Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nhọrọ Gị n’Ihe Banyere Ụkpụrụ

Nhọrọ Gị n’Ihe Banyere Ụkpụrụ

Nhọrọ Gị n’Ihe Banyere Ụkpụrụ

Ị̀ BỤ onye ji ụkpụrụ eme ihe? Ka ị̀ na-ele ụkpụrụ omume anya dị ka ihe mgbe ochie? Nke bụ́ eziokwu bụ na onye ọ bụla nwere ụdị ụkpụrụ ụfọdụ na-eduzi ya, bụ́ ndị o kweere na ha dị mkpa. Dị ka The New Shorter Oxford English Dictionary si kwuo, a pụrụ ịkọwa ụkpụrụ dị ka “usoro iwu onwe onye nke omume ziri ezi.” Ụkpụrụ na-emetụta mkpebi anyị ma na-ekpebi ụzọ anyị ga-agbaso ná ndụ. Ụkpụrụ pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ihe nduzi bụ́ compass.

Dị ka ihe atụ, Jizọs gbara ụmụazụ ya ume idebe Ụkpụrụ Ọma ahụ dị na Matiu 7:12: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” Ụmụazụ Confucius na-agbaso ụkpụrụ li na jen, bụ́ ndị kwuru banyere àgwà ndị dị ka obiọma, ịdị umeala n’obi, nkwanye ùgwù, na iguzosi ike n’ihe. Ọbụna ndị na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe nwere ihe ụfọdụ ha ji kpọrọ ihe ma ọ bụ ụkpụrụ nduzi ndị na-ekpebi ụdị àgwà ha ga na-akpa.

Ụkpụrụ Ndị Dị Aṅaa?

Otú ọ dị, anyị kwesịrị iburu n’uche na ụkpụrụ pụrụ ịbụ nke dị mma ma ọ bụ dị njọ. Dị ka ihe atụ, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ nwere ihe a kọwaworo, n’ime afọ iri gara aga ma ọ bụ karị, dị ka mmụọ nke m godị. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ amaghị banyere okwu ahụ ma ọ bụ na-eche na o metụtaghị ha, mmụọ nke m godị bụ ụkpụrụ omume nke ọtụtụ ndị ji eme ihe, ebe ọ bụ na ha hapụrụ ụkpụrụ omume ndị dị elu. Ma ọ̀ bụ otú ahụ ka e si akọwa ya ma ọ bụ na ọ bụghị, mmụọ nke m godị bụ ngosipụta nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, bụ́ nke ya na ịchụso ihe onwunwe n’echebaraghị ndị ọzọ echiche na-esokarị. “Anyị nwere nanị ụkpụrụ abụọ,” ka otu onyeisi ụlọ ọrụ TV na China kwuru. “Otu bụ imezu ọchịchọ. Nke ọzọ bụ ịkpa ego.”

Mmụọ nke m godị pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ihe ndọta. Oleekwa otú ihe ndọta si emetụta ihe nduzi bụ́ compass? Mgbe ha abụọ nọketere onwe ha, agịga compass na-eche ihu ebe na-ekwesịghị ekwesị. N’otu aka ahụ, mmụọ nke m godị pụrụ itinye compass omume ma ọ bụ ụkpụrụ àgwà ziri ezi nke mmadụ ná mgbagwoju anya site n’ime ka ọchịchọ onye ahụ na-ebutere ihe nile ụzọ.

Ọ̀ ga-eju gị anya ịmata na mmụọ nke m godị abụghị ihe ọhụrụ? Ụzọ ndụ a malitere n’ogige Iden mgbe nne na nna anyị mbụ gbahapụrụ ụkpụrụ omume nke Onye Okike anyị setịpụrụ. Nke ahụ chehiere compass omume ha ihu. N’ihi ịbụ ụmụ Adam na Iv, otu ụzọ ndụ ahụ bụ́ nke a kpọrọ “mmụọ nke m godị” n’oge na-adịbeghị nnọọ anya, na-emetụta ụmụ mmadụ.—Jenesis 3:6-8, 12.

A na-ahụ mgbasawanye nke àgwà ahụ karịsịa n’oge amụma Bible na-akpọ ‘ụbọchị ikpeazụ,’ bụ́ nke e ji “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” mara. Ọtụtụ ndị bụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya.” Ọ bụghị ihe ijuanya na anyị na-enwe nrụgide nke iṅomi mmụọ nke m godị.—2 Timoti 3:1-5.

Eleghị anya ị ga-ekwere ihe otu nwa okorobịa aha ya bụ́ Olaf degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Europe n’akwụkwọ: “O siri nnọọ ike ịnọgide na-adị ọcha n’omume, karịsịa nye anyị bụ́ ndị na-eto eto. Biko nọgidenụ na-echetara anyị mkpa ọ dị ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ Bible.”

Olaf gosipụtara echiche ezi uche dị na ya. Ụkpụrụ Chineke pụrụ inyere anyị—ndị na-eto eto na ndị agadi—aka ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume ndị dị elu. Ha pụkwara inyere anyị aka iguzogide mmụọ nke m godị, ma ọ bụ ihe a kpọrọ ya ma ọ bụ na ọ bụghị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmụtakwu banyere otú ụkpụrụ Bible pụrụ isi nyere gị aka n’ezie, biko tụlee isiokwu na-esonụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ọtụtụ ndị taa achọghị ịma banyere mkpa ndị ọzọ