Ndị A Kwadebere n’Ụzọ Zuru Ezu Dị Ka Ndị Na-ezi Okwu Chineke
Ndị A Kwadebere n’Ụzọ Zuru Ezu Dị Ka Ndị Na-ezi Okwu Chineke
‘Chineke emewo n’ezie ka anyị ruo eru nke ọma ịbụ ndị ozi.’—2 NDỊ KỌRINT 3:5, 6.
1, 2. Mgbalị ndị dị aṅaa ka a na-eme mgbe ụfọdụ banyere ime nkwusa, ma n’ihi gịnị ka ha jikarị akụ afọ n’ala?
OLEE otú ọ ga-adị gị ma e nye gị ọrụ ị na-erughị eru ịrụ? Cheedị echiche: Ihe ndị dị gị mkpa dị gị n’ihu, ngwá ọrụ ndị ị ga-eji rụọ ha dịkwa gị nso. Ma ị matụghị otú ị ga-esi rụọ ọrụ ahụ. Nke kadị njọ bụ na a chọrọ ka a rụọ ọrụ a ngwa ngwa. Ndị mmadụ na-adabere n’ebe ị nọ. Lee ka nke ahụ ga-esi bụrụ ihe na-akpata ahụ́ mgbakasị!
2 Ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme dị otú ahụ abụghị nanị ihe e chepụtara echepụta. Tụlee otu ihe atụ. Mgbe ụfọdụ, otu n’ime chọọchị Krisendọm agbalịwo ime ndokwa maka na ịga ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Mgbalị ndị dị otú ahụ akụwo afọ n’ala ọtụtụ mgbe, na-adakpọ n’ime izu ma ọ bụ ọnwa ole na ole. N’ihi gịnị? N’ihi na Krisendọm enyebeghịrị ndị òtù ya aka iru eru maka ọrụ ahụ. Ọbụna ndị ụkọchukwu ha erughị eru ịrụ ọrụ nkwusa ahụ, n’agbanyeghị ọtụtụ afọ ha ji gụọ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ụwa nakwa na seminarị dị iche iche. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo otú ahụ?
3. Olee okwu e ji mee ihe ná 2 Ndị Kọrint 3:5, 6, gịnịkwa ka ọ pụtara?
3 Okwu Chineke na-akọwa ihe na-eme ka ezi onye na-ekwusa ozi ọma Ndị Kraịst ruo eruo. E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ọ bụghị na anyị ji aka anyị na-eme ka anyị onwe anyị ruo eru nke ọma iwere ihe ọ bụla dị ka nke na-esite n’ebe anyị onwe anyị nọ, kama anyị ịbụ ndị ruru eru nke ọma na-esite n’aka Chineke, bụ́ onye meworo n’ezie ka anyị ruo eru nke ọma ịbụ ndị ozi.” (2 Ndị Kọrint 3:5, 6) Rịba okwu e ji mee ihe n’ebe a ama—‘iru eru nke ọma.’ Gịnị ka ọ pụtara? Akwụkwọ bụ́ Vine’s Expository Dictionary of Biblical Words na-ekwu, sị, “Mgbe a na-ekwu maka ihe nkịtị, [okwu a na Grik mbụ] na-egosi ‘nke zuru ezu’ . . . ; mgbe e ji ya mee ihe banyere ndị mmadụ, ọ pụtara ‘ịma nke a na-akọ,’ ‘kwesịrị ekwesị.’” Ya mere, onye “ruru eru nke ọma” bụ onye ma nke a na-akọ ma kwesị ekwesị ịrụ ọrụ e nyere ya. Ee, ezi ndị ozi nke ozi ọma ahụ ruru eru ịrụ ọrụ a. Ha ma nke a na-akọ, dị mma, ma ọ bụ kwesị ekwesị ime nkwusa.
4. (a) Olee otú ihe nlereanya Pọl si egosi na iru eru maka ozi Ndị Kraịst adịghịrị nanị mmadụ ole na ole nọ n’ọkwá dị elu? (b) Olee ụzọ atọ Jehova si eme ka anyị ruo eruo dị ka ndị ozi?
4 Otú ọ dị, ebee ka iru eru ahụ si abịa? Ọ̀ bụ site na nkà onwe onye? Ọ̀ bụ site n’ike ọgụgụ isi ka ukwuu? Ọ̀ bụ site n’agụmakwụkwọ pụrụ iche n’ụlọ akwụkwọ ndị a ma ama? Ihe àmà na-egosi na Pọl onyeozi nwere ihe ndị ahụ nile. (Ọrụ 22:3; Ndị Filipaị 3:4, 5) Ma, o ji obi umeala kweta na iru eru ya dị ka onye ozi sitere, ọ bụghị n’ụlọ akwụkwọ nke mmụta ka elu, kama n’aka Jehova Chineke. Iru eru ndị dị otú ahụ hà dịịrị nanị mmadụ ole na ole nọ n’ọkwá dị elu? Pọl degaara ọgbakọ Kọrint akwụkwọ banyere “anyị ịbụ ndị ruru eru nke ọma.” N’ezie, nke ahụ na-enye echiche na Jehova na-ahụ na ndị ohu ya nile kwesịrị ntụkwasị obi bụ ndị ma nke a na-akọ, nwee ike ịrụ ọrụ o kenyere ha ịrụ. Olee otú Jehova si eme ka ezi Ndị Kraịst ruo eruo taa? Ka anyị tụlee ụzọ atọ ọ na-eji eme ihe: (1) Okwu ya, (2) mmụọ nsọ ya, na (3) nzukọ ya nke elu ala.
Okwu Jehova Na-eme Ka Anyị Ruo Eruo
5, 6. Mmetụta dị aṅaa ka Akwụkwọ Nsọ na-enwe n’ahụ́ ezi Ndị Kraịst?
5 Nke mbụ, olee otú Okwu Chineke si eme ka anyị ruo eruo ịbụ ndị ozi? Pọl dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Ya mere Akwụkwọ Nsọ na-enye aka eme ka anyị “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ [ndị] a kwadebere n’ụzọ zuru ezu” maka ịrụ “ezi ọrụ” nke izi ndị mmadụ Okwu Chineke. Otú ọ dị, gịnị banyere ndị nile nọ na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm? Ha pụrụ inweta Bible. Olee otú otu akwụkwọ pụrụ isi nyere ụfọdụ ndị aka ịghọ ndị ozi ruru eru ma ọ gaghị enyere ndị ọzọ? Azịza ya na-adabere n’àgwà anyị n’ebe Bible dị.
6 N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-aga chọọchị adịghị anakwere ozi Bible “dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:1) Krisendọm enwewo ihe ndekọ na-eme ihere ma a bịa na nke a. Mgbe ha jisịworo ọtụtụ afọ mụọ ihe n’ụlọ akwụkwọ nkà mmụta okpukpe dị iche iche, ndị ụkọchukwu hà na-abụ ndị a kwadebere dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke? Ọ dịghị ma ọlị. Leenụ, ụmụ akwụkwọ ụfọdụ na-abụ ndị kweere na Bible n’oge ha ka banyere seminarị abanye maka ịgụ akwụkwọ ma ghọzie ndị na-arụ ụka mgbe ha gụsịrị akwụkwọ! Mgbe nke ahụ gasịrị, kama ịdị na-ekwusa Okwu Chineke—nke ọtụtụ n’ime ha na-ekweghịzi na ya—ha na-eche ozi ha ihu n’akụkụ ndị ọzọ, na-akwado akụkụ ụfọdụ n’arụmụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-akwalite ozi ọma maka ịgwọta nsogbu ọha na eze, ma ọ bụ na-emesi nkà ihe ọmụma dị iche iche nke mmadụ ike n’okwuchukwu ha. (2 Timoti 4:3) N’ụzọ dị iche, ezi Ndị Kraịst na-agbaso ihe nlereanya Jizọs Kraịst.
7, 8. Olee otú àgwà Jizọs n’ebe Okwu Chineke dị si dị iche na nke ndị ndú okpukpe nke oge ya?
7 Jizọs ekweghị ka ndị ndú okpukpe nke oge Matiu 13:10-17; 15:1-11) Omume a mere ka ọ dị iche n’ebe ndị ndú okpukpe nke oge ahụ nọ. Ha kụdara ndị nkịtị aka n’ụzọ siri ike ka ha ghara inyobanye anya n’ihe ndị dị omimi nke Chineke. N’ezie, ọ bụ ihe a na-emekarị n’oge ahụ bụ́ onye nkụzi ikwu na akụkụ ụfọdụ nke Bible dịbigara omimi ókè nke na ọ bụ nanị nwa akwụkwọ ya nke ya na ya na-emekọrịtachi ihe anya ka ọ ga-eso tụlee ya—ọbụnakwa otú ahụ, ọ bụ nanị n’olu dị ala, ha ga-ekpuchikwa isi ha ekpuchi. Ndị ndú okpukpe ahụ fọrọ nke nta ka ha nwee nkwenkwe na-ezighị ezi banyere ịtụle akụkụ ụfọdụ nke Bible otú ha nwere banyere ịkpọ aha Chineke!
ya kpụzie echiche ya. Ma ọ̀ na-ezi ntakịrị ìgwè mmadụ, dị ka ndịozi ya, ihe ma ọ bụ oké ìgwè mmadụ, Jizọs na-eji ihe odide ndị dị nsọ eme ihe nke ọma. (8 Kraịst adịghị otú ahụ. O kwenyere na ọ dị mkpa ka mmadụ nile n’ozuzu ha, ọ bụghị nanị mmadụ ole na ole a họọrọ, tụlee ‘okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’ Jizọs achọghị inye ìgwè ndị nọ n’ọkwá dị elu bụ́ ndị ọkà mmụta, mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe m na-agwa unu n’ọchịchịrị, kwuonụ ya n’ìhè; ihe unu nụkwara a takwụnyere atakwụnye, sinụ n’elu ụlọ kwusaa ya.” (Matiu 4:4; 10:27) Ọ gụsiri Jizọs agụụ ike iso ọtụtụ mmadụ ruo n’ókè o kwere mee kerịta ihe ọmụma banyere Chineke.
9. Olee otú ezi Ndị Kraịst si eji Bible eme ihe?
9 Okwu Chineke kwesịrị ịbụ ebe ozizi anyị gbadoro ụkwụ. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-eme ihe omume n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, ọtụtụ mgbe ịgụ amaokwu ndị a họọrọ site na Bible adịghị ezu. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị kọwaa, mee ihe atụ, ma gosi otú a pụrụ isi jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ mee ihe. Nzube anyị bụ ime ka ozi ahụ dị na Bible si n’ime akwụkwọ e biri ebi bamie n’obi nke ndị na-ege anyị ntị. (Nehemaịa 8:8, 12) E kwesịkwara iji Bible na-eme ihe mgbe ọ dị mkpa ka e nye ndụmọdụ ma ọ bụ dọọ aka ná ntị iji gbazie mmadụ. Ọ bụ ezie na ndị Jehova na-asụ asụsụ dị iche iche, sitekwa n’ebe dị iche iche, ha nile na-akwanyere Akwụkwọ ahụ kachasị akwụkwọ nile—Bible—ùgwù.
10. Mmetụta dị aṅaa ka ozi sitere n’ike mmụọ nsọ dị na Bible pụrụ inwe n’ebe anyị nọ?
10 Mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù dị otú a, ozi Bible na-adị ike. (Ndị Hibru 4:12) Ọ na-akpali ndị mmadụ ime mgbanwe ná ndụ ha, dị ka izere omume ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị dị ka ịkwa iko, ikpere arụsị, ịṅụbiga mmanya ókè, na izu ohi. O nyeworo ọtụtụ ndị aka iyipụ mmadụ ochie na iyikwasị mmadụ ọhụrụ. (Ndị Efesọs 4:20-24) Ee, ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ya ùgwù karịa echiche ma ọ bụ ọdịnala ọ bụla nke ụmụ mmadụ ma jiri ya na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi, Bible pụrụ ime ka anyị ruo eruo, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke.
Mmụọ Jehova Na-eme Ka Anyị Ruo Eruo
11. N’ihi gịnị ka o ji daba adaba izo aka n’ebe mmụọ nsọ Jehova dị dị ka “ihe inyeaka”?
11 Nke abụọ, ka anyị tụlee ọrụ mmụọ nsọ Jehova, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, na-arụ n’ime ka anyị bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu. Anyị agaghị echefu mgbe ọ bụla na mmụọ Jehova bụ ike kasịnụ e nwere. Jehova enyewo Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ike iji ike ahụ dị egwu na-eme ihe n’ihi ezi Ndị Kraịst nile. N’ụzọ dabara adaba, Jizọs zoro aka n’ebe mmụọ nsọ dị dị ka “ihe inyeaka.” (Jọn 16:7) Ọ gbara ụmụazụ ya ume ịrịọ Jehova maka mmụọ ahụ, na-emesi ha obi ike na Jehova ga-enye ha ya n’ụba.—Luk 11:10-13; Jems 1:17.
12, 13. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-ekpe ekpere ka mmụọ nsọ nyere anyị aka n’ozi anyị? (b) Olee otú ndị Farisii si gosi na mmụọ nsọ adịghị arụ ọrụ n’ime ha?
12 Ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe ekpere kwa ụbọchị maka mmụọ nsọ, karịsịa iji nyere anyị aka n’ozi anyị. Mmetụta dị aṅaa ka ike ahụ nọ n’ọrụ pụrụ inwe n’ahụ́ anyị? Ọ pụrụ ịrụ ọrụ n’uche na n’obi anyị, na-enyere anyị aka ịgbanwe, ito, na iji mmadụ ọhụrụ ahụ dochie nke ochie. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ọ pụrụ inyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị dị oké ọnụ ahịa yiri nke Kraịst. Ọtụtụ n’ime anyị pụrụ ịgụ Ndị Galeshia 5:22, 23 n’isi. Amaokwu ndị ahụ depụtara mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Nke mbụ bụ ịhụnanya. Àgwà ahụ dị oké mkpa n’ozi anyị. N’ihi gịnị?
Mak 12:28-31) E wezụga ịhụnanya dị otú ahụ, anyị apụghị iru eru n’ezie dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke. Rịba ama ọdịiche dị n’etiti Jizọs na ndị Farisii. Matiu 9:36 na-ekwu banyere Jizọs, sị: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Olee otú ndị Farisii si lee ndị nkịtị anya? Ha kwuru, sị: “Ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu ahụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:49) Ndị Farisii ahụ ahụghị ndị ahụ n’anya kama ha lelịrị ha nke ukwuu. N’ụzọ doro anya, mmụọ Jehova adịghị arụ ọrụ n’ime ha.
13 Ịhụnanya bụ oké ihe mkpali. Ịhụnanya ezi Ndị Kraịst nwere n’ebe Jehova na mmadụ ibe ha nọ na-akpali ha iso ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. (14. Olee otú ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ banyere igosipụta ịhụnanya n’ozi ya kwesịrị isi kpalie anyị?
14 Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị mmadụ. Ọ maara ihe mgbu ha. Ọ maara na e megbuwo ha, gbaa ha akpụkpọ, ma chụsasịa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Jọn 2:25 na-agwa anyị na Jizọs “maara ihe dị n’ime mmadụ.” N’ihi na ọ bụ Onye Ọrụ Bụ́ Ọkà nke Jehova n’oge a na-eke ihe, Jizọs ghọtara ọdịdị ụmụ mmadụ nke ọma. (Ilu 8:30, 31) Nghọta ahụ mere ka ịhụnanya ya mikwuo emie. Ka ịhụnanya dị otú ahụ bụrụ mgbe nile ihe na-akpali ọrụ nkwusa anyị! Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka anyị pụrụ imekwu ihe n’akụkụ a, ka anyị kpee ekpere maka mmụọ nsọ Jehova ma rụzie ọrụ n’ikwekọ n’ekpere anyị. Jehova ga-aza ya. Ọ ga-ezite ike a a na-apụghị iguzogide eguzogide ka o nyere anyị aka ịdịkwu ka Kraịst, bụ́ onye kasị ruo eruo ikwusa ozi ọma ahụ.
15. Olee otú okwu ndị dị n’Aịsaịa 61:1-3 si metụta Jizọs ma, n’otu mgbe ahụ, gbaa ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’anwụ?
15 Ebee ka iru eru Jizọs si bịa? “Mmụọ Jehova dịkwasịrị m,” ka o kwuru. (Luk 4:17-21) Ee, Jehova ji aka ya họpụta Jizọs site na mmụọ nsọ. Ọ dịghị Jizọs mkpa inweta iru eru ọzọ. Ọ̀ bụ mmụọ nsọ họpụtara ndị ndú okpukpe nke oge ya? Ee e. A kwadebeghịkwa ha imezu amụma Aịsaịa 61:1-3, bụ́ nke Jizọs gụrụ n’olu dara ụda ma jiri mee ihe n’ebe ya onwe ya nọ. Biko gụọ amaokwu ndị ahụ ma hụ n’onwe gị na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ nwere ihu abụọ erughị eru. Ha enweghị ozi ọma ha ga-ezisara ndị ogbenye. Oleekwa otú ha pụrụ isi kwusaa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha na ọhụhụ ụzọ nye ndị ìsì? N’ụzọ ime mmụọ, ha onwe ha kpuru ìsì ma nọrọ n’agbụ nke ọdịnala ụmụ mmadụ! N’adịghị ka ha, ànyị ruru eru izi ndị mmadụ ihe?
16. Obi ike dị aṅaa ka ndị Jehova taa pụrụ inwe ma a bịa n’iru eru ha dị ka ndị ozi?
16 N’eziokwu, anyị agụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị dị elu nke Krisendọm. A họpụtaghị anyị ịbụ ndị ozizi site na seminarị nkà mmụta okpukpe. Ọ̀ pụtaziri na anyị erughị eru? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ Jehova họpụtara anyị dị ka Ndịàmà ya. (Aịsaịa 43:10-12) Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka mmụọ ya ma rụọ ọrụ kwekọrọ na ya, anyị ga-enwe iru eru kasịnụ. N’ezie, anyị ezughị okè, anyị adịghịkwa eru ihe nlereanya ahụ Onye Ozizi Ukwu, bụ́ Jizọs, setịpụrụ. Ka o sina dị, ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe ekele na Jehova na-eji mmụọ ya eme ka anyị ruo eruo ma na-akwadebe anyị dị ka ndị na-ezi Okwu ya?
Nzukọ Jehova Na-eme Ka Anyị Ruo Eruo
17-19. Olee otú nzukọ ise nzukọ Jehova haziri ka a na-enwe kwa izu si enye aka eme ka anyị ruo eruo dị ka ndị ozi?
17 Ugbu a, ka anyị tụlee ụzọ nke atọ Jehova si akwadebe anyị dị ka ndị na-ezi Okwu ya—ọgbakọ, ma ọ bụ nzukọ ya nke elu ala, bụ́ nke na-azụ anyị ịbụ ndị ozi. N’ụzọ dị aṅaa? Cheedị nnọọ echiche banyere usoro izi ihe anyị nwere! Dị ka ọ na-adịkarị, n’otu izu, anyị na-aga nzukọ ise nke Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 10:24, 25) Anyị na-ezukọta n’ìgwè ndị dị ntakịrị n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ maka ọmụmụ ihe miri emi nke Bible site n’akwụkwọ nke e si ná nzukọ Jehova wepụta. Site n’ige ntị na ịza ajụjụ, anyị na-amụta ihe site n’ọnụ ibe anyị ma na-agbarịta ibe anyị ume. Anyị na-enwetakwa izi ihe ndị e mere ka ha kwekọọ n’ọnọdụ anyị n’otu n’otu na nlebara anya site n’aka onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ. Ná Nzukọ Ihu Ọha nakwa n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, anyị na-enwetakwu nri ime mmụọ magburu onwe ya.
1 Pita 3:15) È kenyetụwo gị ihe omume n’isiokwu yiri ka ị maara ya nke ọma, i wee hụzie ka ị na-amụta ihe ọhụrụ na ya? Nke ahụ na-emekarị. Ọ dịghị ihe na-eme ka anyị mụtakwuo ihe banyere otu isiokwu karịa izi ya ndị ọzọ. Ọbụna mgbe a na-ekenyeghị anyị ihe omume, anyị ka pụrụ ịmụta ụzọ isi bụrụ ndị ozizi ka mma. Anyị na-ahụ nkà ndị dị mma n’ime onye mmụta ọ bụla, anyị pụkwara iche echiche banyere ụzọ anyị ga-esi ṅomie nkà ndị ahụ.
18 A haziri Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke anyị ịkụziri anyị ụzọ isi na-ezi ihe. Site n’ịkwadebe okwu ndị mmụta dị iche iche, anyị na-amụta ụzọ e si eji Okwu Chineke ezi ihe n’isiokwu dịgasị iche iche. (19 A hazikwara Nzukọ Ije Ozi iji kwadebe anyị dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke. Kwa izu, anyị na-anụ okwu ndị na-ekpo ọkụ, nkwurịta okwu, na ihe ngosi ndị a haziri maka ozi anyị. Olee ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ anyị ga-eji mee ihe? Olee otú anyị pụrụ isi merie ihe ịma aka ndị pụrụ iche n’ozi anyị na-eje maka ọha? Ohere dịgasị aṅaa nke ime nkwusa ka anyị nwere bụ́ ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị jiri mekwuo ihe? Gịnị ga-enyere anyị aka ịbụ ndị ozizi dị irè karị mgbe anyị na-eme nletaghachi ma na-eduzi ọmụmụ Bible? (1 Ndị Kọrint 9:19-22) A na-aza ajụjụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ sara mbara ná Nzukọ Ije Ozi. Ọtụtụ ihe omume nke nzukọ ahụ na-adabere n’isiokwu ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị, bụ́ ngwá ọrụ ọzọ a na-ewepụta iji kwadebe anyị maka ọrụ anyị dị oké mkpa.
20. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru n’ụzọ zuru ezu site ná nzukọ na mgbakọ dị iche iche?
20 Site n’ịkwadebe maka na ịga nzukọ anyị, ma jirizie ihe ndị anyị mụtaworo na-eme ihe n’ọrụ anyị dị ka ndị ozizi, anyị na-anata ọzụzụ sara mbara. Ma e nwere ihe ndị ọzọ. Anyị nwekwara nzukọ ndị buru ibu karị—mgbakọ dị iche iche—bụ́ ndị e dokwara iji kwadebe anyị dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke. Leekwa ka anyị si atụ anya ige ntị nke ọma na itinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ!—Luk 8:18.
21. Olee ihe àmà na-egosi na ọzụzụ a na-enye anyị abụwo nke dị irè, ònye kwesịkwara ịnara otuto maka ya?
21 Ọzụzụ Jehova nyeworo ọ̀ dịwo irè? Ka ihe ndị mere eme zaa ya. Kwa afọ, a na-enyere ọtụtụ narị puku mmadụ aka ịmụta ozizi ndị bụ́ isi nke Bible na ibi ndụ kwekọrọ n’ihe Chineke chọrọ n’aka ha. Ọnụ ọgụgụ anyị na-amụba, ma ọ dịghị onye n’ime anyị pụrụ ịnara otuto maka ya. Anyị aghaghị ile ihe anya otú ha dị n’ezie, dị ka Jizọs mere. O kwuru, sị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” Dị ka ndịozi nke oge ochie, n’akụkụ ka ukwuu, anyị bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ. (Jọn 6:44; Ọrụ 4:13) Ihe ịga nke ọma anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye na-adọta ndị nwere obi eziokwu n’ebe eziokwu ahụ dị. Pọl kọwara ya nke ọma, sị: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs kwọsara ya mmiri, ma Chineke nọgidere na-eme ka ọ na-eto.”—1 Ndị Kọrint 3:6.
22. Gịnị mere anyị na-ekwesịghị iji nwebiga nkụda mmụọ ókè banyere ikere òkè zuru ezu n’ozi Ndị Kraịst?
22 Ee, Jehova Chineke na-ekeresi òkè ike n’ọrụ anyị dị ka ndị na-ezi Okwu ya. O nwere ike ọ gaghị adị anyị mgbe nile ka anyị ruru eru dị ka ndị ozizi. Ma cheta, ọ bụ Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ya onwe ya na Ọkpara ya nọ. Ọ bụ Jehova na-eme ka anyị ruo eruo ijere ndị ọhụrụ ozi site n’Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ ya nke elu ala. Ka anyị na-anabata ọzụzụ Jehova site n’itinye n’ọrụ, ezi ihe ndị ọ na-enye anyị ugbu a iji mee ka anyị bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke!
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Olee otú Bible si akwadebe anyị maka ọrụ nkwusa?
• Òkè dị aṅaa ka mmụọ nsọ na-ekere n’ime ka anyị ruo eruo dị ka ndị ozi?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka nzukọ nke elu ala Jehova siworo nyere gị aka iru eru dị ka onye na-ekwusa ozi ọma?
• Gịnị mere anyị pụrụ iji na-enwe obi ike mgbe anyị na-eje ozi ahụ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 25]
Dị ka onye na-ezi Okwu Chineke, Jizọs gosipụtara ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ