Jehova Bụ Onye Inyeaka Anyị
Jehova Bụ Onye Inyeaka Anyị
“Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa, onye meworo eluigwe na ụwa.”—ABỤ ỌMA 121:2.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na enyemaka na-adị anyị nile mkpa mgbe ụfọdụ? (b) Ụdị Onye Inyeaka dị aṅaa ka Jehova bụ?
ÒNYE n’ime anyị ka enyemaka na-adịtụbeghị mkpa? Nke bụ́ eziokwu bụ na enyemaka na-adị anyị nile mkpa mgbe ụfọdụ—iji nagide nsogbu ndị siri ike, iji die mfu na-agbawa obi, iji tachie obi n’ule tara akpụ. Mgbe enyemaka dị ndị mmadụ mkpa, ha na-agakwurukarị enyi na-eche banyere ha. Ịkọrọ enyi dị otú ahụ nsogbu ahụ pụrụ ime ka ọ dị mfe nnagide. Ma a kpaara ihe mmadụ ibe anyị pụrụ ime iji nyere anyị aka ókè. E wezụga nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ bụghị mgbe nile ka ndị ọzọ ga-anọ n’ọnọdụ inyere anyị aka mgbe enyemaka dị anyị mkpa.
2 Otú ọ dị, e nwere Onye Inyeaka nwere ike na ihe enyemaka na-adịghị agwụ agwụ. Ọzọkwa, ọ na-emesi anyị obi ike na ya agatụghị agbahapụ anyị. Ọ bụ Ya ka ọbụ abụ ahụ kpọrọ aha mgbe o ji obi ike kwuo, sị: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.” (Abụ Ọma 121:2) Gịnị mere ọbụ abụ a ji kwenyesie ike na Jehova ga-enyere ya aka? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee Abụ Ọma nke 121. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịhụ ihe mere anyị onwe anyị kwa pụrụ iji legara Jehova anya dị ka Onye Inyeaka anyị.
Isi Iyi Na-adịghị Ata Ata nke Enyemaka
3. Olee ugwu ọ pụrụ ịbụ na ọbụ abụ ahụ weliri anya lee, n’ihi gịnịkwa?
3 Ọbụ abụ ahụ malitere site n’ịrụtụ aka n’ịbụ onye okike nke Jehova dị ka ihe ndabere maka obi ike: “M ga-eweli anya m abụọ lee ugwu nile: Olee ebe inyeaka m ga-esi bịa? Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa, onye meworo eluigwe na ụwa.” (Abụ Ọma 121:1, 2) Ọ bụghị nnọọ ugwu ọ bụla ka ọbụ abụ ahụ weliri anya lee. Mgbe e dekọrọ okwu ndị a, ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem. Obodo ahụ, nke dị n’elu ugwu Juda, bụ ebe obibi ihe atụ nke Jehova. (Abụ Ọma 135:21) Ọ pụrụ ịbụ na ọbụ abụ ahụ weliri anya lee ugwu Jeruselem bụ́ ebe e wuru ụlọ nsọ Jehova, jiri obi ike na-elegara Jehova anya maka enyemaka. N’ihi gịnị ka ọbụ abụ ahụ ji nnọọ jide n’aka na Jehova pụrụ inyere ya aka? Ọ bụ n’ihi na Ọ bụ “onye meworo eluigwe na ụwa.” Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọbụ abụ na-ekwu, sị, ‘N’ezie, ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Onye Okike nwere ike nile inyere m aka!’—Aịsaịa 40:26.
4. Olee otú ọbụ abụ ahụ si gosi na Jehova mụ anya mgbe nile igbo mkpa nke ndị ya, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji bụrụ ihe na-akasi obi?
4 Ọbụ abụ ahụ kọwakwara na Jehova mụ anya mgbe nile igbo mkpa nke ndị ohu ya: Abụ Ọma 121:3, 4) Chineke apụghị ikwe ka ‘e wezụga ụkwụ ndị na-atụkwasị ya obi n’ọnọdụ ha’ ma ọ bụ ka ha daa ada ha na-apụghị isi na ya bilie. (Ilu 24:16) N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova dị ka onye ọzụzụ atụrụ mụ nnọọ anya nke na-eche atụrụ ya nche. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe na-akasi obi? Ọ dịtụghị mgbe ọ ga-eleghara mkpa nke ndị ya anya. Ọ na-eche ha nche ehihie na abalị.
“Ya ekwela ka e wezụga ụkwụ gị n’ọnọdụ ya: onye na-edebe gị, Ya atụla oru ụra. Lee, Ọ dịghị atụ oru ụra, Ọ dịghị arahụkwa ụra, bụ́ Onye na-edebe Izrel.” (5. N’ihi gịnị ka e ji kwuo na Jehova nọ “n’aka nri”?
5 N’inwe obi ike na Jehova bụ Onye Nchebe na-eguzosi ike n’ihe nke ndị ya, ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Jehova bụ Onye na-edebe gị: Jehova bụ ndò gị n’aka nri gị. Anyanwụ agaghị etigbu gị n’ehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị n’abalị.” (Abụ Ọma 121:5, 6) Nye onye ji ụkwụ eme njem n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ebe dị ndò ga-abụrụ ya ebe nchebe pụọ n’oké anwụ. Jehova dị ka ndò nye ndị ya, na-echebe ha pụọ n’oké ọdachi. Rịba ama na e kwuru na Jehova nọ “n’aka nri.” N’agha oge ochie, ọta bụ́ nke onye agha na-ebu n’aka ekpe ya, adịghị echebecha aka nri ya. Enyi na-eguzosi ike n’ihe pụrụ ichebe onye agha ahụ site n’iguzo n’aka nri ya na-alụ agha. Dị ka enyi dị otú ahụ, Jehova ji iguzosi ike n’ihe na-eguzo n’akụkụ ndị na-efe ya ofufe, na-adị njikere mgbe nile inyere ha aka.
6, 7. (a) Olee otú ọbụ abụ ahụ si mesie anyị obi ike na ọ dịghị mgbe Jehova ga-akwụsị inyere ndị ya aka? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike dị ka ọbụ abụ ahụ?
6 Ọ̀ dị mgbe Jehova ga-akwụsị inyere ndị ya aka? A pụghị ichetụ nke ahụ n’echiche. Ọbụ abụ ahụ ji okwu ndị a mechie: “Jehova ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ịdakwasị gị; Ọ ga-edebe mkpụrụ obi gị. Jehova ga-edebe ọpụpụ gị na mbata gị, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 121:7, 8) Rịba ama na onye dere abụ ọma a gbanwere site n’ikwu ihe ndị na-eme mgbe ahụ gaa n’ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’amaokwu nke 5, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: ‘Jehova bụ Onye na-edebe gị.’ Ma n’amaokwu ndị a, ọbụ abụ ahụ dere, sị: ‘Jehova ga-edebe gị.’ E si otú a na-emesi ndị na-efe ezi ofufe obi ike na enyemaka Jehova ga-adịgide. N’agbanyeghị ebe ha na-aga, n’agbanyeghị ọdachi ha na-eche ihu, ọ dịtụghị mgbe ọ ga-akwụsị inyere ha aka.—Ilu 12:21.
7 N’ezie, onye dere Abụ Ọma nke 121 nwere obi ike na Onye Okike pụrụ ime ihe nile na-eji ịdị nro eche ndị ohu ya nche dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya na onye nche mụ anya. Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike dị ka ọbụ abụ ahụ, n’ihi na Jehova adịghị agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) Nke a ọ̀ pụtara na a ga na-echebe anyị n’ụzọ nkịtị mgbe nile? Ee e, ma ọ bụrụhaala na anyị na-elegara ya anya dị ka Onye Inyeaka anyị, ọ ga-echebe anyị pụọ n’ihe nile pụrụ imerụ anyị ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. O kwesịrị nnọọ ekwesị ịjụ, sị, ‘Olee otú Jehova si enyere anyị aka?’ Ka anyị nyochaa ụzọ anọ o si enyere anyị aka. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú o si nyere ndị ohu ya aka n’oge Bible. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú o si enyere ndị ya aka n’oge a.
Enyemaka Site n’Aka Ndị Mmụọ Ozi
8. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na ndị mmụọ ozi nwere mmasị dị ukwuu n’ọdịmma nke ndị ohu Chineke nọ n’ụwa?
8 Jehova nwere nde kwuru nde ndị mmụọ ozi ọ na-achịkwa. (Daniel 7:9, 10) Ụmụ ya ndị a bụ́ mmụọ na-eji ikwesị ntụkwasị obi eme uche ya. (Abụ Ọma 103:20) Ha maara nke ọma na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ na-efe ya ofufe n’anya nke ukwuu nakwa na ọ na-achọ inyere ha aka. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmụọ ozi nwere mmasị dị ukwuu n’ọdịmma nke ndị ohu Chineke nọ n’ụwa. (Luk 15:10) Mgbe ahụ, ndị mmụọ ozi aghaghị inwe obi ụtọ n’ezie na Jehova na-eji ha eme ihe iji nyere ụmụ mmadụ aka. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si jiri ndị mmụọ ozi mee ihe inyere ndị ohu ya bụ́ ụmụ mmadụ aka n’oge ochie?
9. Nye ihe atụ nke otú Chineke si nye ndị mmụọ ozi ike ichebe ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi.
Jenesis 19:1, 15-17) Otu mmụọ ozi gburu narị na iri puku ndị agha Asiria asatọ na ise bụ́ ndị nọ na-eyi Jeruselem egwu. (2 Ndị Eze 19:35) Mgbe a tụbara Daniel n’olulu ọdụm, Jehova ‘zitere mmụọ ozi Ya, wee kpuchite ọnụ ọdụm.’ (Daniel 6:21, 22) Otu mmụọ ozi tọhapụrụ Pita onyeozi n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 12:6-11) Bible kwuru banyere ọtụtụ ihe atụ ndị ọzọ nke nchebe sitere n’aka ndị mmụọ ozi, na-akwado ihe e kwuru n’Abụ Ọma 34:7: “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.”
9 Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ichebe na ịnapụta ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ndị mmụọ ozi abụọ nyeere Lọt na ụmụ ya aka ịgbanahụ mbibi nke Sọdọm na Gọmọra. (10. Olee otú Jehova si jiri mmụọ ozi gbaa Daniel onye amụma ume?
10 Mgbe ụfọdụ, Jehova jiri ndị mmụọ ozi mee ihe iji gbaa ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ume ma wusie ha ike. A na-ahụ ihe atụ na-emetụ n’ahụ́ nke otú o si mee nke a na Daniel isi 10. N’oge ahụ, ma eleghị anya Daniel fọrọ nta ka o ruo 100 afọ. Onye amụma ahụ nwere nkụda mmụọ, ikekwe n’ihi ọnọdụ ịtọgbọrọ n’efu nke Jeruselem na oge a na-egbu n’iwughachi ụlọ nsọ ya. Egwu tụkwara ya mgbe ọ hụsịrị ọhụụ na-emenye ụjọ. (Daniel 10:2, 3, 8) Chineke ji ịhụnanya zipụ otu mmụọ ozi ịgba ya ume. Mmụọ ozi ahụ chetaara Daniel ihe karịrị otu ugboro na ọ bụ “ihe a na-achọsi ike” n’anya Chineke. Gịnị si na ya pụta? Onye amụma ahụ meworo agadi gwara mmụọ ozi ahụ, sị: “I mewo ka m dị ike.”—Daniel 10:11, 19.
11. Olee otu ihe atụ nke otú e si jiri ndị mmụọ ozi mee ihe n’iduzi ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ?
11 Jehova jikwa ndị mmụọ ozi mee ihe n’iduzi ọrụ nkwusa nke ozi ọma ahụ. Otu mmụọ ozi duziri Filip ikwusara otu ọnaozi Etiopia ozi ọma banyere Kraịst, e mekwara ọnaozi ahụ baptizim ka nke ahụ gasịrị. (Ọrụ 8:26, 27, 36, 38) Obere oge ka e mesịrị, Chineke chọrọ ka e kwusaara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ozi ọma ahụ. N’ọhụụ, Kọniliọs, bụ́ onye Jentaịl na-efe Chineke, hụrụ otu mmụọ ozi nke gwara ya ka o ziga ka a kpọọ Pita onyeozi. Mgbe ndị ozi ahụ Kọniliọs zitere chọtara Pita, ha gwara ya, sị: “Kọnịliọs . . . ka otu mmụọ ozi dị nsọ nyere ntụziaka sitere n’ebe Chineke nọ ka o zie ka a kpọọ gị ka ị bịa n’ụlọ ya na ka ọ nụ ihe ndị i nwere ikwu.” Pita gara, ndị Jentaịl mbụ a na-ebighị úgwù si otú a ghọọ akụkụ nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 10:22, 44-48) Cheedị echiche otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na ị mata na ọ bụ mmụọ ozi nyeere gị aka ịgakwuru onye obi ya ziri ezi!
Enyemaka Site ná Mmụọ Nsọ
12, 13. (a) N’ihi gịnị ka ndịozi Jizọs ji nwee ezi ihe mere ha ji kwere na mmụọ nsọ pụrụ inyere ha aka? (b) Olee otú mmụọ nsọ si nye Ndị Kraịst narị afọ mbụ ike?
12 Obere oge tupu ya anwụọ, Jizọs mesiri ndịozi ya obi ike na a gaghị ahapụ ha n’enyeghịrị ha aka. Nna ahụ ga-enye ha “ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ.” (Jọn 14:26) Ndịozi ahụ nwere ezi ihe mere ha ga-eji kwere na mmụọ nsọ pụrụ inyere ha aka. E kwuwerị, ihe atụ nke otú Jehova si jiri mmụọ nsọ, bụ́ ike kachasịnụ e nwere, mee ihe iji nyere ndị ya aka, jupụtara n’Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee.
13 Ọtụtụ ugboro, e ji mmụọ nsọ mee ihe inye ụmụ mmadụ ike ime uche Jehova. Mmụọ nsọ nyere Ndị Ikpe ike iji napụta Izrel. (Ndị Ikpe 3:9, 10; 6:34) Otu mmụọ ahụ nyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ ike iji nọgide na-eme nkwusa n’atụghị egwu n’agbanyeghị ụdị mmegide ọ bụla. (Ọrụ 1:8; 4:31) Ihe ịga nke ọma ha nwere n’ijezu ozi ha nyere ihe àmà siri ike na mmụọ nsọ nyeere ha aka. Olee ihe ọzọ pụrụ ime ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị” gbasaa ozi Alaeze ahụ n’akụkụ nile nke ụwa a maara mgbe ahụ?—Ọrụ 4:13; Ndị Kọlọsi 1:23.
14. Olee otú Jehova siworo jiri mmụọ nsọ ya mee ihe iji mee ka ndị ya nwekwuo nghọta?
14 Jehova jikwa mmụọ nsọ ya mee ihe iji mee ka ndị ya nwekwuo nghọta. Site n’enyemaka Jenesis 41:16, 38, 39) Site ná mmụọ ya, Jehova mere ka e kpugheere ndị dị umeala n’obi nzube ya ma zonarị ya ndị mpako. (Matiu 11:25) Ya mere, banyere ihe ndị Jehova kwadebewooro “ndị hụrụ ya n’anya,” Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụ anyị ka Chineke kpughewooro ha site na mmụọ ya.” (1 Ndị Kọrint 2:7-10) Ọ bụ nanị site n’enyemaka nke mmụọ nsọ ka mmadụ pụrụ n’ezie ịghọta uche Chineke.
nke mmụọ Chineke, Josef kọwaliri nrọ amụma Fero. (Enyemaka Site n’Okwu Chineke
15, 16. Gịnị ka a gwara Jọshụa ka o mee iji nwee ezi uche?
15 Okwu Jehova sitere n’ike mmụọ nsọ ‘bara uru maka izi ihe,’ ọ na-enyekwara ndị ohu Chineke aka ‘iru eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.’ (2 Timoti 3:16, 17) Bible nwere ọtụtụ ihe atụ nke otú Okwu Chineke ndị e dekọworo n’oge ochie si nyere ndị Ya aka n’oge ahụ.
16 Akwụkwọ Nsọ nyekwara aka inye ndị na-efe Chineke ezi nduzi. Mgbe e nyere Jọshụa ọrụ nke idu Izrel, a gwara ya, sị: “Akwụkwọ iwu a [bụ́ nke Mozis dekọrọ] agaghị apụ n’ọnụ gị, kama ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya: n’ihi na mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.” Rịba ama na Chineke ekweghị Jọshụa nkwa inye ya amamihe n’ụzọ ọrụ ebube. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na Jọshụa agụọ ma tụgharịa uche ‘n’akwụkwọ iwu ahụ,’ mgbe ahụ, ọ ga-enwe uche.—Joshua 1:8; Abụ Ọma 1:1-3.
17. Olee otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e nwere n’oge ha si nyere ma Daniel ma Eze Josaịa aka?
17 Okwu Chineke e dere ede nyekwara aka kpughee uche na nzube ya. Dị ka ihe atụ, Daniel ghọtara ogologo oge Jeruselem ga-atọgbọru n’efu site n’ihe odide Jeremaịa. (Jeremaịa 25:11; Daniel 9:2) Tụleekwa ihe mere n’oge ọchịchị Eze Josaịa nke Juda. N’oge ahụ, mba ahụ esiwo n’ebe Jehova nọ kpafuo, o dokwara anya na ndị eze ya adịghịzi edepụtara onwe ha akwụkwọ Iwu ahụ ma na-agbaso ya. (Deuterọnọmi 17:18-20) Ma ka a na-arụzi ụlọ nsọ ahụ, a chọtara “akwụkwọ iwu ahụ,” ikekwe nke Mozis jiri aka ya dee. Ma eleghị anya nke a bụ nke mbụ e dere, bụ́ nke e dezuru ihe dị ka narị afọ asatọ tupu mgbe ahụ. Mgbe a gụpụtasịịrị ya akwụkwọ iwu ahụ, Josaịa ghọtara otú mba ahụ siruworo n’ime uche Jehova kpafuo, eze ahụ mekwara ihe siri ike iji hụ na e mere ihe dị n’akwụkwọ ahụ. (2 Ndị Eze 22:8; 23:1-7) Ọ́ bụghị ihe doro anya na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e nwere n’oge ahụ nyeere ndị Chineke aka n’oge ochie?
Enyemaka Site n’Aka Ndị Kwere Ekwe
18. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na mgbe otu onye na-efe ezi ofufe nyeere ibe ya aka na enyemaka ahụ si n’aka Jehova?
18 Enyemaka Jehova na-abịakarị site n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị. N’ezie, mgbe ọ bụla onye na-efe ezi ofufe nyeere ibe ya aka, ọ bụ Chineke ka o si n’aka. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ, mmụọ nsọ Chineke nọ n’ọrụ. Mmụọ ahụ na-amịpụta mkpụrụ, gụnyere ịhụnanya na ịdị mma, n’ime ndị na-achọ ka o nwee mmetụta n’ahụ́ ha. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’ihi ya, mgbe a kpaliri otu n’ime ndị ohu Chineke inyere ibe ya aka, nke ahụ na-egosi na mmụọ Jehova nọ n’ọrụ. Nke abụọ, e mere anyị n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26) Nke a pụtara na anyị nwere ikike nke igosipụta àgwà ya, gụnyere obiọma na ọmịiko ya. Ya mere, mgbe ọ bụla otu ohu Jehova nyeere ibe ya aka, Isi Iyi nke enyemaka dị otú ahụ bụ onye e gosipụtara onyinyo ya.
19. Dị ka ihe ndekọ Bible si kwuo, olee otú Jehova si nyere ndị ohu ya aka site n’aka ndị kwere ekwe ibe ha?
19 N’oge Bible, olee otú Jehova si nyere ndị ohu ya aka site n’aka ndị kwere ekwe ibe ha? Mgbe mgbe, Jehova mere ka otu n’ime ndị ohu ya nye ibe ya ndụmọdụ dị ka mgbe Jeremaịa nyere Beruk ndụmọdụ na-azọpụta ndụ. (Jeremaịa 45:1-5) Site n’oge ruo n’oge, a kpaliri ndị na-efe ezi ofufe inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka n’ụzọ ihe onwunwe, dị nnọọ ka mgbe Ndị Kraịst nọ na Masedonia na Akaịa gosipụtara ịdị njikere inyere ụmụnna ha nọ ná mkpa na Jeruselem aka. Pọl onyeozi kwuru na mmesapụ aka dị otú ahụ rụpụtara “okwu ekele nye Chineke.”—2 Ndị Kọrint 9:11.
20, 21. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ụmụnna si Rom wusiri Pọl onyeozi ike?
20 Ọ bụ nnọọ ihe na-agba ume ịgụ ihe ndekọ nke otú ndị ohu Jehova si tinye mgbalị iji wusie ibe ha ike ma gbaa ha ume. Tụlee ihe atụ metụtara Pọl onyeozi. Ka ọ na-aga Rom dị ka onye mkpọrọ, Pọl mere njem n’okporo ụzọ awara awara ndị Rom a maara dị ka Okporo Ụzọ Apịọs. Agba nke ikpeazụ nke njem ahụ tara nnọọ akpụ, n’ihi na ndị njem aghaghị ịgafe ebe mmiri na-adọ nke apịtị jupụtara. * Ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị na Rom maara na Pọl na-abịa. Gịnị ka ha ga-eme? Hà ga-atụsara nnọọ ahụ́ n’ụlọ ha na-echere mgbe Pọl ga-abịarute ma gazie kelee ya?
21 Luk onye so dee Bible bụ́ onye so Pọl mee njem ahụ na-agwa anyị ihe merenụ: “Sitekwa n’ebe ahụ [Rom], mgbe ụmụnna nụrụ akụkọ banyere anyị, ha bịara izute anyị ruo ọbụna n’Ahịa Apịọs na Ụlọ Atọ nke Ndị Ije.” Ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ ihe na-emenụ? N’ịmara na Pọl na-abịa, ụmụnna ndị a họpụtara mere Ọrụ 28:15) Cheedị nnọọ echiche—nanị ịhụ ụmụnna ahụ bụ́ ndị gbalịsịworo ike ime ogologo njem ahụ wusiri Pọl ike ma kasie ya obi! Ònyekwa ka Pọl kelere maka nkwado a na-enye aka? O kelere onye o si n’aka, Jehova bụ́ Chineke.
njem site na Rom ịga zute ya. Ụfọdụ n’ime ha cheere n’Ahịa Apịọs, ebe nchere a maara nke ọma nke dị ihe dị ka kilomita 74 site na Rom. Ụmụnna ndị nke ọzọ cheere n’Ụlọ Atọ nke Ndị Ije, ebe izu ike dị ihe dị ka kilomita 58 site n’obodo ahụ. Gịnị bụ mmeghachi omume Pọl? Luk na-akọ, sị: “Ozugbo Pọl hụkwara ha, o kelere Chineke ma nwee obi ike.” (22. Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 2005, gịnịkwa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
22 Ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ nke otú Chineke si mesoo ndị ya ihe na-egosi nnọọ na ọ bụ onye inyeaka. Ọ bụ Onye Inyeaka na-enweghị oyiri. N’ụzọ dabara adaba, Ndịàmà Jehova ga-eji okwu nke Abụ Ọma 121:2 mere isiokwu dịịrị afọ ha nke 2005, bụ́ nke na-asị: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.” Ma olee otú Jehova si enyere anyị aka taa? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 20 Onye Rom na-ede uri bụ́ Horace (65—68 T.O.A.), bụ́ onye mere otu njem ahụ, kwuru banyere ahụ́ erughị ala agba ikpeazụ nke njem a na-eweta. Horace kọwara Ahịa Apịọs dị ka nke “jupụtara ná ndị ọkwọ ụgbọ mmiri na ndị na-ere mmanya nwere aka ntagide.” O mere mkpesa banyere “ajọ anwụnta na akịrị” nakwa mmiri “ọjọọ.”
Ị̀ Na-echeta?
N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si nyere ndị ya aka—
• site n’aka ndị mmụọ ozi?
• site ná mmụọ nsọ ya?
• site n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ?
• site n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]
Isiokwu dịịrị afọ 2005 ga-abụ: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.” —Abụ Ọma 121:2.
[Foto dị na peeji nke 16]
Pọl kelere Chineke n’ihi enyemaka o nwetara site n’aka ụmụnna si Rom