Ije Ije n’Okporo Ụzọ Jehova Na-eweta Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba
Ije Ije n’Okporo Ụzọ Jehova Na-eweta Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba
Ị̀ GATỤWO mkpagharị ruo ebe dị anya n’ebe ugwu dị? Ọ bụrụ na ị gatụwo, ma eleghị anya ọ dị gị ka ị nọ nnọọ n’elu elu ụwa. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ikuru ikuku dị mma, ilepụ anya hụ ebe dịpụrụ adịpụ, ikiri ịma mma nke ihe ndị e kere eke! Ikekwe, nchegbu ndị ị na-enwe n’ụlọ yiri ka ha belatatụrụ.
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ adịghị agakebe ụdị mkpapụ ahụ, ma ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst raara onwe ya nye, ọ pụrụ ịbụ na ị nọwo na-eje ije n’ógbè bụ́ ugwu ugwu ruo oge ụfọdụ ugbu a—n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ nke oge ochie, obi abụọ adịghị ya na i kpewo ekpere, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile.” (Abụ Ọma 25:4) Ì chetara otú obi dị gị mgbe mbụ ị gbagooro n’ugwu nke ụlọ Jehova wee malite ije ije n’ebe nile dị elu? (Maịka 4:2; Habakuk 3:19) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị chọpụtara n’egbughị oge na ije ije n’ụzọ ndị a dị elu nke ofufe dị ọcha wetaara gị nchebe na ọṅụ. Ị bịara nwee ụdị mmetụta onye ọbụ abụ ahụ nwere: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ nke maara olu iti mkpu ahụ: Jehova, n’ìhè nke ihu Gị ka ha na-eje ije.”—Abụ Ọma 89:15.
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ndị na-aga mkpagharị n’ógbè bụ́ ugwu ugwu aghaghị ịgafe ebe ndị kpọdara akpọda nke ukwuu, ndị dị ogologo. Ụkwụ na-amalite igbu ha mgbu, ike na-agwụkwa ha. Anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe ihe isi ike n’ozi anyị na-ejere Chineke. Ná nso nso a, ọ pụrụ ịbụ na ọ na-esiri anyị ike ịzọli ụkwụ. Olee otu anyị pụrụ isi nwetaghachi ike na ọṅụ anyị? Nzọụkwụ mbụ bụ ịghọta na ụzọ Jehova kasị elu.
Iwu Ndị Dị Elu nke Jehova
Ụzọ Jehova dị elu ‘karịa ụzọ mmadụ,’ e mewokwa ka ofufe ya ‘guzosie ike n’elu ugwu nile, buliekwa ya elu karịa ugwu nta nile.’ (Aịsaịa 55:9; Maịka 4:1) Amamihe Jehova “bụ amamihe nke sitere n’elu.” (Jems 3:17) Iwu ya kachasị iwu ndị ọzọ nile elu. Dị ka ihe atụ, n’oge mgbe ndị Kenan ji ụmụaka na-achụ àjà n’obi ịta mmiri, Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ndị dị elu, ndị e jikwa ọmịiko mara. Ọ gwara ha, sị: “Ahụla onye na-enweghị ike ihu ọma, asọpụrụkwala ihu nke onye ukwu. . . . Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ́ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị.”—Levitikọs 19:15, 34.
Narị afọ 15 mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs nyere ihe atụ ndị ọzọ nke ‘iwu Jehova nke dị ebube.’ (Aịsaịa 24:21) N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nọgidenụ na-ahụ ndị iro unu n’anya ma na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee gosipụta na unu bụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.” (Matiu 5:44, 45) “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ,” ka o kwukwasịrị. “Nke a bụ ihe Iwu ahụ na akwụkwọ ndị amụma pụtara.”—Matiu 7:12.
Iwu ndị a dị elu nwere mmetụta n’obi ndị mmadụ na-aṅa ntị, na-akpali ha iṅomi Chineke ha na-efe ofufe. (Ndị Efesọs 5:1; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Chee nnọọ echiche banyere mgbanwe weere ọnọdụ n’ihe banyere Pọl. Mgbe mbụ anyị nụrụ ihe banyere ya n’ime Bible, ọ nọ ‘na-akwado ogbugbu e gburu’ Stivin ma na-emeso “ọgbakọ ahụ n’ụzọ jọgburu onwe ya.” Nanị afọ ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nọ na-emeso Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka omume n’ụzọ dị nro dị ka “nne na-enye nwa ya ara [nke] na-elezi ụmụ nke aka ya anya.” Izi ihe Chineke gbanwere Pọl site n’ịbụ onye mkpagbu gaa n’ịbụ Onye Kraịst na-ahụ n’anya. (Ọrụ 8:1, 3; 1 Ndị Tesalonaịka 2:7) N’ezie, o nwere ekele na izi ihe Kraịst emewo ka ọ gbanwee ụdị mmadụ ọ bụ. (1 Timoti 1:12, 13) Olee otú inwe ekele yiri nke ahụ pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide na-eje ije n’okporo ụzọ dị elu nke Chineke?
Iji Ekele Na-eje Ije
Ndị na-aga mkpagharị n’ebe ugwu dị na-enwe obi ụtọ n’ihe ndị dị iche ha pụrụ ịnọ n’elu ugwu hụ. Ha na-amụtakwa ụzọ isi nweta obi ụtọ ikiri ụmụ obere ihe ndị dị n’akụkụ ụzọ, dị ka nkume a na-adịghị ahụkebe, okooko osisi mara mma, ma ọ bụ ịhụperetụ otu anụ ọhịa. N’ụzọ ime mmụọ, ọ dị mkpa ka anyị mụrụ anya ịhụ ụgwọ ọrụ ndị na-abịa site n’iso Chineke na-eje ije—ndị ukwu na ndị nta. Ịmata nke a pụrụ ime ka anyị nwetaghachi ume ọhụrụ ma mee ka njem ahụ anyị jisiri ike na-azọli ụkwụ na ya ghọọ njem e ji ume na-eme. Anyị ga-esoro Devid kwughachi ihe ahụ o kwuru: “Mee ka m nụrụ ebere Gị n’ụtụtụ; n’ihi na Gị ka m tụkwasịworo obi: mee m ka m mara ụzọ nke m ga-eje ije n’ime ya.”—Abụ Ọma 143:8.
Mary, bụ́ onye jeworo ije ruo ọtụtụ afọ n’okporo ụzọ Jehova sịrị: “Mgbe m lere anya n’ihe ndị Jehova kere, m na-ahụ ọ bụghị nanị ịdị mgbagwoju anya ha, kama àgwà ịhụnanya nke Chineke. Ma ọ̀ bụ anụmanụ, nnụnụ, ma ọ bụ ahụhụ, nke ọ bụla nwere ọdịdị nke ya, nke na-adọrọ mmasị. A pụkwara inweta obi ụtọ dị otú ahụ site n’eziokwu ime mmụọ ndị na-edowanye anya ka afọ na-aga.”
Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ekele anyị nwere mikwuo emie? N’otu ụzọ, site n’ejighị ihe ndị Jehova na-emere anyị gwurie egwu. Pọl dere, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị. Na-enyenụ ekele banyere ihe ọ bụla.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18; Abụ Ọma 119:62.
Ọmụmụ ihe onwe onye na-atụnye ụtụ na mmụọ inwe ekele. Pọl gbara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ume, sị: “Nọgidenụ na-eje ije n’ịdị n’otu nke unu na [Kraịst Jizọs], . . . na-ejubiga ókè n’okwukwe n’inye ekele.” (Ndị Kọlọsi 2:6, 7) Ịgụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ na-ewusi okwukwe anyị ike ma na-adọta anyị nso n’ebe Onye Chepụtara Bible nọ. E nwere akụ̀ zoro ezo n’ime ya bụ́ ndị pụrụ ịkpali anyị ‘ijubiga ókè n’inye ekele.’
Iso ụmụnna anyị na-ejere Jehova ozi na-eme ka ọ dị mfe karị. Onye ọbụ abụ ahụ kwuru banyere onwe ya sị: “Onye e kekọtaworo mụ na ndị na-atụ egwu gị n’otu ka m bụ.” (Abụ Ọma 119:63) Oge ndị anyị ji gaa mgbakọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ndị anyị na ụmụnna anyị ji mee ihe ndị ọzọ so n’ụfọdụ n’ime oge ndị kasị enye obi ụtọ. Anyị maara na ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst anyị bụ́ nke dị oké ọnụ ahịa malitere n’ebe Jehova na ụzọ ya dị elu nọ.—Abụ Ọma 144:15b.
E wezụga inwe ekele, iburu ọrụ dịịrị anyị n’uche ga-ewusikwu anyị ike ịnọgide na-enwe ọganihu n’okporo ụzọ dị elu nke Jehova.
Iburu Ọrụ Dịịrị Anyị n’Uche Wee Na-Eje Ije
Ndị na-aga mkpagharị n’ebe ugwu dị, bụ́ ndị maara ọrụ dịịrị ha na-ama mkpa ọ dị iji nlezianya na-eje ije ma ọ bụrụ na ha ga-ezere ịkpafu ma ọ bụ ịbịaru nso n’ebe ndị dị mkpọda. Dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, Jehova nyere anyị nnwere onwe ụfọdụ nakwa ọgụgụ isi. Ma nnwere onwe dị otú ahụ na-achọ na anyị ga-amata ọrụ dịịrị anyị ka anyị na-eje ozi Ndị Kraịst anyị.
Dị ka ihe atụ, Jehova tụkwasịrị ndị ohu ya obi na ha ga-arụzu ọrụ dịịrị ha n’ụzọ na-egosi iji ihe akpọrọ ihe. O kwughị ike na oge anyị ga-etinye n’ọrụ Ndị Kraịst ma ọ bụ ókè ụtụ anyị ga-atụnye n’ụzọ ego ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ ga-aha. Kama nke ahụ, ihe Pọl gwara ndị Kọrint na-emetụta anyị nile: “Ka onye ọ bụla na-eme dị nnọọ ka o kpebiworo n’obi ya.”—2 Ndị Kọrint 9:7; Ndị Hibru 13:15, 16.
Inye ihe nke ezi uche dị na ya nke Ndị Kraịst na-enye na-agụnye isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. Anyị na-egosikwa na anyị na-eji ihe akpọrọ ihe site n’inye onyinye maka ọrụ Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ. Gerhardt, bụ́ okenye, na-akọwa na ya na nwunye ya welitekwuru nnọọ aka n’onyinye ha na-enye mgbe ha letachara otu mgbakọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. “Anyị hụrụ na ụmụnna anyị nọ n’ebe ahụ nwere nnọọ ntakịrị ihe onwunwe; ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha ji akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible kpọrọ ihe nke ukwuu,” ka ọ na-ekwu, “n’ihi ya anyị kpebiri na anyị chọrọ inyere ụmụnna anyị nọ ná mkpa n’ala ndị ọzọ aka otú anyị nwere ike.”
Ịmụba Ntachi Obi Anyị
Ịga mkpagharị n’ebe bụ́ ugwu ugwu na-achọ ume. Ndị na-aga mkpagharị n’ebe ugwu dị na-enwe mmega ahụ́ mgbe ọ bụla ha nwere ike, ọtụtụ ndị na-agagharịtụ ntakịrị iji kwadebe onwe ha maka njem dị anya. N’otu aka ahụ, Pọl tụrụ aro ka anyị jide ọrụ n’aka mgbe nile n’ọrụ ọchịchị Chineke ka ahụ́ wee nọgide na-esi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ. Ndị chọrọ ije ije “n’ụzọ kwesịrị Jehova,” ma bụrụ ndị “e ji ike nile na-eme ka ha dị ike,” ka Pọl kwuru, kwesịrị ‘ịnọgide na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla.’—Ndị Kọlọsi 1:10, 11.
Inwe ihe nkwali na-atụnye ụtụ ná ntachi obi nke onye na-aga mkpagharị n’ebe ugwu dị. N’ụzọ dị aṅaa? Ilekwasị anya n’otu ihe a na-ahụ anya nke ọma, dị ka ugwu dị ebe dị anya, bụ ihe mkpali. Mgbe onye na-aga mkpagharị n’ebe ugwu dị rutekwara n’ebe ndị ọ maara nke ọma n’ụzọ ahụ, ọ pụrụ ịtụ ọganihu o nweworo n’iru n’ebe ọ na-aga n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Mgbe o leghachiri anya azụ n’ebe ọ gafeworo, ọ na-enwe afọ ojuju.
N’otu aka ahụ, olileanya anyị nke ndụ ebighị ebi na-akwado ma na-akwali anyị. (Ndị Rom 12:12) Ka ọ dịgodị, ka anyị nọ na-eje ije n’ụzọ Jehova, anyị na-enweta afọ ojuju n’isetịpụ na n’iru ihe mgbaru ọsọ Ndị Kraịst. Leekwa ọṅụ anyị na-enweta mgbe anyị leghachiri anya azụ n’ọtụtụ afọ nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ mgbanwe ndị anyị meworo n’ụdị mmadụ anyị bụ!—Abụ Ọma 16:11.
Iji garuo ebe dị anya n’emefughị ike dị ukwuu, ndị na-eje ije na-eji otu ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ahụ aga ije. N’otu aka ahụ, ezigbo usoro ime ihe nke na-agụnye ịg̣achi nzukọ na ozi ubi anya ga-eme ka anyị legide anya n’ihe mgbaru ọsọ anyị. Ya mere, Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ka anyị nọgide na-eje ije n’usoro n’otu ụkpụrụ a.”—Ndị Filipaị 3:16.
N’ezie, ọ bụghị nanị anyị na-eje ije n’okporo ụzọ Jehova. “Ka anyị chee echiche otú anyị pụrụ isi kpalie ibe anyị inwe ịhụnanya na ịrụ ọrụ ọma,” ka Pọl dere. (Ndị Hibru 10:24). Ezi ndị enyi, bụ́ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe karị ime ka nzọụkwụ anyị na nke ndị ibe anyị na-adaba ka anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-ejekọ ije.—Ilu 13:20.
N’ikpeazụ, nke kasịkwa mkpa, ọ dịghị mgbe anyị ga-echefu ike Jehova na-enye. Ndị ike ha dị n’ebe Jehova nọ ‘ga-esi n’ike jeruo ike.’ (Abụ Ọma 84:5, 7) Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, anyị aghaghị ịgafe ebe ndị siri ike, site n’enyemaka Jehova anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma.