Ụkpụrụ Chineke Pụrụ Ịbara Gị Uru
Ụkpụrụ Chineke Pụrụ Ịbara Gị Uru
OBI abụọ adịghị ya na ị maara na ọ bụ amamihe ebumpụta ụwa na-achịkwa ụmụ anụmanụ. A rụrụ ọtụtụ ígwè ọrụ ịgbaso ntụziaka. Ma n’ezie, e kere ụmụ mmadụ ka ụkpụrụ na-eduzi ha. Olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na nke ahụ bụ eziokwu? Jehova, bụ́ Onye malitere ụkpụrụ ezi omume nile, kwuru mgbe ọ na-achọ ime ụmụ mmadụ mbụ, sị: “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị.” Onye Okike bụ mmụọ; o nweghị ahụ́ dị ka anyị nwere, n’ihi ya, e kere anyị “n’onyinyo” ya n’echiche bụ́ na anyị pụrụ igosipụta àgwà ya, na-egosipụtatụ àgwà ọma ya dị iche iche. Ụmụ mmadụ nwere ikike nke iduzi ndụ ha ka ọ na-ekwekọ n’ụkpụrụ, ya bụ, ka ọ na-ekwekọ n’ihe ha kweere na ọ bụ usoro iwu nke omume ziri ezi. Jehova emewo ka e dee ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị a n’Okwu ya.—Jenesis 1:26; Jọn 4:24; 17:17.
‘Ma ọtụtụ narị ụkpụrụ dị na Bible,’ ka mmadụ pụrụ ikwu. ‘Ọ gaghị ekwe m omume ịmara ha nile.’ Ọ bụ eziokwu. Otú ọ dị, tụlee eziokwu a: Ọ bụ ezie na ụkpụrụ Chineke nile Matiu 22:37-39, bụ́ ebe Jizọs gosiri na n’ime iwu ndị dị n’Iwu Mozis na ụkpụrụ ndị ha na ha kwekọrọ, ụfọdụ dị mkpa karịa ndị ọzọ.
bara uru, ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ karịa ibe ha. Ị pụrụ ịhụ nke ahụ naOlee ụkpụrụ ndị ka gbaa ọkpụrụkpụ? Ụkpụrụ ndị bụ́ isi nke Bible bụ ndị nwere kpọmkwem ihe jikọrọ ha na mmekọrịta anyị na Jehova. Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị na ha, Onye Okike na-aghọ onye bụ́ isi na-emetụta compass omume anyị. Tụkwasị na nke ahụ, e nwere ụkpụrụ ndị na-emetụta mmekọrịta anyị na ndị ọzọ. Itinye ha n’ọrụ ga-enyere anyị aka iguzogide mmụọ nke m godị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla a pụrụ ịkpọ ya.
Ka anyị jiri otu n’ime eziokwu ndị kasị mkpa dị n’ime Bible malite. Gịnị bụ eziokwu ahụ, oleekwa otú o si emetụta anyị?
“Onye Kachasị Ihe Nile Elu n’Elu Ụwa Nile”
Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na Jehova bụ Onye Okike Ukwu anyị, Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọ dịghị onye a pụrụ iji tụnyere ya ma ọ bụ onye a pụrụ iji dochie anya ya. Nke a bụ eziokwu bụ́ isi e dekọrọ na Bible.—Jenesis 17:1; Eklisiastis 12:1.
Otu n’ime ndị so dee akwụkwọ Abụ Ọma kwuru banyere Jehova, sị: “Nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Eze Devid oge ochie kwuru, sị: “Jehova, Gị nwe alaeze, Gị bụkwa Onye a na-eweli elu ịbụrụ ihe nile onyeisi.” A kpalikwara onye amụma ahụ a ma ama bụ́ Jeremaịa ide, sị: “Ọ dịghị nke dị ka Gị ma ọlị, Jehova; Onye ukwu ka Ị bụ, ihe dị ukwuu ka aha Gị dịkwa n’ịdị ike.”—Abụ Ọma 83:18; 1 Ihe E Mere 29:11; Jeremaịa 10:6.
Olee otú anyị kwesịrị isi jiri eziokwu ndị ahụ banyere Chineke na-eme ihe ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị?
O doro anya onye kwesịrị n’ezie ịnọ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị—Onye Okike anyị na Onye Na-enye anyị Ndụ. Mgbe ahụ, ọ́ gaghị abụ ihe kwesịrị ekwesị iguzogide ọchịchọ ọ bụla nke ịdọrọ uche gaa n’ebe onwe anyị nọ—ọchịchọ nke pụrụ ịdị ike n’ebe ụfọdụ nọ karịa n’ebe ndị ọzọ nọ? Ụkpụrụ nduzi amamihe dị na ya bụ ‘ime ihe nile iji nye Chineke otuto.’ (1 Ndị Kọrint 10:31) Daniel onye amụma setịpụrụ ezi ihe nlereanya na nke a.
Akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na e nwere oge otu nrọ mere ka Eze Nebukadneza nke Babilọn maa jijiji, o wee nye iwu ka a gwa ya ihe ọ pụtara. Ọ bụ ezie na ọ gbagwojuru mmadụ nile anya, Daniel gwara eze ahụ kpọmkwem ihe ọ chọrọ ịmara. Daniel ọ̀ naara otuto maka nke a? Ee e, o nyere ‘Chineke Onye nọ n’eluigwe, Nke na-ekpughe ihe nzuzo nile’ otuto. Daniel gara n’ihu, sị: “Ọ bụghị n’ihi amamihe ọ bụla nke dị n’ime m karịa n’ihe ọ bụla dị ndụ ka e kpugheworo ihe nzuzo a nye m.” Daniel bụ nwoke ji ụkpụrụ eme ihe. Ka a sịkwa ihe mere e ji kọwaa ya ugboro atọ n’akwụkwọ Daniel dị ka onye bụ́ “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu” n’anya Chineke.—Daniel 2:28, 30; 9:23; 10:11, 19.
Ị ga-erite uru ma ọ bụrụ na i ṅomie Daniel. Isi ihe dị oké mkpa n’ịgbaso ihe nlereanya Daniel bụ ebumnobi. Ònye kwesịrị inweta otuto maka ihe i mere? N’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ gị, i nwere ikike nke ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible a dị oké mkpa—Jehova bụ Eze Onyenwe anyị. Gị ime otú ahụ ga-eme ka ị bụrụ “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu” n’anya ya.
Ugbu a ka anyị tụlee ụkpụrụ abụọ bụ́ isi ndị pụrụ iduzi anyị n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya. N’agbanyeghị otú mmadụ iche nanị banyere onwe ya si bụrụ ihe juru ebe nile, akụkụ a nke ndụ bụ ihe na-ama aka karịsịa.
“Site n’Ịdị Nwayọọ n’Obi”
Ndị na-edebe onwe ha n’ọnọdụ mbụ adịghị enwekarị afọ ojuju. Ihe ka ọtụtụ na-achọ ndụ ka mma mgbe nile, ha na-achọkwa inweta ya ozugbo. Nye ha, ịdị umeala n’obi na-egosi adịghị ike. Ha na-ele ndidi anya dị ka ihe nanị ndị ọzọ kwesịrị igosipụta. Mgbe a bịara na ha inwe ihe ịga nke ọma, ihe ọ bụla dị mma. Ọ̀ dị gị ka ị pụrụ ịkpa àgwà n’ụzọ dị iche na nke ahụ?
Ndị ohu Chineke na-ezute ndị nwere ụdị àgwà ahụ kwa ụbọchị, ma ha ekwesịghị iṅomi ha. Ndị Kraịst tozuru okè na-anakwere ụkpụrụ ahụ bụ́ na “ọ bụghị onye na-ekwu okwu ọma banyere onwe ya ka a na-anwapụta, kama ọ bụ onye Jehova na-ekwu okwu ọma banyere ya.”—2 Ndị Kọrint 10:18.
Itinye ụkpụrụ dị ná Ndị Filipaị 2:3, 4 n’ọrụ ga-enye aka. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-agba gị ume ‘ịghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama site n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka gị.’ N’ụzọ dị otú a, ị ga ‘na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara gị, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’
Otu onye nke nwere àgwà kwesịrị ekwesị banyere onwe ya, nke tụkwara onwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụ Gidiọn, bụ́ onyeikpe Ndị Ikpe 6:12-16.
n’etiti ndị Hibru oge ochie. Ọ chọghị ịbụ onye ndú Izrel. Otú ọ dị, mgbe a họpụtara Gidiọn ka ọ bụrụ onye ndú, ọ dọọrọ uche gaa n’erughị eru ya. “[Otu puku ndị ikom] nke m bụ nke na-enweghị ike n’ime Manase, mụ onwe m bụkwa onye pekarịsịrị mpe n’ụlọ nna m,” ka ọ kọwara.—Ọzọkwa, mgbe Jehova mesịrị ka Gidiọn nwee mmeri, ndị ikom Ifrem sesịrị ya okwu. Olee otú Gidiọn si meghachi omume? Mmeri ahụ o nwere, ò mere ka onwe ya buo ya isi? Ee e. O zeere ọdachi site n’iji obi umeala zaghachi. “Gịnị ka m pụrụ ime dị ka nke unu mere?” Gidiọn dị umeala n’obi.—Ndị Ikpe 8:1-3.
N’eziokwu, ihe ndị ahụ metụtara Gidiọn mere ogologo oge gara aga. Ma, ọ bara uru ịtụle akụkọ ahụ. Ị pụrụ ịhụ na Gidiọn nwere àgwà dị nnọọ iche n’àgwà juru ebe nile taa, o bikwara ndụ kwekọrọ na ya, ọ bakwaara ya uru.
Àgwà juru ebe nile nke bụ́ ịdọrọ uche aga n’ebe onwe onye nọ pụrụ imerụ echiche anyị banyere ùgwù onwe onye. Ụkpụrụ Bible na-agbazi nke ahụ, na-akụziri anyị otú anyị hà n’ezie ma a bịa n’ebe Onye Okike na ndị ọzọ nọ.
Site n’ịṅa ntị n’ụkpụrụ Bible, anyị ga-emeri mmụọ nke m godị a juru ebe nile. Mmetụta ma ọ bụ ụdị mmadụ anyị bụ agaghịzi na-achịkwa anyị. Ka anyị na-amụtakwu banyere ụkpụrụ ezi omume, otú ahụ ka anyị na-amarakwu Onye malitere ha nke ọma. Ee, ịrịba ụkpụrụ Chineke ama n’ụzọ pụrụ iche mgbe anyị na-agụ Bible, ruru mgbalị e mere maka ya.—Lee igbe.
Jehova emewo ụmụ mmadụ ka ha dị elu karịa ụmụ anụmanụ, bụ́ ndị ihe na-achịkwa ha n’ụzọ bụ́ isi bụ amamihe ha bu pụta ụwa. Ịgbaso uche Chineke na-agụnye itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ. N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ime ka compass omume anyị na-arụ ọrụ nke ọma, bụ́ compass nke ga-eduru anyị banye n’usoro ihe ọhụrụ Chineke. Bible na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji na-atụ anya, n’isi nso, usoro ihe ọhụrụ zuru ụwa ọnụ bụ́ nke ‘ezi omume gaje ibi n’ime ya.’—2 Pita 3:13.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]
Ụkpụrụ Bible Ụfọdụ Ndị Pụrụ Inye Aka
N’ime ezinụlọ:
“Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 Ndị Kọrint 10:24.
‘Ịhụnanya adịghị achọ ọdịmma nke ya.’—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.
“Ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya.”—Ndị Efesọs 5:33.
“Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu.”—Ndị Kọlọsi 3:18.
“Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.”—Ilu 23:22.
N’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ebe azụmahịa:
“Ihe osìsì aghụghọ bụ ihe arụ . . . Onye na-emebi iwu na-arụta ego ọrụ okwu ụgha.”—Ilu 11:1, 18.
“Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike.”—Ndị Efesọs 4:28.
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.”—2 Ndị Tesalonaịka 3:10.
“Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-arụ ya dị ka ọ bụ nye Jehova.”—Ndị Kọlọsi 3:23.
“Anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18.
Omume n’ebe akụ̀ na ụba dị:
“Onye na-enukpọ onwe ya ịbụ ọgaranya, a gaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.”—Ilu 28:20.
“Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ.”—Eklisiastis 5:10.
Ịtụ ùgwù onwe onye n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀:
“Ọ bụrụ na mmadụ egwupụta ala nsọpụrụ ha ọ bụghị nsọpụrụ.”—Ilu 25:27.
“Ka onye ala ọzọ too gị, ma ọ bụghị ọnụ gị.”—Ilu 27:2.
“Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche.”—Ndị Rom 12:3.
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi nke ya.”—Ndị Galeshia 6:3.
[Foto dị na peeji nke 5]
Daniel nyere Chineke otuto ruuru Ya
[Foto dị na peeji nke 7]
Imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke na-eso eme ka e nwee ezi mmekọrịta na obi ụtọ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 7]
U.S. Fish & Wildlife Service, Washington, D.C./Robert Bridges