Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ!

Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ!

Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ!

OTU nwoke maara ihe dere n’otu oge, sị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” (Ilu 24:10) Ọ bụrụ na i nwetụla nkụda mmụọ, o yiri ka ị ga-ekwenye n’okwu ahụ.

Ọ dịghị onye na-adịghị enwe nkụda mmụọ. Obere nkụda mmụọ pụrụ ịdịru otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ ma kwụsịzie. Ma mgbe ọ gụnyere mwute ma ọ bụ iwe, nsogbu ahụ pụrụ ịdịtekwu aka. Ụfọdụ ndị Kraịst bụ́ ndị kwesịworo ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ aghọọla ndị nwere nnọọ nkụda mmụọ nke na ha akwụsịla ọbụna ịga nzukọ ọgbakọ na ikere òkè n’ozi ubi.

Ọ bụrụ na i nwere nkụda mmụọ, kara obi! Ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ndị gara aga nwere ihe ịga nke ọma n’ịnagide nkụda mmụọ, sitekwa n’enyemaka Chineke, ị pụrụ ime otú ahụ.

Mgbe Ndị Ọzọ Mere Ihe Wutere Gị

Ị pụghị ịtụ anya na ọ dịghị onye ga-agwa gị okwu a na-akpachapụghị anya kwuo ma ọ bụ mesoo gị omume n’echeghị echiche. Otú ọ dị, ị pụrụ ịghara ikwe ka ezughị okè nke ndị ọzọ metụta ozi ị na-ejere Jehova. Ọ bụrụ na mmadụ mere ihe wutere gị, ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe enyemaka ịtụle otú Hana, bụ́ nne Samuel, si dozie otu ọnọdụ na-akụda mmụọ.

Hana chọsịrị ike ịmụ ụmụ, ma, ọ bụ nwanyị àgà. Nwunye di ya, bụ́ Penina, amụọlararị di ya ụmụ ndị ikom na ndị inyom. Kama inwe mmetụta banyere nsogbu Hana, Penina lere ya anya dị ka onye ya na ya na-amarịta aka ma gosipụta àgwà dị otú ahụ n’ebe ọ nọ nke na Hana ‘kwara ákwá, ghara iri ihe.’—1 Samuel 1:2, 4-7.

Otu ụbọchị, Hana rịgoruru n’ụlọikwuu ikpe ekpere. Ilaị, bụ́ onyeisi nchụàjà Israel, hụrụ ka egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị. N’amaghị na Hana na-ekpe ekpere, Ilaị kwubiri na ọ ghaghị ịbụ na mmanya na-egbu ya. “Ruo ole mgbe [ka] ị ga na-aṅụbiga mmanya ókè?” ka ọ jụrụ. “Wezụga mmanya vine gị n’ahụ gị.” (1 Samuel 1:12-14) Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche otú obi na-aghaghị ịdịwo Hana? Ọ bịara n’ụlọikwuu ahụ inweta agbamume. N’ezie, ọ tụghị anya na otu n’ime ndị ikom a kasị asọpụrụ n’Israel ga-ebo ya ebubo n’ụzọ na-ezighị ezi!

Ọnọdụ a pụrụ imewo ka Hana nwee nkụda mmụọ. Ọ pụrụ isiwo n’ụlọikwuu ahụ pụọ ozugbo, na-aṅụ iyi na ya agaghị alaghachi ebe ahụ ọzọ ruo ogologo oge nile Ilaị ga-abụ onyeisi nchụàjà. Otú ọ dị, o doro anya na Hana ji mmekọrịta ya na Jehova kpọrọ ihe. Ọ maara na obi agaghị adị Jehova ụtọ ma ya mee otú ahụ. Ụlọikwuu ahụ bụ ebe ofufe dị ọcha hiwere isi. Jehova emewo ka aha ya dịkwasị n’ebe ahụ. N’agbanyeghịkwa otú ọ bụruru onye na-ezughị okè, Ilaị bụ onye nnọchiteanya Jehova họọrọ.

Ụzọ nsọpụrụ Chineke nke Hana si meghachi omume banyere ebubo Ilaị boro ya bụụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya taa. O kweghị ka e bo ya ebubo n’ụzọ na-ezighị ezi, kama o ji nnọọ nkwanye ùgwù meghachi omume. “Ee e, onyenwe m,” ka ọ zaghachiri. “Nwanyị nke mmụọ ya dị arọ ka m bụ: ọ dịghị mmanya vine ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya m ṅụworo, kama awụsịrị m mkpụrụ obi m n’ihu Jehova. Agụla ohu gị nwanyị na nwanyị jọgburu onwe ya: n’ihi na ọ bụ n’ọtụtụ ntụgharị uche m na mkpasu iwe m ka m siteworo kwuo okwu ruo ugbu a.”—1 Samuel 1:15, 16.

Hana ò mere ka okwu ya doo anya? N’ezie o mere. Ma, o ji akọ gwa Ilaị okwu, ọ nwaghị ịkatọ ya maka ebubo ụgha o boro ya. N’aka nke ya, Ilaị ji obiọma zaghachi ya, na-asị: “Laa n’udo: Chineke Israel nyekwa gị arịrịọ gị nke ị rịọworo n’aka Ya.” Ozugbo e doziri okwu ahụ, Hana “wee jee ije ya, rie ihe, ihu ya agbarụghịkwa n’ihi ya ọzọ.”—1 Samuel 1:17, 18.

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe ndekọ a? Hana mere ihe ngwa ngwa iji dozie nghọtahie, ma o ji nkwanye ùgwù miri emi mee otú ahụ. N’ihi ya, o chebere ezi mmekọrịta ya na Jehova nakwa nke ya na Ilaị. Lee ka ezi nkwurịta okwu na ịdịtụ akọ pụrụ mgbe mgbe isi gbochie nsogbu ndị dị obere ịghọ ndị hikwuru nne!

Mmadụ aghaghị ịghọta na iso ndị ọzọ dozie nghọtahie na-achọ obi umeala na ime mgbanwe, ma n’aka ya ma na n’aka ndị ahụ. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe gị ajụ ịnabata mgbalị ndị ị na-eme idozi nghọtahie gị na ya nwere, ị pụrụ ịhapụrụ Jehova okwu ahụ, na-enwe ntụkwasị obi na ọ ga-edozi ya n’oge ya nakwa n’ụzọ nke ya.

Ihe Ùgwù Ije Ozi Ò Funahụwo Gị?

Ụfọdụ adawo mbà n’obi n’ihi ịbụ ndị na-aghaghị ịhapụ ihe ùgwù ha ji kpọrọ ihe n’ozi Chineke. Ha nwere mmasị ijere ụmụnna ha ozi, mgbe ihe ùgwù ahụ funahụkwara ha, ha echee na ọ dịghịzi uru ha baara Jehova ma ọ bụ nzukọ ya. Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị, ị pụrụ inweta nghọta site n’ịtụle ihe atụ nke onye so dee Bible bụ́ Mak, nke a na-akpọkwa Jọn Mak.—Ọrụ 12:12.

Mak so Pọl na Banabas mee njem ozi ala ọzọ mbụ ha, ma ọ hapụrụ ha n’ụzọ ma laghachi Jerusalem. (Ọrụ 13:13) Mgbe e mesịrị, Banabas chọrọ ka Mak soro ha na njem ọzọ. Otú ọ dị, Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghị Pọl mma ka ha kuru onye ahụ ka ya na ha yịkọọ jee, bụ́ onye si na Pamfilia hapụ ha laghachi, ghara isokwa ha jee ọrụ ha.” Banabas ekweghị. “Oké iwe,” ka ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu, “wee pụta n’etiti ha, nke mere ka [Pọl na Banabas] kewaa otu onye n’ebe ibe ya nọ, Banabas wee kuru Mak nye onwe ya, wee baa n’ụgbọ jee Saịprọs; ma Pọl họpụtara Saịlas, wee pụọ.”—Ọrụ 15:36-40.

Mak aghaghị inwewo nkụda mmụọ n’ịmara na Pọl onyeozi a na-akwanyere ùgwù achọghị iso ya rụkọọ ọrụ nakwa na esemokwu e nwere banyere iru eru ya emewo ka Pọl na Banabas kewaa. Ma, ọ bụghị ebe ahụ ka okwu gwụrụ.

Pọl na Saịlas ka chọrọ onye ga-eso ha mee njem. Mgbe ha rutere Listra, ha hụrụ onye a ga-eji dochie anya Mak, nwa okorobịa aha ya bụ Timoti. Ugbu a, ọ pụrụ ịbụwo na e mere Timoti baptism nanị afọ abụọ ma ọ bụ atọ tupu oge ahụ a họọrọ ya. N’aka nke ọzọ, Mak esowo ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọrịta kemgbe ọ malitere—n’ezie, ọ nọtewo aka na ya karịa Pọl n’onwe ya. Ma, ọ bụ Timoti nwetara ọrụ ahụ dị ùgwù.—Ọrụ 16:1-3.

Olee otú Mak si meghachi omume mgbe ọ matara na e jiriwo onye ọ tọrọ atọ, nke ọ ka nwee ahụmahụ dochie anya ya? Bible ekwughị. Otú o sina dị, o gosipụtara na Mak nọgidere na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. O ji ihe ùgwù ndị o nwere mee ihe. Ọ bụ ezie na o nweghị ike iso Pọl na Saịlas jee ozi, o so Banabas jee Saịprọs, bụ́ obodo Banabas. Mak sokwa Pita jee ozi na Babilọn. E mesịa, o nwetara ohere nke iso Pọl—na Timoti—rụkọọ ọrụ na Rom. (Ndị Kọlọsi 1:1; 4:10; 1 Pita 5:13) N’ikpeazụ, e nyere Mak ọbụna ike mmụọ nsọ ide otu n’ime Oziọma ndị ahụ!

Ihe a nile na-enye ihe mmụta bara uru. Mak enweghị nnọọ nchegbu banyere ihe ùgwù funahụrụ ya nke na o nweghị ekele maka ihe ùgwù ndị ọ ka nwere. Mak nọgidere na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova, Jehova gọzikwara ya.

Ya mere, ọ bụrụ na ihe ùgwù efunahụwo gị, enwela nkụda mmụọ. Ọ bụrụ na ị nọgide na-enwe àgwà ziri ezi ma na-arụsi ọrụ ike, a pụrụ inye gị ihe ùgwù ndị ọzọ. E nwere ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị.—1 Ndị Kọrint 15:58.

Otu Ohu Kwesịrị Ntụkwasị Obi Enwee Nkụda Mmụọ

Ọ dịghị mfe ịgbasi mgba nke okwukwe ike. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ inwe nkụda mmụọ. Mgbe ahụ, ị pụrụ ọbụna inwe obi amamikpe banyere ịbụ onye a kụdara mmụọ, na-ekwubi na ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ekwesịghị inwe mmetụta dị otú ahụ ma ọlị. Chee banyere Elaịja, bụ́ otu n’ime ndị amụma a ma ama n’Israel.

Mgbe Eze Nwanyị Jezebel nke Israel, bụ́ onye ji ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè kwalite ofufe Beal, nụrụ na Elaịja egbuola ndị amụma Beal, ọ ṅụrụ iyi igbu ya. Elaịja echewo ndị iro karịrị Jezebel ihu, ma na mberede, o nwere nnọọ nkụda mmụọ nke na ọ chọrọ ịnwụ. (1 Ndị Eze 19:1-4) Nke ahụ pụrụ isiwo aṅaa mee? Ọ dị ihe o chefuru.

Elaịja echefuwo ilegara Jehova anya dị ka Isi Iyi nke ike ya. Ònye nyere Elaịja ike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ na iche ndị amụma Beal ihu? Ọ bụ Jehova. N’ezie, Jehova pụrụ inye ya ike iche ọnụma nke Eze Nwanyị Jezebel ihu.—1 Ndị Eze 17:17-24; 18:21-40; 2 Ndị Kọrint 4:7.

Onye ọ bụla pụrụ inwe obi abụọ ruo nwa oge banyere ntụkwasị obi o nwere n’ebe Jehova nọ. Dị ka Elaịja, ị pụrụ mgbe ụfọdụ ile nsogbu ụfọdụ anya n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya kama iji “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” dozie ya. (Jemes 3:17) Otú ọ dị, Jehova agbahapụghị Elaịja maka ọdịda a ọ dara ruo nwa oge.

Elaịja gbagara Bia-sheba ma banyezie n’ime ọzara, bụ́ ebe o chere na ọ dịghị onye pụrụ ịchọta ya. Ma Jehova chọtara ya. O zigara otu mmụọ ozi ịkasi ya obi. Mmụọ ozi ahụ mere nnọọ ka Elaịja nweta achịcha e mere ọhụrụ ọ ga-ata na mmiri jụrụ oyi ọ ga-aṅụ. Mgbe Elaịja zusịrị ike, mmụọ ozi ahụ duziri ya ịga njem ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 300 ruo Ugwu Horeb, bụ́ ebe Jehova ga-anọ wusikwuo ya ike.—1 Ndị Eze 19:5-8.

N’Ugwu Horeb, Elaịja hụrụ ngosipụta na-ewusikwu okwukwe ike nke ike Jehova. E mesịa, Jehova ji olu dị ala ma dị jụụ mesie ya obi ike na ọ nọghị nanị ya. Jehova nọnyeere ya, ụmụnna ya 7,000 nọnyekwaara ya, ọ bụ ezie na Elaịja amaghị. N’ikpeazụ, Jehova nyere ya ọrụ ọ ga-arụ. Ọ gbahapụbeghị Elaịja dị ka onye amụma ya!—1 Ndị Eze 19:11-18.

Enyemaka Dị

Ọ bụrụ na ị na-enwe obere nkụda mmụọ site n’oge ruo n’oge, ị pụrụ ịchọpụta na ahụ ga-aka adị gị mma ma ọ bụrụ na ị na-ezu ike karị ma ọ bụ na-erikwu nri na-edozi ahụ. Nathan H. Knorr, bụ́ onye jere ozi dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ na 1977, kwuru n’otu oge na nnukwu nsogbu na-adịkarị nnọọ ka obere ihe mgbe mmadụ hisịrị ụra abalị nke ọma. Otú ọ dị, mgbe nsogbu ahụ nọgidere na-agakwu n’ihu, e nwere ike ihe ngwọta dị otú ahụ agaghị ezu—enyemaka ga-adị gị mkpa iji lụsoo nkụda mmụọ ọgụ.

Jehova zigara mmụọ ozi iji wusikwuo Elaịja ike. Taa, Chineke na-enye agbamume site n’aka ndị okenye na ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè. N’ezie, ndị okenye pụrụ ‘ịdị ka ebe izonahụ ifufe.’ (Aịsaịa 32:1, 2) Ma iji nweta agbamume site n’aka ha, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịgakwuru ha. N’agbanyeghị otú Elaịja nweruru nkụda mmụọ, o mere njem gaa n’Ugwu Horeb iji nata ntụziaka site n’aka Jehova. Anyị na-enweta ntụziaka ndị na-ewusikwu anyị ike site n’ọgbakọ ndị Kraịst.

Mgbe anyị na-anakwere enyemaka ma na-eji obi ike eche ule ihu, dị ka mkpasu iwe ma ọ bụ mfu nke ihe ùgwù ụfọdụ, anyị na-adụnyere Jehova úkwù n’otu ihe iseokwu dị mkpa. Olee ihe iseokwu ọ bụ? Setan zọọrọ na ụmụ mmadụ na-ejere Jehova ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe ha. Setan adịghị arụ ụka na anyị ga-ejere Chineke ozi mgbe ihe nile na-agaziri anyị ná ndụ, kama ọ na-azọrọ na anyị ga-akwụsị ijere Chineke ozi mgbe anyị dabara ná nsogbu. (Job, isi nke 1 na nke 2) Site n’iji nkwụsi ike na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị nkụda mmụọ, anyị pụrụ inye aka ịzaghachi Ekwensu okwu banyere ebubo nkwutọ ya.—Ilu 27:11.

Hana, Mak, na Elaịja nwechara nsogbu ndị napụrụ ha ọṅụ ha ruo nwa oge. Otú ọ dị, ha nagidere nsogbu ha ma bie ndụ na-akwụghachi ụgwọ. Site n’enyemaka Jehova, gị onwe gị kwa pụrụ ịnagide nkụda mmụọ!