n’Ịbụ Ndị Na-ele Ọbịa
Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị ozi ala ọzọ tụkwasịrị Jehova obi inye ha ihe nile na-akpa ha. Ma hà pụrụ ịtụ anya ịbụ ndị ndị kwere ekwe ibe ha ga-ele ọbịa? Lidia nyere Pọl na ndị ọzọ ụlọ ya. Onyeozi ahụ nọkwara n’ụlọ Akwịla na Prisila na Kọrint. Otu onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ nyere Pọl na Saịlas ihe oriri na Filipaị. Jesin lere Pọl ọbịa na Tesalonaịka, Filip elee ya na Sesaria, ebe Minesin lere ya ọbịa n’okporo ụzọ sitere Sesaria gaa Jeruselem. Mgbe ọ na-aga Rom, ụmụnna ndị bi na Putiolaị lere Pọl ọbịa. Lee ihe na-akwụghachi ụgwọ n’ụzọ ime mmụọ oge ndị a na-aghaghị ịbụworo ndị lere ya ọbịa!—Ọrụ 16:33, 34; 17:7; 18:1-3; 21:8, 16; 28:13, 14.
Ọkà mmụta bụ́ Frederick F. Bruce kwuru, sị: “Ndị enyi na ndị ọrụ ibe Pọl ndị a, ndị lere ya ọbịa, adịghị ihe ọzọ kpaliri ha inyere ya aka otú ahụ ma e wezụga ịhụnanya ha nwere maka Pọl na Onyenwe ya bụ́ onye ọ na-ejere ozi. Ha maara na mgbe ha na-ejere Pọl ozi ha na-ejere Onyenwe ya ozi.” Nke a bụ ihe magburu onwe ya kwesịrị ịkpali mmadụ ile ọbịa.
A ka nwere mkpa nke ile ọbịa. Ọtụtụ puku ndị nnọchianya na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova bụ ndị ndị kwere ekwe ibe ha na-ele ọbịa. Ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze na-eji ego akpa ha eme njem iji hụ na ozi ọma ahụ ruru ebe ndị a na-adịghị emekarị nkwusa. Anyị na-erite uru dị ukwuu site n’ịnabata ndị dị otú ahụ n’ebe obibi anyị, n’agbanyeghị otú ọ dịruru ala. Ile ọbịa sitere n’obi nke pụrụ ịbụ nanị inye ihe oriri na-efughị oké ego na-enye ohere magburu onwe ya maka ‘mgbarịta ume’ na igosi ịhụnanya maka ụmụnna anyị na Chineke anyị. (Ndị Rom 1:11, 12) Oge ndị dị otú ahụ na-abụ ihe na-akwụghachi ụgwọ karịsịa nye ndị lere ọbịa, n’ihi na “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 E mere atụmatụ na ka ọ na-erule n’afọ 100 O.A., e nwere ihe dị ka iri puku kilomita asatọ nke okporo ụzọ ndị Rom a wụrụ awụ.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị Kraịst ‘na-agbaso omume nke ile ọbịa’