‘Chineke, Zipụta Ìhè Gị’
‘Chineke, Zipụta Ìhè Gị’
“Zipụta ìhè Gị na eziokwu Gị; ka ha onwe ha na-edu m.”—Abụ Ọma 43:3.
1. Olee otú Jehova si ekpughe nzube ya dị iche iche?
JEHOVA na-echebara ndị mmadụ echiche n’ụzọ o si eme ka ndị ohu ya mara nzube ya dị iche iche. Kama ikpughe eziokwu ahụ nile n’otu mgbe na n’otu mgbukepụ ìhè na-egbu anya, ọ na-enye anyị ihe ọmụma n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. A pụrụ iji ije anyị na-eje n’okporo ụzọ nke ndụ tụnyere njem mmadụ na-eme n’ogologo ụzọ ọhịa. Ọ na-amalite n’isi ụtụtụ ma na-ahụ ụzọ nke nta. Ka anyanwụ ji nwayọọ nwayọọ na-awapụta na mbara igwe, onye njem ahụ na-enwe ike ịmata
ọdịiche dị n’etiti ihe ole na ole ndị dị ya gburugburu. Ọ na-ahụ ihe ndị ọzọ inyoghi inyoghi. Ma ka anyanwụ nọgidere na-awapụta, ọ pụrụ ịhụkwu ebe ndị dị anya. Otú ahụ ka ọ dị n’ebe ìhè ime mmụọ nke Chineke na-enye dị. Ọ na-ekwe ka anyị ghọta ihe ole na ole n’otu mgbe. Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, nyere ihe ọmụma ime mmụọ n’ụzọ yiri nke ahụ. Ka anyị tụlee otú Jehova si nye ndị ya ihe ọmụma n’oge ochie na otú o si eme otú ahụ n’oge a.2. Olee otú Jehova si nye ihe ọmụma tupu oge ndị Kraịst?
2 O yikarịrị ka ọ bụ ụmụ Kora dere Abụ Ọma nke 43. Dị ka ndị Livaị, ha nwere ihe ùgwù nke ịkụziri ndị mmadụ Iwu Chineke. (Malakaị 2:7) N’ezie, Jehova bụ Onye Nkụzi Ukwu ha, ha legakwaara ya anya dị ka Isi Iyi nke amamihe nile. (Aịsaịa 30:20) “Chineke, . . . zipụta ìhè Gị na eziokwu Gị,” ka ọbụ abụ ahụ kpere n’ekpere. “Ka ha onwe ha na-edu m.” (Abụ Ọma 43:1, 3) Ruo ogologo oge ụmụ Israel nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, ọ kụziiri ha ụzọ ya nile. Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, Jehova nyere ha ụdị ìhè na eziokwu kasị dị ịrịba ama. Chineke mere otú ahụ mgbe o zitere Ọkpara ya n’ụwa.
3. Olee ụzọ ozizi Jisọs si lee ndị Juu ule?
3 Mgbe ọ bụ nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke bụ “ìhè nke ụwa.” (Jọn 8:12) Ọ kụziiri ndị mmadụ “ọtụtụ ihe n’ilu dị iche iche”—ihe ọhụrụ dị iche iche. (Mak 4:2) Ọ gwara Pọntiọs Paịlet, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.” (Jọn 18:36) Nke ahụ bụụrụ onye Rom nakwa n’ezie ndị Juu hụrụ mba ha n’anya echiche ọhụrụ, n’ihi na ha chere na Mesaịa ahụ ga-emeri Alaeze Ukwu Rom ma weghachite Israel n’ebube mbụ ya. Jisọs nọ na-egosipụta ìhè sitere n’aka Jehova, ma ihe ndị o kwuru atọghị ndị ọchịchị ndị Juu ụtọ, bụ́ ndị “hụrụ otuto mmadụ n’anya karịa otuto Chineke.” (Jọn 12:42, 43) Ọtụtụ n’ime ndị ahụ họọrọ ịrapagidesi ike n’ọdịnala ha nke ụmụ mmadụ karịa ịnakwere ìhè na eziokwu ime mmụọ sitere n’aka Chineke.—Abụ Ọma 43:3; Matiu 13:15.
4. Olee otú anyị si mara na ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-anọgide na-eto eto ná nghọta?
4 Otú ọ dị, ndị ikom na ndị inyom ole na ole nwere obi eziokwu ji ọṅụ nabata eziokwu Jisọs kụziri. Ha nọgidere na-enwe ọganihu ná nghọta ha nke nzube Chineke. Otú ọ dị, ka ndụ elu ala nke Onye Ozizi ha na-eru ná njedebe, ha ka nwere ihe dị ukwuu ịmụta. Jisọs gwara ha, sị: “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ ịgwa unu, ma unu apụghị iburu ha ugbu a.” (Jọn 16:12) Ee, ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-anọgide na-eto eto ná nghọta nke eziokwu Chineke.
Ìhè ahụ Nọgidere Na-enwu
5. Olee ajụjụ bilitere na narị afọ mbụ, ole ndị nwekwara ibu ọrụ idozi ya?
5 Mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, ìhè sitere n’aka Chineke nwuru n’ụzọ gbachapụrụ agbachapụ karịa ka o nwuru na mbụ. N’ọhụụ o mere ka Pita hụ, Jehova kpughere na malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù pụrụ ịghọ ụmụazụ Kraịst. (Ọrụ 10:9-17) Nke ahụ bụ ihe ọhụrụ! Ka o sina dị, otu ajụjụ bilitere mgbe e mesịrị: Jehova ọ̀ chọrọ ka ndị Jentaịl dị otú ahụ bie úgwù mgbe ha ghọsịrị ndị Krịast? A zaghị ajụjụ ahụ n’ọhụụ ahụ, okwu ahụ ghọkwara isiokwu a rụụrụ ụka n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ n’etiti ndị Kraịst. A ghaghị idozi ya, ka ọ ghara imebi ịdị n’otu ha dị oké ọnụ ahịa. Ya mere, na Jerusalem, “ndị ozi na ndị okenye [zukọrọ] ile okwu a.”—Ọrụ 15:1, 2, 6.
6. Ụkpụrụ dị aṅaa ka ndị ozi na ndị okenye ahụ gbasoro mgbe ha tụlere ajụjụ banyere ibi úgwù?
6 Olee otú ndị nọ ná nzukọ ahụ pụrụ isi chọpụta ihe bụ́ uche Chineke maka ndị Jentaịl kwere ekwe? Jehova ezigaghị mmụọ ozi iduzi nkwurịta okwu ahụ, o meghịkwa ka ndị nọ ya hụ ọhụụ. Ma, ọ hapụghị ndị ozi na ndị okenye ahụ kpam kpam n’enyeghị ha nduzi. Ha tụlere akaebe sitere n’aka ndị Juu ụfọdụ bụ́ ndị Kraịst, ndị hụworo otú Chineke si malite imeso ndị mba ọzọ ihe, na-awụkwasị ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù mmụọ nsọ ya. Ha nyochakwara Akwụkwọ Nsọ maka nduzi. N’ihi ya, Jemes onye na-eso ụzọ tụrụ aro dabeere n’akụkụ akwụkwọ nsọ na-enye ihe ọmụma. Ka ha Ọrụ 15:12-29; 16:4.
na-atụgharị uche n’ihe àmà ahụ, uche Chineke bịara doo anya. Ọ dịghị ndị mba ọzọ mkpa ibi úgwù iji bụrụ ndị Jehova nakweere. Ndị ozi na ndị okenye ahụ egbughị oge ọ bụla n’idetu mkpebi ahụ edetu ka o wee duzie ndị Kraịst ibe ha.—7. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst narị afọ mbụ si na-enwe ọganihu?
7 N’adịghị ka ndị ndú okpukpe ndị Juu, bụ́ ndị rapagidesiri ike n’ọdịnala nna nna ha, ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu bụ́ ndị Kraịst ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha nwetara nghọta ọhụrụ a dị ịrịba ama nke nzube Chineke banyere ndị mba ọzọ, n’agbanyeghị na ịnakwere ya chọrọ ka ha gbanwee echiche ha banyere ndị Jentaịl n’ozuzu ha. Jehova gọziri àgwà obi umeala ha, “a [na-enyekwa] nzukọ Kraịst ike n’okwukwe anyị, ọnụ ọgụgụ ha na-ababigakwa ụba ókè kwa ụbọchị.”—Ọrụ 15:31; 16:5.
8. (a) Olee otú anyị si mara na a pụrụ ịtụkwu anya ìhè mgbe narị afọ mbụ gasịrị? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa dị mkpa ka anyị ga-atụle?
8 Ìhè ime mmụọ nọgidere na-enwu na narị afọ mbụ dum. Ma Jehova ekpughereghị ndị Kraịst oge mbụ akụkụ nile nke nzube ya. Pọl onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya nke narị afọ mbụ, sị: “Ugbu a anyị ji enyo hụ ihe, n’ime ilu.” (1 Ndị Kọrint 13:12) Enyo dị otú ahụ enweghị ihu na-egosipụtacha ihe n’ụzọ kasị mma. Mgbe ahụ, na mbụ, ịghọta ìhè ime mmụọ ga-abụ nke a kpaara ókè. Mgbe ndị ozi nwụsịrị, ìhè ahụ bịara dị inyoghi inyoghi ruo oge ụfọdụ, ma n’oge a, ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ abawo ụba. (Daniel 12:4) Olee otú Jehova si enye ndị ya ihe ọmụma n’oge a? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe o mere ka nghọta anyị nke Akwụkwọ Nsọ sakwuo mbara?
Ìhè ahụ Anọgide Na-enwupụtawanye
9. Olee usoro ọmụmụ Bible pụrụ iche ma dị irè nke Ndị Mmụta Bible oge mbụ ji mee ihe?
9 N’oge a, ìhè mbụ bụ́ ezie malitere inwupụtatụ n’afọ iri abụọ na ise ikpeazụ nke narị afọ nke 19, ka otu ìgwè ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi malite ịmụ Akwụkwọ Nsọ. Ha wepụtara ụzọ dị irè maka ọmụmụ Bible. Otu onye ga-ajụ ajụjụ; mgbe ahụ ìgwè ahụ ga-atụle akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile metụtara ya. Mgbe otu amaokwu Bible yiri ka ọ na-emegide ibe ya, ndị Kraịst a nwere obi eziokwu na-agbalị ime ka ha abụọ kwekọọ. N’adịghị ka ndị ndú okpukpe nke oge ahụ, Ndị Mmụta Bible ahụ (dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ) kpebisiri ike ikwe ka Akwụkwọ Nsọ, ọ bụghị ọdịnala ma ọ
bụ ozizi mmadụ chepụtara, bụrụ ihe na-eduzi ha. Mgbe ha tụlesịrị ihe àmà Akwụkwọ Nsọ nile dịnụ, ha na-edekọ mkpebi ha. N’ụzọ dị otú ahụ, e mere ka ha nwee nghọta doro anya nke ọtụtụ ozizi bụ́ isi nke Bible.10. Akwụkwọ ndị dị aṅaa na-enye aka ịmụ Bible ka Charles Taze Russell dere?
10 Onye pụtara ìhè n’etiti Ndị Mmụta Bible ahụ bụ Charles Taze Russell. O dere mpịakọta akwụkwọ isii ndị na-enye aka ịmụ Bible ndị aha ha bụ Studies in the Scriptures. Nwanna Russell bu n’uche ide mpịakọta nke asaa, bụ́ nke ga-akọwa akwụkwọ Bible ndị bụ́ Ezikiel na Mkpughe. “Mgbe ọ bụla m nwetara nkọwa,” ka o kwuru, “aga m ede Mpịakọta nke Asaa.” Otú ọ dị, ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị enye onye ọzọ nkọwa ahụ, ọ pụrụ ide ya.”
11. Olee njikọ oge na nghọta anyị banyere nzube Chineke, nwere?
11 Ihe ahụ dị n’elu nke C. T. Russell kwuru na-egosipụta otu akụkụ dị mkpa nke na-eme ka anyị nwee ike ịghọta akụkụ ụfọdụ nke Bible—oge. Nwanna Russell maara na ọ pụghị ịmanye ìhè ahụ inwukwasị n’akwụkwọ Mkpughe dị nnọọ ka onye njem ọ na-enu enu n’ahụ na-apụghị ịmanye anyanwụ ịwapụta tupu oge ya.
E Kpughere Ya—Kama Ọ Bụ n’Oge Chineke Kara Aka
12. (a) Olee mgbe a na-akasị aghọta amụma Bible? (b) Ihe atụ dị aṅaa na-egosi na ikike anyị nwere ịghọta amụma Bible na-adabere n’oge Chineke yiri? (Lee nkọwa ala ala peji.)
12 Dị nnọọ ka ndị ozi ahụ ghọtara ọtụtụ amụma banyere Mesaịa ahụ nanị mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, ndị Kraịst taa na-aghọta amụma Bible n’ụzọ kasị zuo ezu nanị mgbe o mezusịworo. (Luk 24:15, 27; Ọrụ 1:15-21; 4:26, 27) Mkpughe bụ akwụkwọ amụma, ya mere anyị kwesịrị ịtụ anya ịghọta ya n’ụzọ kasị doo anya ka ihe omume ndị ọ na-akọwa na-eme. Dị ka ihe atụ, C. T. Russell apụghị ịghọtawo ihe anụ ọhịa ihe atụ ahụ na-acha uhie uhie nke a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 17:9-11 pụtara, ebe ọ bụ na òtù ndị anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ha, ya bụ, Njikọ Mba Nile na òtù Mba Ndị Dị n’Otu, adịghịdị adị ruo mgbe ọ nwụsịrị. *
13. Gịnị na-eme mgbe ụfọdụ mgbe a mụkwasịrị ìhè n’otu isiokwu Bible?
13 Mgbe ndị Kraịst oge mbụ ghọtara na ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù pụrụ ịghọ ndị kwere ekwe ibe ha, mgbanwe ahụ dugara n’ajụjụ ọzọ banyere mkpa ọ dị ndị mba ọzọ ịbụ ndị e biri úgwù. Nke a kpaliri ndị ozi na ndị okenye ahụ inyochaghachi okwu obibi úgwù ahụ dum. Otu ụkpụrụ ahụ ka a na-agbaso taa. Mgbe ụfọdụ, mgbukepụ nke ìhè n’otu isiokwu Bible na-eduga ndị ohu Chineke e tere mmanụ, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” inyochagharị isiokwu ndị metụtara ya, dị ka ihe atụ na-esonụ bụ́ nke mere n’oge na-adịbeghị anya na-egosi.—Matiu 24:45.
14-16. Olee otú mgbazi e mere n’echiche anyị banyere ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ si metụta nghọta anyị nwere banyere Ezikiel isi nke 40 ruo 48?
14 Na 1971, e bipụtara nkọwa nke amụma Ezikiel n’akwụkwọ bụ́ “The Nations Shall Know That I Am Jehovah”—How? Otu isiakwụkwọ nke akwụkwọ ahụ tụlere ọhụụ Ezikiel banyere ụlọ nsọ, n’ụzọ dị mkpirikpi. (Ezikiel, isi nke 40-48) N’oge ahụ, ihe e lekwasịrị anya bụ otú a ga-esi emezu ọhụụ Ezikiel banyere ụlọ nsọ n’ụwa ọhụrụ ahụ.—2 Pita 3:13.
15 Otú ọ dị, isiokwu abụọ e bipụtara n’Ụlọ Nche nke December 1, 1972, metụtara nghọta anyị banyere ọhụụ Ezikiel. Ha kwuru banyere ụlọ nsọ ime mmụọ ukwu ahụ nke Pọl onyeozi kọwara ná Ndị Hibru isi nke 10. Ụlọ Nche ahụ kọwara na Ebe Nsọ ahụ na ogige ahụ dị n’ime nke ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ metụtara ọnọdụ nke ndị ahụ e tere mmanụ mgbe ha nọ n’ụwa. Mgbe a tụleghachiri Ezikiel isi nke 40 ruo 48 mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, a ghọtara na dị nnọọ ka ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ na-arụ ọrụ taa, otú ahụ ka ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-aghaghị ịdị na-arụ ọrụ taa. N’ụzọ dị aṅaa?
16 N’ọhụụ Ezikiel, a hụrụ ndị nchụàjà ka ha na agagharị n’ogige nke ụlọ nsọ ahụ na-ejere ebo ndị na-abụghị ndị nchụàjà ozi. N’ụzọ doro anya, ndị nchụàjà a na-anọchite anya “òtù ndị nchụàjà ndị bụ́kwa eze,” bụ́ ndị ohu Jehova e tere mmanụ. (1 Pita 2:9) Otú ọ dị, ha agaghị na-eje ozi n’ogige nke ụlọ nsọ elu ala ahụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ dum nke Kraịst. (Mkpughe 20:4) N’ihe ka ukwuu n’oge ahụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ha nile, ndị ahụ e tere mmanụ ga na-ejere Chineke ozi n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, ‘eluigwe onwe ya.’ (Ndị Hibru 9:24) Ebe ọ bụ na a hụrụ ndị nchụàjà ka ha na-aba ma na-apụta n’ogige ndị nke ụlọ nsọ Ezikiel ahụ, ọhụụ ahụ aghaghị ịdị na-emezu taa, ka ụfọdụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ ka nọ n’ụwa. N’ihi ya, mbipụta nke March 1, 1999, nke magazin a gosipụtara echiche a gbaziri agbazi n’isiokwu a. N’ụzọ dị otú a, rute nnọọ ná ngwụsị nke narị afọ nke 20, a mụkwasịrị ìhè ime mmụọ n’amụma Ezikiel.
Dị Njikere Ime Mgbanwe n’Echiche Gị
17. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka i meworo n’echiche gị kemgbe ị matara eziokwu ahụ, oleekwa otú ha siworo baara gị uru?
17 Onye ọ bụla nke chọrọ inwe ihe ọmụma nke eziokwu ahụ aghaghị ịdị njikere ịdọta “ihe nile ọ bụla a na-echepụta n’agha ịṅa ntị Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 10:5) Nke ahụ anaghị adị mfe mgbe nile, karịsịa mgbe echiche gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. Dị ka ihe atụ, tupu ị mata eziokwu Chineke, ị pụrụ ịnụwo ụtọ isoro ezinụlọ gị na-eme ememe ezumike ụfọdụ nke okpukpe. Mgbe ị malitesịrị ịmụ Bible, gị aghọta na ememe ndị a malitere n’ezie n’aka ndị na-ekpere arụsị. Na mbụ, ị pụrụ ịlawo azụ itinye ihe ị na-amụta n’ọrụ. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ bịara karịa mmetụta okpukpe ike, i wee kwụsị ikere òkè n’ememe ndị na-adịghị atọ Chineke ụtọ. Jehova ọ́ gọzibeghị mkpebi gị?—Tụlee Ndị Hibru 11:25.
18. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe e mere ka nghọta anyị nwere banyere eziokwu Bible doo anya?
18 Anyị na-erite uru mgbe nile site n’ime ihe n’ụzọ nke Chineke. (Aịsaịa 48:17, 18) Ya mere mgbe e mere ka echiche anyị banyere otu akụkụ Bible doo anya, ka anyị ṅụrịa ọṅụ n’eziokwu na-aga n’ihu! N’ezie, anyị ịnọgide na-abụ ndị a na-enye ihe ọmụma na-akwado na anyị nọ n’ezi ụzọ ahụ. Ọ bụ “okporo ụzọ ndị ezi omume” nke “dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) N’eziokwu, n’oge a, anyị na-ahụ akụkụ ụfọdụ nke nzube Chineke “n’ime ilu.” Ma mgbe oge Chineke kara aka ruru, anyị ga-ahụ eziokwu ahụ n’ịma mma ya nile, ọ bụrụhaala na ụkwụ anyị zọgidesiri ike “n’okporo ụzọ” ahụ. Ka ọ dịgodị, ka anyị ṅụrịa ọṅụ n’eziokwu ndị ahụ Jehova meworo ka ha doo anya, na-echere ka e nyekwuo anyị ihe ọmụma banyere ndị ahụ anyị na-aghọtabeghị nke ọma.
19. Olee otu ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ eziokwu ahụ n’anya?
19 Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ìhè ahụ dị, n’ụzọ dị irè? Otu ụzọ bụ site n’ịgụchi Okwu Chineke anya—kwa ụbọchị ma ya kwe mee. Ị̀ na-agbaso usoro ọgụgụ
Bible chiri anya? Magazin Ụlọ Nche na Teta! na-enyekwa anyị ụbara nri ime mmụọ na-ewuli elu ka anyị na-eri. Tụleekwa akwụkwọ dịgasị iche, broshuọ, na mbipụta ndị ọzọ a kwadebeworo maka abamuru anyị. Gịnịkwa banyere akụkọ ndị na-agba ume banyere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ bụ́ ndị a na-ebipụta na Yearbook of Jehovah’s Witnesses?20. Olee njikọ dị n’etiti ìhè na eziokwu sitere n’aka Jehova na anyị ịga nzukọ ndị Kraịst?
20 Ee, Jehova azawo ekpere ahụ e kpere n’Abụ Ọma 43:3 n’ụzọ dị egwu. Ná ngwụsị nke amaokwu ahụ, anyị na-agụ, sị: “Ka [ìhè na eziokwu gị] mee ka m bịaruo ugwu nsọ Gị, bịaruokwa ebe obibi Gị nile.” Ị̀ na-atụ anya isonyere ìgwè ndị ọzọ na-efe Jehova? Ntụziaka ime mmụọ ndị a na-enye ná nzukọ anyị bụ otu ụzọ dị mkpa Jehova si enye anyị ihe ọmụma taa. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji mee ka ekele anyị na-enwe maka nzukọ ndị Kraịst mikwuo emi? Anyị na-agba gị ume iji ekpere tụlee nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Mgbe C. T. Russell nwụsịrị, e wepụtara mbipụta e weere dị ka mpịakọta nke asaa nke Studies in the Scriptures ná mgbalị ịkọwa akwụkwọ Ezikiel na Mkpughe. Mpịakọta ahụ dabeere, n’otu akụkụ, n’ihe ndị Russell kwuru banyere akwụkwọ Bible ndị ahụ. Otú ọ dị, oge a ga-ekpughe ihe amụma ndị ahụ pụtara aka-erughị, n’ozuzu ya kwa, nkọwa e nyere ná mpịakọta nke Studies in the Scriptures ahụ edochaghị anya. N’afọ ndị sochirinụ, ebere Jehova nke na-erughịrị mmadụ na ihe ndị na-eme n’ụwa emewo ka ndị Kraịst ghọta ihe akwụkwọ amụma ndị ahụ pụtara n’ụzọ ka zie ezi.
Ị̀ Pụrụ Ịza?
• N’ihi gịnị ka Jehova ji ekpughe nzube ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu?
• Olee otú ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem si dozie okwu obibi úgwù?
• Usoro dị aṅaa nke ọmụmụ Bible ka Ndị Mmụta Bible oge mbụ gbasoro, n’ihi gịnịkwa ka o ji pụọ iche?
• Nye ihe atụ otú e si ekpughe ìhè ime mmụọ n’oge Chineke kara aka.
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 12]
Charles Taze Russell maara na ìhè ga-amụkwasị akwụkwọ Mkpughe n’oge Chineke kara aka