Obere Ahụ, Obi Ukwu
Obere Ahụ, Obi Ukwu
GỊNỊ ka ọ ga-adị ka ya bụ́ ịgwa ndị ị na-amabughị banyere Alaeze Chineke ma ọ bụrụ na ị dị nanị sentimita 76 n’ogologo? Laura pụrụ ịgwa gị. Mgbe ọ dị afọ 33, nke ahụ bụ ogologo ya, nanị sentimita 76. Ya na nwanne ya nwanyị, bụ́ María, bụ́ onye dị afọ 24, dịkwa sentimita 86 n’ogologo, bi na Quito, Ecuador. Ka ha kọwaa ihe mgbochi ndị ha na-enwe n’ozi ndị Kraịst ha.
“Iji garuo n’ókèala anyị na-eme nkwusa na ya nakwa ná nzukọ ndị Kraịst, anyị na-eje ije ruo ihe dị ka ọkara kilomita iji nweta bọs. Site n’ebe a na-akwụsị anyị, anyị na-eje ije ruo ọkara kilomita ọzọ iji nweta bọs nke abụọ. N’ụzọ dị mwute, nkịta ise ndị anya dị ọkụ bi n’ụzọ a. Anyị na-atụ nkịta ụjọ nke ukwuu n’ihi na ha pụrụ iyi anyị ka ha buru ibu dị ka ịnyịnya. Iji chụghachi ha azụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, anyị na-eji osisi, bụ́ nke anyị na-ezo n’otu ebe tupu anyị abanye bọs ka anyị wee nwee ike iji ya mgbe anyị ga-alaghachi n’ebe obibi anyị.
“N’ụzọ nkịtị, ịbanye bọs na-abụrụ anyị steepụ dị elu. Anyị na-eguzo n’elu ikpo ahịhịa dị n’ebe bọs na-akwụsị ka o wee kara anyị mfe ịbanye n’ime bọs. Ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala na-akwọrọ ụgbọala ha rute n’ikpo ahịhịa ahụ, ma ndị ọzọ adịghị eme otú ahụ. Mgbe ọ dị otú ahụ, onye nke ka ogologo n’ime anyị na-enyere onye nke ka mkpụmkpụ aka ịbanye. Iji nweta bọs nke abụọ, ọ na-achọ na anyị ga-agafe okporo ụzọ na-ekwo ekwo—nke a bụụrụ ụkwụ anyị dị mkpụmkpụ oké ọrụ. N’ihi obere ahụ anyị, akpa oziọma dị arọ na-ewetakwu ihe ịma aka. Iji mee ka akpa ahụ dịkwuo fere fere, anyị na-eji Bible na-aba n’akpa uwe eme ihe, welatakwa ọnụ ọgụgụ akwụkwọ ndị anyị na-eji.
“Kemgbe anyị bụ ụmụaka, anyị abụọ na-anọ nnọọ nanị anyị. Ndị agbata obi anyị maara na ịgwa ndị anyị na-amabughị okwu abụworo anyị ahụmahụ na-eyi egwu. N’ihi ya, ọ na-eju ha anya ma na-amasị ha ịhụ anyị ka anyị na-akụ aka n’ọnụ ụzọ ha, ha na-egekarịkwa anyị ntị. Ma n’ebe a na-amaghị anyị nke ọma, nanị ihe ndị mmadụ na-ahụ mgbe mgbe n’ime anyị bụ na anyị bụ ndị akakpọ; n’ihi ya, ha adịghị ege anyị ntị nke ọma dị ka o si kwesị ozi anyị. Ka o sina dị, ịmara na Jehova hụrụ anyị n’anya na-enye anyị obi ike ịnọgide n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ. Ịtụgharị uche n’Ilu 3:5, 6 na-enyekwa anyị obi ike.”
Dị ka Laura na María na-egosipụta, ịnọgidesi ike n’agbanyeghị ihe mgbochi dị iche iche n’ụzọ anụ ahụ pụrụ inye Chineke otuto. Pọl onyeozi kpere ekpere ka e wepụrụ ya “ogwu n’anụ ahụ,” ikekwe ihe otiti anụ ahụ. Ma Chineke gwara ya, sị: “Amara m ezuworo gị: n’ihi na e mewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” Ee, ọ dịghị mkpa ka e wepụrụ 2 Ndị Kọrint 12:7, 9, 10) Afọ ụfọdụ mgbe nke a gasịrị, Pọl dere, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
anyị ọrụsị anụ ahụ tupu anyị enwee ike ijere Chineke ozi. Ịdabere kpam kpam n’ebe Chineke nọ pụrụ inyere anyị aka iji ọnọdụ ndị anyị nọ na ha na-eme ihe n’ụzọ kasị mma. N’ihi na Pọl lere “ogwu n’anụ ahụ” ya anya n’ụzọ dị otú a, ọ pụrụ ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (N’oge a, Chineke na-arụzu oké ọrụ site n’aka ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka bụ́ ndị raara onwe ha kpam kpam nye ya. Ọtụtụ n’ime ha nwere ọrụsị n’ụzọ ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ha nile nwere olileanya na Chineke ga-agwọ ha mgbe Alaeze ya ga-achị, ha adịghị echere ruo mgbe Chineke mere ka ha nwere onwe ha pụọ ná nsogbu ha tupu ha agbalịa ime ihe n’ozi ya.
Ì nwere adịghị ike anụ ahụ ụfọdụ? Nwee obi ike! Site n’okwukwe gị, ị pụrụ isonye ná ndị dị ka Pọl, Laura, na María. A pụrụ ikwu banyere ha dị ka e kwuru banyere ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe n’oge ochie, sị: “E sitere n’okwukwe mee ka ha dị ike site n’adịghị ike.”—Ndị Hibru 11:34.
[Foto dị na peeji nke 8]
María
Laura
[Foto dị na peeji nke 9]
María na-enyere Laura aka ịba bọs
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
“Anyị na-atụ nkịta ụjọ nke ukwuu n’ihi na ha pụrụ iyi anyị ka ha buru ibu dị ka ịnyịnya”
N’okpuru: Laura na María na ndị ha mụụrụ Bible