“Ònye Ka Mmadụ Na-asị Na Mụ Onwe M Bụ?”
“Ònye Ka Mmadụ Na-asị Na Mụ Onwe M Bụ?”
OGE Krismas eruola ọzọ. Ndị mmadụ gburugburu ụwa họọrọ ime otu ememe ncheta ọmụmụ. Ọ̀ bụ ememe ncheta ọmụmụ onye? Ọ̀ bụ nke Ọkpara Chineke ka ọ̀ bụ nnọọ nke onye Juu na-anụ ọkụ n’obi nke chọrọ ịgbanwe okpukpe a kasị mara amara n’ógbè ya na narị afọ mbụ? Ọ̀ bụ ememe ncheta ọmụmụ nke onye na-agbachitere ndị ogbenye, onye nnupụisi nke bụụrụ nnọọ Alaeze Ukwu Rom ihe iyi egwu nke mere ka ha gbuo ya, ka ọ̀ bụ, ma eleghị anya, nke onye amamihe nke mesiri ihe ọmụma onwe onye na amamihe ike? I nwere ihe mere ị ga-eji jụọ sị, ‘N’ezie, ònye ka Jisọs Kraịst bụ?’
Jisọs n’onwe ya nwere mmasị n’azịza ndị mmadụ nye ajụjụ ahụ. “Ònye ka mmadụ na-asị na Mụ onwe m bụ?” ka ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’otu oge. (Mak 8:27) Gịnị mere o ji jụọ ajụjụ ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị akwụsịlarị iso ya. O dokwara anya na ndị ọzọ nwere mgbagwoju anya na mmechuihu mgbe ọ jụsịrị mgbalị ha mere ime ya eze. Ọzọkwa, mgbe ndị iro Jisọs mara ya aka, o nyeghị ha ihe ịrịba ama sitere n’eluigwe iji gosipụta onye ọ bụ. Ya mere n’ịza ajụjụ ahụ, gịnị ka ndị ozi ya kwuru banyere onye ọ bụ? Ha kwuru ụfọdụ echiche ọtụtụ ndị nwere: “Ụfọdụ sị, Jọn Baptist; ma ndị ọzọ sị, Elaịja: ma ibe ha sị,
Matiu 16:13, 14) Ha ekwughị ọtụtụ aha mkparị kwesịrị ichebara echiche bụ́ ndị a na-anụ ebe nile na Palestine mgbe ahụ banyere Jisọs—onye nkwulu, onye nduhie, onye amụma ụgha, ọbụna onye isi mgbaka.
Jeremaịa, ma ọ bụ otu n’ime ndị amụma.” (Ọtụtụ Akụkụ nke Jisọs
Ọ bụrụ na Jisọs ajụọ otu ajụjụ ahụ taa, ọ pụrụ ọbụna ịtụgharị ya ịbụ: “Ònye ka ndị ọkà mmụta na-ekwu na mụ onwe m bụ?” Ọzọkwa, eleghị anya ihe a ga-aza ya ga-abụ: E nwere ọtụtụ echiche ndị dịrịtara iche. “Jisọs abụwo ịnyịnya nke ndị dị iche iche gbaraworo tinye isi n’ọtụtụ ebe dị iche iche,” ka David Tracy nke Mahadum Chicago kwuru. N’ime narị afọ gara aga, ndị ọkà mmụta ejiwo ọtụtụ ụzọ dị mgbagwoju anya nke nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze, nkà mmụta banyere ịdị adị mmadụ, na nke agụmakwụkwọ mee ihe, ka ha na-agbalị ichepụta azịza nye ajụjụ banyere onye Jisọs bụ n’ezie. N’ikpeazụ, ònye ka ha chere na Jisọs bụ n’ezie?
Ụfọdụ ndị ọkà mmụta nọgidere na-ekwu na Jisọs a kọrọ n’akụkọ ihe mere bụ onye amụma Juu na-ebu amụma banyere ọgwụgwụ, na-agba ndị mmadụ ume ka ha chegharịa. Otú ọ dị, ha zeere ịkpọ ya Ọkpara Chineke, Mesaịa, na Onye Mgbapụta. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-arụ ihe ndekọ Bible kwuru na o sitere n’eluigwe nakwa na a kpọlitere ya n’ọnwụ, ụka. Nye ndị ọzọ, Jisọs bụ nnọọ onye sitere ná ndụ ya kwesịrị nṅomi na ozizi ya kpalite ọtụtụ okpukpe bụ́ ndị mesịrị bịakọta ọnụ ghọọ Iso Ụzọ Kraịst. Dịkwa ka e kwuru n’akwụkwọ bụ́ Theology Today, ndị ọzọkwa na-ewere Jisọs dị ka “onye na-akatọkarị mmadụ, onye amamihe nke na-awagharị awagharị, ma ọ bụ onye nọ n’ọkwá dị elu nke na-anụ olu site n’ógbè ndị bụ́ mmụọ; onye nhazi obodo, nwa okorobia agiri isi ogologo na-agu uri bụ́ onye na-akatọ ọdịnala ọha mmadụ nakweere, ma ọ bụ agamevu nke e dupụrụ ịrụ arụrụala bụ́ onye na-ekwu ekwurekwu ka ọ na-agagharị n’ime obodo ndị dịpụrụ adịpụ na Palestine bụ́ ebe ndị na-abaghị ọgaranya, ebe iwe ji ọha na eze, ebe ndị na-achọkwa ịba n’ọgba aghara.”
E nwekwara echiche ndị ọzọ dị ịtụnanya. A na-egosipụta ihe oyiyi nke Jisọs na-eji oji n’egwu rap, n’ọrụ nkà ndị e debere n’ebe ndị mepere emepe, ọbụna n’ịgba egwu. * Ndị ọzọ na-eche na n’ezie Jisọs bụ nwanyị. N’oge okpomọkụ nke 1993, ndị ọbịa bịara Ememe Ngosi Ngwá Ahịa nke Orange County na California hụrụ ihe ọkpụkpụ bụ́ “Kristi,” bụ́ “Kraịst” bụ́ nwanyị gba ọtọ nke nọ n’elu obe. Ihe dị ka n’otu oge ahụ na New York, a nọkwa na-egosi “Krista”—“Jisọs” bụ́ nwanyị nke a kpọgidere n’elu obe. Ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ kpalitekwara arụmụka nke ha. Ná mmalite 1999 kwa, ndị na-azụ ihe hụrụ akwụkwọ kọrọ “banyere ịhụnanya dị n’etiti Nwa Okoro bụ́ Jisọs na nkịta ya, bụ́ Angel.” A kọwara mmekọrịta ha dị ka nke “na-akpali akpali n’ụzọ ime mmụọ ma na-egosi otú nwa okoro na nkịta si dị njikere ịchụ ndụ ha n’àjà n’ihi ibe ha.”
Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie?
N’ihi gịnị ka ị ga-eji nwee mmasị n’onye Jisọs bụ? Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ bụ n’ihi na, dị ka Napoleon si kwuo, “Jisọs Kraịst enwewo mmetụta ma chịa ndị nọ n’okpuru Ya n’anọghị n’anụ ahụ.” Site n’ozizi ya magburu onwe ha na otú o si bie ndụ, Jisọs enwewo mmetụta dị ukwuu ná ndụ ọtụtụ ijeri mmadụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ. Otu onye edemede kwuru n’ụzọ dabara adaba, sị: “Ndị agha nile zọtụworo njem, na ndị agha mmiri nile e guzobetụworo, na òtù ndị omeiwu nile nọtụworo n’ọkwá, ndị eze nile chịtụworonụ, e jikọta ha nile ọnụ, ha enwebeghị mmetụta ná ndụ ndị mmadụ n’ụwa a ruo otú o meworo.”
Ọzọkwa, ọ dị gị mkpa ịmara onye Jisọs bụ n’ihi na ọ ga-emetụta ọdịnihu gị kpọmkwem. I nwere ohere nke ịghọ onye otu ọchịchị eluigwe nke e guzobewororịị—Alaeze Chineke nke dị n’aka Jisọs—ga-achị. A ga-eme ka mbara ala anyị nke e metọworo nweghachi ọmarịcha ihe dị iche iche dị ndụ, meekwa ka njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị, n’okpuru nduzi Jisọs. Amụma Bible na-emesi anyị obi ike na Alaeze Jisọs ga-enye ndị agụụ na-agụgbu nri, lekọta ndị ogbenye, gwọọ ndị ọrịa, ma mee ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ.
N’ezie ị ga-achọ ịmara ụdị onye ga-achị n’ọchịchị dị otú ahụ a na-achọsi ike. Isiokwu na-esonụ ga-enyere gị aka ịghọta onye Jisọs nke bụ́ ezigbo ya bụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Banyere ọdịdị elu ahụ Jisọs, lee isiokwu bụ́ “Olee Otú Jisọs Dị n’Ile Anya?,” nke dị ná mbipụta Teta! nke December 8, 1998.