Onye Kere Anyị Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi
Chineke kwere Ebreham onye amụma nkwa na otu n’ime ụmụ ya ga-agọzi “mba niile nke ụwa.” (Jenesis 22:18) Ònye ka nwa ahụ ga-abụ?
Ihe fọrọ obere ka o ruo puku afọ abụọ gara aga, Chineke nyere Jizọs, bụ́ nwa Ebreham ike o ji rụọ ọrụ ebube dị iche iche. Ọrụ ebube ndị ahụ gosiri na Chineke ga-esi n’aka Jizọs gọzie mba niile ma si otú ahụ mezuo nkwa ahụ o kwere Ebreham.—Ndị Galeshia 3:14.
Ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ nyeere ndị mmadụ aka ịmata na ọ bụ ya bụ onye Chineke ga-esi n’aka ya gọzie ụmụ mmadụ. Ha gosikwara otú Chineke ga-esi jiri ya gọzie ụmụ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi. Legodị otú ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ si mee ka anyị mata ụfọdụ àgwà ndị magburu onwe ha o nwere.
Obiọma—Jizọs gwọrọ ndị ọrịa.
E nwere mgbe otu onye ekpenta rịọrọ Jizọs ka ọ gwọọ ya. Jizọs bitụrụ ya aka ma gwa ya, sị: “Achọrọ m.” Ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya ozugbo.—Mak 1:40-42.
Mmesapụ aka—Jizọs nyere ndị agụụ ji nri.
Jizọs achọghị ka agụụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ. O nyere ọtụtụ puku mmadụ nri ihe karịrị otu ugboro. Otú o si mee ya bụ na o mere ka achịcha ole na ole na azụ̀ ole na ole dị ọtụtụ. (Matiu 14:17-21; 15:32-38) Ha niile richara nri ahụ rijuo afọ. Ha rifọkwara nri buru ibu.
Ọmịiko—Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ.
Jizọs kpọlitere otu mkpụrụ nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ na-eru uju n’ihi na “o nwere ọmịiko.” Nwaanyị a enweghị onye ọzọ ga-elekọta ya.—Luk 7:12-15.